Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Dị Ịtụnanya E Kere Eke Na-eto Jehova

Ihe Ndị Dị Ịtụnanya E Kere Eke Na-eto Jehova

Ihe Ndị Dị Ịtụnanya E Kere Eke Na-eto Jehova

JEHOVA CHINEKE dị elu karịa ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ iche. Ihe ndị o kere n’ụwa na n’eluigwe na-ewetara ya otuto ma na-atụ anyị n’anya.—Abụ Ọma 19:1-4.

Dị ka Onye Okike na Eze Eluigwe na Ala, o kwesịrị nnọọ ekwesị ka e gee Jehova ntị mgbe ọ na-ekwu okwu. Ma lee ka ọ ga-esi tụọ anyị n’anya ma ọ bụrụ na o jiri ọnụ ya gwa anyị bụ́ mmadụ nkịtị nọ n’ụwa ebe a okwu! Ka e were ya na ọ gwara gị okwu, ikekwe site n’ọnụ mmụọ ozi. N’ezie, ị ga-ege ya ntị. Ọ ghaghị ịbụ na nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job gere nnọọ ntị nke ọma mgbe Chineke na-agwa ya okwu ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe Chineke gwara Job banyere ụwa na eluigwe a na-ahụ anya?

Ònye Tọrọ Ntọala Ụwa, Ònyekwa Na-achịkwa Oké Osimiri?

Chineke si n’oké ifufe jụọ Job ajụjụ banyere ụwa na oké osimiri. (Job 38:1-11) Ọ dịghị mmadụ na-atụpụta ụkpụrụ ihe owuwu nke kpebiri otú ụwa ga-eburu n’ibu ma nyezie aka kee ya. Chineke ji ụwa tụnyere ụlọ ma jụọ Job, sị: “Ònye tọgbọrọ nkume nkuku ya?” Ọ bụghị mmadụ tọgbọrọ ya! Ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi nọ na-ekiri Jehova ma na-aṅụrị ọṅụ ka ọ na-eke ụwa a.

Oké osimiri bụ nnọọ nwatakịrị n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye na-eyiwe ya ákwà n’ụzọ ihe atụ. Ọ ‘na-awapụta dị ka à ga-asị na ọ na-esi n’akpa nwa pụta.’ Chineke jichiri oké osimiri n’otu ebe dị ka à ga-asị na o ji ihe ntụchi na ibo ụzọ mechibido ya, ọ bụkwa ike ndị sitere n’anyanwụ na n’ọnwa na-achịkwa ntoju nke oké osimiri.

The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ọ bụ ifufe na-akpata ihe ka ukwuu n’ebili mmiri a na-enwe n’oké osimiri, ọ na-esite n’ibugharịtụ mmiri ruo n’ịkpata nnukwu ebili mmiri nke pụrụ ịdị ihe karịrị otu narị amaụkwụ (mita 30) n’elu. . . . Mgbe ifufe ahụ kwụsịrị, ebili mmiri ahụ na-anọgide n’elu mmiri, ọ pụkwara ịgbasaru ebe dị ezigbo anya site n’ebe ọ malitere. Ọ na-adịwanye ala ma na-adịwanye ogologo. N’ikpeazụ, ebili mmiri ahụ na-eru n’ụsọ mmiri, bụ́ ebe ọ na-agba ụfụfụ.” Oké osimiri na-erubere iwu a Chineke nyere isi: “Ruo ebe a ka ị ga-abịa, ma ị gaghị agabiga ya.”

Ònye Na-eme Ka Chi Bọọ?

Mgbe nke ahụ gasịrị, Chineke jụrụ Job banyere ọrụ ìhè na-arụ na ihe ndị ọzọ. (Job 38:12-18) Ọ dịghị mmadụ pụrụ ikpebi mgbe chi ga-eji na mgbe ọ ga-abọ. N’ụzọ ihe atụ, ìhè ụtụtụ na-ejide nsọtụ dị iche iche nke ụwa ma yọchapụ ndị na-emebi iwu na ya. Ndị mmehie nwere ike ime mmehie na “chi ojiji.” (Job 24:15, 16) Ma chi ọbụbọ na-eme ka ọtụtụ ndị mmehie gbasaa.

Ìhè ụtụtụ dị ka akara Chineke na-eji aka ụwa iji mee ka ọ maa mma. Anwụ na-eme ka a hụ ọtụtụ àgwà bụ́ ndị na-eme ka ụwa yie ihe e yikwasịrị ákwà ndị magburu onwe ha. Aka Job adịghị na nke a, o jegharịbeghịkwa n’ebe michasịrị emi nke ogbu mmiri iji gụkọọ ihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị n’ebe ahụ. Ọbụna ruo taa, ndị nchọpụta amatabeghị ihe nile banyere ihe ndị dị ndụ bi n’ime oké osimiri!

Ònye Nwe Ebe Nkwakọba nke Snow na Akụ́ Mmiri Igwe?

Ọ dịghị mmadụ ọ bụla dularala ìhè ma ọ bụ ọchịchịrị n’ụlọ ha ma ọ bụ nke baworo n’ụlọ nkwakọba nke snow na akụ́ mmiri igwe bụ́ ihe ndị Chineke gbochiworo iji jiri ha mee ihe ‘n’ụbọchị ọgụ na agha.’ (Job 38:19-23) Mgbe Jehova ji akụ́ mmiri igwe lụso ndị iro ya ọgụ na Gibiọn, “ndị nwụrụ na nkume akụ́ mmiri igwe ahụ karịrị ndị ụmụ Izrel weere mma agha gbuo.” (Joshua 10:11) O nwere ike iji akụ́ mmiri igwe ndị anyị na-amaghị otú ha ga-aha bibie ndị ajọ omume ga-eso Gọg, ma ọ bụ Setan.—Ezikiel 38:18, 22.

Akụ́ mmiri igwe ndị ha ka àkwá gburu mmadụ 25 ma merụọ narị mmadụ abụọ ndị ọzọ ahụ́ n’ebe etiti obodo Henan Province, China, na July 2002. Mgbe Benvenuto Cellini bụ́ onye Ịtali na-akpụ ihe ọkpụkpụ na-ekwu banyere otu akụ́ mmiri igwe dara n’afọ 1545, o dere, sị: “Anyị nọ n’ebe ga-ewe otu ụbọchị site na Lyons . . . mgbe anyị malitere ịnụ ụda nke nnukwu égbè eluigwe. . . . Mgbe égbè eluigwe ahụ gbasịrị, eluigwe mere oké ụzụ na-adachi ntị nke mere ka m chee na ụbọchị ikpeazụ ahụ abịala; n’ihi ya akwụsịtụgodịrị m ịnyịnya m, akụ́ mmiri igwe zowekwara ka mmiri n’enweghị otu ntapụ mmiri so ya. . . . Akụ́ mmiri igwe ndị a buwanyewara ibu ruo mgbe ha hazi ka nnukwu oroma. . . . Oké ifufe fere ruo oge ụfọdụ ma mesịa kwụsị . . . Anyị gosirịtara ibe anyị ebe ndị anyị chihịara ahụ́; ma mgbe anyị gara ihe dị ka otu maịl, anyị hụrụ ebe akụ́ mmiri igwe ndị ahụ kpara aka ọjọọ karịa ihe o mere anyị, ọ bụghịkwa ihe e ji ọnụ ekwu. Ọ gbụsịrị osisi nile akwụkwọ ma gbajisie ha; anụ ndị nọ n’ọhịa nwụsịrị; ọtụtụ ndị na-azụ anụ nwụkwara; anyị hụrụ ọtụtụ akụ́ mmiri igwe ndị mmadụ na-enweghị ike iji aka ya abụọ bulie.”—Autobiography (Mpịakọta nke Abụọ, 50), Harvard Classics, Mpịakọta nke 31, peeji nke 352-353.

Gịnị ga-eme mgbe Jehova mepere ebe nkwakọba snow na nke akụ́ mmiri igwe ya iji lụso ndị iro ya ọgụ? Ọ dịghị ihe ga-azọ ha mgbe o ji snow na akụ́ mmiri igwe mezuo uche ya.

Ònye Mere Mmiri Ozuzo, Igirigi, Hoar-frost, na Ice?

Jehova jụziri Job banyere mmiri ozuzo, igirigi, hoar-frost, na ice. (Job 38:24-30) Chineke bụ nnukwu Ọha Mmiri, ọ na-emedị ka mmiri zokwasị “ọzara mmadụ na-ebighị n’ime ya.” E nweghị mmadụ bụ́ nna ma ọ bụ onye kere mmiri ozuzo, ice, na hoar-frost.

Akwụkwọ bụ́ Nature Bulletin na-ekwu, sị: “Ihe kasị dị ịtụnanya na ma eleghị anya ihe kasị dị mkpa banyere [ice] bụ na mmiri na-agbasa agbasa ka ọ na-aghọ ice . . . Ice nke na-ekpuchi elu mmiri n’oge oyi na-eme ka ihe ndị bi na mmiri ahụ (azụ̀ na ihe ndị dị ka ya) nwee ike ịdịgide ndụ. Ya bụrụ na . . . mmiri na-akpụkọ ọnụ ma na-adịwanye arọ ka ọ na-aghọ ice, ice gaara adị arọ karịa mmiri ma mikpuo n’ala mmiri. Ọ ga-eme ka e nwekwuo ice n’elu mmiri ahụ ruo mgbe mmiri ahụ nile ga-aghọ ice. . . . N’ebe ndị ka jụọ oyi n’ụwa, osimiri, iyi, ọdọ mmiri, na ọbụna oké osimiri ga-abụ ice n’oge nile n’afọ.”

Anyị nwere obi ụtọ na ogbu mmiri dum adịghị aghọ ice! Obi dịkwa anyị ụtọ n’ezie na ihe ndị Jehova kere, bụ́ mmiri ozuzo na igirigi na-eme ka akwụkwọ ndụ na-eto n’ụwa.

Ònye Tụrụ Ụkpụrụ nke Eluigwe?

Chineke jụziri Job banyere eluigwe. (Job 38:31-33) Pleiades bụ otu ìgwè kpakpando nke dị ezigbo anya site n’anyanwụ bụ́ nke nnukwu kpakpando asaa na ndị obere ndị ọzọ mejupụtara. Mmadụ apụghị “ikekọta ihu ụtọ [ma ọ bụ, “ụyọkọ”] Pleiades,” jikọta ha ọnụ. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ‘ịtọsa ihe ọdụdọ nile nke Orion,’ bụ́ aha ụyọkọ kpakpando ọzọ. Ọ bụ ezie na anyị amaghị ụyọkọ kpakpando ndị a na-akpọ Mazzaroth na Bear, mmadụ apụghị ịchịkwa ma ọ bụ duzie ha. Ụmụ mmadụ apụghị ịgbanwe “ụkpụrụ nile nke eluigwe,” bụ́ iwu ndị na-achịkwa eluigwe na ala.

Chineke guzobere iwu ndị na-eduzi ihe ndị dị n’eluigwe, bụ́ ndị na-achịkwa ihu igwe, ntoju mmiri, ikuku, na ndụ n’ụwa anyị a. Weregodị anyanwụ dị ka ihe atụ. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana (Mbipụta nke 1996) na-ekwu banyere ya, sị: “Anyanwụ na-eme ka e nwee okpomọkụ na ìhè n’ụwa, na-eme ka ihe ọkụkụ na-eto, na-amịkọrọ mmiri site n’oké osimiri na ọdọ mmiri ndị ọzọ, soro na-eme ka e nwee ikuku ma na-arụ ọrụ ndị ọzọ dị mkpa iji mee ka ndụ dịgide n’ụwa.” Otu akwụkwọ ahụ na-ekwu, sị: “Iji ghọta otú ikike nke anwụ hà, nanị ihe mmadụ ga-eme bụ icheta na ikike nile dị n’ikuku na mgbidi ndị e ji egbochi mmiri, ikike ndị dị n’osimiri na ikike nile dị n’ihe ndị e kere eke e ji emenwu ọkụ, ndị dị ka nkụ, unyi, na mmanụ sitechara nnọọ n’anwụ nke na-acha n’obere mbara ala [bụ́ ụwa] nke dị ihe dị ka otu narị nde kilomita na iri ise site n’anyanwụ.”

Ònye Tinyere Amamihe n’Igwe Ojii?

Jehova gwara Job ka o chee echiche banyere igwe ojii. (Job 38:34-38) Mmadụ enweghị ike ịgwa igwe ojii ka ọ pụta ma mee ka mmiri ndị dị na ya zoo. Ma ndụ ndị mmadụ dabeere nnọọ ná nrugharị mmiri nke Onye Okike guzobere!

Gịnị bụ nrugharị mmiri? Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Nrugharị mmiri nwere akụkụ anọ dịgasị iche: nchekwa, mmịkọrọ, ozuzo, na nsọba. E nwere ike ichekwa mmiri n’ime ala ruo nwa oge; n’oké osimiri, n’ọdọ mmiri, na n’osimiri; nakwa dị ka ice na snow. Anwụ na-amịkọrọ ya site n’ụwa, ọ na-akpụkọtakwa ọnụ n’igwe ojii, zoghachi ọzọ n’ụwa (dị ka mmiri ma ọ bụ snow), mesịakwa sọba n’oké osimiri ma ọ bụ anwụ amịkọrọkwa ya ọzọ gaa n’urukpuru. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmiri nile dị n’ụwa erugharịala ọtụtụ ugboro.”—Microsoft Encarta Reference Library 2005.

Igwe ojii ndị mmiri juru na ha yiri ite mmiri eluigwe. Ọ bụrụ na Jehova ehulata ha, mmiri ga-ezonụ nwere ike ibu ibu nke na ọ ga-eme ka ájá uzuzu ghọọ apịtị, meekwa ka ájá ụrọ kpụkọta ọnụ. Chineke pụrụ ime ka mmiri zoo ma ọ bụ mee ka ọ ghara izo.—Jems 5:17, 18.

Àmụ̀mà na-esokarị mmiri ozuzo, ma mmadụ enweghị ike ime ka o mezuo uche ya. E kwuru n’ụzọ ihe atụ na àmụ̀mà na-agwa Chineke, sị, “Lee anyị.” Akwụkwọ bụ́ Compton’s Encyclopedia na-ekwu, sị: “Àmụ̀mà na-agbanwe ikuku n’ụzọ dị ịrịba ama. Ka otu àmụ̀mà na-ese, ọ na-eme ka e nwee okpomọkụ buru ibu nke na-eme ka ikuku nitrogen na nke oxygen gwakọta iji ghọọ nitrate na ihe ndị ọzọ. Ihe ndị a na-eso mmiri ezodata n’Ụwa. N’ụzọ dị otú a, ikuku na-enwe ike ịnọgide na-enye ala ihe ndị dị ya mkpa iji na-emepụta ihe.” Ụmụ mmadụ amatachabeghị ihe nile banyere àmụ̀mà ma Chineke macha ya.

Ihe Ndị Dị Ịtụnanya E Kere Eke Na-eto Chineke

N’ezie, ihe ndị dị ịtụnanya e kere eke na-eto Onye kere ihe nile. (Mkpughe 4:11) Lee ka Job na-aghaghị isiwo nwee mmasị n’ihe ndị Jehova gwara ya banyere ụwa na ihe ndị dị n’eluigwe!

Ọ bụghị nanị ihe ndị a dị ịtụnanya e kere eke anyị tụleworo ka a jụrụ Job ajụjụ banyere ha ma kọwaara ya. Ma, ndị nke anyị tụlerela na-akpali anyị itipụ, sị: “Lee, Chineke dị ukwuu, anyị amaghịkwa Ya.”—Job 36:26.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 14]

Mpekere snow: snowcrystals.net

[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji 15]

Pleiades: NASA, ESA na AURA/Caltech; azụ: U.S. Fish & Wildlife Service, Washington, D.C./William W. Hartley