Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amụma Hosea Na-enyere Anyị Aka Iso Chineke Na-eje Ije

Amụma Hosea Na-enyere Anyị Aka Iso Chineke Na-eje Ije

Amụma Hosea Na-enyere Anyị Aka Iso Chineke Na-eje Ije

“Jehova ka ha ga-ejeso.”—HOSEA 11:10.

1. Olee ihe nkiri ihe atụ dị n’akwụkwọ Hosea?

Ọ̀ NA-AMASỊ gị ikiri ihe nkiri nke ndị na-eme ya ma nke a na-akọ na nke akụkọ ya na-adọrọ mmasị? Akwụkwọ Bible bụ́ Hosea nwere ihe nkiri ihe atụ. * Ihe nkiri ahụ na-egosi ihe mere n’ezinụlọ onye amụma Chineke bụ́ Hosea, ya na alụmdi na nwunye ihe atụ dị n’etiti Jehova na mba Izrel site n’ọgbụgba ndụ Iwu Mozis nwekwara njikọ.

2. Gịnị ka a maara banyere Hosea?

2 A kọrọ otú ihe nkiri a si mee na Hosea isi 1. O yiri ka Hosea ò biri n’alaeze ebo iri nke Izrel (nke a na-akpọkwa Ifrem, nke bụ́ aha ebo kasị ukwuu na ya). O buru amụma n’oge ọchịchị nke ndị eze asaa ikpeazụ nke Izrel na n’oge Eze Ụzaịa, Eze Jotam, Eze Ehaz na Eze Hezekaịa chịrị Juda. (Hosea 1:1) Nke bụ́ na Hosea buru amụma ruo ihe dị ka afọ 59 ma ọ dịkarịa ala. Ọ bụ ezie na e desịrị akwụkwọ ahụ bu aha ya obere oge ka afọ 745 T.O.A. gasịrị, ọ ka bara uru taa, bụ́ mgbe ọtụtụ nde mmadụ na-ebi ụdị ndụ ahụ e buru amụma ya, sị: “Jehova ka ha ga-ejeso.”—Hosea 11:10.

Ihe Ịtụle Isi Ihe Ndị Dị n’Ime Ya Na-ekpughe

3, 4. Kọwaa ihe dị na Hosea isi 1 ruo 5 ná mkpirikpi.

3 Iji obere oge tụlee isi ihe ndị dị n’akwụkwọ Hosea isi 1 ruo 5 ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike iso Chineke na-eje ije site n’igosipụta okwukwe na ibi ndụ kwekọrọ n’uche ya. Ọ bụ ezie na ndị bi n’alaeze Izrel kwara iko n’ụzọ ime mmụọ, Chineke ga-emere ha ebere ma ha chegharịa. Otú Hosea si mesoo nwunye ya bụ́ Gomea gosipụtara nke a. Mgbe ọ mụsịịrị ya otu nwa, ihe àmà na-egosi na ọ mụtara ụmụ abụọ site n’ịkwa iko. N’agbanyeghị nke ahụ, Hosea kpọrọghachiiri ya dị nnọọ ka Jehova dị njikere imere ụmụ Izrel chegharịrịnụ ebere.—Hosea 1:1-3:5.

4 Jehova nwere ikpe megide Izrel n’ihi na eziokwu, ebere, ma ọ bụ ihe ọmụma Chineke adịghị n’ala ahụ. Ọ ga-ekpe ma Izrel na-ekpere arụsị ma alaeze Juda na-enupụ isi ikpe. Otú ọ dị, mgbe ndị Chineke nọ “n’ahụhụ,” ha ga-achọ Jehova.—Hosea 4:1-5:15.

Ihe Nkiri ahụ Amalite

5, 6. (a) Ruo ókè ha aṅaa ka ịkwa iko gbasaruru n’alaeze ebo iri nke Izrel? (b) N’ihi gịnị ka ịdọ aka ná ntị e nyere Izrel oge ochie ji baara anyị uru?

5 Chineke nyere Hosea iwu, sị: “Jee, lụrụ n’onwe gị nwunye nke na-akwa iko na ụmụ a mụrụ n’ịkwa iko: n’ihi na ala nke a na-akwa iko nke ukwuu, ghara iso Jehova.” (Hosea 1:2) Ruo ókè ha aṅaa ka ịkwa iko gbasaruru n’Izrel? A gwara anyị, sị: “Mmụọ nke ịkwa iko nile emewo ka [ndị bi n’alaeze ebo iri ahụ] kpafuo, ha wee pụọ n’okpuru Chineke ha kwaa iko. . . . Ụmụ unu ndị inyom na-akwa iko, ọ bụkwa n’ihi nke a ka ndị inyom unu lụworo ọhụrụ na-akwa iko. . . . N’ihi na [ndị ikom] ha na-ewezụga onwe ha soro ndị inyom na-akwa iko, ha na-esokwa ndị inyom e doro nsọ ịkwa iko chụọ àjà.”—Hosea 4:12-14.

6 A kwara iko aghara aghara n’Izrel, ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́. N’ihi ya, Jehova ‘ga-eleta’ ụmụ Izrel. (Hosea 1:4; 4:9) Ịdọ aka ná ntị a baara anyị uru n’ihi na Jehova ga-eleta ndị na-eme omume rụrụ arụ na ndị na-efe ofufe na-adịghị ọcha taa. Ma ndị so Chineke eje ije na-emezu ihe ọ chọrọ ha n’aka iji na-efe ya ofufe dị ọcha, ha makwaara na “ọ dịghị onye na-akwa iko . . . nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze nke Kraịst ahụ na nke Chineke.”—Ndị Efesọs 5:5; Jems 1:27.

7. Gịnị ka ọlụlụ Hosea lụrụ Gomea sere onyinyo ya?

7 Mgbe Hosea lụrụ Gomea, ihe àmà na-egosi na ọ bụ nwanyị na-amaghị nwoke, ọ bụkwa nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe ọ ‘mụtaara ya nwa nwoke.’ (Hosea 1:3) Dị ka e gosiri n’ihe nkiri ihe atụ ahụ, obere oge ka a tọhapụsịrị ụmụ Izrel n’agbụ ndị Ijipt na 1513 T.O.A., Chineke sokwa ha gbaa ndụ nke yiri nkwekọrịta alụmdi na nwunye dị ọcha. Site n’ịbanye n’ọgbụgba ndụ ahụ, Izrel kwere nkwa ikwesị ntụkwasị obi nye “di” ya bụ́ Jehova. (Aịsaịa 54:5) Ee, alụmdi na nwunye dị ọcha dị n’etiti Hosea na Gomea sere onyinyo alụmdi na nwunye ihe atụ a dị n’etiti Chineke na Izrel. Ma lee nnọọ ka ihe si gbanwee!

8. Olee otú alaeze ebo iri nke Izrel si malite, gịnịkwa ka ị pụrụ ikwu banyere chi ọ na-efe?

8 Nwunye Hosea “wee tụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwanyị.” Eleghị anya, Gomea kwatara nwa nwanyị ahụ na nwa ọzọ o mesịrị mụọ n’iko. (Hosea 1:6, 8) Ebe ọ bụ na Gomea nọchiri anya Izrel, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú Izrel si kwaa iko?’ N’afọ 997 T.O.A., ebo iri nke Izrel kewapụrụ onwe ha n’ebo Juda na Benjamin nke dị n’ebe ndịda. A malitere ofufe nwa ehi n’alaeze ebo iri nke Izrel nke dị n’ebe ugwu ka ndị bi ebe ahụ wee ghara ịdị na-aga Juda iji fee Jehova n’ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem. Ofufe chi ụgha bụ́ Bel, ya na inwe mmekọahụ aghara aghara e ji mara ya, bịara gbanyesie mkpọrọgwụ ike n’Izrel.

9. Dị ka e buru n’amụma na Hosea 1:6, gịnị mere Izrel?

9 Mgbe Gomea mụrụ nwa ya nke abụọ bụ́ nke o yiri ka ọ̀ kwatara n’iko, Chineke gwara Hosea, sị: “Kpọọ aha ya Lo-ruhama [nke pụtara “E Mereghị Ya Ebere”]: n’ihi na M gaghị enwekwa obi ebere n’ahụ́ ụlọ Izrel ọzọ, ka M wee bupụrụ ha mmehie ha ma ọlị.” (Hosea 1:6) Jehova “bupụrụ ha” mgbe ndị Asiria dọọrọ ndị Izrel n’agha n’afọ 740 T.O.A. Otú ọ dị, Chineke meere alaeze ebo abụọ nke Juda ebere ma zọpụta ya n’ejighị ụta, mma agha, agha, ịnyịnya, ma ọ bụ ndị ịnyịnya mee ihe. (Hosea 1:7) N’otu abalị n’afọ 732 T.O.A., otu mmụọ ozi gburu ndị agha Asiria dị otu narị puku na iri puku asatọ na ise bụ́ ndị nọchibidoro isi obodo Juda, bụ́ Jeruselem.—2 Ndị Eze 19:35.

Ikpe Jehova Megide Izrel

10. Gịnị ka akwamiko Gomea bụ ihe atụ ya?

10 Gomea hapụrụ Hosea ma ghọọ “nwunye nke na-akwa iko,” soro nwoke ọzọ biri, ya na ya ana-akwakwa iko. Nke a bụ ihe atụ nke otú alaeze Izrel si soro mba ndị na-ekpere arụsị jikọọ aka ma malite ịtụkwasị ha obi. Kama ito Jehova dị ka onye nyere ya akụ̀ na ụba, Izrel toro chi nke mba ndị ahụ maka akụ̀ na ụba ya wee mebie ọgbụgba ndụ alụmdi na nwunye dị n’etiti ya na Chineke site n’ife ofufe ụgha. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji nwee ikpe megide mba ahụ na-akwa iko n’ụzọ ime mmụọ!—Hosea 1:2; 2:2, 12, 13.

11. Gịnị mere ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mgbe Jehova kwere ka a dọrọ Izrel na Juda n’agha?

11 Olee ahụhụ Izrel tara maka ịhapụ Di ya? Chineke mere ka o “jee n’ọzara” nke Babilọn, bụ́ mba nke meriri Asiria, bụ́ ebe a dọọrọ Izrel n’agha gaa n’afọ 740 T.O.A. (Hosea 2:14) Mgbe Jehova si otú a weta alaeze ebo iri ahụ ná njedebe, ọ kagbughị ọgbụgba ndụ alụmdi na nwunye ya na ebo iri na abụọ nke Izrel gbara. N’ezie, mgbe Chineke kwere ka ndị Babilọn bibie Jeruselem na 607 T.O.A., kwerekwa ka a dọrọ ndị Juda n’agha, ọ kagbughị ọgbụgba ndụ Iwu Mozis, bụ́ nke ya na ebo iri na abụọ nke Izrel ji banye n’alụmdi na nwunye ihe atụ. Nanị mgbe e mebiri mmekọrịta ahụ bụ mgbe ndị ndú okpukpe ndị Juu jụrụ Jizọs Kraịst ma gbuo ya n’afọ 33 O.A.—Ndị Kọlọsi 2:14.

Jehova Adụọ Izrel Ọdụ

12, 13. Olee isi ihe dị na Hosea 2:6-8, oleekwa otú okwu ndị ahụ si mezuo n’ahụ́ Izrel?

12 Chineke dụrụ Izrel ọdụ ka o “wezụga ịkwa iko ya nile,” ma ọ chọrọ ijeso ndị na-ahụ ya n’anya. (Hosea 2:2, 5) Jehova kwuru, sị: “N’ihi nke a, lee, M gaje iji ogwu gbachie ụzọ gị, M ga-agbachibidokwa ya ogige, o wee ghara ịchọpụta okporo ụzọ ya nile. Ọ ga-agbasokwa ndị na-ahụ ya n’anya, ma ọ gaghị eru ha ahụ́; ọ ga-achọkwa ha, ma ọ gaghị achọta ha: o wee sị, Ka m jee laghachikwuru di m mbụ; n’ihi na ọ dị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a. Ma ya onwe ya amaghị na ọ bụ Mụ onwe m nyere ya ọka ya na mmanya vaịn ọhụrụ ya, na mmanụ ọhụrụ ya, mee ka ọlaọcha na ọlaedo baara ya ụba, bụ́ nke ha ji meere Bel ihe.”—Hosea 2:6-8.

13 Ọ bụ ezie na Izrel chọrọ enyemaka nke mba ndị “na-ahụ ya n’anya,” o nweghị nke nyeliiri ya aka. E ji ihe dị ka osisi dị ogwu ogwu a na-agaghị agafeli agafeli gbachigide ya, ka ndị “na-ahụ ya n’anya” wee ghara inwe ike inyere ya aka. Mgbe ndị Asiria nọchibidosịrị Sameria, bụ́ isi obodo ya, ruo afọ atọ, Sameria dara n’afọ 740 T.O.A., e guzobeghachighịkwa alaeze ebo iri ahụ ọzọ. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’ime ndị Izrel ahụ a dọọrọ n’agha ga-aghọta na ihe ka mma mgbe ndị nna nna ha nọ na-efe Jehova. Ndị ahụ fọdụrụnụ ga-ajụ ife Bel ma chọọ ka ha na Jehova banyeghachi n’ọgbụgba ndụ.

Ilebakwu Anya n’Ihe Nkiri Ahụ

14. Olee ihe mere Hosea ji maliteghachi imeso Gomea ihe dị ka nwunye ya?

14 Iji ghọtakwuo njikọ dị n’etiti ọnọdụ ezinụlọ Hosea na mmekọrịta Izrel na Jehova, tụlee okwu ndị a: “Jehova wee sị m, Jeekwa, hụ nwanyị n’anya nke iko hụworo ya n’anya, nke bụ́kwa nwanyị a lụrụ na nwunye na-akwa iko.” (Hosea 3:1) Hosea rubere isi n’iwu a site n’ịgbapụtaghachi Gomea site n’aka nwoke ya na ya bi. Mgbe nke ahụ gasịrị, Hosea dọsiri nwunye ya aka ná ntị ike, sị: “Ọtụtụ ụbọchị ka ị ga-anọdụrụ m; ị gaghị akwa iko, ị gaghị abụkwa nwanyị nke nwoke ọ bụla.” (Hosea 3:2, 3) Gomea nabatara ịdọ aka ná ntị ahụ, Hosea maliteghachikwara imeso ya ihe dị ka nwunye ya. Olee otú nke a si mezuo n’otú Chineke si mesoo ndị Izrel na Juda ihe?

15, 16. (a) Gịnị ka ndị Chineke ọ dọrọ aka ná ntị na-aghaghị ime ka o wee meere ha ebere? (b) Olee otú Hosea 2:18 sirila mezuo?

15 Mgbe ndị Izrel na Juda a dọọrọ n’agha ka nọ na Babilọn, Chineke ji ndị amụma ya ‘gwa ha okwu ga-aba ha n’obi.’ Ka Chineke wee meere ndị ya ebere, ha aghaghị ichegharị ma laghachikwuru Di ha, dị ka Gomea laghachikwuuru di ya. Jehova ga-esizi “n’ọzara” Babilọn kpọpụta nwunye ihe atụ ya ọ dọrọ aka ná ntị ma kpọghachi ya na Juda na Jeruselem. (Hosea 2:14, 15) O mezuru nkwa ahụ na 537 T.O.A.

16 Chineke mezukwara nkwa a: “N’ụbọchị ahụ Mụ na anụ ọhịa na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ nke ala ga-agbara ha ndụ: ọ bụkwa ụta na mma agha na agha ka M ga-agbajipụ n’ala ha, mee ka ha dinaa ala ná ntụkwasị obi.” (Hosea 2:18) Ndị Juu fọdụrụnụ, bụ́ ndị laghachiri n’ala nna ha, biri ná ntụkwasị obi, n’atụghịkwa egwu ụmụ anụmanụ. Amụma a mezukwara na 1919 O.A., bụ́ mgbe a tọhapụrụ ihe fọdụrụ n’Izrel ime mmụọ na “Babilọn Ukwu ahụ,” alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ha na ndị enyi ha, bụ́ ndị nwere olileanya ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala, nọ ugbu a na-ebi ná ntụkwasị obi ma na-anụ ụtọ ndụ n’ime paradaịs ime mmụọ. Ezi Ndị Kraịst a anaghị akpa àgwà ndị yiri nke anụ ọhịa.—Mkpughe 14:8; Aịsaịa 11:6-9; Ndị Galeshia 6:16.

Buru Ihe Ndị Ị Mụtara n’Uche

17-19. (a) Olee àgwà Chineke ndị a gbara anyị ume n’ebe a iṅomi? (b) Olee otú ebere na ọmịiko Jehova kwesịrị isi metụta anyị?

17 Chineke nwere obiọma ma na-eme ebere, anyị kwesịkwara ịdị otú ahụ. Nke ahụ bụ otu ihe isi ndị mbụ nke akwụkwọ Hosea na-akụziri anyị. (Hosea 1:6, 7; 2:23) Njikere Chineke dị imere ụmụ Izrel chegharịrị echegharị ebere kwekọrọ n’ilu ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee, nke bụ́: “Onye na-ekpuchi njehie ya nile, ọ gaghị agara ya: ma onye na-ekwupụta ha, nke na-ahapụkwa ha, a ga-enwe obi ebere n’ahụ́ ya.” (Ilu 28:13) Okwu ndị na-esonụ ọbụ abụ ahụ kwuru na-akasikwa ndị mmehie nwere nchegharị obi: “Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.”—Abụ Ọma 51:17.

18 Amụma Hosea na-eme ka ọmịiko na obi ebere nke Chineke anyị na-efe pụta ìhè. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ esi n’ụkpụrụ ezi omume ya kpafuo, ha pụrụ ichegharị ma chigharịa. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, Jehova ga-anabata ha. O meere ndị Izrel chegharịrị echegharị ebere, bụ́ ndị bụ́ nwunye ya n’ụzọ ihe atụ. Ọ bụ ezie na ha nupụụrụ Jehova isi ma ‘kpasuo Onye Nsọ nke Izrel iwe, o meere ha ebere ma nọgide na-echeta na ha bụ anụ ahụ́ nkịtị.’ (Abụ Ọma 78:38-41) Ebere a kwesịrị ịkpali anyị ịnọgide soro Chineke anyị nke nwere ọmịiko, bụ́ Jehova, na-eje ije.

19 Ọ bụ ezie na mmehie ndị dị ka igbu ọchụ, izu ohi, na ịkwa iko juru ebe nile n’Izrel, Jehova ‘gwara Izrel okwu bara ya n’obi.’ (Hosea 2:14; 4:2) Ka anyị na-atụgharị uche n’ebere na ọmịiko Jehova, o kwesịrị imetụ anyị n’obi ma mee ka anyị bịarukwuo ya nso. Ya mere, ka anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘Olee otú m ga-esi ṅomie ebere Jehova n’ụzọ ka mma n’otú m si emeso ndị ọzọ ihe? Ọ bụrụ na Onye Kraịst ibe m nke mejọrọ m, ma ọ bụ kpasuo m iwe, arịọ m mgbaghara, m̀ ga-adị njikere ịgbaghara ya dị ka Chineke dị?’—Abụ Ọma 86:5.

20. Nye ihe atụ iji gosi na anyị kwesịrị inwe obi ike n’olileanya Chineke nyere anyị.

20 Chineke na-enye ezi olileanya. Dị ka ihe atụ, o kwere nkwa, sị: “M ga-esikwa n’ebe ahụ nye ya . . . ndagwurugwu Ekoa ịbụ ọnụ ụzọ olileanya.” (Hosea 2:15) Nzukọ Jehova nke oge ochie, bụ́ nke yiri nwunye ya, nwere nnọọ olileanya na a ga-akpọghachi ha n’ala nna ha, bụ́ ebe “ndagwurugwu Ekoa” dị. Mmezu e mezuru nkwa ahụ na 537 T.O.A., kwesịrị ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi olileanya e ji n’aka nke Jehova debere anyị n’ihu.

21. Olee otú ihe ọmụma si enyere anyị aka iso Chineke na-eje ije?

21 Iji nọgide soro Chineke na-eje ije, ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-enweta ihe ọmụma ya ma jiri ya na-eme ihe ná ndụ anyị. Ihe ọmụma Jehova kọrọ nnọọ ụkọ n’Izrel. (Hosea 4:1, 6) N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ ji ozizi Chineke kpọrọ nnọọ ihe, bie ndụ kwekọrọ na ya, a gọziekwa ha n’ụba. Hosea bụ otu n’ime ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa puku mmadụ asaa ahụ dịrị ndụ n’oge Ịlaịja, bụ́ ndị na-egbughịrị Bel ikpere n’ala. (1 Ndị Eze 19:18; Ndị Rom 11:1-4) Ekele anyị nwere maka ihe ndị Chineke na-ezi anyị ga-enyere anyị aka ịnọgide soro Chineke na-eje ije.—Abụ Ọma 119:66; Aịsaịa 30:20, 21.

22. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ndapụ n’ezi ofufe anya?

22 Jehova na-atụ anya ka ndị na-edu ndú n’etiti ndị ya ghara isi n’ezi ofufe dapụ. Otú ọ dị, Hosea 5:1 na-ekwu, sị: “Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụàjà, ṅaakwanụ ntị, unu ụlọ Izrel, unu ụlọ eze, geekwanụ ntị, n’ihi na unu ka ikpe a dịịrị; n’ihi na igbudu ka unu bụworo na Mizpa, unu abụwokwa ụgbụ a gbasara n’elu Teboa.” Ndị ndú si n’ezi ofufe dapụ bụụrụ ụmụ Izrel igbudu na ụgbụ, na-ara ha ụ̀ra ịga fee arụsị. O yiri ka Ugwu Teboa na ebe a na-akpọ Mizpa hà bụ ebe ofufe ụgha ndị dị otú ahụ hiwere isi.

23. Olee uru i riteworo site n’ịmụ akwụkwọ Hosea isi 1 ruo 5?

23 Ka ọ dị ugbu a, amụma Hosea emeela ka anyị mata na Jehova bụ Chineke obi ebere, onye na-enye anyị olileanya ma na-agọzi ndị na-eji ntụziaka ya eme ihe ma nọgide n’ezi ofufe. Ya mere, dị ka ụmụ Izrel chegharịrị echegharị n’oge gara aga, ka anyị chọọ Jehova ma na-agbalị mgbe nile ime ihe na-atọ ya ụtọ. (Hosea 5:15) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-aghọta ezi mkpụrụ ma nwee ọṅụ na udo na-enweghị atụ, bụ́ nke ndị ji ikwesị ntụkwasị obi soro Chineke na-eje ije na-enwe.—Abụ Ọma 100:2; Ndị Filipaị 4:6, 7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 E nwere ihe nkiri ihe atụ ná Ndị Galeshia 4:21-26. Iji ghọta ya, lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke Abụọ, peeji nke 693-694, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị ka ọlụlụ Hosea lụrụ Gomea nọchiri anya ya?

• Gịnị mere Jehova ji nwee ikpe megide Izrel?

• Olee ihe mmụta dị na Hosea isi 1 ruo 5 nke masịrị gị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Ị̀ maara onye nwunye Hosea nọchiri anya ya?

[Foto dị na peeji nke 19]

Ndị Asiria meriri ndị bi na Sameria na 740 T.O.A.

[Foto dị na peeji nke 20]

Ndị nwere obi ụtọ na-alaghachi n’ala nna ha