Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Onye Kraịst ọ̀ ka ga-enwe akọ na uche dị ọcha ma ọ bụrụ na ọ nakwere ọrụ metụtara ibu ngwá ọgụ?

Ndịàmà Jehova n’ụwa nile na-eji ibu ọrụ Chineke nyere ha igbo mkpa anụ ahụ́ nke ezinụlọ ha akpọrọ ihe. (1 Timoti 5:8) Otú ọ dị, ụdị ọrụ ụfọdụ na-emegide ụkpụrụ Bible ma kwesị ka e zere ha. Ha gụnyere ọrụ metụtara ịgba chaa chaa, iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na ịkwado iji ụtaba eme ihe. (Aịsaịa 65:11; Ọrụ 15:29; 2 Ndị Kọrint 7:1; Ndị Kọlọsi 3:5) Ụdị ọrụ ndị ọzọ, n’agbanyeghị na Bible akatọghị ha kpọmkwem, pụrụ imebi akọ na uche mmadụ ma ọ bụ nke ndị ọzọ.

Ọ bụ mmadụ ga-ekpebiri onwe ya ma ọ̀ ga-arụ ọrụ ego metụtara ibu égbè ma ọ bụ ngwá ọgụ ndị ọzọ. Otú ọ dị, ọrụ a na-ebu ngwá ọgụ arụ na-eme ka ọ dị mfe mmadụ ịghọ onye ikpe ọbara mara ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka o jiri ngwá ọgụ ya mee ihe. N’ihi ya, ọ dị Onye Kraịst mkpa iji ekpere tụlee ma ọ̀ ga-adị njikere itinye onwe ya n’ọnọdụ nke ikpebi na mberede ma ọ̀ ga-eji ngwá ọgụ eme ihe n’ihe metụtara ndụ mmadụ. Ibu ngwá ọgụ na-emekwa ka mmadụ nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye e merụrụ ahụ́ ma ọ bụ gbuo mgbe a wakporo ya ma ọ bụ mgbe ndị ọ wakporo wakpogwaara ya.

Mkpebi mmadụ pụkwara imetụta ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ibu ọrụ bụ́ isi Onye Kraịst nwere bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Ọ̀ ga-ekwe omume mmadụ ịkụziri ndị ọzọ ka ha “na mmadụ nile na-adị n’udo,” ma n’otu oge ahụ jiri ibu ngwá ọgụ na-akpa afọ ya? (Ndị Rom 12:18) Oleekwanụ banyere ụmụ ma ọ bụ ndị ezinụlọ onye ahụ? Inwe égbè n’ụlọ ọ̀ ga-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ? E wezụga nke ahụ, mkpebi mmadụ mere n’okwu a ò nwere ike ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ?—Ndị Filipaị 1:10.

“N’ụbọchị ikpeazụ” ndị a, ọtụtụ ndị mmadụ na-aghọwanye “ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe.” (2 Timoti 3:1, 3) N’ịmara nke a, mmadụ ọ̀ ka pụrụ ịbụ onye “a na-adịghị ebo ebubo” ma ọ bụrụ na ọ họrọ ọrụ a na-ebu ngwá ọgụ arụ nke ga-eme ka ya na ndị dị otú ahụ na-alụrịta ọgụ? (1 Timoti 3:10) Mbanụ. N’ihi nke a, ọgbakọ agaghị ele onye dị otú ahụ anya dị ka “onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ” ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-ebu ngwá ọgụ mgbe e jisịrị obiọma nye ya ndụmọdụ dabeere na Bible. (1 Timoti 3:2; Taịtọs 1:5, 6) N’ihi ya, nwoke ma ọ bụ nwanyị dị otú ahụ agaghị eru eru inweta ihe ùgwù ọ bụla pụrụ iche n’ọgbakọ.

Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ọ bụrụ na ha ebute ihe ndị metụtara Alaeze ụzọ ná ndụ ha, ọ gaghị adị ha mkpa ichegbu onwe ha banyere ihe ndị dị mkpa ná ndụ. (Matiu 6:25, 33) N’ezie, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi kpamkpam, “Ya onwe ya ga-anagidekwa [anyị]: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.