Ì Kweere n’Ezie na Ekwensu Dị Adị?
Ì Kweere n’Ezie na Ekwensu Dị Adị?
AKWỤKWỌ NSỌ na-akọwa Ekwensu dị ka onye dị adị. Ụmụ mmadụ apụghị ịhụ ya anya n’ihi otu ihe ahụ mere na ha apụghị ịhụ Chineke anya. Bible na-ekwu, sị: “Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) Ekwensu bụ mmụọ e kere eke. Ma, Onye Okike enweghị mmalite, Ekwensu nwere mmalite.
Jehova Chineke kere ọtụtụ ìgwè ndị mmụọ ogologo oge tupu ya ekee ụmụ mmadụ. (Job 38:4, 7) Na Bible, a na-akpọ ndị mmụọ a ndị mmụọ ozi. (Ndị Hibru 1:13, 14) Chineke kere ha nile dị ka ndị zuru okè—ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha bụ́ ekwensu ma ọ bụ nke nwere àgwà ọjọọ. Oleekwanụ otú e sizi bịa nwee Ekwensu? Okwu ahụ bụ́ “ekwensu” pụtara “onye nkwutọ,” n’ihi ya kwa, onye a na-akpọ ya bụ onye na-agha ajọ ụgha banyere ndị ọzọ. “Setan” pụtara “Onye Nguzogide,” ma ọ bụ onye mmegide. Dị nnọọ ka onye na-akwụwabu aka ọtọ pụrụ ime onwe ya onye ohi ma o zuo ohi, otu n’ime ụmụ Chineke bụ́ mmụọ zuru okè mezuru echiche na-ezighị ezi batara ya n’uche ma mee onwe ya Setan bụ́ Ekwensu. Bible si otú a kọwaa otú mmadụ si emebi onwe ya: “A na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà. Ọchịchọ ahụkwa, mgbe ọ tụrụwooro ime, na-amụpụta mmehie; mmehie, n’aka nke ya, mgbe e mechaworo ya, na-eweta ọnwụ.”—Jems 1:14, 15.
O doro anya na nke a bụ ihe merenụ. Mgbe Jehova Chineke kere mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, mmụọ ozi ahụ nke mesịrị nupụrụ Chineke isi tinyere uche ya na ya. Ọ maara na Jehova nyere Adam na Iv iwu ka ha mụjupụta ụwa ná ndị ezi omume, bụ́ ndị ga na-efe Onye Okike ha ofufe. (Jenesis 1:28) Mmụọ ozi a hụrụ na ya pụrụ ịghọ onye a na-akwanyere ùgwù na onye a ma ama. Anyaukwu kpaliri ya ịchọ inweta ihe dịịrị nanị Onye Okike—ofufe ụmụ mmadụ. Kama mmụọ ozi a ga-ewepụ ọchịchọ ọjọọ a n’obi ya, ọ nọgidere na-azụlite ya ruo mgbe ọ mụpụtara okwu ụgha, mesịzie mụpụtakwa nnupụisi. Tụlee ihe o mere.
Jenesis 3:1-5) O boro Chineke ebubo na ọ gwaghị Adam na Iv eziokwu. Ọ gwara Iv na ọ bụrụ na o rie mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, ọ ga-adị ka Chineke, nwee ikike nke ikpebi ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. Nke ahụ bụ ụgha mbụ a ghatụrụla. Ụgha ahụ mmụọ ozi ahụ ghara mere ya onye nkwutọ. Ọ ghọkwara onye na-emegide Chineke. Ọ bụ ya mere Bible ji kpọọ onye iro a nke Chineke “agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.”—Mkpughe 12:9.
Mmụọ ozi ahụ na-enupụ isi ji agwọ gwa nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Iv, okwu. Agwọ ahụ jụrụ Iv, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” Mgbe Iv kwughachiri ihe Chineke nyere ha n’iwu na ihe ga-esi na ya apụta ma ọ bụrụ na ha enupụ isi, agwọ ahụ kwuru, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere [n’osisi ahụ nke dị n’etiti ubi ahụ a gbara ogige], mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (“Na-echenụ Nche”
Ụgha ahụ Ekwensu ghaara Iv rụzuru nnọọ ihe o bu n’uche ghaa ya. Bible na-ekwu, sị: “Nwanyị wee hụ na osisi ahụ dị mma ihe oriri, na ọ bụkwa ihe na-agụ anya agụụ ile, na ihe a na-achọsi ike ka osisi ahụ bụkwa ime ka mmadụ nwee uche, o were ụfọdụ n’ime mkpụrụ ya, rie; o nyekwa di ya, tinyere onwe ya, o wee rie.” (Jenesis 3:6) Iv kweere ihe Setan kwuru ma nupụrụ Chineke isi. O nwetakwara Adam iso ya mebie iwu Chineke. Ekwensu si otú a nwee ike ime ka mmadụ abụọ mbụ ahụ nupụwere Chineke isi. Kemgbe ahụ, Setan anọwo na-achịkwa ihe ụmụ mmadụ na-eme n’ụzọ a na-adịghị ahụ anya. Gịnị bụ nzube ya? Ọ bụ ime ka ụmụ mmadụ kwụsị ife ezi Chineke ahụ ma fewe ya onwe ya. (Matiu 4:8, 9) N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji adọ anyị aka ná ntị, sị: “Nọgidenụ na-enwe uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.”—1 Pita 5:8.
Lee nnọọ otú Bible si gosi n’ụzọ doro anya na Ekwensu bụ onye dị adị—mmụọ ozi nke ghọrọ mmụọ ọjọọ na onye obi fere azụ! Ihe mbụ dị anyị mkpa iji bụrụ ndị na-eche nche bụ ịmata na ọ bụ nnọọ onye dị adị. Ma ọ dị ihe ọzọ dị anyị mkpa iji bụrụ ndị nwere uche ziri ezi na ndị na-eche nche. Ọ dịkwa anyị mkpa ịma “atụmatụ” Setan na ụzọ ndị o si eduhie ndị mmadụ. (2 Ndị Kọrint 2:11) Olee ihe ndị bụ́ atụmatụ ya? Oleekwa otú anyị pụrụ isi guzogidesie ha ike?
Ekwensu Na-eji Mkpa Ụmụ Mmadụ Bu Pụta Ụwa Eme Ihe
Ekwensu anọwo na-ekiri ụmụ mmadụ kemgbe e kere ha. Ọ maara ụmụ mmadụ nke ọma—mkpa ha, ihe ndị na-amasị ha, na ọchịchọ ha. Setan maara nke ọma na e kenyere ọchịchọ ife ofufe n’ime ụmụ mmadụ, Ekwensu ejirikwala aghụghọ jiri ọchịchọ a mee ihe. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’izi ụmụ mmadụ ozizi ụgha n’aha okpukpe. (Jọn 8:44) Ọtụtụ ihe ndị okpukpe na-akụzi banyere Chineke na-emegide onwe ha ma na-agbagwoju anya. Ònye ka i chere nke a na-emezu nzube ya? Ozizi abụọ na-emegide ibe ha enweghị ike ịbụcha eziokwu. Ebe ọ dị otú ahụ, ó nweghị ike ịbụ na ọ bụ Setan wepụtara ozizi ụfọdụ ndị okpukpe na-ezi iji nnọọ duhie ndị mmadụ? N’ezie, Bible na-akpọ ya “chi nke usoro ihe a,” onye meworo ka uche ndị mmadụ kpuo ìsì.—2 Ndị Kọrint 4:4.
Eziokwu sitere n’aka Chineke na-eme ka okpukpe ghara ịghọgbu mmadụ. Bible ji eziokwu nke Okwu Chineke tụnyere ihe onye agha oge ochie na-eke iji chebe úkwù ya. (Ndị ) Ọ bụrụ na i nweta ihe ọmụma Bible ma na-ebi ndụ kwekọrọ na ya, ka à ga-asị na i ji ya kee onwe gị ekike, Okwu Chineke ga-echebe gị, mee ka a ghara iji ozizi ụgha ndị a na-ezi n’okpukpe na mmehie ndị a na-eme na ha duhie gị. Efesọs 6:14
Ọchịchọ ụmụ mmadụ nwere ife ofufe emewo ka ha chọọ ịmata ihe ndị ha na-amabughị. Nke a emewo ka ọ dịrị Setan mfe iji ụzọ aghụghọ ya ọzọ enweta ha. Setan anọwo na-eji mgbaasị achịkwa ọtụtụ ndị n’ihi na ọ maara na ụmụ mmadụ na-enwe mmasị ịmata ihe ọhụrụ na ihe dị omimi. Dị ka osi ọnyà si eji ihe ụrà enweta anụ ọ na-achọ ịmata n’ọnyà, Setan na-eji ihe ndị dị ka ịkọ ọdịnihu, ịgụ kpakpando, ịkọ ọgwụ, amoosu, ịgụ akara aka, na ime majik arata ọtụtụ mmadụ gburugburu ụwa ma na-amata ha n’ọnyà.—Levitikọs 19:31; Abụ Ọma 119:110.
Olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị ka a ghara iji mgbaasị mata gị n’ọnyà? Deuterọnọmi 18:10-12 na-ekwu, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị onye na-eme ka nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị gabiga n’ime ọkụ, ma ọ bụ onye na-ajụ ase, ma ọ bụ onye na-eji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ma ọ bụ onye na-agba afa, ma ọ bụ onye mgbaasị, ma ọ bụ dibịa nrafu, ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe, ma ọ bụ dibịa afa, ma ọ bụ onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe. N’ihi na ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ: ọ bụkwa n’ihi ihe arụ ndị a ka Jehova, bụ́ Chineke gị, na-anapụ ha ala ha n’ihu gị.”
Ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ahụ doro anya: Zere mgbaasị kpamkpam. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị na-emebu mgbaasị ma chọzie ịkwụsị ya? Ị pụrụ ịgbaso ihe nlereanya nke Ndị Kraịst oge mbụ bi n’obodo Efesọs. Bible kwuru na mgbe ha nabatara ‘okwu Jehova, ọnụ ọgụgụ dịtụ ukwuu nke ndị na-eme majik chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ nile.’ Akwụkwọ ndị ahụ dị oké ọnụ. Ọnụ ego ha bụ puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise. (Ọrụ 19:19, 20) N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst bi n’Efesọs eleghị anya n’azụ n’ibibi ha.
Setan Na-eji Adịghị Ike Ụmụ Mmadụ Eme Ihe
Otu mmụọ ozi nke zuru okè ghọrọ Setan bụ́ Ekwensu n’ihi na o mezuru ọchịchọ ya nke ibuli onwe ya elu. Ọ kpalikwara Iv ịdị mpako nke mere ka ọ chọọ ịdị ka Chineke. Taa, Setan na-anọgide na-achịkwa ụfọdụ ndị site n’ịkpali ha ịdị mpako. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-eche na agbụrụ ha ma ọ bụ mba ha ka nke ndị ọzọ mma. Lee ka nke a si dị iche n’ihe Bible na-akụzi! (Ọrụ 10:34, 35) Bible kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “[Chineke] sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ.”—Ọrụ 17:26.
Ihe dị irè nke ga-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa Setan na-anwa anyị ịdị mpako bụ ịdị umeala n’obi. Bible na-adụ anyị ọdụ ka anyị “ghara iche banyere [onwe anyị] karịa ka ọ dị mkpa iche.” (Ndị Rom 12:3) Ọ na-ekwu, sị: “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.” (Jems 4:6) Otu ụzọ dị irè isi guzogide mgbalị ndị Setan na-eme bụ igosipụta umeala n’obi na àgwà ndị ọzọ Chineke kwadoro ná ndụ gị.
Ekwensu dịkwa nnọọ njikere iji adịghị ike ụmụ mmadụ nwere bụ́ imezu ọchịchọ ndị na-ezighị ezi nke anụ ahụ́ eme ihe. Jehova Chineke zubere ka ụmụ mmadụ bie ndụ obi ụtọ. Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ emezuo ọchịchọ ha n’ụzọ na-emegideghị uche Chineke, ọ na-eme ka ha nwee ezi obi ụtọ. Ma Setan na-anwa ụmụ mmadụ ọnwụnwa imezu ọchịchọ ha n’ụzọ ndị rụrụ arụ. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ ka nnọọ mma ịnọgide na-eche banyere ihe ndị dị ọcha na omume ọma. (Ndị Filipaị 4:8) Nke a ga-enyere gị aka ịchịkwa nnọọ echiche gị na mmetụta gị.
Nọgide Na-eguzogide Ekwensu
Ị̀ ga-eguzogideli Ekwensu? Ee, ị ga-emeli ya. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jems 4:7) Ya bụrụgodị na i guzogide Setan, ọ gaghị ahapụ gị ozugbo ma kwụsị inye gị nsogbu ka ị na-anara ihe ọmụma Chineke. Ee e, Ekwensu ga-anwa gị ọzọ ‘n’oge ọzọ ga-adaba adaba.’ (Luk 4:13) N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịghị ịtụ Ekwensu egwu. Ọ bụrụ na ị nọgide na-eguzogide ya, ọ gaghị emeli ka ị gbakụta ezi Chineke azụ.
Otú ọ dị, iji guzogide Ekwensu, ọ dị gị mkpa ịmata onye ọ bụ, otú o si eduhie ndị mmadụ nakwa ihe ndị ị pụrụ ime iji chebe onwe gị pụọ n’atụmatụ ya. E nwere nanị otu ebe ziri ezi a pụrụ isi nweta ihe ọmụma ahụ—Okwu Chineke, bụ́ Bible. N’ihi ya, kpebisie ike ịmụ Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee ma na-etinye ihe ndị ị na-amụta na ya n’ọrụ ná ndụ gị. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka site n’iduziri gị ọmụmụ ihe dị otú ahụ n’oge ga-adị gị mma n’anaghị gị ego. Biko alala azụ ịkpọtụrụ ha ma ọ bụ idetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.
Ka ị na-amụ Bible, ọ dị mkpa ka ị ghọta na Setan nwere ike iji mmegide ma ọ bụ mkpagbu mee ka ị kwụsị ịmụ eziokwu nke Okwu Chineke. Ụfọdụ ndị ị hụrụ n’anya nwere ike iwesawara gị iwe n’ihi na ị na-amụ Bible. Ha nwere ike ime otú ahụ n’ihi na ha amaghị eziokwu ndị magburu onwe ha dị n’ime ya. Ndị ọzọ nwere ike iji gị mee ihe ọchị. Ma ịkwụsị n’ihi nsogbu ndị dị otú ahụ ọ̀ ga-eme Chineke obi ụtọ? Ekwensu chọrọ ịkụda gị obi ka i wee kwụsị ịmụ banyere ezi Chineke. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwe ka Ekwensu merie gị? (Matiu 10:34-39) I jighị ya ụgwọ. Ọ bụ Jehova nyere gị ndụ. Ya mere, kpebisie ike iguzogide Ekwensu ma ‘mee ka obi Jehova ṅụrịa.’—Ilu 27:11.
[Foto dị na peeji nke 6]
Ndị ghọrọ Ndị Kraịst kpọrọ akwụkwọ mgbaasị ha ọkụ
[Foto dị na peeji nke 7]
Kpebisie ike ịmụ Bible