Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amagedọn—Oge Mgbanwe nke Ga-eweta Obi Ụtọ

Amagedọn—Oge Mgbanwe nke Ga-eweta Obi Ụtọ

Amagedọn—Oge Mgbanwe nke Ga-eweta Obi Ụtọ

E SI n’okwu Hibru bụ́ “Ha-magedọn,” ma ọ bụ “Ugwu Megido,” nweta okwu ahụ bụ́ “Amagedọn.” Ọ dị ná Mkpughe 16:16, bụ́ ebe na-ekwu, sị: “Ha wee chịkọta ha ọnụ n’ebe a na-akpọ Ha-magedọn n’asụsụ Hibru.” Olee ndị a chịkọtara n’Amagedọn, oleekwa ihe mere e ji chịkọta ha ebe ahụ? Kpọmkwem n’amaokwu abụọ tupu amaokwu a, ná Mkpughe 16:14, anyị na-agụ na a chịkọtara “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi gaa n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” Dị nnọọ ka a pụrụ ịtụ anya ya, okwu ndị ahụ na-ewelite ajụjụ ndị ọzọ na-akpali mmasị. Olee ebe “ndị eze” a ga-anọ lụọ agha? Gịnị ka ha ga-alụrụ agha, ònyekwa ka ha ga-alụso agha? Hà ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba mee ihe, dị ka ọtụtụ ndị na-eche? À ga-enwe ndị ga-alanahụ Amagedọn? Ka Bible zaa ajụjụ ndị a.

Aka Bible zoro ‘n’Ugwu Megido’ ọ̀ pụtara na a ga-alụ agha Amagedọn n’otu ugwu dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa? Ee e. Otu ihe mere o ji ghara ịdị otú ahụ bụ na e nweghịdị ugwu na-aza aha ahụ—ihe dị n’ebe Megido oge ochie dịbu bụ nanị mkpumkpu ebe dị ihe dị ka mita 20 n’elu nke ndagwurugwu ya dị larịị. Ọzọ bụ na ọ dịghị otú gburugburu Megido ga-esi baa ‘ndị eze nile nke ụwa na usuu ndị agha ha.’ (Mkpughe 19:19) Otú ọ dị, a nọ na Megido lụọ agha ndị kasị kpụọ ọkụ n’ọnụ na ndị e ji mara ọkaibe n’akụkọ ihe mere eme nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. N’ihi ya, aha ahụ bụ́ Amagedọn bụ ihe atụ nke agha a ga-eji mara ọkaibe, nke ọ bụ nanị otu onye ga-emeri na ya.—Lee igbe bụ́ “Megido—Ihe Atụ Dabara Adaba,” nke dị na peeji nke 5.

Amagedọn enweghị ike ịbụ agha nkịtị ga-adị n’etiti mba dị iche iche nke ụwa, ebe ọ bụ na Mkpughe 16:14 kwuru na “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ga-ejikọta aka “n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” N’amụma Jeremaịa ji ike mmụọ nsọ buo, o kwuru na “ndị Jehova gburu” ga-ejupụta ebe nile “site n’otu nsọtụ ụwa wee ruo nsọtụ ọzọ nke ụwa.” (Jeremaịa 25:33) N’ihi ya, Amagedọn abụghị agha ụmụ mmadụ ga-alụ n’otu ebe dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Ọ bụ agha Jehova ga-alụ, ọ ga-ezukwa ụwa ọnụ.

Otú ọ dị, rịba ama na ná Mkpughe 16:16, a kpọrọ Amagedọn “ebe.” Na Bible, “ebe” nwere ike ịpụta ọnọdụ—n’ebe a, ọ pụtara na ụwa nile ga-ejikọta aka imegide Jehova. (Mkpughe 12:6, 14) N’Amagedọn, mba nile nke ụwa ga-ejikọ aka imegide “usuu ndị agha nọ n’eluigwe” bụ́ ndị nọ n’okpuru ọchịagha bụ́ “Eze nke ndị eze na Onyenwenụ nke ndị nwenụ,” bụ́ Jizọs Kraịst.—Mkpughe 19:14, 16.

Gịnị banyere ihe ahụ ndị mmadụ na-ekwu bụ́ na Amagedọn ga-abụ mgbukpọ nke a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba gbukpọọ ndị mmadụ, ma ọ bụ na ọ bụ nkụkọta nke ụwa na ihe dị na mbara igwe? Chineke nke na-ahụ n’anya ọ̀ ga ekwe ka ihe a kpọrọ mmadụ na ebe obibi ha bụ́ ụwa si n’ụzọ a na-emenye ụjọ bịa ná njedebe? Ee e. Ọ na-ekwu n’ụzọ doro anya na ya ekeghị ụwa ka ọ “tọgbọrọ n’efu” kama “ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18; Abụ Ọma 96:10) N’Amagedọn, Jehova agaghị eji ọkụ ebibi ụwa anyị a. Kama nke ahụ, ọ ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.

Amagedọn—Olee Mgbe Ọ Ga-abịa?

Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ajụjụ nọgiderela na-agbagwoju ndị mmadụ anya bụ, Olee mgbe Amagedọn ga-abịa? Iji ihe akụkụ ndị ọzọ nke Bible kwuru tụlee akwụkwọ Mkpughe pụrụ inyere anyị aka ịmata mgbe a ga-alụ agha a dị oké mkpa. Mkpughe 16:15 na-ejikọta Amagedọn na ọbịbịa Jizọs ga-abịa dị ka onye ohi. Jizọs jikwa ihe atụ a kọwaa ọbịbịa ya ikpe usoro ihe dị ugbu a ikpe.—Matiu 24:43, 44; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:2.

Dị ka mmezu nke amụma Bible na-egosi, kemgbe 1914, anyị bi n’ụbọchị ndị ikpeazụ nke usoro ihe a. * Ihe ga-egosi na anyị abanyela n’akụkụ ikpeazụ nke ụbọchị ikpeazụ ndị a bụ oge ahụ Jizọs kpọrọ oge “oké mkpagbu.” Bible ekwughị otú oge ahụ ga-aha n’ogologo, ma ọdachi ndị ọ ga-akpata ga-adị njọ karịa ihe ọ bụla ụwa hụtụrụla. Oké mkpagbu ahụ ga-ebi n’Amagedọn.—Matiu 24:21, 29.

Ebe ọ bụ na Amagedọn bụ ‘agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,’ ụmụ mmadụ agaghị eyigharịli ya. Jehova ewepụtala “mgbe a kara aka” agha ahụ ga-amalite. “Ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakuk 2:3.

Chineke nke Ezi Omume Alụọ Agha Ezi Omume

Ma, n’ihi gịnị ka Chineke ga-eji lụọ agha ga-ezu ụwa ọnụ? Amagedọn na otu n’ime àgwà Ya ndị bụ́ isi, bụ́ ikpe ziri ezi, nwere njikọ chiri anya. Bible na-ekwu, sị: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) Ọ hụla ikpe na-ezighị ezi nile e kperela n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ. O doro anya na nke a na-eme ka o wee iwe ezi omume. N’ihi ya, ọ họpụtala Ọkpara ya ịlụ agha ezi omume iji weta ajọ usoro ihe a nile ná njedebe.

Ọ bụ nanị Jehova nwere ike ibu agha bụ́ nnọọ nke ezi omume na nke ga-egbu nanị ndị ajọ omume, bụ́ nke na-agaghị egbu ndị obi ha ziri ezi, ebe ọ bụla ọ sọrọ ha nọrọ n’ụwa. (Matiu 24:40, 41; Mkpughe 7:9, 10, 13, 14) Ọ bụkwa nanị ya nwere ike ịchị ụwa nile, n’ihi na ọ bụ ya kere ya.—Mkpughe 4:11.

Olee ihe ndị Jehova ga-eji bibie ndị iro ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị amaghị. Ihe anyị maara bụ na o nwere ihe ọ ga-eji bibie mba ọjọọ nile kpamkpam. (Job 38:22, 23; Zefanaịa 1:15-18) Otú ọ dị, ndị na-efe Chineke ofufe n’ụwa agaghị eso lụọ agha ahụ. Ọhụụ dị ná Mkpughe isi 19 na-egosi na ọ bụ nanị usuu ndị agha eluigwe ga-eso Jizọs Kraịst lụọ agha ahụ. Ọ dịghị ohu Jehova nọ n’ụwa ga-eso lụọ ya.—2 Ihe E Mere 20:15, 17.

Chineke nke Amamihe Adọọ Ndị Mmadụ Aka ná Ntị Ruo Ogologo Oge

À ga-enwe ndị ga-alanahụ? N’ezie, ọ dịghị onye kwesịrị ịla n’iyi n’Amagedọn. Pita onyeozi kwuru, sị: ‘Jehova achọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) Pọl onyeozi kwukwara na “ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.

Iji mezuo nke ahụ, Jehova ejirila amamihe hụ na a na-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” ahụ n’ụwa nile, n’ọtụtụ narị asụsụ. A na-enye ndị bi n’ebe nile ohere nke ịlanahụ na ịbụ ndị a zọpụtara. (Matiu 24:14; Abụ Ọma 37:34; Ndị Filipaị 2:12) Ndị nabatara ozi ọma ahụ nke ọma pụrụ ịlanahụ Amagedọn ma dị ndụ ebighị ebi n’izu okè n’ime ụwa paradaịs. (Ezikiel 18:23, 32; Zefanaịa 2:3; Ndị Rom 10:13) Nke a ọ́ bụghị ihe mmadụ pụrụ ịtụ anya ya n’aka Chineke onye bụ́ ịhụnanya?—1 Jọn 4:8.

Chineke nke Ịhụnanya Ọ̀ Pụrụ Ịlụ Agha?

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-eche ihe mere Chineke nke bụ́ ịhụnanya n’onwe ya ga-eji bibie ọtụtụ mmadụ. A pụrụ iji ọnọdụ ahụ tụnyere ọnọdụ nke ụlọ chịnchị jupụtara. Í kweghị na onye nwe ụlọ nke maara ihe ọ na-eme ga-echebe ahụ́ ike nke ndị ezinụlọ ya ma mee ha obi ụtọ site n’igbuchapụ chịnchị ndị ahụ?

N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụ ịhụnanya miri emi Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ mere a na-aghaghị iji lụọ agha Amagedọn. Nzube Chineke bụ ime ka ụwa ghọọ paradaịs na ime ka ihe a kpọrọ mmadụ zuo okè ma nọrọ n’udo, n’enweghị “onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:3, 4; Mkpughe 21:4) Gịnịzi ka a ga-eme ndị na-eyi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke mmadụ ibe ha egwu? Chineke ga-ekpochapụrịrị “chịnchị” ndị dị otú ahụ—ndị mmehie na-enweghị nchegharị—n’ihi ndị ezi omume.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:8, 9; Mkpughe 21:8.

Ọ bụ ọchịchị nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè na oké ịhụ mba n’anya na-akpata ọtụtụ esemokwu na mwụfu ọbara a na-enwe taa. (Eklisiastis 8:9) N’ihi ọchịchọ ndị ọchịchị bụ́ ụmụ mmadụ nwere ịmụba ikike ha, ha na-eleghara Alaeze Chineke e guzobeworo eguzobe anya kpamkpam. Ọ dịtụghị ihe na-egosi na ha ga-ahapụrụ Chineke na Kraịst ọchịchị ha. (Abụ Ọma 2:1-9) N’ihi ya, a ga-ewepụrịrị ọchịchị ndị dị otú ahụ ka ọchịchị ezi omume nke Alaeze Jehova nke dị n’aka Kraịst wee nwee ike ịmalite. (Daniel 2:44) A ghaghị ịlụ agha Amagedọn iji kpebie n’ụzọ zuru ezu onye o ruuru ịchị ụwa a na ihe a kpọrọ mmadụ.

Ihe pụtara ìhè Jehova ga-eme n’Amagedọn ga-abụ maka abamuru kasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ka ọnọdụ ụwa na-akawanye njọ, ọ bụ nanị ọchịchị zuru okè nke Chineke ga-egbo mkpa nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ nanị Alaeze ya ga-eme ka e nwee ezi udo na ihe ịga nke ọma. Olee otú ụwa ga-adị ma ọ bụrụ na Chineke emeghị nnọọ ihe ọ bụla? Ọ̀ bụ na ịkpọasị, ime ihe ike, na agha agaghị anọgide na-akpa ihe a kpọrọ mmadụ aka ọjọọ dị nnọọ ka ha nọworo na-eme kemgbe ọtụtụ narị afọ ụmụ mmadụ chịwara? Agha Amagedọn bụ n’ezie otu n’ime ihe ndị kasị mma pụrụ imere anyị!—Luk 18:7, 8; 2 Pita 3:13.

Agha nke Ga-akwụsị Agha Nile

Amagedọn ga-arụzu ihe agha ọ bụla ọzọ na-enwetụbeghị ike ịrụzu—ịkwụsị agha nile. Ọ̀ dị onye na-achọghị ịhụ mgbe agha ga-aghọ ihe mgbe ochie? Otú ọ dị, ụmụ mmadụ enwebeghị ike ịkwụsị agha. Ọdịda dị otú ahụ ụmụ mmadụ daworo ugboro ugboro ịkwụsị agha na-eme ka ọ pụta nnọọ ìhè na ihe Jeremaịa kwuru bụ eziokwu: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Banyere ihe Jehova ga-eme, Bible na-ekwe nkwa, sị: “[Ọ] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esure ụgbọala nile n’ọkụ.”—Abụ Ọma 46:8, 9.

Ka mba dị iche iche nke ụwa ji ngwá agha ọjọọ ha na-egburịta onwe ha ma na-eyi egwu ibibi ụwa, Onye kere ụwa ga-eme ihe—n’Amagedọn nke e kwuru okwu ya na Bible! (Mkpughe 11:18) N’ihi ya, agha a ga-arụzu ihe ndị na-atụ egwu Chineke kemgbe ụwa na-atụ anya ya. Ọ ga-eme ka oruru o ruuru Onye nwe ụwa, bụ́ Jehova Chineke, ịchị ihe nile o kere eke pụta ìhè.

Ya mere, Amagedọn ekwesịghị ịdị na-atụ ndị hụrụ ezi omume n’anya egwu. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka ha nwee olileanya. Agha Amagedọn ga-ewepụ omume ọjọọ na mmebi iwu n’ụwa ma webata usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume n’okpuru ọchịchị Alaeze Mezaịa nke Chineke. (Aịsaịa 11:4, 5) Kama ịbụ mbibi mberede nke ụwa, Amagedọn ga-abụ oge mgbanwe nke ga-ewetara ndị ezi omume ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs obi ụtọ.—Abụ Ọma 37:29.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, isi nke 11, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

MEGIDO—IHE ATỤ DABARA ADABA

Megido oge ochie dị nnọọ n’ebe dị mma, chee ihu n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Jezril na-emepụta nri, n’ebe ugwu Izrel. Ụzọ ndị mba dị iche iche si aga ahịa na agha zutere onwe ha n’ebe ahụ. N’ihi ya, Megido ghọrọ ebe a nọrọ lụọ agha ndị e ji mara ndị bụ́ ọkaibe. Prọfesọ Graham Davies dere n’akwụkwọ ya bụ́ Cities of the Biblical World—Megiddo, sị: “E nwere ọtụtụ okporo ụzọ ndị ahịa na ndị ọbịa pụrụ nnọọ isi bata n’obodo Megido . . . ; ma obodo ahụ nwekwara ike ịchịkwa ọpụpụ na mbata nke ndị na-esi n’okporo ụzọ ndị a aga, n’ihi ya kwa, o nwere ike ịchịkwa ma azụmahịa ma agha. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ bụ ebe . . . a lụrụ ọgụ ugboro ugboro inweta, mgbe e nwetakwara ya, a na-alụsi ọgụ ike ijigide ya.”

Megido malitere iwu ewu na narị afọ iri nke abụọ T.O.A. mgbe onye ọchịchị Ijipt bụ́ Thutmose nke Atọ meriri ndị ọchịchị Kenan n’ebe ahụ. Ọ nọgidere na-ewu ewu n’ime narị afọ ndị sochirinụ ruo na 1918 bụ́ mgbe Ọchịagha Edmund Allenby nke Britain meriri ndị agha Turkey ajọ mmeri n’ebe ahụ. Ọ bụ na Megido ka Chineke kwere ka Onyeikpe Berak merie Eze Jebin nke Kenan ajọ mmeri. (Ndị Ikpe 4:12-24; 5:19, 20) Ọ bụ n’ógbè ahụ ka Onyeikpe Gidiọn meriri ndị Midian ajọ mmeri. (Ndị Ikpe 7:1-22) Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka e gburu Eze Ehazaịa na Eze Josaịa.—2 Ndị Eze 9:27; 23:29, 30.

N’ihi ya, iji Amagedọn atụnyere ógbè ahụ dabara adaba, ebe ọ bụ na a nọrọ ebe ahụ lụọ ọtụtụ agha ndị e ji mata ọkaibe. Ọ bụ ihe atụ dabara adaba nke mmeri zuru ezu Chineke ga-emeri ndị nile na-emegide ya.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Gburugburu ụwa, a na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị ma na-enye ha ohere ịlanahụ Amagedọn

[Foto dị na peeji nke 7]

Amagedọn ga-abụ oge mgbanwe ga-eweta obi ụtọ