Ị̀ Ga-eso Chineke Jee Ije?
Ị̀ Ga-eso Chineke Jee Ije?
“Iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije.”—MAỊKA 6:8.
1, 2. Olee otú a pụrụ isi jiri mmetụta Jehova na-enwe n’ebe anyị nọ tụnyere nke nne ma ọ bụ nna na-enwe mgbe ọ na-akụziri nwa ya ije ije?
NWA ọhụrụ nke ụkwụ na-esichaghị ike n’ala esetịpụ aka ijide aka nna ya ma si otú a malite ịzọpụ ụkwụ. Ọ pụrụ iyi obere ihe, ma nye nne na nna ya, ọ bụ ihe dị ịrịba ama, ihe na-eme ka ha nwee nnọọ olileanya. Nne na nna ahụ na-atụsi anya ike ịhụ mgbe ha na nwa ha ga-eso na-eje ije ụkwụ na ụkwụ n’ọdịnihu. Ha na-atụ anya iduzi na ịkwado nwa ha n’ọtụtụ ụzọ ruo ogologo oge n’ọdịnihu.
2 Jehova Chineke nwere mmetụta dị otú ahụ n’ebe ụmụ elu ala ya nọ. N’otu oge, o kwuru banyere ndị ya bụ́ Izrel, ma ọ bụ Ifrem, sị: “Mụ onwe m na-ezi Ifrem ije ije; [kuru] ha n’ogwe aka [M] abụọ . . . Achịịrị m ụdọ mmadụ, bụ́ ihe nhiegide ịhụnanya, adọ ha.” (Hosea 11:3, 4) N’ebe a, Jehova na-akọwa onwe ya dị ka nna na-ahụ n’anya nke ji ndidi akụziri nwa ya otú e si eje ije, ikekwe na-ekuru ya n’ogwe aka ya mgbe ọ bụla ọ dara ada. Jehova, bụ́ Nna kasị mma e nwere, dị njikere ịkụziri anyị otú e si eje ije. Obi na-adịkwa ya ụtọ iso anyị na-eje ije ka anyị na-amụtakwu ije ije. Dị ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke isiokwu a dabeere na ya na-egosi, anyị pụrụ iso Chineke jee ije! (Maịka 6:8) Ma gịnị ka iso Chineke eje ije pụtara? Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ime otú ahụ? Olee otú ọ pụrụ isi kwee omume? Oleekwa ngọzi ndị a na-enweta site n’iso Chineke eje ije? Ka anyị tụlee ajụjụ anọ a otu otu.
Gịnị Ka Iso Chineke Eje Ije Pụtara?
3, 4. (a) Olee ihe dị ịrịba ama n’ihe e ji mee ihe atụ nke iso Chineke eje ije? (b) Gịnị ka iso Chineke eje ije pụtara?
3 N’ezie, mmadụ nke nwere anụ ahụ́ na ọbara apụghị iso Jehova bụ́ mmụọ jee ije n’ụzọ nkịtị. (Ọpụpụ 33:20; Jọn 4:24) Ya mere, mgbe Bible na-ekwu banyere mmadụ iso Chineke na-eje ije, ọ bụ n’ụzọ ihe atụ. Ọ na-enye ihe atụ dị ịrịba ama nke ndị si ná mba nile na agbụrụ nile pụrụ ịghọta, na nke ga-adịgide adịgide. E kwuwerị, olee ebe ma ọ bụ mgbe ndị mmadụ na-agaghị aghọta ihe bụ́ mmadụ na onye ọzọ iso eje ije? Ọ̀ bụ na ihe atụ ahụ adịghị egosi ịhụnanya na ọbụbụenyi? Mmetụta ndị dị otú ahụ na-eme ka anyị ghọtakwuo ihe iso Chineke eje ije pụtara. Otú ọ dị, ka anyị kapịkwuo ya ọnụ.
4 Cheta ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ịnọk na Noa. Gịnị mere e ji kọwaa ha dị ka ndị ha na Chineke so jegharịa? (Jenesis 5:24; 6:9) Na Bible, okwu ahụ bụ́ “ije ije” na-apụtakarị ịdị na-akpa otu ụdị àgwà a kapịrị ọnụ. Ịnọk na Noa kpebiri ibi ndụ kwekọrọ n’uche Jehova Chineke. N’adịghị ka ndị ha na ha dịkọrọ ndụ, ha chọrọ nduzi Jehova ma gbasoo ya. Ha tụkwasịrị ya obi. Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ Jehova nọ na-ekpebiri ha ihe ha ga-eme? Ee e. Jehova enyela ụmụ mmadụ nnwere onwe ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme, ọ chọkwara ka anyị jiri onyinye ahụ na ‘ikike iche echiche’ anyị na-eme ihe. (Ndị Rom 12:1) Otú ọ dị, mgbe anyị na-eme mkpebi, anyị kwesịrị iji umeala n’obi kwe ka uche Jehova nke karịrị nnọọ nke anyị chịkwaa ikike iche echiche anyị. (Ilu 3:5, 6; Aịsaịa 55:8, 9) Ka anyị na-eje ije ná ndụ, ọ dị nnọọ ka anyị so Jehova aga ụkwụ na ụkwụ.
5. Gịnị mere Jizọs ji kwuo banyere ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ mmadụ?
5 Bible na-ejikarị ndụ atụnyere ime njem ma ọ bụ ije ije. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji ya atụnyere ya n’ụzọ pụtara ìhè, ma n’ebe ndị ọzọ, ọ na-eji ya atụnyere ya n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?” (Matiu 6:27) Okwu ahụ nwere ike ịgbagwoju gị anya. Olee ihe mere Jizọs ga-eji kwuo banyere ịgbakwụnye “otu kubit,” nke bụ́ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịdị anya, ná “ndụ” mmadụ, bụ́ nke a na-eji ihe e ji atụ oge n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ? * O doro anya na Jizọs ji ndụ na-atụnyere njem. Ya mere, ihe ọ na-akụzi bụ na ichegbu onwe gị agaghịdị agbakwụnye otu nzọụkwụ na njem nke ndụ gị. Otú ọ dị, ànyị kwesịrị ikwubi na anyị apụtụghị ịgbatịkwu njem ahụ? Mbanụ! Nke ahụ na-eduga anyị n’ajụjụ nke abụọ, Gịnị mere o ji dị anyị mkpa iso Chineke jee ije?
Gịnị Mere O Ji Dị Anyị Mkpa Iso Chineke Na-eje Ije?
6, 7. Gịnị dịsi ụmụ mmadụ na-ezughị okè mkpa ike, oleekwa ihe mere anyị kwesịrị iji legara Jehova anya igbo mkpa ahụ?
6 A kọwara otu ihe mere o ji dị anyị mkpa iso Jehova Chineke na-eje ije na Jeremaịa 10:23: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Ya mere, anyị bụ́ ụmụ mmadụ apụghị iduzi ndụ anyị, e nyeghịkwa anyị ikike ime otú ahụ. Nduzi dịsi anyị mkpa ike. Ndị kpebiri imere otú o si sọ ha, n’ekweghị ka Chineke na-eduzi ha, na-ehie otu ụzọ ahụ Adam na Iv hiere. Di na nwunye mbụ ahụ weghaara ọrụ nke ikpebiri onwe ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 3:1-6) “Ọ bụghị n’aka” anyị ka ọ dị ime mkpebi ahụ.
7 Í cheghị na nduzi dị gị mkpa na njem nke ndụ? Kwa ụbọchị, anyị na-enwe mkpebi ndị anyị ga-eme, ma ndị ukwu ma ndị nta. Ụfọdụ n’ime ha na-esi ike omume, ha pụkwara imetụta ọdịnihu anyị—nakwa ọdịnihu nke ndị anyị hụrụ n’anya. Ma cheedị nnọọ echiche na onye tọrọ anyị ezigbo ọtụtọ ma mara nnọọ ihe karịa anyị nwere obi ụtọ iji ịhụnanya na-agwa anyị otú anyị ga-esi mee mkpebi ndị ahụ! Ọ dị mwute ịhụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa na-ahọrọ ịtụkwasị echiche nke ha obi ma na-eduzi nzọụkwụ ha. Ha na-eleghara eziokwu ahụ dị n’Ilu 28:26 anya: “Onye na-atụkwasị obi n’obi nke aka ya, onye ahụ bụ onye nzuzu: ma onye na-eje ije n’amamihe, onye ahụ ka a ga-eme ka o wepụga onwe ya.” Jehova chọrọ ka anyị zere ọdachi ndị na-abịa site n’ịtụkwasị obi mmadụ dị aghụghọ obi. (Jeremaịa 17:9) Ọ chọrọ ka anyị jiri amamihe na-eje ije, ka anyị tụkwasị ya obi dị ka Onye Nduzi na Onye Nkụzi anyị maara ihe. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ dịghị ihe ga-eme anyị na njem anyị ná ndụ, njem anyị ga-abụkwa nke na-eju afọ ma na-enye ọṅụ.
8. Olee ebe mmehie na ezughị okè na-emesị eduga ụmụ mmadụ, ma gịnị ka Jehova zubeere anyị?
8 Ihe ọzọ mere o ji dị anyị mkpa iso Chineke jee ije bụ n’ihi otú njem anyị na-achọ ime dịruru n’ogologo. Bible kwuru otu eziokwu dị mwute. N’ụzọ ụfọdụ, mmadụ nile na-ezughị okè na-aga otu ebe. N’ịkọwa nsogbu ndị ime agadi na-akpata, Eklisiastis 12:5 na-ekwu, sị: “Mmadụ na-ala n’ụlọ ebighị ebi ya, ndị na-eti aka n’obi ewee jegharịa n’ámá gburugburu.” Gịnị bụ ‘ụlọ ebighị ebi a’? Ọ bụ ili, bụ́ ebe mmehie na ezughị okè na-emesị duga anyị. (Ndị Rom 6:23) Otú ọ dị, Jehova chọrọ ka anyị jee ihe karịrị njem dị mkpirikpi, nke jupụtara ná nsogbu malite n’ọmụmụ ruo n’ọnwụ. (Job 14:1) Ọ bụ nanị mgbe anyị so Chineke na-eje ije ka anyị pụrụ inwe olileanya ije ije ruo ogologo oge o zubere ka anyị jee—ruo mgbe ebighị ebi. Ọ́ bụghị ihe ị chọrọ? Ya bụrụ otú ahụ, o doro anya na ọ dị gị mkpa iso Nna gị na-eje ije.
Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Soro Chineke Jee Ije?
9. Gịnị mere Jehova ji zonahụ ndị ya onwe ya mgbe ụfọdụ, ma olee otú o si mesie ha obi ike dị ka Aịsaịa 30:20 si kwuo?
9 Ajụjụ nke atọ anyị ga-atụle chọrọ ka anyị lebara ya anya nke ọma. Ajụjụ ahụ bụ, Olee otú anyị pụrụ isi soro Chineke jee ije? Anyị na-achọta azịza ya n’Aịsaịa 30:20, 21: “[Onye] ozizi gị agaghị ezobe onwe [ya] ọzọ, kama anya gị abụọ ga na-ahụ [onye] ozizi gị: ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” N’amaokwu ndị a na-agba ume, ọ pụrụ ịbụ na okwu Jehova nke dị n’amaokwu nke 20 chetaara ndị ya na mgbe ha nupụụrụ ya isi, a pụrụ ikwu na o zonahụrụ ha onwe ya. (Aịsaịa 1:15; 59:2) Ma n’ebe a, e gosiri Jehova, ọ bụghị dị ka onye zoro ezo, kama dị ka onye guzo nnọọ n’ihu ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ihe pụrụ ịgbata anyị n’obi bụ onye nkụzi nke guzo n’ihu ụmụ akwụkwọ ya, na-egosi ha ihe ọ chọrọ ka ha mụta.
10. N’echiche dị aṅaa ka ị pụrụ ‘ịnụ okwu n’azụ gị’ site n’ọnụ Onye Nkụzi Ukwu gị?
10 N’amaokwu nke 21, e ji ihe atụ ọzọ dị iche mee ihe. E gosiri Jehova dị ka onye na-aga n’azụ ndị ya, na-agwa ha ụzọ ha kwesịrị ije ije na ya. Ndị ọkà mmụta Bible ekwuola na okwu a pụrụ ịdabere n’otú ndị ọzụzụ atụrụ na-esi eso atụrụ ha mgbe ụfọdụ, na-akpọ ha òkù iji duzie ha ma mee ka ha ghara ịkpafu. Olee otú ihe atụ a si metụta anyị? Mgbe anyị na-agụ Okwu Chineke iji nweta nduzi, anyị na-agụ okwu ndị e dere ọtụtụ puku afọ gara aga. Anyị pụrụ ikwu na anyị na-anụ ya n’azụ anyị, n’ihi na e dere ha n’oge ndị gara aga. N’agbanyeghị nke ahụ, ha ka bakwara nnọọ uru taa dị nnọọ ka ha bara mgbe e dere ha. Ndụmọdụ Bible pụrụ iduzi anyị ná mkpebi ndị anyị na-eme kwa ụbọchị, ọ pụkwara inyere anyị aka ịhazi otú anyị ga-esi bie ndụ ruo ọtụtụ afọ n’ọdịnihu. (Abụ Ọma 119:105) Mgbe anyị ji obi anyị nile na-achọ ndụmọdụ dị otú ahụ ma na-etinye ya n’ọrụ, Jehova ga-abụzi Onye Ndú anyị. Anyị so Chineke na-eje ije.
11. Dị ka Jeremaịa 6:16 si kwuo, olee ihe atụ magburu onwe ya Jehova meere ndị ya, ma olee otú ha si meghachi omume?
11 Ànyị na-ekwe n’ezie ka Okwu Chineke na-eduzichi anyị anya otú ahụ? O kwesịrị ka anyị nọrọ ọdụ mgbe ụfọdụ ma jiri ezi obi nyochaa onwe anyị. Ka anyị tụlee otu amaokwu nke ga-enyere anyị aka ime otú ahụ: “Otú a ka Jehova sịrị, Guzonụ n’ụzọ nile, hụ, jụọkwanụ ajụjụ Jeremaịa 6:16) Okwu ndị a pụrụ ichetara anyị onye na-eme njem nke kwụsịrị n’ebe ụzọ gbara ngalaba iji jụta ụzọ nke ọ ga-eso. Ọ dị ndị Jehova na-enupụ isi n’Izrel mkpa ime ihe yiri nke ahụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dị ha mkpa ịchọta ụzọ laghachi ‘n’okporo ụzọ nile nke mgbe ebighị ebi gara aga.’ “Ezi ụzọ” ahụ bụ ụzọ ndị nna nna ha kwesịrị ntụkwasị obi jere ije na ya, bụ́ ụzọ nke mba ahụ ji nzuzu kpapụ na ya. Ọ dị mwute na ndị Izrel jụwapụrụ isi ịnabata ihe a Jehova ji ịhụnanya chetara ha. Otu amaokwu ahụ gakwara n’ihu ikwu, sị: “Ha wee sị, Anyị agaghị eje ije n’ime ya.” Ma n’oge a, ndị Chineke agbasoola ndụmọdụ dị otú ahụ.
banyere okporo ụzọ nile nke mgbe ebighị ebi gara aga, sị, Olee ebe ezi ụzọ dịkwa? jeekwanụ ije n’ime ya, wee chọtara mkpụrụ obi unu izu ike.” (12, 13. (a) Olee ihe ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ merela banyere ndụmọdụ ahụ dị na Jeremaịa 6:16? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nyochaa onwe anyị n’ihe banyere ụzọ anyị na-eje ije na ya taa?
12 Kemgbe afọ ndị ikpeazụ nke narị afọ nke 19, ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ anọwo na-ekwu na ọ bụ ha ka ndụmọdụ dị na Jeremaịa 6:16 metụtara. Dị ka otu òtù, ha ebutela ụzọ n’iji obi ha nile laghachi ‘n’okporo ụzọ nile nke mgbe ebighị ebi gara aga.’ N’adịghị ka Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ, ha ejirila ikwesị ntụkwasị obi gbasoo “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ” nke Jizọs Kraịst guzobere, nakwa nke ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi nke narị afọ mbụ O.A., gbasoro. (2 Timoti 1:13) Ruo taa, ndị e tere mmanụ na-enyere ibe ha na ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” aka ịdị na-ebi ezigbo ndụ nke na-enye obi ụtọ, bụ́ nke Krisendọm jụrụ.—Jọn 10:16.
13 Site n’iwepụta nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị, òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ịchọta “okporo ụzọ nile nke mgbe ebighị ebi gara aga” na iso Chineke na-eje ije. (Matiu 24:45-47) Ì so n’ọtụtụ nde ahụ? Ya bụrụ na i so, gịnị ka ị pụrụ ime ka ị ghara ịkpafu, ma gawara onwe gị? Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịnọrọ ọdụ mgbe ụfọdụ ma nyochaa ụzọ ị na-eje ije na ya ná ndụ. Ọ bụrụ na ị na-agụchi Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible anya ma na-agachi nzukọ ndị na-enye nduzi anya, bụ́ ndị ndị ahụ e tere mmanụ na-ahazi, mgbe ahụ, a na-azụ gị iso Chineke na-eje ije. Mgbe i ji umeala n’obi jiri ndụmọdụ e nyere gị na-eme ihe, n’ezie, i so Chineke na-eje ije, ị na-ejekwa ije ‘n’okporo ụzọ nile nke mgbe ebighị ebi gara aga.’
Na-eje Ije Dị Ka Ị̀ “Na-ahụ Onye ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya”
14. Ọ bụrụ na anyị na-ele Jehova anya dị ka onye dị adị, olee otú ọ ga-esi metụta mkpebi onwe onye ndị anyị na-eme?
14 Ka anyị wee nwee ike iso Jehova jee ije, anyị aghaghị ile ya anya dị ka onye dị adị. Cheta na Jehova mesiri ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi n’Izrel oge ochie obi ike na ya ezonahụghị ha onwe ya. Taa, ọ na-emekwa ka ndị ya mata ya dị ka Onye Nkụzi Ukwu. Ị̀ na-ele Jehova anya dị ka onye dị adị, dị nnọọ ka à ga-asị na o guzo n’ihu gị ịkụziri gị ihe? Nke ahụ bụ ụdị okwukwe dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-eso Chineke na-eje ije. Mozis nwere ụdị okwukwe ahụ “n’ihi na ọ nọgidere na-eguzosi ike dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Hibru 11:27) Ọ bụrụ na anyị na-ele Jehova anya dị ka onye dị adị, anyị ga na-atụle uche ya mgbe anyị chọrọ ime mkpebi. Dị ka ihe atụ, anyị agatụdịghị echewe echiche ime mmehie ma zonahụ ya ndị okenye ọgbakọ ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị. Kama nke ahụ, anyị ga na-agbalịsi ike iso Chineke na-eje ije ọbụna mgbe mmadụ ibe anyị na-anaghị ahụ anyị. Dị ka Eze Devid oge ochie, mkpebi anyị ga-abụ: “M ga-ejegharị n’etiti ụlọ m n’izu okè nke obi m.”—Abụ Ọma 101:2.
15. Olee otú iso ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị akpakọrịta pụrụ isi nyere anyị aka ịhụ Jehova dị ka onye dị adị?
15 Jehova maara na anyị bụ anụ ahụ́ na-ezughị okè, nakwa na ọ pụrụ isiri anyị ike mgbe ụfọdụ ikwere n’ihe anyị na-apụghị ịhụ anya. (Abụ Ọma 103:14) Ọ na-agbalịsi ike inyere anyị aka imeri adịghị ike dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ kpọkọtawo “otu ndị maka aha ya” site ná mba nile nke ụwa. (Ọrụ 15:14) Ka anyị na-ejekọ ozi ọnụ, anyị na-enweta ike site n’aka ibe anyị. Ịnụ otú Jehova si nyere otu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị aka imeri otu adịghị ike ma ọ bụ ịgabiga ule siri ike na-emekwu ka anyị na-ahụ Chineke anyị dị ka onye dị adị.—1 Pita 5:9.
16. Olee otú ịmụ banyere Jizọs si enyere anyị aka iso Chineke na-eje ije?
16 Karịsịa, Jehova enyela anyị Ọkpara ya dị ka ihe nlereanya. Jizọs kwuru, sị: “Abụ m ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ịmụ banyere ndụ Jizọs biri mgbe ọ nọ n’ụwa bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi mee ka anyị na-elekwu Jehova anya dị ka onye dị adị. Ihe nile Jizọs kwuru ma ọ bụ mee gosiri kpọmkwem àgwà na ụzọ nke Nna ya nke eluigwe. (Jọn 14:9) Mgbe anyị na-eme mkpebi, ọ dị anyị mkpa iche echiche nke ọma banyere ihe Jizọs gaara eme ma ọ bụrụ ya. Mgbe mkpebi anyị na-egosi na anyị na-eji ekpere na nlezianya echebara ihe echiche otú ahụ, anyị na-agbaso nzọụkwụ Kraịst. (1 Pita 2:21) N’ihi ya, anyị na Chineke so na-eje ije.
Olee Ngọzi Ndị Na-esi na Ya Apụta?
17. Ọ bụrụ na anyị ejee ije n’ụzọ Jehova, olee “izu ike” anyị ga-achọtara mkpụrụ obi anyị?
17 Iso Jehova Chineke eje ije na-eme ka mmadụ nwee afọ ojuju ná ndụ. Cheta ihe Jehova kwere ndị ya nkwa na ha ga-enweta ma ọ bụrụ na ha achọọ “ezi ụzọ” ahụ. O kwuru, sị: “Jeekwanụ ije n’ime ya, wee chọtara mkpụrụ obi unu izu ike.” (Jeremaịa 6:16) Gịnị ka “izu ike” ahụ pụtara? Ọ̀ bụ ndụ ntụsara ahụ́ nke ihe ụtọ na oké ihe onwunwe? Ee e. Jehova na-enye anyị ihe ka nnọọ nke ahụ mma, ihe onye kasị baa ọgaranya n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na-apụghị inweta. Inweta izu ike nye mkpụrụ obi gị bụ inwe udo nke obi, ọṅụ, obi ụtọ na afọ ojuju n’ụzọ ime mmụọ. Inwe izu ike dị otú ahụ na-egosi na ị pụrụ inwe obi ike na ị họrọwo ije ije n’ụzọ kasị mma ná ndụ. Udo nke obi dị otú ahụ bụ ngọzi na-esi ike nnweta n’ụwa a nke nsogbu jupụtara!
18. Olee ngọzi Jehova chọrọ inye gị, gịnịkwa bụ mkpebi gị?
18 N’ezie, ndụ n’onwe ya bụ nnukwu ngọzi. Ije ije ruo obere oge ka mma karịa ejetụghị ejetụ. Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe Jehova zubere ka ije gị bụrụ nanị obere njem malite n’oge ị gbasiri ike dị ka onye ntorobịa ruo mgbe i mere okenye bụ́ mgbe ị ga-amalite nwewe ahụ́ mgbu. Ee e, Jehova chọrọ ka i nweta ngọzi kasị mma. Ọ chọrọ ka i soro ya jee ije ruo mgbe ebighị ebi! E kwuru nke a n’ụzọ doro anya na Maịka 4:5, sị: “Ndị nile dị iche iche na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha nke chi ya, anyị onwe anyị ga na-ejegharịkwa n’aha Jehova, bụ́ Chineke anyị, ruo mgbe nile ebighị ebi.” Ị̀ ga-achọ inweta ngọzi ahụ? Ị̀ ga-achọ ibi ndụ na-enye obi ụtọ nke Jehova kpọrọ ‘ndụ nke bụ́ ndụ n’ezie?’ (1 Timoti 6:19) Ya bụrụ otú ahụ, kpebisie ike iso Jehova jee ije taa, echi, kwa ụbọchị, nakwa ruo mgbe ebighị ebi!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ụfọdụ nsụgharị Bible gbanwere “kubit” dị n’amaokwu a gaa n’ihe e ji atụ oge n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, dị ka “otu sekọnd” (The Emphatic Diaglott) ma ọ bụ “otu nkeji” (A Translation in the Language of the People, nke Charles B. Williams dere). Otú ọ dị, okwu e ji mee ihe n’ihe odide mbụ pụtara nnọọ otu kubit, nke bụ́ ihe dị ka sentimita 45.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• Olee ihe iso Chineke eje ije pụtara?
• Gịnị mere i ji chee na ọ dị gị mkpa iso Chineke jee ije?
• Gịnị ga-enyere gị aka iso Chineke jee ije?
• Olee ngọzi ndị na-abịara ndị so Chineke na-eje ije?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Site n’ihe e dere na Bible, anyị na-anụ olu Jehova n’azụ anyị ka ọ na-ekwu, sị, “Nke a bụ ụzọ”
[Foto dị na peeji nke 25]
Ná nzukọ, anyị na-enweta nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị