Ihe Mgbapụta Ahụ Na-eme Ka Ezi Omume Chineke Pụta Ìhè
Ihe Mgbapụta Ahụ Na-eme Ka Ezi Omume Chineke Pụta Ìhè
MGBE Adam na Iv nupụsịrị isi, Jehova kwupụtara nzube ya ime ka otu Mkpụrụ bilie, bụ́ nke a ga-echifịa n’ikiri ụkwụ. (Jenesis 3:15) E mezuru nke a mgbe ndị iro Chineke gburu Jizọs Kraịst n’elu osisi ịta ahụhụ. (Ndị Galeshia 3:13, 16) Jizọs enweghị mmehie ebe ọ bụ na a tụụrụ ime ya n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke n’ụzọ ọrụ ebube site n’ike mmụọ nsọ. N’ihi ya, a pụrụ iji ọbara ya a wụsịrị mee ihe dị ka ihe mgbapụta iji mee ka ụmụ mmadụ, bụ́ ndị ketara mmehie na ọnwụ site n’aka Adam, nwere onwe ha.—Ndị Rom 5:12, 19.
Ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Chineke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, imezu nzube ya. N’ihi ya, mgbe mmehie Adam na Iv gasịrị, n’anya Jehova, ọ dị ka à kwụọla ụgwọ ihe mgbapụta ahụ, o nwekwara ike iso ndị gosipụtara okwukwe ná mmezu nke nkwa ya dị iche iche mekọọ ihe. Nke a mere ka o kwe ụmụ Adam na-eme mmehie, dị ka Ịnọk, Noa na Ebreham, omume iso Chineke jee ije na Chineke imetadị ha enyi, n’emebighị ịdị nsọ ya.—Jenesis 5:24; 6:9; Jems 2:23.
Ụfọdụ ndị nwere okwukwe na Jehova mere oké mmehie. Eze Devid bụ otu n’ime ha. Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee ihe mere Jehova ji nọgide na-agọzi Eze Devid mgbe Devid kwasosịrị Bat-sheba iko ma gbuo di ya, bụ́ Yuraịa?’ Otu ihe dị mkpa kpatara ya bụ ezi nchegharị Devid na okwukwe ya. (2 Samuel 11:1-17; 12:1-14) Dabere n’àjà Jizọs Kraịst ga-achụ n’ọdịnihu, Chineke nwere ike ịgbaghara Devid bụ́ onye nwere nchegharị mmehie ya ma ka bụrụ Onye na-ekpe ikpe ziri ezi na Onye ezi omume. (Abụ Ọma 32:1, 2) Iji kwado nke a, Bible na-akọwa na ihe kasị dị ebube àjà mgbapụta Jizọs rụzuru bụ “iji wee gosi ezi omume nke [Chineke], n’ihi na ọ na-agbaghara mmehie ndị weere ọnọdụ n’oge gara aga” na “n’oge a a kara aka.”—Ndị Rom 3:25, 26.
Ee, ihe a kpọrọ mmadụ na-erite uru dị ukwuu n’ihi ịdị mkpa nke ọbara Jizọs. Dabere n’ihe mgbapụta ahụ, ndị mmehie nwere nchegharị na Chineke pụrụ inwe mmekọrịta chiri anya. Tụkwasị na nke ahụ, ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka o kwe omume Ọrụ 24:15) N’oge ahụ, dabere n’ihe mgbapụta ahụ, Jehova ga-enye ụmụ mmadụ nile na-erube isi ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:36) Jizọs n’onwe ya kọwara, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ihe mere ihe a kpọrọ mmadụ ga-eji rite uru a nile bụ na Chineke mere ndokwa maka àjà mgbapụta.
ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ Chineke. Nke ahụ ga-agụnye ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwụrụ tupu Jizọs akwụọ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ na ọbụna ọtụtụ ndị nwụrụ mgbe ha na-amaghị ihe ọ bụla banyere Chineke, n’ihi ya kwa, ghara ife Ya. Bible na-ekwu, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Otú ọ dị, ihe ka mkpa n’ihe mgbapụta ahụ abụghị uru ndị anyị na-erite na ya. Ihe àjà mgbapụta Kraịst na-emere aha Jehova dị mkpa karịa nke ahụ. Ọ na-egosi na Jehova bụ Chineke nke na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe nile, onye ya na ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ imekọ ihe ma ya anọgide na-adị ọcha, dịkwa nsọ. A sị na Chineke ezubeghị iweta ihe mgbapụta ahụ, ọ dịghị nwa Adam, ọbụnadị Ịnọk, Noa, na Ebreham, nke gaara enwe ike iso Jehova jee ije ma ọ bụ bụrụ enyi ya. Ọbụ abụ ahụ ghọtara nke a ma dee, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Lee otú anyị kwesịrị isi nwee obi ụtọ na Jehova zitere Ọkpara ọ hụrụ n’anya n’ụwa, nakwa na Jizọs dị njikere inye ndụ ya iji gbapụta anyị!—Mak 10:45.