Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onyinye Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ

Onyinye Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ

Onyinye Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ

Ọ BỤGHỊ akụkọ na-enye ọṅụ. Eze Nwanyị Atalaịa ejiriwo aghụghọ na igbu ọchụ zọrọ ọchịchị Juda. Ebe o chere n’ụzọ hiere ụzọ na ndị nile gaara anọchi n’oche ọchịchị anwụọla, o mere onwe ya eze nwanyị. Nwanyị ọzọ, bụ́ Jehosheba nwa eze, onye hụrụ Jehova na Iwu ya n’anya nke ukwuu, ji obi ike zoo otu nwa eze, bụ́ Jehoash a mụrụ ọhụrụ. Jehosheba na di ya, bụ́ Jehoịada Nnukwu Onye Nchụàjà, zoro nwa eze ahụ n’ebe ha bi n’ogige ụlọ nsọ ahụ ruo afọ isii.—2 Ndị Eze 11:1-3.

Ka Jehoash na-erule afọ asaa, Jehoịada Nnukwu Onye Nchụàjà adịla njikere imezu atụmatụ ya bụ́ ịchụtu eze nwanyị ahụ ji aka ike zọrọ ọchịchị na-erughịrị ya. O si n’ebe e zoro nwata ahụ kpọpụta ya ma chie ya eze dị ka onye ọchịchị alaeze ahụ ruru n’aka. Ndị nche obí eze chụpụziri ajọ Eze Nwanyị Atalaịa n’ogige ụlọ nsọ ahụ ma gbuo ya, nke a mere ndị obodo ahụ obi ụtọ ma mee ka obi ruo ha ala. Site n’ihe ha mere, Jehoịada na Jehosheba tụnyere ụtụ dị ukwuu n’iweghachi ezi ofufe n’ala Juda. Ma nke ka mkpa bụ na ha tụnyere ụtụ n’ịhụ na usoro ndị eze si n’eriri Devid, bụ́ nke a ga-esi na ya nweta Mezaịa ahụ, dịgidere.—2 Ndị Eze 11:4-21.

Eze ọhụrụ ahụ ga-emekwa ihe ga-eme Chineke obi ụtọ. Ụlọ Jehova chọrọ nnọọ nrụzi. Oké ọchịchọ Atalaịa nwere ịbụ onye nanị ya ga-achị Juda abụghị nanị na o mere ka e leghara ụlọ nsọ ahụ anya, kamakwa o dujere ná ndị mmadụ ịkwakọrọ ihe ndị dị na ya. N’ihi ya, Jehoash kpebisiri ike iwuzigharị ụlọ nsọ ahụ ma mee ka ọ dịghachi otú ọ dịbu. N’egbughị oge, o tiri iwu ka a nakọta ego iji rụzie ụlọ Jehova. O kwuru, sị: “Ego nile nke ihe nsọ nile nke a na-ewebata n’ụlọ Jehova, bụ́ ego onye na-agabiga n’ebe ndị a gụkọtara agụkọta nọ, nwoke ọ bụla ego mmadụ nile nke o ruru ọnụ ya, na ego nile nke ọ batara n’obi nwoke ọ bụla iwebata n’ụlọ Jehova, ka ndị nchụàjà were ya n’onwe ha, nwoke ọ bụla site n’aka onye ọ maara: ha onwe ha ga-eme ka ebe e tipuru etipu nke ụlọ ahụ dị ike, ebe ọ bụla a ga-achọta ebe e tipuru etipu.”—2 Ndị Eze 12:4, 5.

Ndị ahụ ji obi ha nile nye onyinye. Otú ọ dị, ndị nchụàjà ejighị obi ha nile rụọ ọrụ e nyere ha nke bụ́ ịrụzi ụlọ nsọ ahụ. N’ihi ya, eze ahụ kpebiri ịhụ maka okwu ahụ n’onwe ya ma nye iwu ka a tụnye onyinye nile n’otu igbe pụrụ iche. Ọ gwara Jehoịada ka ọ hụ maka ya, ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Jehoịada, bụ́ onye nchụàjà, wee were otu igbe hapuo oghere n’okwu ya, dọba ya n’akụkụ ebe ịchụàjà, n’aka nri nke ebe mmadụ na-aba n’ụlọ Jehova: ndị nchụàjà ndị na-eche mbata ụzọ wee tinye n’ebe ahụ ego nile a na-ewebata n’ụlọ Jehova. O ruo, mgbe ha hụrụ na ego ahụ hiri nne n’igbe ahụ, na odeakwụkwọ eze na onyeisi nchụàjà rịgoro, kee ego ahụ n’ihe, gụọkwa ya, bụ́ nke a chọtara n’ụlọ Jehova. Ha wee nye ego ahụ nke a tụrụ atụ n’aka ndị na-eje ozi ahụ, bụ́ ndị na-elekọta ụlọ Jehova: ha wee wepụta ya nye ndị ọkà n’osisi, nyekwa ndị na-ewu ụlọ, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ Jehova, nyekwa ndị na-edo nkume, nyekwa ndị na-awa nkume, na iji zụta osisi na nkume a wara awa ime ka ebe e tipuru etipu nke ụlọ Jehova dị ike, na ịkwụ ụgwọ ihe nile na-apụtara ụlọ ahụ ime ka ọ dị ike.”—2 Ndị Eze 12:9-12.

Ndị ahụ ji obi ha nile kwado ọrụ ahụ. E wuzighachiri ụlọ ofufe Jehova ka e wee nọgide na-efe Ya n’ụzọ dị ùgwù. E si otú a jiri ego nile e nyere n’onyinye mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Eze Jehoash hụrụ na e mere otú ahụ!

Taa, nzukọ Jehova a na-ahụ anya na-elezi anya iji hụ na e ji ego nile e nyere n’onyinye mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji mee ka ofufe Jehova na-aga n’ihu, ezi Ndị Kraịst enyewokwa onyinye dị ka ndị Izrel oge ochie ahụ nyere—site n’ala ala obi ha. Ikekwe i so ná ndị nyere onyinye iji hụ na ihe ndị metụtara Alaeze ahụ gara n’ihu n’afọ ije ozi gara aga. Ka anyị hụ ihe ụfọdụ e jiworo onyinye gị mee.

OBIBI AKWỤKWỌ

Gburugburu ụwa, e wepụtara ihe ndị na-esonụ iji duzie ọmụmụ ihe na iji kesaara ha ndị mmadụ:

• Akwụkwọ: 47,490,247

• Akwụkwọ nta: 6,834,740

• Broshuọ: 167,854,462

• Kalenda: 5,405,955

• Magazin: 1,179,266,348

• Traktị: 440,995,740

• Vidio: 3,168,611

A na-ebipụta akwụkwọ n’Africa, Ebe Ugwu, Ebe Etiti, na n’Ebe Ndịda America, Eshia, Europe, nakwa n’agwaetiti ndị dị na Pacific—ha dị mba 19 ná ngụkọta.

“Aha m bụ Katelyn May. Adị m afọ asatọ. Enwere m $28, m ga-achọkwa inye ya unu ka unu were ya nye aka kwụọ ụgwọ ígwè obibi akwụkwọ ndị ahụ. Abụ m obere nwanna unu nwanyị, Katelyn.”

“Anyị kpọrọ nzukọ ezinụlọ iji kwurịta banyere ígwè obibi akwụkwọ ọhụrụ ndị ahụ. Ụmụ anyị, ndị otu n’ime ha dị afọ 11, nke ọzọ adịkwa afọ 9, kpebiri iwere ego site n’ego ha na-echekwa iji nye onyinye nke ha. Obi dị anyị ụtọ izitekọta onyinye ha na nke anyị.”

IHE OWUWU

Ihe na-esonụ bụ ihe ụfọdụ e wuru iji kwado ọrụ Ndịàmà Jehova:

• Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ala ndị na-abachaghị ọgaranya: 2,180

• Ụlọ Mgbakọ: 15

• Alaka ụlọ ọrụ: 10

• Ndị na-arụ ọrụ iwu ihe ná mba ndị ọzọ bụ́ ndị nọ n’ozi oge nile: 2,342

“Anyị nwere nzukọ mbụ anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ anyị ná ngwụsị izu a. Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu inwe ebe kwesịrị ekwesị ịnọ enye Nna anyị, bụ́ Jehova Chineke, otuto. Anyị na-ekele Jehova, na-ekelekwa unu maka ilebara mkpa anyị anya site n’iwukwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ezie, Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị bara nnọọ uru n’ógbè anyị.”—Chile.

“Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nwere nnọọ ekele maka enyemaka nzukọ Jehova na-enye. Ruokwa taa, anyị ka na-akọ akụkọ otú anyị na ndị ọrụ owuwu ihe ahụ si nnọọ rụkọọ ọrụ.”—Moldova.

“Ọ dịbeghị anya mụ na nwunye m mere ememe ncheta agbamakwụkwọ anyị nke afọ 35. Anyị nọ na-eche ihe anyị ga-azụtara ibe anyị maka ememe ahụ, anyị wee kpebie inye Jehova na nzukọ ya ihe, n’ihi na e wezụga enyemaka ha, ma eleghị anya, anyị agaraghị enwe ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye anyị. Anyị ga-achọ ka e jiri ego anyị tinyere n’akwụkwọ ozi a nye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’otu n’ime mba ndị na-abachaghị ọgaranya.”

“Enwetara m ihe nketa n’oge na-adịbeghị anya, ebe ọ bụkwa na ‘ihe ndị m chọrọ’ dị ole na ole, ‘mkpa m’ adịkwa ole na ole ọbụna karị, m ga-achọ ka unu jiri ego m tinyere n’akwụkwọ ozi a nye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ndị dị ezigbo mkpa n’ọtụtụ mba.”

ENYEMAKA N’OGE ỌDACHI

N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, ọdachi na-emekarị n’egbughị opi. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-etinyekwu ihe n’onyinye ndị ha na-enye ka e wee nwee ike inyere ụmụnna ha ndị nọ n’ebe ndị ọdachi mere aka. Ọ dị mma icheta na a na-esi n’onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ enyere ndị ọdachi metụtara aka. Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ ebe Ndịàmà Jehova nyewooro ndị ọdachi dakwasịrị aka:

• Africa

• Eshia

• Ógbè Caribbean

• Agwaetiti ndị dị na Pacific

“Mụ na di m chọrọ ikele nnọọ unu maka ihe ndị unu zitere iji nyere anyị aka n’ihi ihe ndị oké ifufe ahụ mebiri. O mere ka anyị nwee ike ikụchigharị elu ụlọ anyị. Obi dị anyị nnọọ ụtọ na unu gbataara anyị ọsọ enyemaka n’egbughị oge.”

“Aha m bụ Connor, adịkwa m afọ 11. Mgbe m hụrụ ihe merenụ mgbe idei mmiri rikpuru ebe ụfọdụ, o metụrụ m n’obi inye aka. Enwere m olileanya na nke a ga-enyere ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị aka.”

NDỊ OZI OGE NILE PỤRỤ ICHE

Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eje ozi oge nile n’ọrụ izisa ozi ọma ma ọ bụ n’ebe obibi Betel dị iche iche. A na-eji onyinye afọ ofufo akwado ụfọdụ ndị ọrụ afọ ofufo oge nile. Ha gụnyere ndị na-esonụ:

• Ndị ozi ala ọzọ: 2,635

• Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị: 5,325

• Ndị Betel: 20,092

“Ebe ọ bụ na m gaghị ejeli ozi na Betel ugbu a [nwata nwoke dị afọ ise], eji m ezigbo ịhụnanya na-ezitere unu onyinye a. Mgbe m toro, m ga-aga Betel gaa rụsie ọrụ ike.”

Ịkwado Nkụzi Bible

Jizọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha “mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ [ya].” (Matiu 28:19) Iji rubere okwu Jizọs isi, Ndịàmà Jehova ji ọrụ n’aka na-ekwusa ma na-akụzi ozi Bible na narị ala abụọ na iri atọ na ise. Ha na-ebipụta ma na-ekesa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na narị asụsụ anọ na iri na atọ.

N’ezie, onyinye kasị baa uru Onye Kraịst nwere ike inye iji nyekwuoro ọtụtụ mmadụ aka ịmụta ihe banyere Chineke na nzube Ya bụ oge ya. Ndịàmà Jehova enyewo oge na ume ha n’ụba iji nyere ndị agbata obi ha aka. Ha ejiriwokwa mmesapụ aka nye onyinye ego, onyinye ha nile kwa, n’agbanyeghị ụdị ọ bụ, enyewo aka mee ka a mara aha Jehova na nzube ya gburugburu ụwa. Ka Jehova nọgide na-agọzi mgbalị ndị a a na-eme iji nyere ndị ọzọ aka ịmụtakwu ihe banyere ya. (Ilu 19:17) Ịdị njikere otú ahụ inyere ndị ọzọ aka na-eme Jehova obi ụtọ!—Ndị Hibru 13:15, 16.

[Igbe dị na peeji nke 28-30]

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Na-ahọrọ Isi Na-enye Ihe

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ na-amawapụta, ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ e dere “Contributions for the Worldwide Work—Matthew 24:14” (“Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14”).

Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba ha. A pụkwara iziga onyinye ego afọ ofufo kpọmkwem n’alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. E kwesịrị ide akwụkwọ ndọrọ ego ka ha bụrụ ndị a ga-akwụnye “Watch Tower.” A pụkwara inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọta onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye kpam kpam, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze uru n’ụwa nile. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, ego a gbazinyere ụlọ akụ̀, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ bụrụ nke a ga-akwụnye Watch Tower mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ, n’ọnọdụ ebe onye nwe ụlọ ahụ ka bi na ya, site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-edenye ala na ụlọ ọ bụla n’aha ya. ▸

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: A pụrụ idenyere Watch Tower ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Watch Tower aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye.

Iji nwetakwuo ihe ọmụma, ị pụrụ ịkpọtụrụ Alaka Ụlọ Ọru Nigeria nke Ndịama Jehova, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telifon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba gị.

Jehovah’s Winesses

P.M.B. 1090,

Benin City 300001,

Edo State, Nigeria

Telifon: (234) 01-3204850–4

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 27]

Vidio Faithful: Stalin: Foto Ndị Agha U.S.