Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịghọ Ndị Ozi Na-enwe Ọganihu na Ndị Pụrụ Ime Mgbanwe

Ịghọ Ndị Ozi Na-enwe Ọganihu na Ndị Pụrụ Ime Mgbanwe

Ịghọ Ndị Ozi Na-enwe Ọganihu na Ndị Pụrụ Ime Mgbanwe

“Aghọwo m ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.”—1 NDỊ KỌRINT 9:22.

1, 2. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Pọl onyeozi si bụrụ onye ozi dị irè? (b) Olee otú Pọl si kọwaa otú o si ele ọrụ ya anya?

AHỤ́ na-eru ya ala mgbe ya na ndị gụrụ oké akwụkwọ na ndị ogbenye na-akpa ákwà ụlọikwuu na-emekọ ihe. O mere ka ma ndị oké ozu Rom ma ndị Frijia na-agụghị akwụkwọ kwenyere ya. Ihe odide ya kpaliri ma ndị Grik na-anabata echiche ndị ọzọ ma ndị Juu na-anaghị anabata echiche ndị ọzọ. Arụmụka ya enweghị mgbagha, ọ na-erukwa nnọọ n’obi ndị mmadụ. Ọ gbalịrị ime ka e nwee ebe ya na onye ọ bụla ga-ekwekọrịta ka o wee nwee ike ime ka ụfọdụ ndị kwere na Kraịst.—Ọrụ 20:21.

2 Nwoke ahụ bụ Pọl onyeozi, obi abụọ adịghị ya na ọ bụ onye ozi dị irè na nke nwere ọganihu. (1 Timoti 1:12) Jizọs nyere ya ọrụ nke “iburu aha [Kraịst] gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze na ụmụ Izrel.” (Ọrụ 9:15) Olee otú o si lee ọrụ a anya? O kwuru, sị: “Aghọwo m ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị. Ma m na-eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye ya na ndị ọzọ na-ekerịta ya.” (1 Ndị Kọrint 9:19-23) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Pọl nke pụrụ inyere anyị aka ịbụ ndị na-arụpụtakwu ihe n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe?

Nwoke A Gbanwere Ndụ Ya Meriri Ihe Ịma Aka Ahụ

3. Olee otú Pọl si lee Ndị Kraịst anya tupu ya aghọọ Onye Kraịst?

3 Pọl ò nweburu ntachi obi ma na-echebara ndị ọzọ echiche, bụ́ àgwà ndị dị mkpa n’ọrụ ya? Ọ dịghị ma ọlị! Ịnụrụ okpukpe ọkụ n’obi gabiga ókè mere ka Sọl (bụ́ aha e jibu mara Pọl) jiri obi ọjọọ kpagbuo ụmụazụ Kraịst. Mgbe ọ bụ okorobịa, ọ kwadoro ogbugbu e gburu Stivin. Mgbe nke ahụ gasịrị, Pọl ji obi ịta mmiri chụgharịa Ndị Kraịst. (Ọrụ 7:58; 8:1, 3; 1 Timoti 1:13) Ọ nọgidere na-ekupụ “iyi egwu na igbu ọchụ dị ka ume megide ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị.” Ebe ọ na-ezughịrị ya ịchụgharị ndị kwere ekwe nọ nanị na Jeruselem, ọ chụụrụ ha gawa n’ebe ugwu, ọbụna ruo Damaskọs iji jichie ha.—Ọrụ 9:1, 2.

4. Olee mgbanwe ndị Pọl na-aghaghị ime iji rụzuo ọrụ e kenyere ya?

4 Ọ pụrụ ịbụ na ihe bụ́ isi kpatara oké asị ahụ Pọl kpọrọ Iso Ụzọ Kraịst bụ na o kwenyesiri ike na okpukpe ọhụrụ ahụ ga-agwagbu okpukpe ndị Juu site n’iwebata echiche ọhụrụ ndị na-adịghị mma na ya. E kwuwerị, Pọl abụwo “onye Farisii,” bụ́ aha pụtara nnọọ “onye e kewapụrụ iche.” (Ọrụ 23:6) Cheedị ụdị mwute Pọl na-aghaghị inwewo mgbe ọ matara na o nweghị nnọọ ndị ọzọ Chineke hụrụ iziga ya ka ọ gaa kwusaara banyere Kraịst ma ọ́ bụghị ndị Jentaịl! (Ọrụ 22:14, 15; 26:16-18) Ndị Farisii anaghịdị ekwe ka ha na ndị ha lere anya dị ka ndị mmehie rikọọ ihe! (Luk 7:36-39) O doro anya na ọ dị Pọl mkpa ịrụsi ọrụ ike iji gbanwee echiche ya ma mee ka o kwekọọ n’uche Chineke nke bụ́ ka a zọpụta ụdị mmadụ nile.—Ndị Galeshia 1:13-17.

5. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Pọl n’ozi anyị?

5 Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ime otu ihe ahụ. Ka anyị na-ezutekwu ụdị mmadụ dịgasị iche n’ozi anyị na-eje n’ụwa nile na n’ọtụtụ asụsụ, ọ dị anyị mkpa ịgbalịsi ike ịdị na-enyocha àgwà anyị ma wepụ ụdị ịkpọasị ọ bụla pụrụ ịdị n’ime anyị. (Ndị Efesọs 4:22-24) Ma ànyị ma, ma ọ̀ bụ na anyị amaghị, ebe a nọ zụọ anyị na ebe anyị gụruru akwụkwọ na-emetụta ụdị ndị anyị bụ. Nke a pụrụ ime ka anyị bụrụ ndị na-ele mmadụ anya n’ihu, ndị na-akpa ókè na ndị na-adịghị anabata echiche ndị ọzọ. Anyị aghaghị iwepụ àgwà ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịchọta ndị yiri atụrụ na inyere ha aka. (Ndị Rom 15:7) Nke ahụ bụ ihe Pọl mere. Ọ nakweere ihe ịma aka nke ịgbasa ozi ya. Ịhụnanya kpaliri ya ịzụlite nkà izi ihe ndị kwesịrị nṅomi. N’ezie, ọ bụrụ na anyị atụlee ozi nke ‘onyeozi a nke ndị mba ọzọ,’ anyị ga-ahụ na ọ bụ onye anya na-eru ala, onye pụrụ ime mgbanwe iji mee ka okwu ya kwekọọ n’ọnọdụ e nwere na onye na-adị nkọ n’ichepụta ihe mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma ma na-ezi ihe. *Ndị Rom 11:13.

Ihe Ndị Onye Ozi Na-enwe Ọganihu Mere

6. Olee otú Pọl si lebara ihe ndị na-ege ya ntị maara anya, gịnịkwa si na ya pụta?

6 Pọl lebaara ihe ndị na-ege ya ntị kweere na ha na otú e si zụlite ha anya. Mgbe ọ na-agwa Eze Agrịpa nke Abụọ okwu, Pọl kwetara na eze ahụ bụ “ọkachamara n’omenala nile nakwa n’arụmarụ ndị dị n’etiti ndị Juu.” Pọl jizi nkà jiri ihe ndị ọ maara Agrịpa kweere mee ihe ma gwa eze ahụ okwu banyere ihe ndị ọ maara nke ọma. Otú ihe ndị ọ gwara Agrịpa si doo anya na otú o si soro eze ahụ tụgharịa uche n’ụzọ mere ka o kwenyere ya mere ka Agrịpa kwuo, sị: “Ná mkpirikpi oge ị ga-eme ka m kweta ịghọ onye Kraịst.”—Ọrụ 26:2, 3, 27, 28.

7. Olee otú Pọl si mee ka okwu ya kwekọọ n’ọnọdụ e nwere mgbe ọ na-ezi otu ìgwè mmadụ ozi ọma na Listra?

7 Pọl na-emekwa ka okwu ya kwekọọ n’ọnọdụ e nwere. Rịba ama na o mere ihe dị iche mgbe ọ na-agbalị ime ka otu ìgwè mmadụ ha zutere n’obodo Listra ghara ife ya na Banabas ofufe dị ka chi. E kwuru na ndị a na-asụ Lycaonian so ná ndị kasị bụrụ iti na ndị ka nwee nkwenkwe ụgha n’oge ahụ. Dị ka Ọrụ 14:14-18 si kwuo, Pọl rụtụrụ aka n’ihe ndị e kere eke na ụbara ihe ndị na-esi na ha apụta dị ka ihe ndị na-egosi na ezi Chineke ahụ karịrị chi ụgha ha. Arụmụka ahụ esighịrị ha ike nghọta, o yikwara ka ‘ò gbochiri ìgwè mmadụ ahụ ịchụrụ Pọl na Banabas àjà.’

8. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Pọl si gosi na ya pụrụ ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’agbanyeghị na o were iwe mgbe ụfọdụ?

8 N’ezie, Pọl ezughị okè, mgbe ụfọdụkwa, o were iwe banyere ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, n’otu oge e mesoro ya ihe n’ụzọ na-eweda n’ala na n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ gwakasịrị onye Juu aha ya bụ Ananaịas okwu ahụ́. Ma mgbe a gwara Pọl na ọ kparịrị nnukwu onye nchụàjà n’amaghị ama, ọ rịọrọ mgbaghara ozugbo. (Ọrụ 23:1-5) N’Atens, ‘o wutere ya na mbụ mgbe ọ hụrụ na obodo ahụ jupụtara n’arụsị.’ N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe Pọl kwuru okwu n’Ugwu Mars, o meghị ka ha mata na iwe ji ya. Kama nke ahụ, mgbe ọ gwara ndị Atens okwu n’ebe ha na-ezukọ, o buru ụzọ kwuo ihe ndị ha na ya kwekọrịtara site n’izo aka n’ebe ịchụàjà ha wuru “Nye Chi A Na-amaghị Ama,” o hotakwara ihe otu n’ime ndị obodo ha na-ede uri kwuru.—Ọrụ 17:16-28.

9. Olee otú Pọl si dị nkọ n’ichepụta ihe mgbe ọ na-agwa ụdị ndị dị iche iche okwu?

9 Ka Pọl na-agwa ụdị ndị dị iche iche okwu, ọ na-echepụta nnọọ ụzọ dị iche iche isi gwa ha okwu. O chebaara omenala na ebe a zụlitere ndị na-ege ya ntị echiche n’ihi na ihe ndị a na-emetụta otú ha si eche echiche. Mgbe o degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ozi, ọ maara nke ọma na ha bi n’isi obodo nke ọchịchị kasị ike n’oge ahụ. Ihe bụ́ isi dị n’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Rom bụ na ikike Kraịst nwere ịgbapụta mmadụ dị ike karịa ikike mmehie Adam nwere imerụ mmadụ. Ọ gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị Rom okwu otú ọ ga-eru ha n’obi.—Ndị Rom 1:4; 5:14, 15.

10, 11. Olee otú Pọl si jiri ihe atụ ndị na-ege ya ntị ga-aghọta mee ihe? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

10 Gịnị ka Pọl mere mgbe ọ chọrọ ịkọwara ndị na-ege ya ntị eziokwu Bible ndị miri emi? Onyeozi ahụ maara otú e si eji ihe atụ ndị ọ na-agwa okwu maara nke ọma na nke ga-adịrị ha mfe nghọta akọwa ihe ime mmụọ ndị siri ike nghọta. Dị ka ihe atụ, Pọl maara na ndị bi na Rom maara ụdị ịgba ohu dị gburugburu Alaeze Ukwu Rom. N’ezie, o nwere ike ịbụ na ọtụtụ n’ime ndị o degaara akwụkwọ ozi ahụ bụ ndị ohu. N’ihi ya, Pọl ji ịgba ohu mee ihe atụ iji kwado arụmụka ya bụ́ na mmadụ pụrụ ịhọrọ ịnọ n’okpuru mmehie ma ọ bụ ezi omume.—Ndị Rom 6:16-20.

11 Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “N’etiti ndị Rom, nna ukwu nke onye ohu nwere ike ịtọhapụ ya n’anaghị ya ihe ọ bụla, ma ọ bụkwanụ ohu ahụ nwere ike ịzụrụ nnwere onwe ya site n’ịkwụ nna ya ukwu ụgwọ. Ohu nwekwara ike inwere onwe ya ma ọ bụrụ na nna ya ukwu enyefee ya n’aka otu chi.” Ohu nweere onwe ya pụrụ ịnọgide na-arụrụ nna ya ukwu ọrụ, ya ana-akwụkwa ya ụgwọ. Ọ pụrụ ịbụ na Pọl na-ezo aka na nke a mgbe o dere banyere mmadụ ịhọrọ nna ukwu ọ ga-erubere isi—mmehie ma ọ bụ ezi omume. A tọhapụwo Ndị Kraịst nọ na Rom n’agbụ nke mmehie, ọ bụ Chineke nwezi ha. Ha nweere onwe ha ijere Chineke ozi, ma, ha ka pụkwara ịhọrọ ịgbara mmehie—nna ha ukwu mbụ—ohu ma ha chọọ. Ihe atụ ahụ ha maara nke ọma na nke dị mfe nghọta ga-akpali Ndị Kraịst ahụ nọ na Rom ịjụ onwe ha, sị, ‘Olee nna ukwu m na-ejere ozi?’ *

Ịmụta Ihe Site n’Ihe Nlereanya Pọl

12, 13. (a) Olee mgbalị dị mkpa taa iji mee ka ozi anyị ruo ụdị ndị dị iche iche n’obi? (b) Olee ihe ị chọpụtaworo na-adị irè mgbe ị na-ezi ndị si ebe ọzọ ozi ọma?

12 Dị ka Pọl, ka ozi anyị wee ruo ụdị ndị dị iche iche anyị na-ezi ya n’obi, anyị aghaghị ịbụ ndị anya na-eru ala, ndị na-eme mgbanwe iji mee ka okwu anyị kwekọọ n’ọnọdụ e nwere, na ndị na-adị nkọ n’ichepụta ihe. Iji nyere ndị na-ege anyị ntị aka ịghọta ozi ọma ahụ, ọ naghị eju anyị afọ ịga nnọọ n’ụlọ ndị mmadụ iji mezuo iwu, zie ha ozi anyị kwadoro akwado, ma ọ bụ nye ha akwụkwọ e ji amụ Bible. Anyị na-agbalịsi ike ịghọta mkpa ha na nchegbu ha, ihe ndị na-amasị ha na ihe ndị na-adịghị amasị ha, ihe ndị na-atụ ha ụjọ na ihe ndị ha kpọrọ asị. Ọ bụ ezie na nke a na-achọ ichesi echiche ike na itinye mgbalị siri ike, ndị nkwusa Alaeze e nwere gburugburu ụwa ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme otú ahụ. Dị ka ihe atụ, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Hungary na-akọ, sị: “Ụmụnna na-akwanyere omenala na ụzọ ndụ nke ndị si mba ọzọ ùgwù, ha anaghịkwa atụ anya ka ha gbasowe omenala nke obodo a.” Ndịàmà nọ n’ebe ndị ọzọ na-agbalịsi ike ime otu ihe ahụ.

13 N’otu mba dị n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ihe kasị echegbu ọtụtụ mmadụ bụ ahụ́ ike ha, ịzụ ụmụ, na agụmakwụkwọ. Ndị nkwusa Alaeze nọ ebe ahụ na-agbalị ikwu banyere ihe ndị a karịa ikwu banyere ihe ndị dị ka otú ọnọdụ si na-ajọwanye njọ n’ụwa nile ma ọ bụ nsogbu ọha na eze ndị na-esi ike nghọta. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị nkwusa nọ n’otu obodo buru ibu dị na United States chọpụtara na n’otu ebe n’ókèala ha, ihe na-echegbu ndị mmadụ bụ ihe ndị dị ka nrụrụ aka, ụgbọala ijupụta ebe nile, na mpụ. Ndịàmà na-enwe ihe ịga nke ọma n’iji isiokwu ndị a amalite nkwurịta okwu Bible. Ndị nkụzi dị irè na-ejide n’aka na n’agbanyeghị isiokwu ha họọrọ iji mee ihe, na ozi ha na-enye ndị mmadụ olileanya, na-agba ha ume, na-egosi ha na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na-aba uru ugbu a, ha na-ejidekwa n’aka na ozi ha na-ekwu banyere atụmanya na-enye obi ụtọ nke Chineke kwere nkwa ya maka ọdịnihu.—Aịsaịa 48:17, 18; 52:7.

14. Kọwaa ụzọ ndị anyị si eme ka ozi anyị kwekọọ ná mkpa na ọnọdụ dịgasị iche nke ndị mmadụ.

14 Ọ dịkwa mkpa ka anyị na-agbanwetụ otú anyị si ezi ozi ọma n’ihi na omenala mmadụ nile abụghị otu, ọ bụghị otu ebe ka ha nile gụruru akwụkwọ, okpukpe ha dịgasịkwa nnọọ iche. Otú anyị ga-esi ezi onye kweere na e nwere Onye Okike ma ghara ikwere na Bible ozi ọma ga-adị iche n’otú anyị ga-esi zie onye na-ekweghị na Chineke dị. Otú anyị ga-esi gwa onye chere na akwụkwọ okpukpe bụ ihe e ji emegharị mmadụ anya ga-adị iche n’otú anyị ga-esi agwa onye kweere n’ihe Bible na-akụzi. Ọ dịkwa anyị mkpa ịdị na-emetụ mgbanwe n’otú anyị si ezi ozi ọma n’ihi na ebe ndị anyị na-ezi ozi ọma gụruru akwụkwọ dịgasị iche. Ndị nkụzi Bible nwere nkà ga-eji arụmụka na ihe atụ ndị kwekọrọ n’ọnọdụ onye ha na-agwa okwu mgbe ahụ mee ihe.—1 Jọn 5:20.

Enyemaka Dị Ndị Ozi Ọhụrụ Mkpa

15, 16. Gịnị mere e ji nwee mkpa nke ịzụ ndị ọhụrụ malitere ije ozi?

15 Ihe nọ na-echegbu Pọl abụghị nanị imeziwanye otú o si ezi ihe. Ọ hụrụ mkpa ọ dị ịzụ na ịkwadebe ndị ga-anọchi ya, ndị dị ka Timoti na Taịtọs, ịghọ ndị ozi dị irè. (2 Timoti 2:2; 3:10, 14; Taịtọs 1:4) N’otu aka ahụ, taa, e nwekwara mkpa dị ukwuu nke ịzụ ndị mmadụ na inweta ọzụzụ.

16 Na 1914, e nwere ihe dị ka puku ndị nkwusa Alaeze ise n’ụwa nile; taa, a na-eme ihe dị ka puku ndị ọhụrụ ise baptizim kwa izu! (Aịsaịa 54:2, 3; Ọrụ 11:21) Mgbe ndị ọhụrụ malitere iso ọgbakọ Ndị Kraịst akpakọrịta, chọọkwa iso ha na-eje ozi, ọ dị mkpa ka a zụọ ma duzie ha. (Ndị Galeshia 6:6) Ọ dị oké mkpa ka anyị gbasoo ihe nlereanya nke Nna anyị Ukwu, bụ́ Jizọs, setịpụrụ mgbe ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe ma na-enye ha ọzụzụ. *

17, 18. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọhụrụ aka inwe obi ike n’ozi?

17 Ihe Jizọs mere abụghị ịhụ otu ìgwè mmadụ ma gwa ndịozi ya ka ha malite ịgwa ha okwu. O bu ụzọ mesie ike mkpa ọrụ nkwusa ahụ dị ma gbaa ha ume ịdị na-ekpe ekpere banyere ozi ahụ. O nyeziri ha ihe enyemaka atọ bụ́ isi: onye ibe, ókèala, na ozi. (Matiu 9:35-38; 10:5-7; Mak 6:7; Luk 9:2, 6) Anyị pụrụ ime otu ihe ahụ. Ma ànyị na-enyere nwa anyị, onye ọhụrụ anyị na-amụrụ ihe, ma ọ bụ onye na-ejebeghị ozi ruo oge ụfọdụ aka, o kwesịrị ekwesị itinye mgbalị iji nye ya ọzụzụ n’ụzọ dị otú a.

18 Enyemaka dị ndị ọhụrụ mkpa iji nwee obi ike mgbe ha na-ezi ozi Alaeze ahụ. Ị̀ pụrụ inyere ha aka ịkwadebe na ịmụgharị ụzọ iche ihe n’ihu dị mfe ma na-adọrọ mmasị? Mgbe unu nọ n’ozi, zie ozi ọma n’ụlọ ndị mbụ unu rụrụ ka ha wee mụta ihe site n’ihe i mere. Ị pụrụ ime dị ka Gidiọn mere, bụ́ onye sịrị ndị ibe ya ya na ha so na-alụso ndị iro ha ọgụ: “Leenụ m anya, meekwanụ otú a.” (Ndị Ikpe 7:17) Mgbe nke ahụ gasịrị, nye onye ọhụrụ ahụ ohere ka o zie ozi ọma. Jaa ndị ọhụrụ mma n’ihi mgbalị ha, mgbe ọ dịkwa mkpa, tụọrọ ha aro ebe ndị ha ga-emeziwanye ihe.

19. Gịnị ka i kpebisiri ike ime ka ị na-agbalị ‘ijezu ozi gị n’ụzọ zuru ezu’?

19 Iji nwee ike ‘ijezu ozi anyị n’ụzọ zuru ezu,’ anyị kpebisiri ike ịdị na-emekwu mgbanwe iji mee ka ozi anyị kwekọọ n’ọnọdụ ndị anyị na-ezi ozi ọma, anyị chọkwara ịzụ ndị ọhụrụ ka ha na-eme otu ihe ahụ. Mgbe anyị tụlere otú ebumnobi anyị—inye ndị mmadụ ihe ọmụma Chineke nke ga-eduga ha ná nzọpụta—dịruru ná mkpa, anyị na-ekwenyesi ike na mgbalị nile anyị tinyere iji ghọọ “ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ, ka [anyị] wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị” kwesịrị ekwesị.—2 Timoti 4:5; 1 Ndị Kọrint 9:22.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Iji hụ ihe atụ nke àgwà ndị dị otú ahụ n’ozi Pọl, tụlee Ọrụ 13:9, 16-42; 17:2-4; 18:1-4; 19:11-20; 20:34; Ndị Rom 10:11-15; 2 Ndị Kọrint 6:11-13.

^ par. 11 N’otu aka ahụ, mgbe ọ na-akọwa mmekọrịta ọhụrụ dị n’etiti Chineke na “ụmụ” ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, Pọl ji ihe iwu kwadoro, nke doro nnọọ ndị nọ n’Alaeze Ukwu Rom bụ́ ndị o degaara akwụkwọ ozi ya anya, mee ihe. (Ndị Rom 8:14-17) Akwụkwọ bụ́ St. Paul at Rome na-ekwu, sị: “Nkuchi bụ omenala ndị Rom, ọ bụkwa ihe a na-emekarị n’ezinụlọ ndị Rom.”

^ par. 16 Ka ọ dị ugbu a, e nwere usoro ihe omume bụ́ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka n’ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova. N’usoro ihe omume a, ndị ozi oge nile nwere ahụmahụ bụ́ ndị natarala ọzụzụ na-enyere ndị nkwusa na-enwechabeghị ahụmahụ aka.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi ṅomie Pọl n’ozi anyị?

• Olee mgbanwe ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị mee n’ụzọ anyị si eche echiche?

• Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ozi anyị na-ewuli elu?

• Gịnị dị ndị ọhụrụ mkpa iji nwee obi ike?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Pọl onyeozi bụ onye anya na-eru ala, onye pụrụ ime mgbanwe iji mee ka okwu ya kwekọọ n’ọnọdụ e nwere na onye na-adị nkọ n’ichepụta ihe mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma ma na-ezi ihe

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ihe enyemaka atọ bụ́ isi: onye ibe, ókèala, na ozi

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Pọl mere ka okwu ya ruo ụdị ndị dị iche iche n’obi site n’ime ka ozi ya kwekọọ n’ọnọdụ ha

[Foto dị na peeji nke 30]

Ndị ozi dị irè na-echebara omenala nke ndị na-ege ha ntị echiche

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị ozi na-enwe ọganihu na-enyere ndị ọhụrụ aka ịkwadebe maka ozi