Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Good News for People of All Nations

Good News for People of All Nations

Good News for People of All Nations

IHE ahụ dị n’elu bụ akwụkwọ nta e wepụtara ná Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije” nke 2004/2005 nke Ndịàmà Jehova. Otu mbipụta ya nwere peeji 96, o nwekwara ozi dị mkpirikpi n’asụsụ 92, o ji asụsụ Acholi malite ma jiri asụsụ Zulu mechie, e mepụtara ya iji mee ka ozi ọma Alaeze ahụ ruo ọtụtụ mmadụ dị ka o kwere mee. (Matiu 24:14) Ihe ndị na-esonụ bụ ihe atụ nke ihe akwụkwọ nta ahụ na-arụpụta ma e jiri ya mee ihe.

• Mgbe otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà natasịrị akwụkwọ nta ahụ ná mgbakọ distrikti, ha gara n’ogige ntụrụndụ mba atọ. N’ebe ndị ahụ, ha zutere ndị si India, the Netherlands, Pakistan, na Philippines. Onyeisi ezinụlọ ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ndị a nile na-asụtụ Bekee, obi tọrọ ha ụtọ mgbe anyị gosiri ha ozi ahụ n’asụsụ ha n’ihi na ha nọ nnọọ n’ebe dị anya site n’obodo ha. Ọ bịara doo ha anya na ọrụ anyị zuru ụwa nile, nakwa na anyị dị n’otu.”

• Otu Onyeàmà gosiri onye ọrụ ibe ya, bụ́ onye India, akwụkwọ nta ahụ. Obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ hụrụ asụsụ nile dị na ya ma gụọ ozi dị na ya n’asụsụ nke ya. Nke a mere ka ha kwurịtakwuo okwu banyere Bible. Ọ tụrụ onye ọrụ ibe ya ọzọ, bụ́ onye Philippines, n’anya mgbe ọ hụrụ asụsụ ala ya n’akwụkwọ nta ahụ, o nwekwara mmasị ịmatakwu banyere Ndịàmà Jehova.

• Na Canada, otu nwanyị, bụ́ onye Nepal, kwetara ka otu Onyeàmà mụwara ya Bible na fon, ma, ọ chọghị ịgwa nwanna nwanyị ahụ ka ọ bịa n’ụlọ ya. Otú ọ dị, mgbe Onyeàmà ahụ gwara nwanyị ahụ banyere akwụkwọ nta ahụ nwere ozi e dere n’asụsụ Nepali, nwanyị ahụ ji obi ụtọ gwa nwanna nwanyị ahụ ka ọ bịa n’ụlọ ya. Ọ chọrọ nnọọ iji anya ya hụ ebe e dere ozi Bible n’asụsụ ala ya! Kemgbe ahụ, a na-anọzi n’ụlọ nwanyị ahụ amụrụ ya Bible.