Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Bụ Onye Na-azụ Anyị Dị Ka Atụrụ

Jehova Bụ Onye Na-azụ Anyị Dị Ka Atụrụ

Jehova Bụ Onye Na-azụ Anyị Dị Ka Atụrụ

“Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m.”—ABỤ ỌMA 23:1.

1-3. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na Devid ji Jehova tụnyere onye ọzụzụ atụrụ?

A SỊ gị kọwaa otú Jehova si elekọta ndị ya, olee otú ị ga-esi kọwaa ya? Gịnị ka ị ga-eji tụnyere nlekọta ịhụnanya ọ na-elekọta ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi? Ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, ọbụ abụ bụ́ Eze Devid kọwara Jehova n’ụzọ magburu onwe ya n’ihe odide ya, Devid ji ọrụ ọ rụrụ mgbe ọ ka na-eto eto tụnyere ọrụ Jehova na-arụ.

2 Devid bụ onye ọzụzụ atụrụ mgbe ọ bụ nwa okorobịa, n’ihi ya, ilekọta atụrụ doro ya anya. Ọ maara nke ọma na ọ bụrụ na e lebaaraghị ụmụ atụrụ anya, ha na-akpafukarị, ndị ohi ezuru ha, ma ọ bụ anụ ọhịa adọgbuo ha. (1 Samuel 17:34-36) Ọ bụrụ na ụmụ atụrụ enweghị onye ọzụzụ atụrụ na-elebara ha anya nke ọma, o nwere ike ha agaghị ahụ ebe ha ga-ata nri. Obi abụọ adịghị ya na mgbe Devid mere okenye, obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ bụla o chetara ọtụtụ awa ndị o ji duo, chebe ma nye ụmụ atụrụ nri.

3 Ọ bụghị ihe ijuanya na ihe gbatara Devid n’obi mgbe e nyere ya ike mmụọ nsọ ịkọwa otú Jehova si elekọta ndị ya bụ ọrụ onye ọzụzụ atụrụ. Abụ Ọma nke 23, nke Devid dere, ji okwu ndị a malite: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m.” Ka anyị tụlee ihe mere okwu a ji daba adaba. Abụ Ọma nke 23 ga-enyeziri anyị aka ịhụ ụzọ ndị Jehova si elekọta ndị na-efe ya ofufe dị ka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta ụmụ atụrụ ya.—1 Pita 2:25.

Ntụnyere Dabara Adaba

4, 5. Olee otú Bible si kọwaa àgwà ụmụ atụrụ?

4 Jehova nwere ọtụtụ utu aha n’Akwụkwọ Nsọ, ma utu aha ahụ bụ́ ‘Onye Ọzụzụ Atụrụ’ so ná ndị kasị egosi ịhụnanya. (Abụ Ọma 80:1) Iji ghọtakwuo ihe mere o ji daba adaba ịkpọ Jehova Onye Ọzụzụ Atụrụ, ọ dị ihe abụọ anyị kwesịrị ịmata: nke mbụ bụ àgwà ụmụ atụrụ, nke abụọ bụ ọrụ na àgwà nke ezi onye ọzụzụ atụrụ.

5 Bible na-ekwukarị banyere àgwà ụmụ atụrụ, na-akọwa na ọ na-adịrị ha nnọọ mfe ịma mgbe onye na-azụ ha gosiri ha ịhụnanya (2 Samuel 12:3), na ha anaghị achọ okwu (Aịsaịa 53:7), nakwa na ha anaghị echebeli onwe ha. (Maịka 5:8) Otu onye edemede nke zụrụ atụrụ ruo ọtụtụ afọ dere, sị: “Ụfọdụ pụrụ iche na ụmụ atụrụ ‘na-elekọta nnọọ onwe ha’ ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Ọ dị ha mkpa ka a nọgide na-elebara ha anya ma jiri ezi nlezianya na-elekọta ha karịa anụ ụlọ ọ bụla ọzọ.” Ebe ọ bụ na ụmụ atụrụ apụghị ilekọta onwe ha, ọ dị ha mkpa inwe onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya iji dịgide ndụ.—Ezikiel 34:5.

6. Olee otú otu akwụkwọ ọkọwa okwu Bible si kọwaa ihe onye ọzụzụ atụrụ oge ochie na-eme n’ụbọchị?

6 Olee ihe onye ọzụzụ atụrụ oge ochie na-eme n’ụbọchị? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu Bible na-akọwa, sị: “N’isi ụtụtụ, ọ na-esi n’ogige atụrụ kpọpụta ìgwè atụrụ ahụ, duru ha gawa ebe ha ga-ata nri. Ọ na-anọ ebe ahụ elekọta ha site n’ụtụtụ ruo abalị iji hụ na ọ dịghị nke kpafurunụ, ya bụrụkwa na e nwee nke pụrụnụ mgbe ọ na-amaghị, wee si n’ebe ndị nke ọzọ nọ kpafuo, ọ na-achọgide ya ruo mgbe ọ chọtara ya ma kpọghachi ya. . . . N’abalị, ọ na-akpọghachi ìgwè atụrụ ahụ n’ogige ha, jiri mkpara ya na-agụ ha ọnụ ka ha na-aba n’ogige ha iji jide n’aka na o nweghị nke furunụ. . . . Mgbe mgbe, ọ ghaghị iche ogige atụrụ ahụ nche ruo ụtụtụ ka anụ ọhịa ghara ịwakpo ha, ma ọ bụ ka ndị ohi ghara izuru ha.” *

7. Gịnị mere o ji dị onye ọzụzụ atụrụ mkpa mgbe ụfọdụ inwekwu ndidi na ịdịkwu nro?

7 E nwere mgbe ụmụ atụrụ na-achọ ka e jiri ndidi na ịhụnanya mesoo ha ihe, karịsịa ndị nke dị ime na ndị a mụrụ ọhụrụ. (Jenesis 33:13) Otu akwụkwọ na-akọwa Bible na-ekwu, sị: “Ọ na-abụkarị n’ebe ugwu ka atụrụ na-anọ amụ nwa. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-eji nlezianya echebe nne atụrụ ahụ n’oge ndị ahụ ike gwụchara ya ma kuru nwa atụrụ ahụ n’ogwe aka ya laghachi n’ebe atụrụ ndị nke ọzọ nọ. Malite n’ụbọchị a mụrụ ya ruo ụbọchị ole na ole mgbe ọ malitere ije ije, onye ọzụzụ atụrụ ahụ pụrụ ịdị na-eku ya n’ogwe aka ya ma ọ bụ n’obi ya.” (Aịsaịa 40:10, 11) O doro anya na ọ dị ezi onye ọzụzụ atụrụ mkpa inwe obi ike na ịdị nro.

8. Olee ihe ndị Devid kwuru mere a ga-eji nwee obi ike na Jehova?

8 “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ”—nke ahụ ọ́ bụghị ụzọ dabara adaba isi kọwaa Nna anyị nke eluigwe? Ka anyị na-atụle Abụ Ọma nke 23, anyị ga-ahụ otú Chineke si eji ike na ịhụnanya nke onye ọzụzụ atụrụ elekọta anyị. N’amaokwu 1, Devid kọwara obi ike o nwere na Chineke ga-enye ụmụ atụrụ Ya ihe nile dị ha mkpa ka ọ ‘ghara ịdị ihe kọrọ ha.’ N’amaokwu ndị sochiri ya, Devid kwuru ihe atọ mere o ji nwee obi ike a: Jehova na-edu, na-echebe ma na-enye atụrụ Ya nri. Ka anyị tụlee ihe ndị a otu otu.

“Ọ Na-edu M”

9. Olee ebe dị n’udo Devid na-akọwa, oleekwa otú ụmụ atụrụ ga-esi garuo ebe dị otú ahụ?

9 Nke mbụ, Jehova na-edu ndị ya. Devid na-ede, sị: “N’ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ ka Ọ na-eme ka m makpuru: n’akụkụ mmiri nke izu ike ka Ọ na-edu m nwayọọ. Ọ na-eweghachi mkpụrụ obi m: Ọ na-edu m n’ụzọ nile nke ezi omume n’ihi aha Ya.” (Abụ Ọma 23:2, 3) Ìgwè atụrụ makpu n’udo n’ebe ahịhịa juru—n’ebe a, Devid na-ekwu banyere inwe afọ ojuju, ntụrụndụ, na ịnọ n’ebe dị nchebe. Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ebe ịta nri” nwere ike ịpụta “ebe mara mma.” Eleghị anya, ụmụ atụrụ ahụ agaghị achọtali n’onwe ha ebe na-enye ume ọhụrụ ha ga-amakpu n’udo. Onye na-azụ ha aghaghị iduru ha gaa ‘n’ebe mara mma’ dị otú ahụ.

10. Olee otú Chineke si egosi na ya nwere obi ike n’ebe anyị nọ?

10 Olee otú Jehova si edu anyị taa? Otu ụzọ o si edu anyị bụ site n’isetịpụrụ anyị ihe nlereanya. Okwu ya na-agba anyị ume ịghọ “ndị na-eṅomi Chineke.” (Ndị Efesọs 5:1) Okwu ndị dị ka ọmịiko, mgbaghara, na ịhụnanya gbara okwu ndị ahụ gburugburu. (Ndị Efesọs 4:32; 5:2) N’ezie, Jehova na-esetịpụ ihe nlereanya kasị mma n’igosi àgwà ịhụnanya ndị dị otú ahụ. Site n’ịgwa anyị ka anyị ṅomie ya, ọ̀ na-atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli? Ee e. Ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ n’ezie ngosipụta magburu onwe ya nke obi ike o nwere n’ebe anyị nọ. N’ụzọ dị aṅaa? E kere anyị n’onyinyo Chineke, nke pụtara na anyị nwere ikike ịkpa ezi àgwà na iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. (Jenesis 1:26) N’ihi ya, Jehova maara na n’agbanyeghị ezughị okè anyị, anyị nwere ike ịzụlite otu àgwà ndị ahụ o nwere. Cheedị—Chineke anyị na-ahụ na-anya nwere obi ike na anyị pụrụ ịdị ka ya. Ọ bụrụ na anyị agbasoo ihe nlereanya ya, a pụrụ ikwu na ọ ga-eduru anyị gaa ‘n’ebe izu ike’ na-enye obi ụtọ. N’ime ụwa a nke ihe ike jupụtara, anyị ‘ga-ebi ná ntụkwasị obi,’ na-enwe udo nke na-abịa site n’ịmara na anyị nwere ihu ọma Chineke.—Abụ Ọma 4:8; 29:11.

11. Olee ihe Jehova na-ebu n’obi mgbe ọ na-edu ụmụ atụrụ ya, oleekwa otú nke a si pụta ìhè n’ihe ọ na-achọ n’aka anyị?

11 Jehova na-eji ịhụnanya na ndidi edu anyị. Onye ọzụzụ atụrụ na-eburu adịghị ike nke atụrụ ya n’obi, n’ihi ya, ọ na-edu ha “dị ka ijeụkwụ anụ ụlọ” si dị. (Jenesis 33:14) N’otu aka ahụ, Jehova na-edu atụrụ ya “dị ka ijeụkwụ” ha si dị. Ọ na-aghọta ebe ike anyị ruru na ọnọdụ anyị. A pụrụ ikwu na ọ na-eji maka anyị aga nwayọọ nwayọọ, ọ dịghịkwa mgbe ọ na-achọ ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Ihe ọ na-achọ anyị n’aka bụ iji mkpụrụ obi dum na-ejere ya ozi. (Ndị Kọlọsi 3:23) Ma gịnị ma ọ bụrụ na i meela okenye, wee gharazie inwe ike ime ihe ndị ị na-emebu? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa siri ike nke na-egbochi gị ime ihe ị chọrọ ime? Ọ bụ ebe a ka ihe a chọrọ anyị n’aka bụ́ iji mkpụrụ obi anyị dum na-eje ozi nọrọ magbuo onwe ya. Ọ dịghị mkpụrụ obi abụọ bụ nnọọ otu. Iji mkpụrụ obi gị dum na-eje ozi pụtara iji ike na ume gị nile na-eme ihe ruo n’ókè o kwere gị mee n’ozi Chineke. N’agbanyeghị adịghị ike ndị pụrụ ibelata ihe anyị pụrụ ime, Jehova na-eji nnọọ ofufe anyị ji mkpụrụ obi anyị dum efe ya akpọrọ ihe.—Mak 12:29, 30.

12. Olee ihe atụ dị n’Iwu Mozis nke na-egosi na Jehova na-edu atụrụ ya “dị ka ijeụkwụ” ha si dị?

12 Iji nye ihe atụ na-egosi na Jehova na-edu ụmụ atụrụ ya “dị ka ijeụkwụ” ha si dị, tụlee ihe e kwuru banyere àjà ikpe ọmụma ụfọdụ n’Iwu Mozis. Jehova chọrọ àjà ndị mara mma bụ́ ndị sitere n’ezi obi. N’agbanyeghị nke ahụ, e kwuru ihe dị iche iche mmadụ pụrụ iji chụọ àjà, dabere n’ihe onye ahụ ga-enyeli. Iwu ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na aka ya erughị ihe ga-ezu nwa atụrụ, ọ [ga-ewetakwa] nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.” Gịnị ma ọ bụrụ na onye ahụ agaghị ewetali ụmụ kpalakwukwu abụọ? O nweziri ike iweta “ụtụ ọka flour.” (Levitikọs 5:7, 11) Nke a na-egosi na Chineke achọghị ka ndị ahụ bịara ịchụ àjà weta ihe ha na-agaghị ewetali. Ebe ọ bụ na Chineke adịghị agbanwe agbanwe, ọ pụrụ ịbụrụ anyị ihe nkasi obi ịmata na ọ dịghị achọ ka anyị nye ihe anyị na-agaghị enyeli; kama, ọ na-enwe obi ụtọ ịnabata ihe anyị ga-enyeli. (Malakaị 3:6) Lee nnọọ ka o si bụrụ ihe obi ụtọ na ọ bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ nwere ezi uche dị otú ahụ na-edu anyị!

“M Gaghị Atụ Egwu Ihe Ọjọọ Ọ Bụla; n’Ihi na Gị Onwe Gị Nọnyeere M”

13. N’Abụ Ọma 23:4, olee otú Devid si kwuo okwu dị ka onye ya na Jehova nwere mmekọrịta chikwuru anya, gịnịkwa mere na nke a abụghịrị anyị ihe ijuanya?

13 Devid kwuru ihe nke abụọ mere o ji nwee obi ike: Jehova na-echebe atụrụ ya. Anyị na-agụ, sị: “A sị na ejee m ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị nọnyeere m: ndele Gị na mkpanaka Gị, ha onwe ha na-akasi m obi.” (Abụ Ọma 23:4) Devid na-ekwuzi ka onye ya na Jehova nwere mmekọrịta chikwuru anya, na-eji nnọchiaha bụ́ “gị” agwa Jehova okwu. Nke a abụghị ihe ijuanya n’ihi na Devid na-ekwu otú Chineke si nyere ya aka ịtachi obi n’ahụhụ. Devid ejeela ije n’ọtụtụ ndagwurugwu gbara ọchịchịrị—ya bụ, oge ndị ndụ ya nọ n’ihe ize ndụ. Ma, o kweghị ka ụjọ rikpuo ya n’ihi na ọ hụrụ na Chineke nọnyeere ya—“ndele” Ya na “mkpanaka” Ya adịrịkwa njikere ịrụ ọrụ. Mmara Devid maara na a na-echebe ya kasịrị ya obi, obi abụọ adịghịkwa ya na o mere ka ọ bịarukwuo Jehova nso. *

14. Olee mmesi obi ike Bible na-enye anyị banyere nchebe Jehova, ma gịnị ka nke a na-apụtaghị?

14 Olee otú Jehova si echebe atụrụ ya taa? Bible na-emesi anyị obi ike na ọ dịghị ndị mmegide—ma ndị mmụọ ọjọọ ma ndị mmadụ—ga-ekpochapụli atụrụ ya n’ụwa. Jehova agaghị ekwe ka nke ahụ mee. (Aịsaịa 54:17; 2 Pita 2:9) Otú ọ dị, nke a adịghị apụta na Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị ga-echebe anyị pụọ n’ọdachi nile. Anyị na-enweta ọnwụnwa ndị na-abịara ụmụ mmadụ, a na-emegidekwa anyị dị ka e si emegide ezi Ndị Kraịst nile. (2 Timoti 3:12; Jems 1:2) A pụrụ ikwu na e nwere oge ndị anyị nwere ike ije “ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ.” Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịfọdụ nke nta ka anyị nwụọ n’ihi mkpagbu ma ọ bụ ọrịa. Ma ọ bụ, ya afọdụ nke nta ka onye anyị hụrụ n’anya nwụọ ma ọ bụ ọbụna ya anwụọ. N’oge ndị o yiri ka olileanya adịghịzi, Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị na-anọnyere anyị, ọ ga-echebekwa anyị. N’ụzọ dị aṅaa?

15, 16. (a) Olee ụzọ ndị Jehova si enyere anyị aka imeri ihe mgbochi ndị anyị pụrụ izute? (b) Kọọ otu ahụmahụ na-egosi otú Jehova si enyere anyị aka n’oge ọnwụnwa.

15 Jehova anaghị ekwe nkwa inyere anyị aka n’ụzọ ọrụ ebube. * Ma anyị pụrụ ijide n’aka na: Jehova ga-enyere anyị aka imeri ihe mgbochi ọ bụla anyị pụrụ izute. Ọ pụrụ inye anyị amamihe iji nagide “ọnwụnwa dị iche iche.” (Jems 1:2-5) Ọ bụghị nanị anụ ndị na-egbu atụrụ ka onye ọzụzụ atụrụ na-eji ndele ma ọ bụ mkpanaka ya achụ, ọ na-ejikwa ya enutụ ụmụ atụrụ ya ka ha gawa ebe ha kwesịrị ịga. Jehova pụrụ “inutụ” anyị, ikekwe site n’aka nwanna anyị, itinye ụkpụrụ Bible pụrụ ime ka ọnọdụ anyị kakwuo nnọọ mma n’ọrụ. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova pụrụ inye anyị ike ịtachi obi. (Ndị Filipaị 4:13) Site na mmụọ nsọ ya, ọ pụrụ inye anyị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Mmụọ Chineke pụrụ inyere anyị aka ịtachi obi n’ule ọ bụla Setan pụrụ iwetara anyị. (1 Ndị Kọrint 10:13) Ọ́ bụghị ihe na-akasi obi ịmara na Jehova dị njikere inyere anyị aka?

16 Ee, n’agbanyeghị otú ndagwurugwu anyị hụrụ onwe anyị n’ime ya gbaruru n’ọchịchịrị, anyị agaghị eje ije na ya nanị anyị. Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị nọnyeere anyị, na-enyere anyị aka n’ụzọ ndị anyị nwere ike ghara ịghọtacha ná mmalite. Tụlee ahụmahụ nke otu okenye ọgbakọ nke dọkịta gwara na ọ na-arịa ọrịa ụbụrụ ịza aza bụ́ nke na-esi ike ngwọta. “Aghaghị m ikweta na ná mmalite, anọ m na-eche ma Jehova ọ̀ na-ewesa m iwe, ma ọ bụ ka ọ̀ hụkwadịrị m n’anya. Ma ekpebisiri m ike na agaghị m ahapụ Jehova. Kama nke ahụ, agwara m ya nsogbu m. Jehova nyekwaara m aka, na-eji ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị akasi m obi mgbe mgbe. Ọtụtụ mere ka m ghọtakwuo ọnọdụ m site n’ahụmahụ ha nwere mgbe ha rịara ọrịa siri ike, ihe ndị ahụ ha gwara m nyekwaara m aka. Ihe ndị ha ji ezi uche gwa m chetaara m na ihe na-eme m emetụkwala ndị ọzọ. Enyemaka ndị m nwetara, gụnyere ụfọdụ ndị ji obiọma rịọ ka ha nyere m aka n’ụzọ metụrụ m n’obi, mesiri m obi ike na Jehova anaghị ewesa m iwe. N’ezie, mụ na ọrịa m ka na-alụ, amaghịkwa m ihe ga-esi na ya pụta. Ma ekwenyesiri m ike na Jehova nọnyeere m, nakwa na ọ ga-anọgide na-enyere m aka n’ọnwụnwa a.”

“Ị Na-edo Tebụl n’Usoro n’Ihu M”

17. Olee otú Devid si kọwaa Jehova n’Abụ Ọma 23:5, gịnịkwa mere nkọwa a na ihe atụ nke onye ọzụzụ atụrụ ji kwekọọ?

17 Devid kwuziri ihe nke atọ mere o ji nwee obi ike n’ebe Onye Ọzụzụ Atụrụ ya nọ: Jehova na-enye atụrụ ya nri, ọ na-emekwa otú ahụ n’ụba. Devid na-ede, sị: “Ị na-edo tebụl n’usoro n’ihu m n’anya ndị na-akpagbu m: I tewo isi m mmanụ; iko m bụ inwebiga ihe ókè.” (Abụ Ọma 23:5) N’amaokwu a, Devid kọwara Onye Ọzụzụ Atụrụ ya dị ka onye nwere afọ ọma nke na-eleta ndị ọbịa, na-enye ha nri na ihe ọṅụṅụ n’ụba. Ihe atụ abụọ a—onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya na onye nwere afọ ọma nke na-eleta ndị ọbịa—adịghị emegide onwe ha. E kwuwerị, ezi onye ọzụzụ atụrụ aghaghị ịma ebe ọ ga-achọta ebe ịta nri na mmiri ọṅụṅụ ga-ezu ezu ka ìgwè atụrụ ya wee ghara inwe ‘ihe kọrọ ha.’—Abụ Ọma 23:1, 2.

18. Gịnị na-egosi na Jehova bụ onye nwere afọ ọma nke na-elekọta ndị ọbịa?

18 Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị ò nwere afọ ọma ma na-elekọta ndị ọbịa? A naghị agbagha nke ahụ agbagha! Cheedị banyere otú nri ime mmụọ ndị anyị na-eri ugbu a si edozi ahụ́, otú ha baruru n’ụba, na otú ha si dịgasịa iche. Site n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, Jehova enyela anyị akwụkwọ na ihe ndị ọzọ na-enye aka na ihe omume ndị na-abara anyị uru ná nzukọ, mgbakọ ukwu na ndị nke nta—bụ́ ndị na-egbocha mkpa ime mmụọ anyị. (Matiu 24:45-47) N’eziokwu, anyị anọghị n’ụkọ nri ime mmụọ. “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ebipụtala ọtụtụ nde Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, e nwekwara akwụkwọ ndị ahụ ugbu a na narị asụsụ anọ na iri na atọ. Jehova enyela nri ime mmụọ a n’ụdị ya dị iche iche—malite na “mmiri ara,” bụ́ ozizi Bible ndị bụ́ isi, ruo ná “nri siri ike,” bụ́ ihe ọmụma ime mmụọ ndị ka sie ike. (Ndị Hibru 5:11-14) N’ihi ya, mgbe anyị nwere nsogbu ma ọ bụ nwee mkpebi ndị anyị ga-eme, anyị pụrụ ịhụ ihe anyị chọrọ kpọmkwem. Olee otú ndụ anyị gaara adị ma e wezụga nri ime mmụọ ndị ahụ? Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị bụ n’ezie onye kasị eji afọ ọma enye ihe!—Aịsaịa 25:6; 65:13.

‘M Ga-ebi n’Ụlọ Jehova’

19, 20. (a) N’Abụ Ọma 23:6, olee obi ike Devid gosiri, oleekwa otú anyị pụrụ isi nwee ụdị obi ike ahụ? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Mgbe Devid tụgharịsịrị uche n’otú Onye na-azụ ya dị ka atụrụ na Onye na-egboro ya mkpa si eme ihe, o kwubiri, sị: “Nanị ịdị mma na ebere ga-agbaso m ụbọchị nile nke ndụ m: m ga-ebikwa n’ụlọ Jehova ruo ogologo ụbọchị nile.” (Abụ Ọma 23:6) Ihe kpaliri Devid ikwu ihe ndị ahụ o kwuru bụ obi ekele na okwukwe—obi ekele o nwere n’ihi ihe ndị mere n’oge gara aga bụ́ ndị o chetara, na okwukwe o nwere n’ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Obi ruru onye a bụbu onye ọzụzụ atụrụ ala n’ihi na ọ maara na ọ bụrụhaala na ya anọgide n’akụkụ Onye Ọzụzụ Atụrụ ya nke eluigwe, dị ka à ga-asị na o bi n’ụlọ Ya, Jehova ga-anọgide jiri ịhụnanya na-elekọta ya.

20 Lee ekele anyị nwere maka ihe ahụ magburu onwe ya e dekọrọ n’Abụ Ọma nke 23! O nweghị ụzọ ọzọ ka daba adaba Devid gaara esi kọwaa otú Jehova si edu, echebe ma na-enye ụmụ atụrụ ya nri. E chekwara okwu ndị a na-egosi ịhụnanya Devid kwuru iji mesie anyị obi ike na anyị pụkwara iwere Jehova dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị. Ee, ọ bụrụhaala na anyị anọgide n’akụkụ Jehova, ọ ga na-elekọta anyị dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ na-ahụ n’anya “ruo ogologo ụbọchị nile,” ọbụna ruo mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị, dị ka ụmụ atụrụ ya, anyị nwere ibu ọrụ nke iso Onye Ọzụzụ Atụrụ ukwu anyị, bụ́ Jehova, na-eje ije. A ga-atụle ihe nke a gụnyere n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Devid rọrọ ọtụtụ abụ ndị o ji too Jehova maka ịnapụta ya n’ihe ize ndụ.—Dị ka ihe atụ, lee ihe e dekwasịrị n’elu Abụ Ọma nke 18, 34, 56, 57, 59, na nke 63.

^ par. 15 Lee Isiokwu bụ́ “Ntinye Aka Chineke—Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịtụ Anya Ya?” nke dị n’Ụlọ Nche nke October 1, 2003.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị mere ojiji Devid ji Jehova tụnyere onye ọzụzụ atụrụ ji daba adaba?

• Olee otú Jehova si eji nghọta edu anyị?

• Olee ụzọ ndị Jehova si enyere anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa?

• Gịnị na-egosi na Jehova bụ Onye nwere afọ ọma nke na-eleta ndị ọbịa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Dị ka onye ọzụzụ atụrụ n’Izrel, Jehova na-edu ụmụ atụrụ Ya