Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwensu Ọ̀ Dị Adị?

Ekwensu Ọ̀ Dị Adị?

Ekwensu Ọ̀ Dị Adị?

OLEE otú i si ele Ekwensu anya? Ị̀ na-ele ya anya dị ka onye dị adị nke na-anwa ụmụ mmadụ ime ihe ọjọọ, ka ị̀ na-eche na ọ bụ nanị onye na-anọchi anya ihe ọjọọ? Ekwensu ọ̀ bụ onye e kwesịrị ịtụ egwu, ka è kwesịrị iwere ya nanị dị ka echiche efu ma ọ bụ onye na-adịghị adị nke a kọrọ n’akụkọ ifo? Okwu ahụ bụ́ “ekwensu” ọ̀ na-ezo aka n’ikike na-emebi ihe nke a na-adịghị ahụ anya? Okwu ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ nanị ihe e ji akọwa àgwà ọjọọ ndị ụmụ mmadụ nwere, dị ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe nke oge a na-ekwu?

Ọ bụghị ihe ijuanya na ụmụ mmadụ nwere echiche dịgasị iche banyere onye Ekwensu bụ. Lee ka ọ pụrụ isi sie ike ịmata onye mmadụ bụ n’ezie ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ aka ochie n’ime ihu abụọ! Ọ ga-esi ike karịsịa ma ọ bụrụ na o kpebisiri ike ịnọgide na-ezo ụdị onye ọ bụ ezo. Bible na-akọwa Ekwensu dị ka onye dị otú ahụ. Ọ kpọrọ ya Setan ma kwuo, sị: “Setan n’onwe ya anọgidewo na-enwogha onwe ya ịbụ mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:14) N’agbanyeghị na ọ bụ onye ọjọọ, Ekwensu na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ọma iji duhie ndị mmadụ. Ya bụrụkwa na o nwee ike ime ka ndị mmadụ kweta na ya adịghị adị, ọ ga-enyekwuru ya aka inweta ihe ọ na-achọ.

Ya bụrụ otú ahụ, ònye ka Ekwensu bụ n’ezie? Olee mgbe ọ malitere ịdị adị, oleekwa otú o si malite? Olee otú o si achịkwa ụmụ mmadụ taa? Ọ̀ dị ihe anyị pụrụ ime iji ghara iso ná ndị ọ na-achịkwa? Bible na-agwa anyị ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Ekwensu site nnọọ n’oge ọ malitere ịdị adị, ọ na-enyekwa anyị azịza ndị ziri ezi nye ajụjụ ndị a.

[Foto dị na peeji nke 3]

Lee ka ọ pụrụ isi sie ike ịmata onye mmadụ bụ ma ọ bụrụ na o kpebisiri ike ịnọgide na-ezo ụdị onye ọ bụ ezo!