Ụwa Mmegbu
Ụwa Mmegbu
Ì KWEERE na anyị bi n’ụwa mmegbu? O doro anya na i kweere. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’agbanyeghị nkà anyị na otú anyị jiruru amamihe mee atụmatụ maka ndụ anyị, ọ gaghị eme ka anyị jide n’aka na anyị ga-aba ọgaranya, nwee ihe ịga nke ọma ma ọ bụ ọbụna rijuo afọ. Ihe na-emekarị bụ ihe ahụ Eze Solomọn oge ochie maara ihe kwuru: “Ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ̀ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị.” N’ihi gịnị? Solomọn gara n’ihu ikwu na ọ bụ n’ihi na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.”—Eklisiastis 9:11.
“Mgbe Ọjọọ, Mgbe Ọ Na-adakwasị Ha na Mberede”
Ee, “mgbe na ihe ndapụta,” nke na-apụtakarị mmadụ ịnọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị, na-emebikarị atụmatụ ndị anyị ji nlezianya mee na ezi atụmanya anyị. Dị ka Solomọn si kwuo, anyị “dị ka azụ̀ nke a na-anwụde n’ụgbụ ọjọọ, na dị ka ụmụ nnụnụ nke na-ama n’ọnyà, . . . na mgbe ọjọọ, mgbe ọ na-adakwasị ha na mberede.” (Eklisiastis 9:12) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde mmadụ na-arụsi ọrụ ike iji kọpụta ihe ezinụlọ ha ga-eri, ma daba na “mgbe ọjọọ” mgbe mmiri na-ezoghị, okpomọkụ ebibiekwa ihe ndị ha kụrụ.
Ndị ọzọ na-agbalị inye aka, ma ọbụna otú ụwa na-esi enyere ndị dabara na “mgbe ọjọọ” aka na-adịkarị ka ọ̀ bụ mmegbu. Dị ka ihe atụ, otu ụlọ ọrụ bụ́ isi na-enyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka kwuru na n’otu afọ na-etechabeghị aka, iji hụ na a kwụsịrị ụkọ nri, “e nyere kọntinent [Africa] dum ego enyemaka nke bụ́ otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego e wepụtara iji lụọ agha Gulf.” Ò kwesịrị ekwesị na ego mba ndị bara ọgaranya na-emefu n’agha a na-alụ n’otu mba ji okpukpu ise karịa nke ha na-emefu n’ịkwụsị ihe mgbu na ahụhụ nke ụnwụ nri kpatara n’otu kọntinent? Ò kwesịkwara ekwesị na n’oge ọtụtụ ndị bara ọgaranya, otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla bi n’ụwa ka bụ ogbenye ọnụ ntụ ma ọ bụ na ọtụtụ nde ụmụaka na-anwụ kwa afọ n’ihi ọrịa ndị a pụrụ igbochi egbochi? O kwesịghị nnọọ ekwesị!
N’ezie, ọ bụghị nanị “mgbe na ihe ndapụta” na-akpata ‘mgbe ọjọọ na-adakwasị ndị mmadụ na mberede.’ E nwekwara ikike ndị dị ike
anyị na-agaghị achịkwali bụ́ ndị na-achịkwa ndụ anyị ma na-ekpebi ihe ga-eme anyị. Nke ahụ bụ nnọọ ihe mere na Beslan, Alania, n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 2004, mgbe e gburu ọtụtụ narị mmadụ, ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụaka gara ụlọ akwụkwọ nke mbụ ya, n’ọgụ ọnwụ ndị na-eyi ọha egwu na ndị nche lụrụ. N’eziokwu, ọ bụ nnọọ ihe ndapụta mere ụfọdụ ji nwụọ ụfọdụ alanahụ ọdachi ahụ—ma ihe bụ́ isi kpatara “mgbe ọjọọ” ahụ bụ ọgba aghara ụmụ mmadụ kpatara.Ọ̀ Ga-adịgide Otú A?
Mgbe a na-ekwu banyere mmegbu, ụfọdụ na-ekwu, sị: “Ma nke ahụ bụ otú ụwa dị. Otú ahụ ka ọ dị kemgbe, ọ ga-adịgidekwa otú ahụ.” Ihe ha na-ekwu bụ na ndị dị ike ga-anọgide na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị ọgaranya anọgidekwa na-erigbu ndị ogbenye. Ha na-ekwu na mmegbu dị otú ahụ na “mgbe na ihe ndapụta” ga na-akpa anyị aka ọjọọ ruo oge nile ụmụ mmadụ ga-adịru ndụ.
Ọ̀ ga-adịrịrị otú a? Ọ̀ dị mgbe ndị na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya ga-enweta ụgwọ ọrụ kwesịrị ekwesị maka ọrụ ha ji ike ha nile na-arụ? Ọ̀ dị onye pụrụ ime ihe ga-agbanwe ụwa mmegbu a kpamkpam na n’ụzọ ga-adịgide adịgide? Tụlee ihe isiokwu na-esonụ nwere ikwu n’okwu a.
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 2]
IHU AKWỤKWỌ: Nwoke ku nwatakịrị: FOTO UN 148426/McCurry/Stockbower
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 3]
MAXIM MARMUR/AFP/Getty Images