Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Onye Pụrụ n’Ezie Ịgbanwe Ụwa?

Ọ̀ Dị Onye Pụrụ n’Ezie Ịgbanwe Ụwa?

Ọ̀ Dị Onye Pụrụ n’Ezie Ịgbanwe Ụwa?

“Ndị ogbenye na-agwa anyị na ihe ha chọrọ karịsịa bụ udo na nchebe—na ihe ọzọ dịzi ha mkpa bụ ohere iji mee ka ndụ ha ka mma. Ha chọrọ ka mba ha na ụwa nile tie iwu ndị na-agaghị akpata mmegbu ka nnukwu ikike nke mba na ụlọ ọrụ ndị bara ọgaranya wee ghara igbochi mgbalị ndị ha na-eme.”

NKE ahụ bụ otú onyeisi otu ụlọ ọrụ zuru ụwa ọnụ na-enyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka si kọwaa olileanya na ọchịchọ nke ndị ogbenye. N’ezie, ihe ahụ o kwuru nwere nnọọ ike ịbụ ọchịchọ nke ndị nile na-ahụju anya n’ihi ọdachi na mmegbu ndị dị n’ụwa. Ụwa nke e nwere ezi udo na nchebe na ya na-agụsi ha nile agụụ ike. Ọ̀ dị mgbe a ga-enwe ụwa dị otú ahụ? Ọ̀ dị onye nwere ikike ịgbanwe nnọọ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ ụwa mmegbu?

Mgbalị Ndị E Meworo Ịgbanwe Ụwa

Ọtụtụ ndị agbalịwo ime nke ahụ. Dị ka ihe atụ, Florence Nightingale, bụ́ onye England dịrị ndụ na narị afọ nke 19, wepụtara onwe ya iji hụ na e ji ọmịiko na-elekọta ndị ọrịa ma na-edebe ihe ndị e ji elekọta ha ọcha. N’oge ya—mgbe a na-emepụtabeghị ọgwụ ndị na-egbu nje—nlekọta a na-enye mmadụ n’ụlọ ọgwụ erughị ka nlekọta anyị ga-atụ anya inweta taa. Otu akwụkwọ kwuru na “ndị nọọsụ e nwere mgbe ahụ agụghị akwụkwọ, ha na-eru unyi, a makwa ha ama dị ka ndị aṅụrụma na ndị na-eme omume rụrụ arụ.” Florence Nightingale ò nwere ihe ịga nke ọma ọ bụla ná mgbalị ya ịgbanwe otú e si elekọta ndị ọrịa? O nwere. Ọtụtụ ndị ihe na-emetụ n’obi, bụ́ ndị na-echebara ndị ọzọ echiche enwewokwa nnọọ ihe ịga nke ọma n’ọtụtụ akụkụ nke ndụ—n’agụmakwụkwọ, nkà ọgwụ na ahụ́ ike, ime ka ndị mmadụ nwee ebe obibi, ime ka ndị mmadụ nweta nri ga-ezuru ha, nakwa n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’ihi ya, e mewo ka ndụ ọtụtụ nde ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha ka nnọọ mma.

N’agbanyeghị nke ahụ, anyị apụghị ileghara eziokwu a na-ewute ewute anya: Ọtụtụ narị nde mmadụ ka na-ata ahụhụ n’ihi agha, mpụ, ọrịa, ụnwụ nri na ọdachi ndị ọzọ. Ụlọ ọrụ ndị Ireland na-enyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka nke a na-akpọ Concern na-ekwu na “ịda ogbenye na-egbu iri puku mmadụ atọ kwa ụbọchị.” Ọbụna ịgba ohu, bụ́ ihe ọtụtụ ndị na-eme mgbanwe lekwasịrị anya ikpochapụ, ka dị adị. Akwụkwọ bụ́ Disposable People—New Slavery in the Global Economy na-ekwu na “ọnụ ọgụgụ ndị ohu e nwere taa karịrị ọnụ ọgụgụ nke mmadụ nile e zuuru n’Africa n’oge a na-agba mgbere ohu n’Oké Osimiri Atlantic.”

Olee ihe gbochiworo mgbalị ndị mmadụ na-eme ịgbanwe ihe kpamkpam na n’ụzọ ga-adịgide adịgide? Ọ̀ bụ nanị ike dị ukwuu nke ndị ọgaranya, ka ọ̀ dị ihe ndị ọzọ na-eso egbochi ya?

Ihe Ndị Na-egbochi Mgbanwe

Dị ka Okwu Chineke na-egosi, ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu kasị egbochi mgbalị ndị ụmụ mmadụ na-eme iji hụ na e nwere ụwa nke mmegbu na-adịtụghị na ya. Jọn onyeozi na-agwa anyị na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’ezie, Setan nọ ugbu a “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ọ gwụla ma è wepụrụ onye ọjọọ a, a ga na-emejọ ma na-emegbu ndị mmadụ. Gịnị kpatara ọnọdụ ọjọọ a?

E nyere nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, ụwa nke e kere ịbụ ebe obibi paradaịs zuru okè maka ezinụlọ mmadụ—ụwa nke “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Gịnị mere ihe ji gbanwee? Ọ bụ Setan gbanwere ya. Ọ sịrị na o rughịrị Chineke ime iwu kwesịrị ịchịkwa ndụ ụmụ mmadụ. O kwuru n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè na Chineke na-achị ọchịchị nchịgbu. O mere ka Adam na Iv họrọ ndụ nke ime ihe masịrị ha ka ha wee nwee ike ikpebiri onwe ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 3:1-6) Nke a meziri ka e nwee ihe nke abụọ na-egbochi mgbalị ụmụ mmadụ na-eme ime ka e nwee ụwa nke mmegbu na-adịghị na ya—mmehie na ezughị okè.—Ndị Rom 5:12.

N’ihi Gịnị Ka O Ji Kwe Ka Ọ Dịrị?

Ụfọdụ nwere ike ịjụ, sị, ‘Ma gịnị mere Chineke ji kwe ka mmehie na ezughị okè malite? N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị jiri ike ya na-enweghị atụ bibie ndị nnupụisi ahụ ma kee ndị ọzọ?’ Nke ahụ yiri ka ọ̀ bụ ụzọ dị mfe isi dozie nsogbu ahụ. Otú ọ dị, iji ike eme ihe na-ewelite ajụjụ ndị dị oké mkpa. Iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ọ́ bụghị otu n’ime ihe ndị bụ́ isi na-ewe ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu n’ụwa iwe? Onye ọchịchị aka ike iji ike ewepụ onye ọ bụla na-erubeghịrị iwu ya isi ọ́ naghị eme ka ndị obi ha ziri ezi na-enwe obi abụọ banyere onye ọchịchị ahụ?

Iji mesie ndị nwere obi eziokwu obi ike na Ya abụghị onye ọchịchị aka ike nke ji ike ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, Chineke kwere ka Setan na ụmụ mmadụ ahụ na-enupụ isi na-eme ihe na-ekwekọghị n’iwu na ụkpụrụ ya—ruo nanị obere oge. Ọ ga-emecha doo anya na ọ bụ nanị ọchịchị Chineke ziri ezi. Ọ ga-egosi na ihe ọ bụla o gbochiri anyị ime bụ maka abamuru anyị. N’ezie, ihe ọjọọ ndị sirila n’inupụ isi n’iwu Chineke pụta egosipụtawo na nke ahụ bụ eziokwu. Ha egosipụtawokwa na ọ dịghị ụta ọ bụla ga-adịrị Chineke mgbe ọ bụla ọ chọrọ iji ike ya dị ukwuu kpochapụ ajọ omume nile. Ọ ga-eme nke ahụ n’oge na-adịghị anya.—Jenesis 18:23-32; Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 37:9, 10, 38.

Anyị ga-anọgide na-ebi n’ụwa mmegbu, “na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu,” ruo mgbe Chineke ga-eme ihe. (Ndị Rom 8:22) N’agbanyeghị ihe anyị mere iji gbanwee ọnọdụ ụwa, anyị agaghị ewepụli Setan, anyị agaghịkwa ekpochapụli ezughị okè kpamkpam nke bụ́ isi ihe na-akpata ahụhụ nile anyị na-ata. Anyị agaghị ewepụli nnọọ ihe ndị mmehie anyị ketara n’aka Adam kpatara.—Abụ Ọma 49:7-9.

Jizọs Kraịst Ga-eweta Mgbanwe Ga-adịgide Adịgide

Nke a ọ̀ pụtara na olileanya adịtụghị? Ọ dịghị ma ọlị. E nyewo onye dị nnọọ ike karịa mmadụ nkịtị ọrụ nke iweta mgbanwe ga-adịgide adịgide. Ònye ka ọ bụ? Ọ bụ Jizọs Kraịst. Na Bible, a kpọrọ ya Onye Nnọchiteanya Ukwu nke Chineke maka nzọpụta nke ụmụ mmadụ.—Ọrụ 5:31.

Ọ nọ ugbu a na-echere ka “oge [Chineke] kara aka” ruo ka o mee ihe. (Mkpughe 11:18) Gịnị n’ezie ka ọ ga-eme? Ọ ‘ga-eweghachi ihe nile bụ́ nke Chineke kwuru banyere ya site n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ nke oge gboo.’ (Ọrụ 3:21) Dị ka ihe atụ, Jizọs “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. . . . Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.” (Abụ Ọma 72:12-16) Chineke na-ekwe nkwa isi n’aka Jizọs Kraịst mee ka “agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) Ọ na-ekwe nkwa, sị: “Onye obibi [nke ụwa ya e mere ka ọ dị ọcha] agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” Ndị ìsì, ndị ntị chiri, ndị ngwụrọ—ndị nile na-arịa ọrịa—ga-enwetaghachi ahụ́ ike zuru okè. (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6; Mkpughe 21:3, 4) Ọbụna ndị nwụrụ na narị afọ ndị gara aga ga-erite uru. Ọ na-ekwe nkwa ime ka ndị e megburu na ndị e mejọrọ dịghachi ndụ.—Jọn 5:28, 29.

Mgbanwe Jizọs Kraịst ga-eweta abụghị nke na-ezughị ezu na nke ga-adịru nanị nwa oge. Ọ ga-ewepụcha ihe nile na-egbochi inwe ụwa nke mmegbu na-adịghị na ya. Ọ ga-ewepụ mmehie na ezughị okè ma bibie Setan bụ́ Ekwensu na ndị nile na-agbaso ụzọ nnupụisi ya. (Mkpughe 19:19, 20; 20:1-3, 10) Nhụsianya na ahụhụ Chineke kweworo ka ha dịrị ruo obere oge “agaghị ebili nke ugboro abụọ.” (Nehum 1:9) Nke a bụ ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ kụziiri anyị ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa na ka uche Chineke mee “n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:10.

I nwere ike ịjụ, sị, ‘Ma Jizọs n’onwe ya ó kwughị na anyị “na ndị ogbenye nọ mgbe nile”? Nke ahụ ọ́ pụtaghị na mmegbu na ịda ogbenye ga-adịgide?’ (Matiu 26:11) Ee, Jizọs kwuru na anyị na ndị ogbenye nọ mgbe nile. Otú ọ dị, ihe ndị gbara ihe ahụ o kwuru gburugburu na nkwa ndị dị n’Okwu Chineke na-egosi na ihe o bu n’uche bụ na anyị na ndị ogbenye ga-anọ ruo mgbe usoro ihe a ga-abịa ná njedebe. Ọ maara na ọ dịghị mmadụ pụrụ iwepụ ịda ogbenye na mmegbu n’ụwa. Ọ makwaara na ya ga-ewepụ ha nile. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eweta usoro ihe dị nnọọ ọhụrụ—“eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” nke ihe mgbu, ọrịa, ịda ogbenye, na ọnwụ na-agaghị adị na ya.—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1.

“Unu Echefula Ime Ihe Ọma”

Nke a ọ̀ pụtara na ọ baghị uru ime ihe ọ bụla anyị pụrụ ime iji nyere ndị ọzọ aka? Ọ dịghị ma ọlị. Bible na-agba anyị ume ịdị na-enyere ndị ọzọ aka mgbe ha nọ n’ule ma na-ahụsi anya. Eze Solomọn oge ochie na-ede, sị: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.” (Ilu 3:27) Pọl onyeozi na-agba ume, sị: “Unu echefula ime ihe ọma na iso ndị ọzọ na-ekerịta ihe.”—Ndị Hibru 13:16.

Jizọs Kraịst n’onwe ya gbara anyị ume ime ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka. Ọ tụrụ ilu nke onye Sameria hụrụ onye a kụrụ ihe ma pụnara ya ihe ya n’ike. Jizọs kwuru na onye Sameria ahụ “nwere ọmịiko” n’ahụ́ nwoke ahụ, n’ihi ya, o ji ihe si n’akpa ya kechie ọnyá nwoke ahụ e tiri ihe ma nyere ya aka ịgbake. (Luk 10:29-37) Onye Sameria ahụ nwere ọmịiko agbanweghị ụwa, ma o mere ihe gbanwere nnọọ ndụ onye ọzọ. Anyị pụrụ ime otu ihe ahụ.

Otú ọ dị, Jizọs Kraịst pụrụ ime ihe karịrị nanị inyere ndị mmadụ n’otu n’otu aka. Ọ pụrụ n’ezie ịgbanwe ihe, ọ ga-emekwa nke ahụ n’isi nso. Mgbe o mere nke ahụ, ndụ nke ndị nile a na-emegbu emegbu taa ga-aka mma, ha ga-enwekwa ezi udo na ntụkwasị obi.—Abụ Ọma 4:8; 37:10, 11.

Ka anyị na-echere ka nke ahụ mee, ya adịla mgbe anyị ga-ala azụ n’ime ihe ọ bụla anyị pụrụ ime, ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́, iji ‘na-emere ndị nile na-ahụsi anya n’ụwa mmegbu a ihe ọma.’—Ndị Galeshia 6:10.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Florence Nightingale gbanwere nnọọ otú e si elekọta ndị ọrịa

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike a natara Ọ́bá Akwụkwọ Nkà Ọgwụ na Ahụ́ Ike nke Mba

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ụmụazụ Kraịst na-emere ndị ọzọ ihe ọma

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 4]

The Star, Johannesburg, S.A.