Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amagedọn—Ọ̀ Bụ Mbibi Mberede nke Ụwa?

Amagedọn—Ọ̀ Bụ Mbibi Mberede nke Ụwa?

Amagedọn—Ọ̀ Bụ Mbibi Mberede nke Ụwa?

AMAGEDỌN! Okwu a ọ̀ na-eme ka mbibi zuru ụwa ọnụ ma ọ bụ ịgba eluigwe na ụwa ọkụ gbata gị n’obi? Ọ bụ nanị okwu Bible ole na ole ghọrọla okwu a kpụ n’ọnụ dị ka “Amagedọn.” Ọtụtụ ndị ejirila okwu a kọwaa ọnọdụ ọjọọ na-eche ụmụ mmadụ ihu. Ndị na-emepụta ihe nkiri egosila ndị mmadụ ọtụtụ ihe nkiri ndị na-emenye ụjọ banyere “Amagedọn” na-abịa n’ọdịnihu. Ọtụtụ ndị na-ele okwu ahụ anya dị ka ihe omimi, a kọwahiewokwa ya ugboro ugboro. Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ihe a sịrị na ọ pụtara, ihe ka ọtụtụ n’ime ha ekwekọghị n’ihe Bible—bụ́ ebe e si nweta okwu ahụ—na-akụzi banyere Amagedọn.

Ebe ọ bụ na Bible jikọtara Amagedọn na “ọgwụgwụ ụwa,” ị́ gaghị ekweta na ọ dị oké mkpa ịghọta ihe okwu ahụ pụtara nke ọma? (Matiu 24:3, King James Version) Ọ́ gaghịkwa abụ ihe amamihe dị na ya ịga n’isi iyi kasịnụ nke eziokwu, bụ́ Okwu Chineke, iji mata ihe bụ́ Amagedọn na ihe ọ ga-apụtara gị na ezinụlọ gị?

Nnyocha dị otú ahụ ga-egosi na Amagedọn abụghị mbibi mberede nke ụwa, kama na ọ bụ ihe ga-eweta mgbanwe nke ga-eme ka ndị chọrọ ibi ndụ obi ụtọ n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume nwee ike ime otú ahụ. Ị ga-aghọta eziokwu Akwụkwọ Nsọ a dị oké mkpa nke ọma ka ị na-atụle ihe Amagedọn bụ n’ezie n’isiokwu na-esonụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 3]

GỊNỊ KA I CHERE AMAGEDỌN BỤ?

• Oké mgbukpọ site ná ngwá agha ọgwụrụ mba

• Mbibi nke ihe ndị e kere eke ga-akpata

• Nkụkọta nke ụwa na ihe dị na mbara igwe

• Mbibi Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume