Enwetara M ‘Ihe Obi M Na-arịọ’
Akụkọ Ndụ
Enwetara M ‘Ihe Obi M Na-arịọ’
DỊ KA DOMINIQUE MORGOU SI KỌỌ
Na December 1998, emesịrị m nọrọ n’Africa! Enwetala m ihe m nọworo na-achọ kemgbe m bụ nwata. Kemgbe ụwa, obi na-atọ m ụtọ mgbe ọ bụla m chere banyere ebe ndị tọgbọrọ n’efu na ụmụ anụmanụ ndị na-adọrọ mmasị e nwere n’Africa. Ugbu a, anọzi m ebe ahụ! N’otu oge ahụ, enwetakwara m ihe ọzọ m nọworo na-achọ. Abụ m onye na-ezisa ozi ọma oge nile nke na-eje ozi ná mba ọzọ. Nye ọtụtụ ndị, nke a pụrụ iyi ihe na-agaghị ekwe omume. Anaghị m ahụ ụzọ nke ọma, m na-ejikwa nkịta a zụrụ idu onye ìsì na Europe agagharị n’ime ime obodo Africa nke dị uzuzu uzuzu. Ka m kọọrọ gị otú m si nwee ike ije ozi n’Africa nakwa otú Jehova si nye m ‘ihe obi m na-arịọ.’—Abụ Ọma 37:4.
A MỤRỤ M na June 9, 1966, n’ebe ndịda France. Abụ m nwa ikpeazụ n’ime ụmụ asaa—ndị nwoke abụọ na ndị nwanyị ise—nne na nna anyị na-ahụ n’anya lekọtara anyị nile. Otú ọ dị, enwere m otu nsogbu mgbe m ka na-eto eto. Dị ka nne nne m, nne m, na otu n’ime ụmụnne m ndị nwanyị, arịara m ọrịa m ketara eketa nke na-emesị mee ka mmadụ kpuo ìsì kpamkpam.
Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma, echere m ịkpa ókè agbụrụ, ịkpọasị, na omume ihu abụọ ihu, bụ́ nke mere ka m malite ịkpa àgwà otú o si masị m. Ọ bụ n’oge a ihe siri ike ka anyị kwagara n’ógbè Hérault. N’ebe ahụ, ihe dị ịtụnanya mere.
Otu ụtụtụ Sunday, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ anyị. Mama m maara ha, ọ kpọbatakwara ha. Otu n’ime ụmụ nwanyị ahụ Ndị Galeshia 2:14.
jụrụ mama m ma ò chetara na ọ dị mgbe o kwere nkwa na otu ụbọchị ya ga-amalite ịmụ Bible. Mama m chetara ma jụọ, sị, “Olee mgbe anyị ga-amalite?” Ha kwekọrịtara ịdị na-amụ ihe n’ụtụtụ Sunday ọ bụla, ọ bụkwa otú a ka mama m si malite ịmụ “eziokwu nke ozi ọma ahụ.”—Otú M Si Nweta Ihe Ọmụma
Mama m gbalịsiri ike ịghọta na icheta ihe ọ mụrụ. Ebe ọ bụ na o kpuru ìsì, ọ ghaghị ibu ihe nile n’isi. Ndịàmà ahụ nweere ya nnọọ ndidi. Mụ onwe m na-ezokarị n’ime ụlọ m mgbe ọ bụla Ndịàmà ahụ bịara ma pụta mgbe ha lara. Otú ọ dị, otu ehihie, Eugénie, bụ́ otu n’ime Ndịàmà ahụ, zutere m ma gwa m okwu. Ọ gwara m na Alaeze Chineke ga-ewepụ ihu abụọ na ụdị ịkpọasị nile dị n’ụwa. O kwuru, sị: “Ọ bụ nanị Chineke ga-ewepụli nsogbu ndị a.” Ọ jụrụ m ma m̀ chọrọ ịmụtakwu ihe. N’echi ya, amalitere m ịmụ Bible.
Ihe nile m mụtara bụụrụ m ihe ọhụrụ. Aghọtaziri m na Chineke nwere ezi ihe mere o ji kwe ka ajọ omume dịrị n’ụwa ruo nwa oge. (Jenesis 3:15; Jọn 3:16; Ndị Rom 9:17) Amụtakwara m na Jehova agbachighị anyị nkịtị. O kwewo anyị nkwa magburu onwe ya inye anyị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:29; 96:11, 12; Aịsaịa 35:1, 2; 45:18) Na Paradaịs ahụ, anya m, nke na-adịghị ahụ ụzọ nke ọma, ga-ahụ ụzọ ọzọ.—Aịsaịa 35:5.
Ịbanye n’Ozi Oge Nile
Na December 12, 1985, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptizim ime mmiri, na-esonyere nwanne m nwanyị, bụ́ Marie-Claire, bụ́ onye e merela baptizim. N’oge na-adịghị anya, e mere nwanne m nwoke bụ́ Jean-Pierre baptizim, meekwa ezigbo nne m.
N’ọgbakọ m nọ na ya, e nwere ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile. Ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi ha maka ozi ahụ gbara m ume. Marie-Claire, bụ́ onye na-arịa ọrịa anya, nke na-eyikwa ihe e ji agbazi ụkwụ n’otu ụkwụ, malitedịrị ozi oge nile. Ọ nọgidere na-agba m ume n’ụzọ ime mmụọ ruo taa. Ịbụ onye ndị ọsụ ụzọ gbara gburugburu n’ọgbakọ nakwa n’ezinụlọ nyeere m aka ịzụlite ọchịchọ siri ike ịbanye n’ozi oge nile. Ya mere, na November 1990, amalitere m ije ozi na Béziers dị ka onye ọsụ ụzọ.—Abụ Ọma 94:17-19.
Ịnagide Nkụda Mmụọ
Ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ na-elebara m anya mgbe anyị nọ n’ozi. N’agbanyeghị nke ahụ, site n’oge ruo n’oge, ana m enwe nkụda mmụọ n’ihi ihe ndị m na-adịghị emeli, ya ana-agụkwa m agụụ ka ọ bụrụ na m pụrụ imekwu ihe. Otú ọ dị, Jehova kwagidere m n’oge ndị ahụ m nwere nkụda mmụọ. Emere m nnyocha na Watch Tower Publications Index, na-achọ akụkọ ndụ nke ndị ọsụ ụzọ nwere nsogbu anya ka m. Ọ tụrụ m n’anya ịchọta ọtụtụ! Akụkọ ndụ ndị a dị irè ma na-agba ume kụziiri m inwe ekele n’ihi ihe ndị m pụrụ ime na ikweta na o nwere ihe ndị m na-apụghị ime.
Iji gboo mkpa m, esoro m Ndịàmà ọzọ rụọ ọrụ ịzachasị na ihichasị nnukwu ụlọ ahịa. Otu ụbọchị, achọpụtara m na ndị ọrụ ibe m na-ehichagharị ebe ndị m ka hichapụrụ. O doro anya na e nwere ọtụtụ unyi ndị m na-ahụghị. Agara m hụ Valérie, bụ́ onye ọsụ ụzọ na-elekọta òtù nhicha na nzacha anyị ma gwa ya ka ọ gwa m eziokwu ma m̀ na-eme ka ihe na-esiri ndị ọzọ ike. O ji obiọma hapụrụ m ikpebi mgbe m chere na apụghịzi m ịrụ ọrụ ahụ. Na March 1994, akwụsịrị m ọrụ nhicha na nzacha ahụ.
Ọzọkwa, echere m na abaghị m uru ọ bụla. Ekpekusiri m Jehova ekpere ike, amakwaara m na ọ nụrụ arịrịọ m. Ọzọkwa, ịmụ Bible na akwụkwọ Ndị Kraịst nyeere m aka nke ukwuu. N’agbanyeghị nke ahụ, ka ọrịa anya m na-akawanye njọ, ọchịchọ m ijere Jehova ozi nọ na-esiwanye ike. Gịnị ka m pụrụ ime?
Ebu M Ụzọ Na-eche Ka E Nye M Nkịta, Mesịzie Mee Mkpebi n’Egbughị Oge
Etinyere m akwụkwọ ịnata ọzụzụ n’Ụlọ Ọrụ Na-enyere Ndị Ìsì na Ndị Na-adịghị Ahụcha Ụzọ Aka nke dị na Nîmes, e mesịkwara nabata m ịnara ọzụzụ ebe ahụ ruo ọnwa atọ. Ọnụnọ m nọrọ ebe ahụ baara m nnọọ uru. Abịara m ghọta otú ọrịa m siruru n’ike ma mụta ịnagide ya. Iso ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche nọkọọ nyeere m aka ịghọta na olileanya m nwere dị ka Onye Kraịst dị nnọọ oké ọnụ ahịa. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, enwere m ihe mgbaru ọsọ, apụkwara m ịrụ ọrụ bara uru. Tụkwasị na nke ahụ, amụtara m otú e si agụ mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’asụsụ French.
Mgbe m lọtara, ndị ezinụlọ m hụrụ na ọzụzụ ahụ enyeworo m aka nke ukwuu. Otú ọ dị, otu ihe m na-enwetụghị nnọọ mmasị na ya bụ na m ga na-ejizi mkpara aga ije. O siiri m ike ikweta na “osisi” ahụ dị m mkpa. Ọ ga-adị mma ma m nwee ihe ọzọ ga na-enyere m aka—ikekwe nkịta na-edu ndị ìsì.
Etinyere m akwụkwọ ka e nye m nkịta ma a gwara m na e nwere ọtụtụ ndị tinyere akwụkwọ a na-enyebeghị. Ọzọ, ụlọ ọrụ ahụ na-enye nkịta ga-ebu ụzọ mee nchọpụta. Ọ bụghị onye ọ bụla a hụrụ ka a na-enye nkịta na-edu ndị ìsì. Otu ụbọchị, otu nwanyị bụ́ onyeisi nke otu òtù na-ahụ maka ndị ìsì gwara m na òtù ndị na-akụ tenis n’ógbè ahụ chọrọ inye otu onye ìsì ma ọ bụ onye na-adịghị ahụcha ụzọ nke bi n’ógbè anyị nkịta ga na-edu ya. O kwuru na uche ya gbagara n’ebe m nọ. M̀ ga-anara ya? Aghọtara m na aka Jehova dị na ya, ekwetakwara m ịnara onyinye obiọma ahụ. Otú ọ dị, aghaghị m ichere ka ha weta nkịta ahụ.
M Ka Na-eche Banyere Africa
Ka m nọ na-echere, echeweziri m banyere ihe ọzọ. Dị ka m kpọtụrụ uche ná malite, enwere m nnọọ mmasị n’Africa kemgbe m
bụ nwata. N’agbanyeghị na ọrịa anya m na-akawanye njọ, mmasị ahụ nọgidere na-esikwu ike, karịsịa ebe ọ bụ na m nụrụ na ọtụtụ ndị Africa nwere mmasị na Bible nakwa n’ijere Jehova ozi. Tupu mgbe ahụ, agwatụla m Valérie na m ga-achọ ịga nleta n’Africa. Ajụrụ m ya ma ọ̀ ga-achọ iso m gaa. O kwetara, anyị degakwaara ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-asụ French n’Africa akwụkwọ ozi.Alaka ụlọ ọrụ Togo deghachiiri anyị akwụkwọ. Eji m obi ụtọ gwa Valérie ka ọ gụọrọ m ya. Akwụkwọ ozi ahụ na-agba ume, Valérie kwukwara, sị: “Gịnịkwanụ ga-egbochi anyị ịga?” Mgbe mụ na ụmụnna na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ derịtasịrị akwụkwọ ozi, ha gwara m ka mụ na Sandra, bụ́ onye ọsụ ụzọ bi na Lomé, bụ́ isi obodo ahụ, kparịta ya. Anyị kpebiri ịga na December 1, 1998.
Ebe ahụ dị nnọọ iche, ma obi dị anyị nnọọ ụtọ na anyị bịara! Ka ụgbọelu anyị dasịrị na Lomé, anyị si n’ụgbọelu rịtuo, okpomọkụ Africa zukwara anyị ahụ́. Sandra zutere anyị. Anyị ahụtụbeghị onwe anyị mbụ, ma ozugbo ahụ, o yiri ka ọ dịla anya anyị bụụrụ enyi. Obere oge tupu anyị erute, a họpụtara Sandra na onye ya na ya na-asụkọ ụzọ bụ́ Christine ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Tabligbo, bụ́ obere obodo dịbara adịba. Anyị nweziri ihe ùgwù nke iso ha gaa ebe ọhụrụ e kenyere ha ọrụ. Anyị nọrọ ihe dị ka ọnwa abụọ, mgbe anyị lakwara, amaara m na m ga-alọghachi.
Obi Tọrọ M Ụtọ Ịlọghachi
Mgbe m rutere France, amalitere m ozugbo ịkwadebe ịgaghachi Togo. Site ná nkwado ezinụlọ m nyere m, emere m ndokwa ịnọru ọnwa isii n’ebe ahụ. Ya mere, na September 1999, abara m ụgbọelu ọzọ ịga Togo. Otú ọ dị, ọ bụ nanị m so na nke ugbu a. Cheedị otú ọ ga-adị ndị ezinụlọ m mgbe ha hụrụ ka nanị m so aga n’agbanyeghị nsogbu anya m! Ma ha ekwesịghị ichegbu onwe ha. Emesiri m ndị mụrụ m obi ike na ndị enyi m, bụ́ ndị dịwooro m ka ezinụlọ, ga na-eche m na Lomé.
Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịlọghachi n’ebe ọtụtụ mmadụ nwere mmasị na Bible! Ịhụ ndị na-agụ Bible n’okporo ámá abụghị ihe ọhụrụ. Na Tabligbo, ndị mmadụ ga-akpọ gị òkù nanị ka gị na ha wee nwee nkwurịta okwu site na Bible. Leekwa ihe ùgwù ọ bụ iso ụmụnna nwanyị abụọ a bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche biri n’obere ụlọ! Amatara m omenala ọzọ, ụzọ dị iche e si ele ihe anya. Nke kasị mkpa bụ na achọpụtara m na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bi n’Africa na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ. Dị ka ihe atụ, ije ije ruo ọtụtụ kilomita iji ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze adịghị egbochi ha ịga nzukọ. Amụtakwara m ọtụtụ ihe site n’omume enyi ha nakwa site n’omume ile ọbịa ha.
Otu ụbọchị ka anyị si ozi ubi na-alọta, agbanyeere m Sandra izu na egwu na-atụ m ịlaghachi France. Ọrịa anya m akakwuola njọ. Echere m banyere ụzọ ndị na-ekwo ekwo dị na Béziers, steepụ ụlọ elu ebe ndị mmadụ bi, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eme ka ihe siere onye na-adịghị ahụcha ụzọ ike.
Ụzọ ndị dị na Tabligbo dị nnọọ iche, ọ bụ ezie na e teghị ha ete, ha dị jụụ—ọtụtụ mmadụ na ụgbọala anaghị aga na ha. Olee otú m ga-esi nwee ike ibi na France ugbu a Tabligbo maarala m ahụ́?Abalị abụọ ka nke ahụ gasịrị, mama m kpọrọ m na fon ma gwa m na ụlọ akwụkwọ na-azụ nkịta na-edu ndị ìsì na-eche m. Otu obere nkịta na-edu ndị ìsì a na-akpọ Océane na-aga ịghọ “anya m.” Ọzọkwa, e gboro mkpa m, akwụsịkwara m ichegbu onwe m. Ka m jisịrị obi ụtọ gaa ozi na Tabligbo ruo ọnwa isii, alaghachiri m France ịga hụ Océane.
Ka e nyesịrị Océane ọzụzụ ruo ọtụtụ ọnwa, e nyefere m ya. Ọ dịghịrị mụ na ya mfe ná mmalite. Anyị aghaghị ịmụta onwe anyị. Otú ọ dị, nke nta nke nta, abịara m ghọta na Océane dị m ezigbo mkpa. N’ezie, ọ dịghịzi ihe m na-eme hapụ Océane. Olee ihe ndị bi na Béziers mere mgbe ha hụrụ ka m ji nkịta na-abịa n’ụlọ ha? Ha kwanyeere m ùgwù nke ukwuu ma meso m omume obiọma. Océane ghọrọ ihe nkiri n’ógbè ahụ. Ebe ọ bụ na ahụ́ adịghị eru ọtụtụ mmadụ ala ma ha hụ onye nwere nkwarụ, iji nkịta na-eme ka ọ dịrị m mfe ikwu banyere ọrịa m. Obi na-eru ndị mmadụ ala, ha na-egekwa m ntị. N’ezie, Océane ghọrọ ihe kasị mma m na-eji amalite nkwurịta okwu.
Ịkpọ Océane Gaa Africa
Echefubeghị m Africa, ebidoziri m ịkwadebe maka njem nke atọ m. Nke ugbu a, Océane so m gaa. Mụ na otu di na nwunye ka lụrụ ọhụrụ, bụ́ Anthony na Aurore, na enyi m nwanyị bụ́ Caroline sokwa gaa—ha nile bụcha ndị ọsụ ụzọ ibe m. Na September 10, 2000, anyị rutere Lomé.
Na mbụ, ọtụtụ mmadụ na-atụ Océane ụjọ. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na Lomé hụtụrụla nkịta bururu ibu otú ahụ n’ihi na ihe ka ọtụtụ ná nkịta ndị e nwere na Togo dịcha obere. Mgbe ụfọdụ hụrụ ọgbụ olu ya, ha chere na ọ bụ anụ na-emerụ ahụ́ a na-achịkwa achịkwa. Océane malitekwaranụ ịdị na-adị njikere ịwakwasị ihe ọ bụla o lere anya na ọ ga-emerụ m ahụ́ iji chebe m. N’agbanyeghị nke ahụ, n’oge na-adịghị anya, ahụ́ ruru Océane ala n’ebe ọhụrụ a. Mgbe a nyawara ya ọgbụ olu ya, ọ na-anọ n’ọrụ—ọ na-akpa àgwà nkịta a zụrụ azụ, nke ji ọrụ ya kpọrọ ihe, ọ na-anọkwa m n’akụkụ. Mgbe a tọhapụrụ ya, ọ na-egwu egwu, na-emebikwa ihe mgbe ụfọdụ. Anyị na-eme nnọọ onwe anyị obi ụtọ.
A gwara anyị nile ka anyị soro Sandra na Christine biri na Tabligbo. Iji nyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị aka ịmara Océane nke ọma, anyị na-akpọ ha òkù ịbịa leta anyị, anyị na-akọwakwara ha ihe bụ́ ọrụ nkịta na-edu ndị ìsì, ihe mere o ji dị m mkpa inwe ya, na otú ha kwesịrị isi na-emeso ya. Ndị okenye kwetara ka m na-akpọ Océane abịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ebe ọ bụ na ndokwa a bụ nnọọ ihe ọhụrụ na Togo, a maara ọgbakọ ọkwa iji kọwaara ha ya. A bịa n’ozi, Océane na-eso m nanị mgbe m na-aga nletaghachi na iduzi ọmụmụ Bible—ebe ọ ga-adịrị ndị mmadụ mfe ịghọta ihe mere o ji bịa.
Ikwusa ozi ọma n’ókèala a nọgidere na-eme m obi ụtọ. Obi na-atọ m nnọọ ụtọ maka otú ndị obodo ahụ bụ́ ndị na-ahụ n’anya si echebara m echiche. Ha na-eme nke a site n’omume obiọma ha, ndị otu n’ime ha bụ ịgba mbọ inye m oche. N’October 2001, mama m soro m bịa Togo mgbe m na-abịa nke ugboro anọ m. Mgbe ọ nọsịrị izu atọ, ọ laghachiri France, obi ruru ya ala ma tọọ ya ụtọ.
Ana m ekele Jehova nke ukwuu na enwewo m ike ije ozi na Togo. Obi siri m ike na Jehova ga-anọgide na-enye m ‘ihe obi m na-arịọ’ ka m nọgidere na-eji ihe nile m nwere ejere ya ozi. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 37 Nwanna Nwanyị Morgou laghachiri France, ọ gakwara Togo nke ugboro ise ya n’October 6, 2003, ma laghachi na February 6, 2004. Ọ dị mwute na n’ihi nsogbu ahụ́ ike ya, nke ahụ pụrụ ịbụ nke ikpeazụ ọ ga-aga Togo n’usoro ihe a. Ka o sina dị, ọ ka nwere ọchịchọ siri ike ijere Jehova ozi.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Kemgbe ụwa, obi na-atọ m ụtọ mgbe ọ bụla m chere banyere ala ndị tọgbọrọ n’efu na ụmụ anụmanụ ndị na-adọrọ mmasị e nwere n’Africa
[Foto dị na peeji nke 10]
Océane na-eso m aga nletaghachi
[Foto dị na peeji nke 11]
Ndị okenye kwere ka m na-akpọ Océane abịa nzukọ