Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Àmà nke Ịhụnanya, Okwukwe na Nrubeisi

Ihe Àmà nke Ịhụnanya, Okwukwe na Nrubeisi

Ihe Àmà nke Ịhụnanya, Okwukwe na Nrubeisi

ỤTỤTỤ May 16, 2005, mara nnọọ mma, dị jụụ, anyanwụ ana-awapụtakwa na Watchtower Farms nke dị na Wallkill, New York. Mmiri zoro n’abalị bọtara ụbọchị ahụ mere ka ahịhịa ndị a sụrụ nke ọma na okooko osisi ndị a kụrụ n’ahịrị n’ahịrị na-egbuke egbuke. Otu ọbọgwụ na ụmụ ya asatọ ji nwayọọ nwayọọ na-ese n’elu ọdọ mmiri dị jụụ nke dị n’ebe ahụ. Otú ebe ahụ si maa mma tụrụ ndị ọbịa bịara ebe ahụ n’anya. Ha na-ekwu okwu nwayọọ nwayọọ ka à ga-asị na ha achọghị ime ụ̀zụ̀ n’ụtụtụ ahụ ebe nile dara jụụ.

Ndị ọbịa ahụ bụ Ndịàmà Jehova si mba 48 dị gburugburu ụwa bịa. Ma ihe ha bịara abụghị ikiri ebe ahụ mara mma. Ihe kpọtara ha ebe ahụ bụ ihe a na-eme n’ime otu nnukwu ụlọ e ji brik na-acha uhie uhie wuo, nke bụ́ ụlọ kasị ọhụrụ a gbakwụnyere n’ihe owuwu Betel United States nke dị na Wallkill. Mgbe ha banyere n’ime ụlọ ahụ, ihe a na-eme ebe ahụ tụkwara ha n’anya, ọ bụ ezie na ụ̀zụ̀ dị n’ime ụlọ ahụ.

Ndị ọbịa ahụ si n’otu ebe dị elu letuo anya ma hụ ọtụtụ ígwè ọrụ. A dọbara nnukwu ígwè obibi akwụkwọ ise n’ala siment na-egbuke egbuke nke buru ibu karịa ámá egwuregwu bọl ụkwụ isii. Ọ bụ n’ebe a ka a na-ebipụta Bible, akwụkwọ ukwu na magazin. Nnukwu ùkwù akwụkwọ ndị nke ọ bụla n’ime ha dị ihe dị ka otu puku kilogram na narị asaa n’arọ, nọ na-agba gburugburu dị ka ụkwụ gwongworo na-agba oké ọsọ. Ígwè obibi akwụkwọ ahụ na-ebicha otu ùkwù akwụkwọ nke na-adị kilomita 23 n’ogologo na minit 25 nanị. N’ime oge ahụ, ígwè obibi akwụkwọ ahụ na-eji ink ebi ihe n’akwụkwọ ahụ, mee ka ink ahụ kọọ ma mezie ka akwụkwọ ahụ jụọ oyi ka e wee nwee ike ịpịa ya apịa dị ka magazin bụ́ ndị na-eji ọsọ esi n’ígwè na-ebu akwụkwọ, bụ́ ndị si n’elu gafee, agbaga n’ebe a na-etinye ha na katọn ma buga ha n’ọgbakọ dị iche iche. Ígwè obibi akwụkwọ ndị ọzọ na-anọ nnọọ n’ọrụ, na-ebipụta akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ ukwu, bụ́ ndị a na-ebuba ngwa ngwa n’otu ebe a na-adọba akwụkwọ site n’ala ruo n’uko; ha na-anọ ebe ahụ ruo mgbe a ga-ebuga ha n’ebe ndụkọta akwụkwọ. Ọ bụ kọmputa na-arụ ihe a nile, nke ahụ na-emekwa ka ihe nile na-aga kpọmkwem otú e si hazie ha.

Mgbe ndị ọbịa ahụ si n’ebe obibi akwụkwọ pụta, ha gara n’ebe ndụkọta akwụkwọ. Ígwè ọrụ ndị e nwere ebe a na-emepụta ihe dị ka iri puku ise nke akwụkwọ ndị mkpo ha siri ike na Bible deluxe kwa ụbọchị. A na-ejikọta akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ ukwu, dụkọta ha ọnụ ma bee ha ọnụ. A na-ejikọtazi ha na mkpo ha. A na-etinye akwụkwọ ndị e mechara emecha na katọn. Ọnụ katọn ndị ahụ na-emechi ozugbo, a mapawakwa ha adres nke ebe ha na-aga ma dọba ha n’elu osisi a kụrụ akụ. Ígwè ọrụ ndị na-arụ ọrụ n’akwụkwọ ndị mkpo ha na-esighị ike na-adụkọta ma na-etinye ihe ruru otu narị puku akwụkwọ na katọn n’ụbọchị. E nwekwara ọtụtụ ígwè ọrụ ndị na-arụ ọrụ ebe a—ọtụtụ injin, ígwè ndị na-ebupụ akwụkwọ, ihe ndị e ji agbanwe ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ ígwè ọrụ, wiil, na ụdọ dị iche iche—ha nile na-agba ọsọ dị egwu iji bipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.

Ígwè ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị e nwere n’ebe obibi akwụkwọ ahụ, bụ́ ndị na-arụkọ nnọọ ọrụ ọnụ dị ka akụkụ dị iche iche nke elekere mgbanaka a rụrụ nke ọma, bụ nnọọ ihe ịtụnanya nke nkà na ụzụ nke oge a rụpụtara. Dị ka anyị ga-ahụ, ọ bụkwa ihe àmà nke ịhụnanya, okwukwe na nrubeisi nke ndị Chineke. Ma olee ihe mere e ji si na Brooklyn, New York, bufee ihe nile metụtara ibipụta akwụkwọ na Wallkill?

Otu ihe bụ́ isi kpatara ya bụ iji mee ka obibi akwụkwọ na mbupụ ya dịkwuo mfe site n’ịchịkọta ha nile ọnụ n’otu ebe. Ruo ọtụtụ afọ, a na-anọ na Brooklyn ebipụta ma na-ebupụ akwụkwọ ukwu, ma nọrọ na Wallkill na-ebipụta ma na-ebupụ magazin. Ịchịkọta ọrụ nile ahụ ọnụ otu ebe ga-ebelata ndị ọrụ ma mee ka e jiri ego ndị a raara nye mee ihe n’ụzọ ka mma. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ígwè obibi akwụkwọ ndị e nwere na Brooklyn emewela ochie, a tụrụ ọda ka e si na Germany bubata nnukwu ígwè obibi akwụkwọ ọhụrụ abụọ a na-akpọ MAN Roland Lithoman. Ígwè obibi akwụkwọ ndị a buru oké ibu nke na ha agaghị aba n’ebe obibi akwụkwọ e nwere na Brooklyn.

Jehova Kwadoro Ọrụ Ahụ

Kemgbe, nzube e ji ebipụta akwụkwọ bụ iji mee ka ozi ọma nke Alaeze Chineke gaa n’ihu. O doro anya na Jehova na-agọzi ọrụ a site nnọọ ná mmalite ya. Malite n’afọ 1879 ruo 1922, ọ bụ ụlọ obibi akwụkwọ achụmnta ego biiri anyị akwụkwọ. Na 1922, e nwetara otu ụlọ elu dị okpukpu isii na 18 Concord Street, Brooklyn, ma zụọ ihe ndị e ji ebi akwụkwọ. N’oge ahụ, ụfọdụ nwere obi abụọ ma ụmụnna hà ga-arụlikwa ọrụ ahụ.

Otu n’ime ndị ahụ nwere obi abụọ bụ onyeisi nke ụlọ ọrụ na-ebibu ihe ka ukwuu n’akwụkwọ anyị. Mgbe o letara Concord Street, o kwuru, sị: “Leenụ, unu nwere ígwè obibi akwụkwọ kasị mma e nwere, ma o nweghị onye n’ime unu maara otú e si eji ya arụ ọrụ. N’ime ọnwa isii, ọ ga-emebisị; unu ga-ahụkwa na ndị kwesịrị ịdị na-ebiri unu akwụkwọ bụ ndị ahụ na-ebiburu unu ya ma jiri ya mere aka ọrụ.”

Onye nlekọta ebe obibi akwụkwọ n’oge ahụ, bụ́ Robert J. Martin, kwuru, sị: “Ihe ahụ o kwuru yiri eziokwu, ma o cheghị banyere Onyenwe anyị; ọ dịbeghịkwa mgbe ọ gbahapụrụ anyị. . . . N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ibipụta akwụkwọ.” Site n’oge ahụ ruo afọ 80, Ndịàmà Jehova bipụtara ọtụtụ nde akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ígwè obibi akwụkwọ ndị nke ha.

Mgbe ahụzi, n’October 5, 2002, ná nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, a mara ọkwa na Òtù Na-achị Isi akwadola ka e bufee ọrụ obibi akwụkwọ nile a na-arụ n’alaka United States na Wallkill. A tụọla ọda ígwè obibi akwụkwọ ọhụrụ abụọ, a ga-ebutekwa ha na February 2004. Ọ ga-adị ụmụnna ahụ mkpa ise otú ebe obibi akwụkwọ ahụ ga-adị na iwusa ya ma dị njikere ịnabata ígwè obibi akwụkwọ ọhụrụ ndị ahụ n’ime ọnwa 15. A ga-ahụzi na a dọnyechara ígwè ọrụ nile dị mkpa maka ndụkọta na mbupụ akwụkwọ n’ime ọnwa itoolu. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ nọ na-eche ma ọ̀ ga-ekwekwa omume mgbe ha nụrụ oge e kwuru na a ga-emecha ihe ndị a—o yiri ọrụ na-agaghị ekwe ọrụrụ. Ma ụmụnna ahụ maara na site n’enyemaka Jehova, a ga-emeli ya.

‘Iji Obi Ụtọ Emekọ Ihe Ọnụ’

Ebe ha maara na ndị Jehova ga-enye onwe ha n’afọ ofufo, ụmụnna malitere ọrụ ahụ. (Abụ Ọma 110:3) Ọrụ ahụ buru ibu nke na ndị na-arụ ná ngalaba iwu ihe dị iche iche e nwere na Betel agaghị arụli ya nanị ha. Ihe karịrị otu puku ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị si United States na Canada, bụ́ ndị nwere nkà n’iwu ihe owuwu, wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ nwa oge malite n’otu izu ruo ọnwa atọ. A kpọkwara ndị ozi mba nile na ndị ọzọ na-arụ ọrụ afọ ofufo isonye n’ọrụ ahụ. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè dị iche iche nyekwara aka n’ụzọ dị ukwuu.

Nye ọtụtụ ndị, iwepụta onwe ha maka ọrụ ahụ a na-arụ na Wallkill ga-efu ha nnukwu ego na oge n’ihi ime njem gaa n’ebe ahụ na ịhapụ ọrụ ego ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ha ji ọṅụ chụọ ihe ndị a n’àjà. Inye ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo a ụlọ na nri mere ka ezinụlọ Betel nwee ike itinyekwu onwe ha n’ọrụ iji kwado ọrụ ahụ. Ihe karịrị narị ndị òtù ezinụlọ Betel ise na iri atọ na ise, bụ́ ndị si Brooklyn, Patterson, na Wallkill, wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ ebe ahụ kwa Saturday, tinyere ọrụ ha ndị ha na-arụ n’izu. Nnukwu nkwado ndị Chineke nyere ọrụ a mere ihe akụkọ bụ nanị n’ihi na Jehova na-akwado ọrụ ahụ.

Ndị ọzọ nyere aka n’ụzọ ego. Dị ka ihe atụ, ụmụnna nwetara akwụkwọ ozi site n’aka Abby dị afọ itoolu. O dere, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ n’ọrụ nile unu na-arụ—ibipụta akwụkwọ ndị ahụ magburu onwe ha. Enwere m ike ịbịa leta unu n’oge na-adịghị anya. Papa m sịrị na ọ ga-abụ n’afọ ọzọ! Aga m eyi baajị ka unu wee nwee ike ịmata onye m bụ. Ana m ezitere unu dollar 20 maka ígwè obibi akwụkwọ ọhụrụ ahụ! Ọ bụ ego mmachi akpa m, ma achọrọ m inye ya unu.”

Otu nwanna nwanyị dere, sị: “Biko naranụ onyinye m bụ́ okpu a kpara akpa nke m ji obere aka m abụọ kpaa. Aga m achọ ka e nye ndị na-arụ ọrụ na Wallkill okpu ndị a. Otu akwụkwọ e ji agụ oge kwuru na nnukwu oyi ga-atụ. Amaghị m ma hà kwuru eziokwu ma hà ghara ụgha. Ma amaara m na ọtụtụ ọrụ a ga-arụ na Wallkill ga-abụ n’èzí, achọkwara m ịhụ na ụmụnna m nwere ihe ga na-ekpo ha isi ọkụ. Enweghị m nke ọ bụla n’ime nkà ndị a chọrọ, ma apụrụ m ịkpa ihe, n’ihi ya, ekpebiri m iji nkà a nye aka ruo n’ókè m nwere ike.” O nyere okpu dị otu narị na isii!

A rụchara ebe obibi akwụkwọ ahụ mgbe e mere atụmatụ ịrụcha ya. John Larson, bụ́ onye nlekọta nke ebe obibi akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “Ụmụnna ahụ na-eji nnọọ obi ụtọ emekọ ihe ọnụ. Ònye ga-asị na Jehova agọzighị ọrụ ahụ? Ihe gara nnọọ ngwa ngwa. Echetara m mgbe m guzo n’ájá ụrọ na May 2003, na-ekiri ka ụmụnna na-atọ ntọala ụlọ ahụ. Ihe na-erughị otu afọ, eguzokwa m n’otu ebe ahụ na-ele ka ígwè obibi akwụkwọ ahụ na-arụ ọrụ.”

Ihe Omume Nraranye

E mere ememe nraranye nke ebe obibi akwụkwọ ọhụrụ ahụ, nakwa nke ebe obibi atọ, na Wallkill na Monday, May 16, 2005. Ndị nọ na Betel ndị dị na Patterson na Brooklyn, nakwa nke Canada, nọ na-ekiri ihe omume ahụ na vidio. Ná ngụkọta, puku mmadụ isii na iri anọ na itoolu bịara ihe omume ahụ. Theodore Jaracz, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ onyeisi oche, ọ kọrọ banyere ọrụ obibi akwụkwọ ná mkpirikpi. Ndị so na Kọmitii Alaka, bụ́ John Larson na John Kikot, ji ajụjụ ọnụ na ihe ngosi vidio tụlee akụkọ banyere ma ihe owuwu ahụ ma ihe ndị metụtara obibi akwụkwọ na United States. John Barr, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu ikpeazụ ma rara ebe obibi akwụkwọ ọhụrụ ahụ na ụlọ obibi atọ ndị ọhụrụ ahụ nye Jehova Chineke.

N’ime izu sochirinụ, e nyere ndị Betel si Patterson na Brooklyn ohere ịgagharị gburugburu ebe ọhụrụ ndị ahụ. Ná ngụkọta, puku mmadụ ise, narị itoolu na iri abụọ bịara n’oge ahụ.

Olee Otú Anyị Si Ele Ebe Obibi Akwụkwọ ahụ Anya?

Mgbe Nwanna Barr na-ekwu okwu nraranye, o chetaara ndị na-ege ya ntị na n’agbanyeghị otú ebe obibi akwụkwọ ahụ pụrụ isi na-adọrọ mmasị, ọ bụghị ígwè ọrụ ndị e ji arụ ọrụ na ya mere o ji dị mkpa. Ọ bụ ndị mmadụ mere o ji dị mkpa. Akwụkwọ ndị anyị na-ebipụta na-enwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ ndị mmadụ.

Nke ọ bụla n’ime ígwè obibi akwụkwọ ndị ọhụrụ ahụ pụrụ ibi otu nde traktị nanị n’otu awa! N’agbanyeghị nke ahụ, nanị otu traktị pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, na 1921, otu òtù na-arụzi ụzọ okporo ígwè na South Africa rụụrụ ọrụ ha na-aga n’ogologo ụzọ okporo ígwè. Otu n’ime ha a na-akpọ Christiaan hụrụ otu mpempe akwụkwọ a tụpụrụ n’ụzọ okporo ígwè ahụ. Ọ bụ otu n’ime traktị anyị. Christiaan ji nnọọ mmasị gụọ ya. Ọ gbakwuuru di nwa ya nwanyị ma jiri obi ụtọ gwa ya, sị: “Achọtala m eziokwu ahụ taa!” Obere oge nke ahụ gasịrị, ha detara akwụkwọ na ha chọrọ inwetakwu ihe ọmụma. Alaka ụlọ ọrụ South Africa zigaara ha akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Bible. Mmadụ abụọ ahụ mụrụ ihe, e mee ha baptizim, ha agwakwa ndị ọzọ banyere eziokwu Bible. Ihe si na ya pụta bụ na ọtụtụ mmadụ nabatara eziokwu ahụ. N’ezie, ka ọ na-erule ihe dị ka n’afọ 1991, ihe karịrị otu narị ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha aghọọla Ndịàmà Jehova—ihe a nile mere nanị n’ihi na otu onye hụrụ otu mkpụrụ traktị n’ụzọ okporo ígwè!

Nwanna Barr kwuru na akwụkwọ ndị anyị na-ebipụta na-akpọbata ndị mmadụ n’eziokwu, na-edebe ha n’eziokwu, na-akpali ha ịnụkwu ọkụ n’obi, na-emekwa ka mmekọrịta ụmụnna sikwuo ike. Karịsịakwa, akwụkwọ anyị, bụ́ ndị anyị nile na-eso ekesa, na-enye Chineke anyị, bụ́ Jehova, otuto!

Olee Otú Jehova Si Ele Ebe Obibi Akwụkwọ ahụ Anya?

Nwanna Barr gwakwara ndị na-ege ya ntị ka ha tụlee otú Jehova si ele ebe obibi akwụkwọ ahụ anya. O doro anya na Jehova adabereghị na ya. Ọ pụrụ ime ka nkume zie ozi ọma! (Luk 19:40) Ọzọkwa, otú ígwè ọrụ ndị ahụ dịruru ná mgbagwoju anya, otú ha haruru, ụdị ọsọ ha ji ebipụta akwụkwọ, ma ọ bụ ihe ndị ha nwere ike ime adịghị atụ ya n’anya. Ọ bụ ya kere eluigwe na ala! (Abụ Ọma 147:10, 11) Jehova maara ụzọ ọgbara ọhụrụ ndị a pụrụ isi bipụta akwụkwọ, bụ́ ndị ụmụ mmadụ na-emepụtabeghị, ndị ha na-echetụbeghịkwa n’echiche. Ya mere, olee ihe Jehova na-ahụ nke o ji akpọrọ ihe n’ezie? N’eziokwu, ihe ọ na-ahụ n’ebe obibi akwụkwọ a bụ àgwà ndị dị oké ọnụ ahịa nke ndị ya—ịhụnanya ha, okwukwe ha na nrubeisi ha.

E mere ihe atụ nke ịhụnanya. Nwatakịrị nwanyị meere ndị mụrụ ya keki. O yiri ka ndị mụrụ ya hà ga-enwe obi ụtọ. Ee, otú ọ bụla ọ sọrọ keki ahụ ya dịrị, ihe ga-eme ndị mụrụ nwa ahụ obi ụtọ bụ ịhụnanya nwa ahụ gosiri site n’omume afọ ọma ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe Jehova lere ebe obibi akwụkwọ ọhụrụ ahụ anya, ọ bụghị nanị ụlọ ahụ na ígwè obibi akwụkwọ ahụ ka ọ na-ahụ. N’ụzọ bụ́ isi, ọ na-ahụ ya dị ihe na-egosi ịhụnanya ndị ya nwere n’ebe aha ya dị.—Ndị Hibru 6:10.

Ọzọkwa, dị nnọọ ka Jehova si lee ụgbọ ahụ anya dị ka ngosipụta nke okwukwe Noa, ọ na-ele ebe obibi akwụkwọ a anya dị ka ngosipụta a na-ahụ anya nke okwukwe anyị. Okwukwe na gịnị? Noa nwere okwukwe na ihe Jehova kwuru ga-emezu. Anyị nwere okwukwe na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ, na ozi ọma ahụ bụ ozi kasị mkpa a na-ezi n’ụwa, nakwa na ọ dị ndị mmadụ oké mkpa ịnụ ya. Anyị maara na ozi Bible pụrụ ịzọpụta ndụ.—Ndị Rom 10:13, 14.

Obi abụọ adịghị ya na Jehova na-ahụkwa ngosipụta nke nrubeisi anyị n’ebe obibi akwụkwọ a. Dị ka anyị maara, ọ bụ uche ya na a ga-ekwusa ozi ọma a n’ụwa nile tupu ọgwụgwụ abịa. (Matiu 24:14) Ebe obibi akwụkwọ a na ndị ọzọ dị n’akụkụ dị iche iche nke ụwa, ga-enye aka n’ịrụzu ọrụ ahụ.

Ee, a na-ahụkwa otu ụdị ịhụnanya, okwukwe, na nrubeisi ahụ e gosipụtara n’onyinye ego, n’owuwu, na n’iji ebe obibi akwụkwọ ahụ eme ihe n’ozi ndị Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje n’ebe nile ka ha nọgidere na-akpọsara ndị nile ga-achọ ige ntị eziokwu ahụ.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11]

MGBASAWANYE NKE ỌRỤ OBIBI AKWỤKWỌ NA UNITED STATES

1920: E ji nnukwu ígwè obibi akwụkwọ mbụ anyị bie magazin, na 35 Myrtle Avenue, Brooklyn.

1922: E bufere ebe obibi akwụkwọ n’ụlọ dị okpukpu ise dị na 18 Concord Street. E bipụtawara akwụkwọ ukwu.

1927: E bugara ebe obibi akwụkwọ n’ụlọ ọhụrụ dị na 117 Adams Street.

1949: A rụrụ ụlọ ọzọ dị okpukpu asatọ nke mere ka ebe obibi akwụkwọ ahụ bukwuo ibu okpukpu abụọ.

1956: E mere ka ebe obibi akwụkwọ dị n’Adams Street bukwuo ibu okpukpu abụọ mgbe e wuru ụlọ ọhụrụ na 77 Sands Street.

1967: E wuru ụlọ elu dị okpukpu itoolu, nke mere ka o kwe omume ijikọta ebe obibi akwụkwọ nile ahụ, ma mee ka ụlọ ahụ jiri okpukpu iri karịa otú ọ habu.

1973: E wuru obere ebe obibi akwụkwọ na Wallkill, nke ga na-enyere nke dị adị aka, bụ́ ebe a na-ebipụta nanị magazin.

2004: E buuru ihe nile metụtara obibi akwụkwọ, ndụkọta akwụkwọ na mbupụ akwụkwọ na United States gaa Wallkill.