Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ụzọ Nile nke Jehova Ziri Ezi”

“Ụzọ Nile nke Jehova Ziri Ezi”

“Ụzọ Nile nke Jehova Ziri Ezi”

“Ụzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndị ezi omume ga-ejekwa ije n’ime ha; ma ndị njehie ga-asụ ngọngọ n’ime ha.”—HOSEA 14:9.

1, 2. Olee ụdị mmalite Jehova nyere ụmụ Izrel, ma gịnị ka ha meziri?

JEHOVA mere ka ụmụ Izrel malite dị ka ndị ezi omume n’oge onye amụma bụ́ Mozis. Otú ọ dị, ka ọ na-erule ná mmalite narị afọ nke asatọ T.O.A., ọnọdụ ha adịla nnọọ njọ nke na Chineke mara ha ikpe dị ka ndị na-eme omume dị oké njọ. Hosea isi 10 ruo 14 na-eme ka nke a pụta ìhè.

2 Obi ụmụ Izrel jupụtara n’omume ihu abụọ. Alaeze ebo iri “arụwo mmebi iwu dị ka ihe ubi” ma ghọrọ ajọ omume. (Hosea 10:1, 13) Jehova kwuru, sị: “Mgbe Izrel bụ nwata, ahụrụ m ya n’anya, ọ bụkwa site n’Ijipt ka M kpọpụtara nwa m.” (Hosea 11:1) Ọ bụ ezie na Chineke napụtara ụmụ Izrel n’agbụ Ijipt, ha jiri ụgha na aghụghọ kwụọ ya ụgwọ. (Hosea 11:12) N’ihi ya, Jehova dụziri ha ọdụ, sị: “N’ime Chineke gị ka ị ga-alọta: debe ebere na ikpe ziri ezi.”—Hosea 12:6.

3. Gịnị ga-eme Sameria na-enupụ isi, ma olee ihe ụmụ Izrel pụrụ ime ka e wee meere ha ebere?

3 A ga-ebibi Sameria na-enupụ isi na eze ya. (Hosea 13:11, 16) Ma isiakwụkwọ ikpeazụ nke amụma Hosea ji arịrịọ a malite: “Izrel, laghachikwute Jehova, bụ́ Chineke gị.” Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ga-arịọ mgbaghara, Chineke ga-emere ha ebere. N’ezie, ha ga-amata na “ụzọ nile nke Jehova ziri ezi,” ma jee ije na ha.—Hosea 14:1-6, 9.

4. Olee ụkpụrụ ndị anyị ga-atụle n’amụma Hosea?

4 N’akụkụ a nke amụma Hosea, e nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị pụrụ inyere anyị aka iso Chineke na-eje ije. Ka anyị tụlee ụkpụrụ ndị ahụ: (1) Jehova na-atụ anya ka anyị ghara iji ihu abụọ na-efe ya, (2) Chineke nwere ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe n’ebe ndị ohu ya nọ, (3) anyị kwesịrị ịdị na-ele anya Jehova mgbe nile, (4) ụzọ Jehova na-ezi ezi mgbe nile, na (5) ndị mmehie pụrụ ịlaghachikwute Jehova.

Jehova Na-atụ Anya Ka Anyị Ghara Iji Ihu Abụọ Na-efe Ya

5. Olee ụdị ozi Chineke na-atụ anya ka anyị na-ejere ya?

5 Jehova na-atụ anya ka anyị na-ejere ya ozi dị nsọ n’ụzọ dị ọcha, n’ejighị ihu abụọ. Otú ọ dị, Izrel aghọọla “osisi vaịn nke na-ekosa ekosa” nke na-adịghị amị mkpụrụ. Izrel emeela ‘ka ebe ịchụàjà baa ụba’ maka ofufe ụgha. Ndị a si n’ezi ofufe dapụ ewuola ogidi—ikekwe, ihe ncheta e wuru iji na-efe ofufe na-adịghị ọcha. Jehova ga-ebibi ebe ịchụàjà na ogidi ndị dị otú ahụ.—Hosea 10:1, 2.

6. Iji soro Chineke na-eje ije, olee àgwà anyị kwesịrị izere?

6 A dịghị anabata omume ihu abụọ n’etiti ndị ohu Jehova. Ma gịnị ka ụmụ Izrel mere? Leenụ, ‘ha ekesawo obi ha’! Ọ bụ ezie na ha na Jehova agbaala ndụ dị ka ndị raara onwe ha nye ya, o kwuru na ikpe omume ihu abụọ mara ha. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na nke a? Anyị ekwesịghị ịbụ ndị ihu abụọ ma ọ bụrụ na anyị ararawo onwe anyị nye Chineke. Ilu 3:32 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye sihiere esihie bụ: ma n’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Ya dị.” Iji soro Chineke na-eje ije, anyị aghaghị ịdị na-egosipụta ịhụnanya “site n’obi dị ọcha na site n’ezi akọ na uche na site n’okwukwe na-enweghị ihu abụọ.”—1 Timoti 1:5.

Chineke Nwere Ịhụnanya Na-eguzosi Ike n’Ihe n’Ebe Ndị Ohu Ya Nọ

7, 8. (a) Olee ihe ndị ga-eme ka Chineke jiri ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe na-emeso anyị ihe? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị mere mmehie dị oké njọ?

7 Ọ bụrụ na anyị efee Jehova n’ejighị ihu abụọ na n’ụzọ ziri ezi, anyị ga-enweta ebere, ma ọ bụ ịhụnanya ya na-eguzosi ike n’ihe. A gwara ụmụ Izrel na-enupụ isi, sị: “Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume, weenụ ihe ubi dị ka ebere si dị; rụchaaranụ onwe unu ubi: n’ihi na ọ bụ mgbe ịchọ Jehova, ruo mgbe Ọ ga-abịa, zokwasị unu ezi omume dị ka mmiri.”—Hosea 10:12.

8 A sị nnọọ na ụmụ Izrel ga-echegharị ma chọọ Jehova! Mgbe ahụ, ọ ga-eji obi ụtọ ‘zokwasị ha ezi omume dị ka mmiri.’ Ọ bụrụ na anyị emeela mmehie dị oké njọ, ka anyị chọọ Jehova, rịọ ya mgbaghara ma chọọ enyemaka ime mmụọ site n’aka ndị okenye ọgbakọ. (Jems 5:13-16) Ka anyị chọọkwa nduzi nke mmụọ nsọ Chineke, n’ihi na “onye na-agha mkpụrụ maka abamuru nke anụ ahụ́ ya ga-aghọrọ ire ure site n’anụ ahụ́ ya, ma onye na-agha mkpụrụ maka abamuru nke mmụọ nsọ ga-aghọrọ ndụ ebighị ebi site na mmụọ nsọ.” (Ndị Galeshia 6:8) Ọ bụrụ na anyị ‘aghaa mkpụrụ maka abamuru nke mmụọ nsọ,’ Chineke ga-anọgide jiri ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe na-emeso anyị ihe.

9, 10. Olee otú Hosea 11:1-4 si metụta Izrel?

9 Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova na-eji ịhụnanya emeso ndị ya ihe mgbe nile. A na-ahụ ihe àmà nke a na Hosea 11:1-4, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Mgbe Izrel bụ nwata, ahụrụ m ya n’anya, ọ bụkwa site n’Ijipt ka M kpọpụtara nwa m. . . . Bealim ka ha chụụrụ àjà, sureere arụsị dị iche iche a pịrị apị ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Ma Mụ onwe m na-ezi Ifrem [ụmụ Izrel] ije ije; O kuuru ha n’ogwe aka Ya abụọ; ma ha amataghị na emere m ka ahụ́ dị ha mma. Achịịrị m ụdọ mmadụ, bụ́ ihe nhiegide ịhụnanya, adọ ha; M wee dịrị ha dị ka ndị na-ebuli yok n’elu agba ha, ana m esetịkwa aka m mee ka ha rie ihe.”

10 N’ebe a, e ji Izrel tụnyere obere nwa. Jehova ji ịhụnanya kụziere ụmụ Izrel ije ije, na-ekuru ha n’ogwe aka ya. Ọ nọgidekwara jiri “ihe nhiegide ịhụnanya” na-adọ ha. Lee ihe atụ na-emetụ n’ahụ́ nke ahụ bụ! Were ya na ị bụ nne ma ọ bụ nna nke nọ na-enyere obere nwa gị aka ịzọpụ ije. Ị matịala aka gị abụọ. Ị pụrụ ịtụpụrụ obere nwa gị ahụ eriri ọ ga-ejide aka ka o wee ghara ịda. N’otu aka ahụ, ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ị nọ dị nro otú ahụ. Ọ na-enwe obi ụtọ iji “ihe nhiegide ịhụnanya” na-edu gị.

11. Olee otú Chineke si ‘dịrị ka ndị na-ebuli yok n’elu’?

11 Mgbe ọ na-emeso ụmụ Izrel ihe, Jehova “dịrị ha dị ka ndị na-ebuli yok n’elu agba ha, [ọ na-esetịkwa aka ya] mee ka ha rie ihe.” Chineke mere ihe dị ka onye bupụrụ yok gaa n’ebe dị anya ka o wee dịrị ụmụ anụmanụ mfe iri nri. Ọ bụ nanị mgbe ndị Izrel gbubiri yok na-egosi na ha nọ n’okpuru Jehova ka ha bịara nọrọ n’okpuru yok dị arọ nke ndị iro ha. (Deuterọnọmi 28:45, 48; Jeremaịa 28:14) Ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-adaba n’aka onye iro ukwu anyị, bụ́ Setan, ma nweta ihe mgbu nke yok ya dị arọ. Kama nke ahụ, ka anyị nọgide jiri iguzosi ike n’ihe soro Chineke anyị na-ahụ n’anya na-eje ije.

Na-ele Anya Jehova Mgbe Nile

12. Dị ka Hosea 12:6 si kwuo, gịnị ka a chọrọ n’aka anyị iji nọgide soro Chineke na-eje ije?

12 Iji nọgide soro Chineke na-eje ije, anyị aghaghị ịdị na-ele anya ya mgbe nile. A gwara ụmụ Izrel, sị: “Ma gị onwe gị, n’ime Chineke gị ka ị ga-alọta: debe ebere na ikpe ziri ezi, leekwa anya Chineke gị mgbe dum.” (Hosea 12:6) Ụmụ Izrel pụrụ inye ihe àmà na-egosi na ha echegharịwo ma laghachikwute Jehova site n’igosipụta ebere, site n’ikpe ikpe ziri ezi, nakwa site ‘n’ile anya Chineke mgbe dum.’ N’agbanyeghị ogologo oge anyị sorola Chineke jee ije, anyị aghaghị ikpebisi ike ịdị na-egosipụta ebere, ikpe ikpe ziri ezi, na ịdị na-ele anya Chineke mgbe dum.—Abụ Ọma 27:14.

13, 14. Olee otú Pọl si jiri ihe dị na Hosea 13:14 mee ihe, oleekwa ihe nke ahụ na-agwa anyị mere anyị ga-eji na-ele anya Jehova?

13 Amụma Hosea buru banyere ụmụ Izrel na-eme ka anyị nwee ihe pụrụ iche mere anyị ga-eji na-ele anya Chineke. Jehova kwuru, sị: “N’aka [“Shiol,” NW] ka M ga-esi gbapụta ha; n’aka ọnwụ ka M ga-eme ka ha si pụọ nwere onwe ha: olee ebe ajọ ọrịa gị nile nke na-efe efe dị, gị ọnwụ? olee ebe mbipụ gị dị, gị [“Shiol”]?” (Hosea 13:14) Jehova agaghị anapụta ụmụ Izrel n’aka ọnwụ nkịtị n’oge ahụ, kama ọ ga-emesị loda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi ma mee ka mmeri ya ghara ịdị irè.

14 Mgbe ọ na-agwa Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ okwu, Pọl hotara ihe e kwuru n’amụma Hosea ma dee, sị: “Mgbe ihe a nke pụrụ ire ure yikwasịrị ereghị ure, ihe a nke pụrụ ịnwụ anwụ eyikwasịkwa anwụghị anwụ, mgbe ahụ okwu ahụ ga-emezu bụ́ nke e dere, sị: ‘E lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.’ ‘Ọnwụ, olee mmeri gị? Ọnwụ, olee ihe ọgbụgba gị?’ Ihe ọgbụgba nke na-akpata ọnwụ bụ mmehie, ma ike mmehie bụ Iwu ahụ. Ma ekele dịrị Chineke, n’ihi na ọ na-enye anyị mmeri site n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst!” (1 Ndị Kọrint 15:54-57) Jehova si n’ọnwụ kpọlie Jizọs, na-eme ka e nwee ihe mere a ga-eji kwere na a ga-akpọlite ndị nọ ná ncheta Chineke. (Jọn 5:28, 29) Lee nnọọ otú nke a si bụrụ ihe na-enye obi ụtọ mere a ga-eji na-ele anya Jehova! Ma, ọ dị ihe ọzọ ya na olileanya mbilite n’ọnwụ na-akpali anyị iso Chineke na-eje ije.

Ụzọ Jehova Na-ezi Ezi Mgbe Nile

15, 16. Gịnị ka e buru n’amụma banyere Sameria, oleekwa otú e si mezuo amụma ahụ?

15 Nkwenye anyị kwenyere na “ụzọ nile nke Jehova ziri ezi” na-enyere anyị aka ịnọgide soro Chineke na-eje ije. Ndị bi na Sameria ejeghị ije n’ụzọ ezi omume nke Chineke. N’ihi ya, ha ga-ata ahụhụ n’ihi omume ọjọọ ha na okwukwe ha na-enweghị n’ebe Jehova nọ. E buru nke ahụ n’amụma, sị: “Sameria ga-ahụ ahụhụ ikpe ọmụma ya; n’ihi na o nupụwo isi n’okpuru Chineke ya: site ná mma agha ka ha ga-ada; a ga-atụpịa ụmụntakịrị ha, a ga-agbawakwa ndị inyom ha dị ime afọ.” (Hosea 13:16) Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ndị Asiria, bụ́ ndị meriri Sameria, pụrụ ịkpa ụdị arụ dị otú ahụ.

16 Sameria bụ isi obodo alaeze ebo iri nke Izrel. Ma n’ebe a, aha ahụ bụ́ Sameria pụrụ ịnọchi anya ókèala nile nke alaeze ahụ. (1 Ndị Eze 21:1) Eze Shalmanesa nke Ise nke Asiria nọchibidoro obodo Sameria na 742 T.O.A. Mgbe e mesịziri bibie Sameria na 740 T.O.A., a dọọrọ ọtụtụ n’ime ndị a ma ama bi na ya n’agha gaa Mesopotemia na Midia. A matabeghị ma ọ bụ Shalmanesa nke Ise ka ọ̀ bụ onye nọchiri ya bụ́ Sagọn nke Abụọ meriri Sameria. (2 Ndị Eze 17:1-6, 22, 23; 18:9-12) Ka o sina dị, ihe ndekọ banyere Sagọn kwuru banyere nchụga a chụgara ụmụ Izrel dị puku iri abụọ na asaa na narị abụọ na iri itoolu n’ógbè ndị dị n’Ebe Ugwu Yufretis na Midia.

17. Kama ịdị na-elelị ụkpụrụ Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

17 Ndị bi na Sameria tara nnukwu ahụhụ n’ihi na ha jụrụ ime ihe kwekọrọ n’ụzọ ezi omume Jehova. Dị ka Ndị Kraịst raara onwe ha nye, anyị onwe anyị ga-atakwa nnukwu ahụhụ ma ọ bụrụ na anyị aghọọ ndị e ji ime mmehie mara, na ndị na-elelị ụkpụrụ ezi omume Chineke. Ya adịla mgbe anyị ga-agbaso ụzọ ọjọọ dị otú ahụ! Kama nke ahụ, ka onye ọ bụla n’ime anyị mee ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pita onyeozi, nke bụ́: “Ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịta ahụhụ dị ka onye na-egbu ọchụ ma ọ bụ onye ohi ma ọ bụ onye ajọ omume ma ọ bụ dị ka onye na-enyonye anya n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ. Ma ọ bụrụ na ọ na-ata ahụhụ dị ka Onye Kraịst, ka ihere ghara ime ya, kama ka ọ nọgide na-enye Chineke otuto n’aha nke a.”—1 Pita 4:15, 16.

18. Olee otú anyị pụrụ isi ‘nọgide na-enye Chineke otuto’?

18 Anyị ‘na-anọgide na-enye Chineke otuto’ site n’ịdị na-eje ije n’ụzọ ya ziri ezi kama ịdị na-eme ihe otú o si masị anyị. Ken gburu ọchụ n’ihi na o mere ihe otú o si masị ya ma ghara ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jehova nyere ya na ọ ga-adaba ná mmehie. (Jenesis 4:1-8) Belam naara ụgwọ eze Moab kwụrụ ya iji kọchaa Izrel ma mgbalị ya ime otú ahụ kụrụ afọ n’ala. (Ọnụ Ọgụgụ 24:10) Chineke gbukwara Kora bụ́ onye Livaị na ndị ọzọ n’ihi inupụ isi megide ịchịisi Mozis na Erọn. (Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3, 31-33) N’ezie, anyị ekwesịghị ‘ije ije n’ụzọ igbu ọchụ nke Ken,’ iji ọsọ gbaga “n’ụzọ na-ezighị ezi nke Belam,” ma ọ bụ ịla “n’iyi n’okwu nnupụisi nke Kora!” (Jud 11) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị emehie, amụma Hosea na-akasi anyị obi.

Ndị Mmehie Pụrụ Ịlaghachikwute Jehova

19, 20. Olee àjà ụmụ Izrel chegharịrịnụ nwere ike ịchụ?

19 Ọbụna ndị dapụworonụ site n’ime mmehie dị oké njọ pụrụ ịlaghachikwute Jehova. Na Hosea 14:1, 2, anyị na-ahụ arịrịọ a: “Izrel, laghachikwute Jehova, bụ́ Chineke gị; n’ihi na ị sụwo ngọngọ site n’ajọ omume gị. Chịrịnụ okwu n’aka unu laghachikwute Jehova: sịnụ Ya, Bupụ ajọ omume nile anyị, nara ezi ihe: anyị ewee kwụghachi egbugbere ọnụ anyị, dị ka oké ehi.”

20 Ụmụ Izrel chegharịrịnụ nwere ike ịchụrụ Chineke àjà ‘egbugbere ọnụ ha, dị ka oké ehi.’ Ha bụ àjà otuto ndị e ji obi eziokwu chụọ. Pọl zoro aka n’amụma a mgbe ọ gbara Ndị Kraịst ume ‘ịchụrụ Chineke àjà otuto mgbe nile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.’ (Ndị Hibru 13:15) Lee ihe ùgwù ọ bụ iso Chineke na-eje ije na ịchụ àjà ndị dị otú ahụ taa!

21, 22. Olee otú a ga-esi weghachi ụmụ Izrel ahụ chegharịrị echegharị?

21 Ụmụ Izrel bụ́ ndị hapụrụ ụzọ nnupụisi ha ma chigharịkwute Chineke chụụrụ ya àjà ‘egbugbere ọnụ ha, dị ka oké ehi.’ E weghachiziri ha n’ụzọ ime mmụọ dị nnọọ ka Chineke kwere ha ná nkwa. Hosea 14:4-7 na-ekwu, sị: “M [Jehova] ga-agwọ ndaghachi azụ ha, M ga-ahụ ha n’anya n’afọ ofufo: n’ihi na iwe m esiwo n’ahụ́ ya chigharịa. M ga-adịrị Izrel dị ka igirigi, ọ ga-ama ifuru dị ka urodi, gbasaa mkpọrọgwụ ya nile dị ka Lebanọn. Ome ya nile ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, ísì ọma ọ na-esi ga-adị ka Lebanọn. Ndị bi n’okpuru ndò ya ga-alọta, mee ka ọka dị ndụ, ha ga-ama ifuru dị ka osisi vaịn: ihe ncheta ya ga-adị ka mmanya vaịn nke Lebanọn.”

22 A ga-agwọ ụmụ Izrel nwere nchegharị n’ụzọ ime mmụọ, Chineke ga-amaliteghachi ịhụ ha n’anya. Jehova ga-aghọrọ ha igirigi na-enye ume ọhụrụ n’echiche nke bụ́ na ọ ga-agọzi ha n’ụba. Ndị ya e weghachiri eweghachi ‘ga-ama mma dị ka osisi oliv,’ ha ga-ejekwa ije n’ụzọ Chineke. Ebe ọ bụ na anyị onwe anyị kpebisiri ike iso Jehova Chineke na-eje ije, gịnị ka a na-achọ anyị n’aka?

Nọgide Na-eje Ije n’Ụzọ Ziri Ezi nke Jehova

23, 24. Olee amụma na-agba ume akwụkwọ Hosea jiri mechie, oleekwa otú o si emetụta anyị?

23 Ọ bụrụ na anyị ga-anọgide soro Chineke na-eje ije, anyị aghaghị ịdị na-eji “amamihe nke sitere n’elu” na-eme ihe ma na-eme ihe kwekọrọ n’ụzọ ezi omume ya mgbe nile. (Jems 3:17, 18) Amaokwu ikpeazụ nke amụma Hosea na-agụ, sị: “Ònye bụ onye amamihe? ọ ga-aghọtakwa ihe ndị a; ònye bụ onye nghọta? ọ ga-amakwa ha. N’ihi na ụzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndị ezi omume ga-ejekwa ije n’ime ha; ma ndị njehie ga-asụ ngọngọ n’ime ha.”—Hosea 14:9.

24 Kama ịbụ ndị amamihe na ụkpụrụ dị iche iche nke ụwa a na-eduzi, ka anyị kpebisie ike ịdị na-eje ije n’ụzọ nile ziri ezi nke Chineke. (Deuterọnọmi 32:4) Hosea mere otú ahụ ruo afọ 59 ma ọ bụ karịa. O ji ikwesị ntụkwasị obi kpọsaa ozi Chineke n’ihi na ọ maara na ndị maara ihe na ndị nwere uche ga-aghọta okwu ndị dị otú ahụ. Gịnị banyere anyị? Ruo ogologo oge Jehova kwere ka anyị na-agba àmà, anyị ga-anọgide na-achọ ndị ga-eji amamihe nabata obiọma ya na-erughịrị mmadụ. Anyị nwekwara obi ụtọ ime nke a iji kwado “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” n’ụzọ zuru ezu.—Matiu 24:45-47.

25. Gịnị ka ntụle anyị tụlere amụma Hosea kwesịrị inyere anyị aka ime?

25 Ntụle anyị tụlere amụma Hosea kwesịrị inyere anyị aka ịnọgide soro Chineke na-eje ije n’olileanya nke inweta ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ya o kwere ná nkwa. (2 Pita 3:13; Jud 20, 21) Lee olileanya magburu onwe ya nke ahụ bụ! Olileanya ahụ ga-emezuru anyị ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-egosi site n’okwu na omume na anyị na-ekwupụta otú ọ dị anyị n’obi mgbe anyị na-asị: “Ụzọ nile nke Jehova ziri ezi.”

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ọ bụrụ na anyị efee Chineke ofufe dị ọcha, olee otú ọ ga-esi mesoo anyị?

• Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ele anya Jehova mgbe nile?

• Olee ihe mere i ji kweta na ụzọ nile nke Jehova ziri ezi?

• Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-eje ije n’ụzọ ezi omume nile nke Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 28]

Nakwere enyemaka ime mmụọ nke ndị okenye ọgbakọ na-enye

[Foto dị na peeji nke 29]

Amụma Hosea na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya ná nkwa Jehova kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Nọgide soro Chineke na-eje ije n’olileanya nke inweta ndụ ebighị ebi