Ezi Àgwà Arụpụta Ezi Ihe
Ezi Àgwà Arụpụta Ezi Ihe
NDỊÀMÀ JEHOVA malitere ịmụrụ otu nwanyị na ụmụ ya atọ na-eto eto, bụ́ ndị bi n’otu obere agwaetiti dịdebere ụsọ oké osimiri nke ebe ndịda Japan, Bible. Mgbe ndị agbata obi ha n’agwaetiti ahụ dịpụrụ adịpụ, bụ́ ebe a na-agbasokarị ọdịnala, hụrụ nke a, ha kwụsịrị ịtụpụrụ nwanyị ahụ ọnụ mgbe ọ bụla ha hụrụ ya. Ọ na-akọ, sị: “Nkịtị ha na-agba di m na ụmụ m na-ewute m karịa nke ha na-agba m.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọ gwara ụmụ ya, sị: “N’ihi Jehova, anyị aghaghị ịnọgide na-ekele ndị agbata obi anyị.”—Matiu 5:47, 48.
N’ụlọ, ọ kụziiri ụmụ ya ka ha na-eji ihu ọchị ekele ndị mmadụ n’agbanyeghị na ha ga-agbachi ha nkịtị. Mgbe ha na-aga n’iyi na-asụpụta mmiri ọkụ, bụ́ ebe ha na-agakarị, ụmụaka ahụ na-anọ n’ime ụgbọala na-amụgharị otú ha ga-esi kelee ndị mmadụ. Mgbe ọ bụla ụmụaka ahụ banyere ebe ahụ, ha na-eji ihu ọchị ekele ndị mmadụ n’olu dara ụda, sị, “Konnichiwa!”—“Ndeewonụ!” Ezinụlọ ahụ nọgidere jiri ndidi na-ekele ndị nile ha na-ezute, ọ bụ ezie na ndị agbata obi ha adịghị eji ihu ọchị azaghachi ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mmadụ hụrụ àgwà ọma ụmụaka ahụ.
N’ikpeazụ, ụfọdụ ndị agbata obi ha malitere ịzaghachi ha “Konnichiwa.” Ka afọ abụọ gasịrị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nọ n’obodo ahụ malitere ịzaghachi ekele ndị ezinụlọ ahụ. Ha malitekwara ịdị na-ekele ibe ha ma na-emesokwu ibe ha omume enyi. Osote onyeisi obodo ahụ chọrọ inye ụmụaka ahụ ihe nrite n’ihi ụtụ ha tụnyere ná mgbanwe a. Ma nne ha gwara ya na ihe ha na-eme bụ nnọọ ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-eme. Ka e mesịrị, n’asọmpi ikwu okwu nke ndị agwaetiti ahụ mere, nwa ya nwoke kọrọ otú nne ya si kụziere ndị ezinụlọ ha iji ihu ọchị ekele ndị ọzọ n’agbanyeghị otú ha si zaghachi. E nyere ya ihe nrite nke mbụ n’ihi okwu ya, e bipụtakwara ya n’akwụkwọ akụkọ obodo ahụ. Taa, obi dị ndị ezinụlọ ahụ ụtọ na ụkpụrụ Ndị Kraịst ha gbasoro rụpụtara ezi ihe dị otú ahụ. Ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na-adị nnọọ mfe karị mgbe ha nwere omume enyi.