Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi

Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi

Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi

“Ị ga-azọpụtakwa ndị e wedara n’ala [ma ọ bụ, “ndị dị umeala n’obi”].”—2 Samuel 22:28.

1, 2. Olee ihe jikọrọ ọtụtụ ndị ọchịchị ụwa?

PYRAMID ndị e nwere n’Ijipt na-agba akaebe banyere ndị chịrị ala ahụ n’oge ndị gara aga. Ndị ọzọ a ma ama n’akụkọ ihe mere eme bụ Senakerib nke Asiria, Alexander Onye Ukwu nke Gris na Julius Caesar nke Rom. Ndị ọchịchị nile dị otú ahụ nwere otu ihe jikọrọ ha. Ọ dịghị nke a maara dị ka onye dị umeala n’obi.—Matiu 20:25, 26.

2 Ì chere na ndị ọchịchị a a kpọrọ aha n’elu ga na-achọgharị n’obodo ha ịhụ ma è nwere ndị dị ala chọrọ nkasi obi? Ọ dịghị ma ọlị! Ị gaghịkwa eche na ha na-aga n’ebe obibi nke ndị ogbenye ha na-achị bụ́ ndị a na-emegbu emegbu iji gbaa ha ume. Lee ka otú ha si mesoo ndị dị ala ihe si dị iche n’otú Onye Ọchịchị Kasị Elu n’eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke, si emeso ha!

Onye Kasị Dị Umeala n’Obi

3. Olee otú Onye Ọchịchị Kasị Elu si emeso ụmụ mmadụ ọ na-achị ihe?

3 Jehova dị nnọọ ukwuu ma dị elu n’ụzọ na-enweghị atụ, n’agbanyeghị nke ahụ, “anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Gịnịkwa ka Jehova na-eme mgbe ọ hụrụ ndị dị ala na-efe ofufe bụ́ ndị ule dị iche iche kụdara obi? A pụrụ ikwu na o ji mmụọ nsọ ya ‘ebinyere’ ndị dị otú ahụ iji ‘mee ka obi nke ndị a zọpịara azọpịa n’ime mmụọ ha dị ndụ.’ (Aịsaịa 57:15) N’ihi ya, ndị na-efe ya ofufe o meworo ka mmụọ ha dịghachi ndụ na-amaliteghachi iji ọṅụ ejere ya ozi. Lee ka Chineke si dị umeala n’obi!

4, 5. (a) Olee ihe ọbụ abụ ahụ chere banyere otú Chineke si achị? (b) Olee ihe Chineke ‘ihulata ala’ iji nyere “onye na-enweghị ike” aka pụtara?

4 Ọ dịbeghị onye ọ bụla ọzọ weturula onwe ya ala ruo n’ókè Eze Kachasị Elu merela iji nyere ụmụ mmadụ na-eme mmehie aka. Ọbụ abụ ahụ pụrụ ide, sị: “Jehova dị elu n’elu mba nile, n’elu eluigwe ka ebube Ya dị. Ònye dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị? nke na-eme Onwe ya ka Ọ dị elu ịnọdụ ka eze, nke na-eme Onwe ya ka Ọ dị ala [ma ọ bụ, “onye na-ehulata ala”] ilekwasị eluigwe na ilekwasị ụwa anya. Ọ bụ onye na-eme ka onye na-enweghị ike si n’ájá bilie, ọ na-esi n’ebe ikpofu ahịhịa bulie ogbenye elu.”—Abụ Ọma 113:4-7.

5 Jehova dị ọcha ma dị nsọ ma dị nsọ, n’ihi ya kwa, bụrụ onye na-adịghị “mpako.” (Mak 7:22, 23) “Onye na-ehulata ala” pụrụ ịpụta onye na-eweda onwe ya ala iji tinye onwe ya n’ọnọdụ onye ọ ka n’obodo ma ọ bụ onye na-eweda onwe ya ala site n’ọkwá ma ọ bụ ùgwù ya mgbe ya na onye ọ ka na-emekọrịta ihe. N’ihi ya, ụfọdụ Bible na-asụgharị Abụ Ọma 113:6 ikwu na Chineke dị umeala n’obi. Lee ka nke ahụ si kwekọọ n’omume nke Chineke anyị dị umeala n’obi bụ́ onye na-elebara mkpa nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-efe ya ofufe anya!—2 Samuel 22:36.

Ihe Mere Jizọs Ji Dị Umeala n’Obi

6. Olee umeala n’obi kachasịnụ Jehova gosipụtara?

6 Nzite Chineke zitere Ọkpara ya o buru ụzọ mụọ nke ọ hụrụ n’anya ka a mụọ ya n’ụwa ma zụlite ya dị ka mmadụ ka o wee zọpụta ihe a kpọrọ mmadụ bụ ịdị umeala n’obi na ịhụnanya kachasịnụ O gosipụtatụrụla. (Jọn 3:16) Jizọs kụziiri anyị eziokwu banyere Nna ya nke eluigwe ma nyezie ndụ mmadụ ya zuru okè iji wepụ “mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29; 18:37) Jizọs na-egosipụta àgwà Nna ya, nke gụnyere ịdị umeala n’obi, n’ụzọ zuru okè, n’ihi ya ọ dị njikere ime ihe Chineke gwara ya mee. Nke a bụ ihe atụ umeala n’obi na ịhụnanya kachasịnụ otu n’ime ndị Chineke kere eke gosipụtatụrụla. Ọ bụghị mmadụ nile ji ịdị umeala n’obi Jizọs kpọrọ ihe, ndị iro ya ledịrị ya anya dị ka “onye dị ala karịa mmadụ nile.” (Daniel 4:17) Ka o sina dị, Pọl onyeozi ghọtara na ndị kwere ekwe ibe ya kwesịrị iṅomi Jizọs ma dị umeala n’obi mgbe ha na ibe ha na-emekọrịta ihe.—1 Ndị Kọrint 11:1; Ndị Filipaị 2:3, 4.

7, 8. (a) Olee otú Jizọs si mụta ịdị umeala n’obi? (b) Olee arịrịọ Jizọs rịọrọ ndị pụrụ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?

7 Pọl mere ka ihe atụ gbara ọkpụrụkpụ Jizọs setịpụrụ pụta ìhè, na-ede, sị: “Meenụ ka ụzọ iche echiche a dịrị n’ime unu bụ́ nke dịkwa n’ime Kraịst Jizọs, onye, ọ bụ ezie na ọ dị adị n’ọdịdị nke Chineke, na-echeghị echiche ịnara ihe n’ike, ya bụ, ka o wee hà ka Chineke. Ee e, kama o mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi nke mmadụ. Ọzọkwa, mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ọdịdị nke mmadụ, o wedara onwe ya n’ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.”—Ndị Filipaị 2:5-8.

8 Ụfọdụ pụrụ iche, sị, ‘Olee otú Jizọs si mụta ịdị umeala n’obi?’ Ọ bụ ihe magburu onwe ya si ná mmekọrịta chiri anya nke ya na Nna ya nke eluigwe nwere ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ pụta, bụ́ mgbe ọ rụrụ ọrụ dị ka “onye ọkà” nke Chineke n’ike ihe nile. (Ilu 8:30) Mgbe Adam na Iv nupụsịrị isi ahụ n’Iden, Ọkpara Chineke e bu ụzọ mụọ hụrụ otú Nna ya si jiri ịdị umeala n’obi mesoo ụmụ mmadụ mere mmehie ihe. N’ihi ya, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosipụtara ụdị ịdị umeala n’obi Nna ya ma rịọ arịrịọ a: “Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ.”—Matiu 11:29; Jọn 14:9.

9. (a) Olee ihe mere Jizọs ji nwee mmasị n’ebe ụmụaka nọ? (b) Site n’iji nwatakịrị mee ihe, gịnị ka Jizọs kụziri?

9 Ụmụaka atụghị Jizọs ụjọ n’ihi na ọ dị umeala n’obi n’ezie. Kama nke ahụ, ha nwere mmasị ịbịakwute ya. Ya onwe ya hụkwara ụmụaka n’anya, ọ nọnyekwaara ha. (Mak 10:13-16) Olee ihe mere Jizọs ji nwee mmasị n’ebe ụmụaka nọ? N’ezie, ha nwere àgwà ndị mara mma bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya toro eto na-adịghị egosipụta mgbe nile. Onye ọ bụla maara na ụmụaka na-ele ndị toro eto anya dị ka ndị ka ha. Ihe ị ga-eji mata nke a bụ ọtụtụ ajụjụ ha na-ajụ. Ee, e jiri ha tụnyere ọtụtụ ndị toro eto, ụmụaka na-aka adị njikere ịmụta ihe, ha adịghịkwa akparu nganga ka ndị toro eto. N’otu oge, Jizọs kpọpụtara otu nwatakịrị ma gwa ụmụazụ Ya, sị: “Ọ gwụla ma ùnu chigharịrị wee dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze nke eluigwe ma ọlị.” Ọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya n’ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kasị ukwuu n’alaeze nke eluigwe.” (Matiu 18:3, 4) Jizọs kwupụtara ụkpụrụ a: “Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, ma onye na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Luk 14:11; 18:14; Matiu 23:12.

10. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

10 Eziokwu ahụ na-ewelite ajụjụ ndị dị mkpa. Ruo n’ókè ụfọdụ, anyị inweta ndụ ebighị ebi dabeere n’anyị ịzụlite ezi ịdị umeala n’obi, ma n’ihi gịnị ka o ji esiri Ndị Kraịst ike mgbe ụfọdụ ịdị umeala n’obi? N’ihi gịnị ka o ji esiri anyị ike iweda onwe anyị ala ma jiri ịdị umeala n’obi die ọnwụnwa? Gịnịkwa ga-enyere anyị aka ịzụlite ezi ịdị umeala n’obi?—Jems 4:6, 10.

Ihe Mere O Ji Esi Ike Ịdị Umeala n’Obi

11. Gịnị mere ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na ọ na-esiri anyị ike ịdị umeala n’obi?

11 Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịdị umeala n’obi, ọ bụghị nanị gị ka ọ dị otú ahụ. Laa azụ na 1920, magazin a tụlere ihe Bible kwuru banyere ịdị mkpa nke umeala n’obi, na-ekwu, sị: “Ebe anyị hụrụla otú Onyenwe anyị si jiri nnọọ ịdị umeala n’obi kpọrọ ihe, o kwesịrị ịgba ezi ndị na-eso ụzọ nile ume ịdị na-azụlite àgwà a kwa ụbọchị.” O kwuziri n’ezoghị ọnụ, sị: “N’agbanyeghị ndụmọdụ ndị a si n’Akwụkwọ Nsọ, ezughị okè mmadụ na-eme ka ọ bụrụ n’ebe a, karịa n’ebe ọ bụla ọzọ, ka ndị ghọrọ ndị nke Onyenwe anyị ma na-agbaso ụzọ ya na-enwe ihe isi ike.” Nke ahụ na-egosi otu ihe mere o ji esiri ezi Ndị Kraịst ike ịdị umeala n’obi—mmehie anyị bu pụta ụwa na-eme ka anyị na-achọ otuto gabiga ókè. Nke a bụ n’ihi na anyị bụ ụmụ nke mmadụ abụọ bụ́ ndị mmehie, bụ́ Adam na Iv, bụ́ ndị dabara n’ọnwụnwa nke ịchọ ọdịmma onwe ha nanị.—Ndị Rom 5:12.

12, 13. (a) Olee otú ụwa si eme ka o siere Ndị Kraịst ike ịdị umeala n’obi? (b) Ònye na-eme ka ọ na-esikwuru anyị ike ịdị umeala n’obi?

12 Ihe ọzọ mere o ji esiri anyị ike ịdị umeala n’obi bụ na anyị bi n’ụwa nke na-agba ndị mmadụ ume ịgbalị ịka ndị ọzọ. Otu n’ime ihe mgbaru ọsọ nke ụwa a bụ ịchọ imejụ “ọchịchọ nke anụ ahụ́ [na-emehie emehie] na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ.” (1 Jọn 2:16) Kama ịbụ ndị ọchịchọ nke ụwa na-achịkwa, ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-eme ka anya ha na-elegide otu ebe ma na-elekwasị anya n’ime uche Chineke.—Matiu 6:22-24, 31-33; 1 Jọn 2:17.

13 Ihe nke atọ mere o ji esi ike ịzụlite na igosipụta umeala n’obi bụ na ọ bụ onye malitere mpako, bụ́ Setan Ekwensu, na-achị ụwa a. (2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Timoti 3:6) Setan na-akwalite àgwà ọjọọ ya. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị Jizọs na ọ bụrụ na o fee ya ofufe na ya ga-enye ya “alaeze nile nke ụwa na ebube ha.” Dị ka onye na-egosipụta ịdị umeala n’obi mgbe nile, Jizọs jụwara isi ịnara ihe ahụ Ekwensu chọrọ inye ya. (Matiu 4:8, 10) N’otu aka ahụ, Setan na-anwa Ndị Kraịst ịchọwara onwe ha otuto. Kama ime otú ahụ, Ndị Kraịst dị umeala n’obi na-agbalị ịgbaso ihe nlereanya Jizọs, na-enye Chineke otuto na nsọpụrụ.—Mak 10:17, 18.

Ịzụlite na Igosipụta Ezi Ịdị Umeala n’Obi

14. Gịnị bụ “umeala n’obi ụgha”?

14 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọlọsi, Pọl onyeozi dọrọ ha aka ná ntị ka ha zere ime ka hà dị umeala n’obi iji dọta mmasị ndị mmadụ. Pọl kọwara nke a dị ka “umeala n’obi ụgha.” Ndị na-eme ka o yie ka hà dị umeala n’obi ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Kama nke ahụ, n’amaghị ama, ha na-egosipụta na nganga ‘na-afụli ha elu.’ (Ndị Kọlọsi 2:18, 23) Jizọs nyere ihe atụ nke ndị na-egosipụta umeala n’obi ụgha dị otú ahụ. Ọ mara ndị Farisii ikpe maka ekpere ha na-ekpe iji dọta mmasị ndị mmadụ na maka ọnụ ha na-eji ihu gbarụrụ agbarụ ebu ka ndị mmadụ wee hụ ha. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-eji ekpere anyị akpọrọ ihe, anyị kwesịrị iji obi umeala na-ekpe ha.—Matiu 6:5, 6, 16.

15. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nọgide na-adị nwayọọ n’obi? (b) Olee ụfọdụ ndị bụ́ ezi ihe nlereanya n’ịdị umeala n’obi?

15 Ilekwasị ndị kasị dịrị umeala n’obi, bụ́ Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, anya na-enyere Ndị Kraịst aka ịnọgide na-adị umeala n’obi. Ime nke a na-agụnye ịmụ Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta. (Matiu 24:45) Ọmụmụ ihe dị otú ahụ dị Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta oké mkpa, “ka obi [ha] wee ghara ịdị elu karịa ụmụnne [ha].” (Deuterọnọmi 17:19, 20; 1 Pita 5:1-3) Chee banyere ọtụtụ ndị a gọziri n’ihi ịdị umeala n’obi ha, ndị dị ka Rut, Hana, Elizabet na ọtụtụ ndị ọzọ. (Rut 1:16, 17; 1 Samuel 1:11, 20; Luk 1:41-43) Cheekwa banyere ọtụtụ ezi ihe nlereanya nke ndị ikom a ma ama bụ́ ndị nọgidere na-adị umeala n’obi ka ha na-ejere Jehova ozi, ndị dị ka Devid, Josaịa, Jọn Onye Na-eme Baptizim na Pọl onyeozi. (2 Ihe E Mere 34:1, 2, 19, 26-28; Abụ Ọma 131:1; Jọn 1:26, 27; 3:26-30; Ọrụ 21:20-26; 1 Ndị Kọrint 15:9) Gịnịkwanụ banyere ọtụtụ ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị anyị na-ahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge a? Site n’ịtụgharị uche n’ihe nlereanya ndị a setịpụrụ, ezi Ndị Kraịst ga-enwe ike ‘ịdị nwayọọ n’obi n’ebe ibe ha nọ.’—1 Pita 5:5.

16. Olee otú ozi Ndị Kraịst si enyere anyị aka ịdị umeala n’obi?

16 Ịgachi ozi Ndị Kraịst anya pụkwara inyere anyị aka ịdị umeala n’obi. Ịdị nwayọọ n’obi pụrụ ime ka ozi anyị dị irè mgbe anyị na-agakwuru ndị anyị na-amabughị bụ́ ndị anyị na-ahụ n’ozi ụlọ n’ụlọ na n’ebe ndị ọzọ. Ọ na-adịkarị otú ahụ mgbe ndị nwe ụlọ na-enweghị mmasị n’ozi Alaeze ahụ ma ọ bụ mgbe ha kparịrị anyị ná mmalite. Mgbe mgbe, ndị mmadụ na-agbagha ozizi anyị, ịdị umeala n’obi pụkwara inyere Onye Kraịst aka ịnọgide na-eji “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi” azaghachi. (1 Pita 3:15) Ndị ohu Chineke dị umeala n’obi akwagawo n’ógbè ndị ọhụrụ, ha enyewokwara ndị si n’obodo dịgasị iche aka, ma ndị ogbenye ma ndị ọgaranya. Ndị ozi dị otú ahụ pụrụ ịdị na-eji umeala n’obi anagide ihe isi ike nke ịmụ asụsụ ọhụrụ iji nwee ike inyere ndị ha na-ezisara ozi ọma aka. Nke a kwesịrị nnọọ ịja mma!—Matiu 28:19, 20.

17. Olee ọrụ dịịrị Ndị Kraịst bụ́ ndị chọrọ ịdị umeala n’obi?

17 Ọtụtụ ndị ejiriwo ịdị umeala n’obi rụọ ọrụ ndị dịịrị ha dị ka Ndị Kraịst, na-eme ka ihe ndị metụtara ndị ọzọ butere ndị nke ha ụzọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-achọ ịdị umeala n’obi n’aka nna bụ́ Onye Kraịst iwepụta oge site n’ihe ndị ọ na-eme iji kwadebe ma duziere ụmụ ya ọmụmụ Bible dị irè. Ịdị umeala n’obi na-emekwa ka ụmụaka nwee ike ịsọpụrụ ndị mụrụ ha, bụ́ ndị na-ezughị okè na irubere ha isi. (Ndị Efesọs 6:1-4) Ụmụ nwanyị ndị nwere di na-ekweghị ekwe na-ahụkarị onwe ha n’ọnọdụ ndị chọrọ ka ha dị umeala n’obi iji nwee ike irite di ha n’uru site “omume [ha] nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù miri emi.” (1 Pita 3:1, 2) Umeala n’obi na ịhụnanya achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-enyekwara anyị aka mgbe anyị ji ịhụnanya na-elekọta ndị nne na nna anyị na-arịa ọrịa na ndị mere agadi.—1 Timoti 5:4.

Ịdị Umeala n’Obi Na-edozi Nsogbu

18. Olee otú ịdị umeala n’obi pụrụ isi nyere anyị aka idozi nsogbu?

18 Ndị ohu Chineke nile bụ́ mmadụ ezughị okè. (Jems 3:2) Mgbe ụfọdụ, Ndị Kraịst abụọ pụrụ ise okwu ma ọ bụ nwee nghọtahie. Otu nwere ike inwe ezi ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa banyere onye nke ọzọ. Mgbe mgbe, a pụrụ idozi esemokwu ndị dị otú ahụ site n’itinye ndụmọdụ a n’ọrụ: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:13) N’eziokwu, ọ naghị adị mfe ịgbaso ndụmọdụ a, ma ịdị umeala n’obi ga-enyere mmadụ aka itinye ya n’ọrụ.

19. Gịnị ka anyị na-aghaghị icheta mgbe anyị na-agwa onye mejọrọ anyị okwu?

19 Mgbe ụfọdụ, Onye Kraịst pụrụ iche na ihe ọjọọ e mere ya buru nnọọ ibu ileghara anya. Ya bụrụ otú ahụ, ịdị umeala n’obi ga-enyere ya aka ịgakwuru onye ahụ o chere mejọrọ ya iji mee ka udo dịghachi n’etiti ha abụọ. (Matiu 18:15) Otu ihe mere nsogbu ji adịgide mgbe ụfọdụ n’etiti Ndị Kraịst bụ na otu n’ime ha ma ọ bụ ikekwe ha abụọ adịghị nke chọrọ ikweta na ọ bụ ya mejọrọ. Ma ọ bụkwanụ onye nke bu ụzọ gakwuru onye nke ọzọ pụrụ iji ọnụ ọjọọ gakwuru onye ahụ iji gosi na ya bụ onye ezi omume karịa onye ahụ. Kama ime otú ahụ, ịdị umeala n’obi n’ezie ga-enye nnọọ aka n’idozi ọtụtụ esemokwu.

20, 21. Olee otu n’ime ihe ndị kasị enyere mmadụ aka ịdị umeala n’obi?

20 Otu isi ihe dị mkpa n’ịzụlite ịdị umeala n’obi bụ ikpe ekpere maka enyemaka Chineke na mmụọ ya. Ma cheta, “Chineke . . . na-enye ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ,” tinyere mmụọ nsọ ya. (Jems 4:6) N’ihi ya, ya bụrụ na gị na onye kwere ekwe ibe gị enwee nghọtahie, kpegara Jehova ekpere ka o nyere gị aka iji umeala n’obi nabata obere mmejọ ma ọ bụ nnukwu mmejọ nke gị. Ọ bụrụ na e mejọrọ gị, onye mejọrọ gị ejirikwa ezi obi rịọ gị mgbaghara, jiri umeala n’obi gbaghara ya. Ọ bụrụ na o siiri gị ike ime nke a, rịọ Jehova n’ekpere ka o nyere gị aka iwepụ mpako ọ bụla ka pụrụ ịfọ n’obi gị.

21 Ịghọta ọtụtụ uru a na-erite site n’ịdị umeala n’obi kwesịrị ịkpali anyị ịzụlite na ịnọgide na-enwe àgwà a dị oké ọnụ ahịa. Iji nyere anyị aka ime otú ahụ, lee ihe nlereanya magburu onwe ya Jehova Chineke na Jizọs Kraịst setịpụụrụ anyị! Ya adịla mgbe ị ga-echefu mmesi obi ike a sitere n’aka Chineke: “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.”—Ilu 22:4.

Ihe Ndị A Ga-atụgharị Uche na Ha

• Olee ndị kasị dị umeala n’obi?

• Gịnị mere o ji esi ike ịzụlite umeala n’obi?

• Olee ihe pụrụ inyere anyị aka ịdị umeala n’obi?

• Gịnị mere o ji dị oké mkpa ịnọgide na-adị umeala n’obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 26]

Jizọs dị umeala n’obi n’ezie

[Foto dị na peeji nke 28]

Ụwa na-agba ndị mmadụ ume ịgbalị ịka ndị ọzọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto WHO nke L. Almasi/K. Hemzǒ sere

[Foto dị na peeji nke 29]

Ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka izi ndị anyị na-amabughị ozi ọma

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Mgbe mgbe, a pụrụ idozi nghọtahie site n’iji umeala n’obi na ịhụnanya kpuchie mmejọ

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

E nwere ọtụtụ ụzọ Ndị Kraịst si egosipụta ịdị umeala n’obi