Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ihe E Mere nke Abụọ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ihe E Mere nke Abụọ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ihe E Mere nke Abụọ

Ọ BỤ Solomọn na-achị Izrel ná mmalite nke akwụkwọ Bible bụ́ Ihe E Mere nke Abụọ. Akwụkwọ ahụ ji okwu ndị a Eze Saịrọs nke Peshia gwara ndị Juu a dọọrọ n’agha nọ na Babilọn mechie: “[Jehova] mekwara m ka m bụrụ onye nlekọta n’iwuru Ya ụlọ n’ime Jeruselem, nke dị na Juda. Ònye nọ n’etiti unu site ná ndị Ya nile? Ka Jehova, bụ́ Chineke ya, nọnyere ya, ya rịgookwa [Jeruselem].” (2 Ihe E Mere 36:23) Akwụkwọ ahụ, nke onye nchụàjà bụ́ Ezra dechara n’afọ 460 T.O.A., kọrọ ihe mere n’ime narị afọ ise—site n’afọ 1037 T.O.A. ruo 537 T.O.A.

Iwu Saịrọs nyere mere ka o kwe ndị Juu omume ịlaghachi Jeruselem ma maliteghachi ofufe Jehova n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ogologo oge ha nọrọ ná ndọrọ n’agha na Babilọn emetụtala ha. Ndị ahụ si ná ndọrọ n’agha lọta amaghị akụkọ ihe mere eme nke mba ha. Akwụkwọ Ihe E Mere nke Abụọ chịkọtaara ha ihe ndị mere n’oge eze ndị sitere n’eriri Devid chịrị. Akụkọ ndị ahụ bakwaara anyị uru n’ihi na ha gosiri ngọzi ndị a na-enweta site n’irubere ezi Chineke isi nakwa ihe ọjọọ ndị na-esi n’inupụrụ ya isi apụta.

OTU EZE EWUORO JEHOVA ỤLỌ

(2 Ihe E Mere 1:1–9:31)

Jehova nyere Eze Solomọn ihe ọ rịọrọ ya—amamihe na ihe ọmụma—tinyekwara akụ̀ na ụba na nsọpụrụ. Eze ahụ wuuru Jehova ụlọ dị ebube na Jeruselem, ndị obodo ya ‘ṅụrịkwara ọṅụ, obi adịkwa ha mma.’ (2 Ihe E Mere 7:10) Solomọn bịara “dị ukwuu karịa eze nile nke ụwa n’akụ̀ na amamihe.”—2 Ihe E Mere 9:22.

Mgbe Solomọn chịsịrị Izrel ruo afọ 40, o ‘sooro nna ya hà dinaa n’ọnwụ, Rehoboam nwa ya ghọkwara eze n’ọnọdụ ya.’ (2 Ihe E Mere 9:31) Ezra edekọghị ndapụ Solomọn dapụrụ n’ezi ofufe. Nanị ihe ndị na-adịghị mma eze ahụ mere o dekọrọ bụ àgwà iberibe ọ kpara site n’ịzụnara ndị Ijipt ọtụtụ ịnyịnya na ịlụ ada Fero. Ya mere, onye dere akwụkwọ Ihe E Mere nke Abụọ lekwasịrị anya n’ihe ndị na-ewuli elu ka ọ na-akọ akụkọ ahụ.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:14—N’ihi gịnị ka usoro ọmụmụ nke onye ọkpụ ọla ahụ nke e kwuru n’ebe a ji dị iche na nke dị ná 1 Ndị Eze 7:14? Ndị Eze nke Mbụ kpọrọ nne ọkpụ ọla ahụ “nwanyị di ya nwụrụ, . . . sitere n’ebo Naftalaị” n’ihi na ọ lụrụ nwoke si n’ebo ahụ. Ma nwanyị ahụ n’onwe ya si n’ebo Dan. Mgbe di ya nwụrụ, ọ lụrụ nwoke onye Taịa, ọ bụkwa nwoke ahụ ka ọ mụụrụ ọkpụ ọla ahụ.

2:18; 8:10—Amaokwu ndị a na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ndị enyemaka e doro ịbụ ndị nlekọta na ndị isi ọrụ bụ puku atọ na narị isii tinyere narị abụọ na iri ise, ebe 1 Ndị Eze 5:16; 9:23 na-ekwu na ha dị puku atọ na narị atọ tinyere narị ise na iri ise. N’ihi gịnị ka ọnụ ọgụgụ ndị ahụ ji dị iche? O yiri ka ebe e nwere ọdịiche ọ̀ bụ n’otú e si kewasịa ndị isi ahụ. Ọ pụrụ ịbụ na Ihe E Mere nke Abụọ gụrụ puku ndị isi atọ na narị isii na-abụghị ndị Izrel iche ma gụọ narị ndị isi abụọ na iri ise bụ́ ndị Izrel iche, ebe Ndị Eze nke Mbụ gụpụrụ puku ndị isi ọrụ atọ na narị atọ ná ndị isi nke ndị isi ndị ọrụ bụ́ ndị dị narị ise na iri ise bụ́ ndị ọkwá ha ka elu. Otú ọ bụla e si gụọ ha, ngụkọta nke ndị isi ọrụ nile bụ puku atọ, narị asatọ na iri ise.

4:2-4—N’ihi gịnị ka e ji kpụnye oké ehi n’ala osimiri ahụ a wụrụ awụ? N’Akwụkwọ Nsọ, oké ehi na-anọchi anya ike. (Ezikiel 1:10; Mkpughe 4:6, 7) Ọ dabara adaba na ọ bụ oké ehi ka a họọrọ iji mee ihe n’ihi na a rụkwasịrị nnukwu “osimiri” ahụ nke dị tọn 30 n’arọ n’elu oké ehi 12 ahụ e ji ọla kọpa kpụọ. Oké ehi a e ji mee ihe ebe a adịghị otú o si mebie iwu nke abụọ ahụ, nke sịrị ka a ghara ịkpụ ihe iji ya mee ihe n’ofufe.—Ọpụpụ 20:4, 5.

4:5—Mmiri ha aṅaa ka osimiri ahụ a wụrụ awụ nwere ike ịba? Ọ bụrụ na a gbajuo ya n’ọnụ, osimiri ahụ nwere ike ịba puku bath mmiri atọ, ma ọ bụ puku lita iri isii na isii. Otú ọ dị, ọ dị ka ọ̀ bụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmiri ga-aba na ya ka a na-agbanyekarị na ya. Ndị Eze nke Mbụ 7:26 na-ekwu, sị: “Nnụ bath ise [iri puku lita anọ na anọ] ka [osimiri ahụ] na-anagide.”

5:4, 5, 10—Olee arịa dịbu n’ụlọikwuu nzute mbụ ahụ nke sokwa n’arịa ndị dị n’ụlọ nsọ Solomọn? Nanị ihe dịbu n’ụlọikwuu nzute mbụ ahụ nke e wefetara n’ụlọ nsọ Solomọn bụ Igbe ahụ. Mgbe e wuchara ụlọ nsọ ahụ, e si na Gibiọn bufee ụlọikwuu nzute ahụ na Jeruselem, ọ dịkwa ka à kwabara ya n’otu ebe n’ebe ahụ.—2 Ihe E Mere 1:3, 4.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:11, 12. Arịrịọ Solomọn gosiri Jehova na amamihe na ihe ọmụma na-agụ eze ahụ agụụ. Ekpere anyị na-ekpegara Chineke na-egosi ihe na-agụ anyị agụụ. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya anyị inyocha ihe anyị na-ekpe n’ekpere.

6:4. Inwe ekele sitere n’obi maka ebere na ịdị mma Jehova kwesịrị ịkpali anyị ịgọzi ya—ya bụ, iji ịhụnanya na obi ekele eto ya.

6:18-21. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ụlọ pụrụ ịba Chineke, ụlọ nsọ ahụ gaje ịbụ ebe a ga na-anọ efe Jehova. Taa, Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova bụ ebe ndị a na-anọ efe Jehova ezi ofufe n’ógbè ọ bụla ha dị.

6:19, 22, 32. Ọ dịghị onye na-enweghị ike ịbịakwute Jehova—site n’eze ruo n’onye kasị nta ná mba ahụ—onye ala ọzọ obi ya dị ọcha nwedịrị ike ịbịakwute ya. *Abụ Ọma 65:2.

USORO NDỊ EZE SI N’ERIRI DEVID

(2 Ihe E Mere 10:1–36:23)

E kewara alaeze Izrel dị n’otu ụzọ abụọ—alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu na alaeze ebo abụọ nke Juda na Benjamin nke dị n’ebe ndịda. Ndị nchụàjà na ndị Livaị nọ n’Izrel nile ji ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ kpọrọ ihe karịa ịhụ mba n’anya ma dụnyere nwa Solomọn bụ́ Rehoboam úkwù. Mgbe ihe karịtụrụ afọ 30 gasịrị ka e wuchara ụlọ nsọ ahụ, a kwakọọrọ ihe ndị dị oké ọnụ ahịa dị na ya.

N’ime ndị eze 19 sochiri Rehoboam, 5 kwesịrị ntụkwasị obi, 3 malitere nke ọma ma mesịa ghọọ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi, otu sikwa n’ụzọ ọjọọ ya chegharịa. Ndị ọchịchị ndị ọzọ nile mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. * E mere ka ihe ndị eze ise ndị tụkwasịrị Jehova obi mere pụta ìhè. Akụkọ nke otú Hezekaịa si mee ka a maliteghachi ozi ndị a na-eje n’ụlọ nsọ na otú Josaịa si hazie oké Ememe Ngabiga aghaghị ịgbawo ndị Juu ahụ chọrọ iweghachi ofufe Jehova na Jeruselem ume.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

13:5—Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ọgbụgba ndụ nnu” pụtara? N’ihi ikike nnu nwere ichekwa ihe, ọ ghọrọ ihe e ji eme ihe atụ nke ihe na-adịgide adịgide na ihe na-adịghị agbanwe agbanwe. N’ihi ya, “ọgbụgba ndụ nnu” na-anọchi anya nkwekọrịta siri ike.

14:2-5; 15:17—Eze Esa ò wepụrụ “ebe nile dị elu”? O yighị ka o mere otú ahụ. O nwere ike ịbụ na Esa wepụrụ nanị ebe ndị dị elu e jikọrọ ha na ofufe nke chi ụgha ma hapụ ndị ndị mmadụ na-anọ na ha efe Jehova. O nwekwara ike ịbụ na e wughachiri ebe ndị dị elu n’akụkụ ikpeazụ nke ọchịchị Esa. Nwa ya nwoke bụ́ Jehoshafat wepụrụ ebe ndị ahụ dị elu. N’ezie, e wepụchaghị ebe ndị ahụ dị elu, ọbụna n’oge ọchịchị Jehoshafat.—2 Ihe E Mere 17:5, 6; 20:31-33.

15:9; 34:6—A bịa n’otú e si kewasịa alaeze Izrel, olee ebe ebo Simiọn kwụ? Ebe ọ bụ na e nyere ebo Simiọn obodo dị iche iche n’ebo Juda, ha bi n’alaeze Juda na Benjamin. (Joshua 19:1) Ma, a bịa n’ihe metụtara ofufe na ọchịchị, ebo ahụ sonyeere alaeze nke ebe ugwu ahụ. (1 Ndị Eze 11:30-33; 12:20-24) N’ihi ya, a gụnyere Simiọn n’alaeze ebo iri ahụ.

16:13, 14—À kpọrọ ozu Esa ọkụ? Ee e, “oké nsure ọkụ dị ukwuu” ahụ na-ezo aka ná nsure nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ọ bụghị n’ịkpọ ozu Esa ọkụ.

35:3—Olee ebe Josaịa si bubata Igbe ahụ n’ụlọ nsọ ahụ? Bible ekwughị ma otu n’ime ndị eze ọjọọ bu Josaịa ụzọ chịa ò bupụrụ Igbe ahụ ka ọ̀ bụ Josaịa bupụrụ ya ka ihe ghara ime ya mgbe a na-arụzigharị ọtụtụ ebe n’ụlọ nsọ ahụ. Nanị ihe ọzọ akụkọ ihe mere eme kwuru banyere Igbe ahụ mgbe ụbọchị Solomọn gasịrị bụ na Josaịa bubatara ya n’ụlọ nsọ ahụ.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

13:13-18; 14:11, 12; 32:9-23. Lee nnukwu ihe amaokwu ndị a na-akụziri anyị banyere mkpa ọ dị ịdabere na Jehova!

16:1-5, 7; 18:1-3, 28-32; 21:4-6; 22:10-12; 28:16-22. Iso ndị mba ọzọ ma ọ bụ ndị na-ekweghị ekwe jikọọ aka na-akpata ọdachi. Ọ ga-abụ ihe amamihe anyị izere iso ndị ụwa na-emekọ ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.—Jọn 17:14, 16; Jems 4:4.

16:7-12; 26:16-21; 32:25, 26. Mpako mere ka Eze Esa kpaa àgwà ọjọọ n’afọ ndị ikpeazụ nke ndụ ya. Mpako dugara n’ọdịda Ụzaịa. Hezekaịa kpara àgwà iberibe, ikekwe bulie onwe ya elu mgbe o gosiri ndị ozi Babilọn ihe ndị dị oké ọnụ ahịa o nwere. (Aịsaịa 39:1-7) Bible na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.”—Ilu 16:18.

16:9. Jehova na-enyere ndị obi ha zuru okè n’ebe ọ nọ aka, ọ na-achọkwa iji ikike ya azọpụta ha.

18:12, 13, 23, 24, 27. Dị ka Maịkaịa, anyị kwesịrị inwe obi ike na nkwuwa okwu mgbe anyị na-ekwu banyere Jehova na nzube ya.

19:1-3. Jehova na-ahụ ebe ndị anyị meziri emezi ọbụna mgbe anyị kpasuru ya iwe.

20:1-28. Anyị nwere ike inwe obi ike na Jehova ga-ekwe ka anyị chọta ya mgbe anyị ji umeala n’obi na-achọ nduzi ya.—Ilu 15:29.

20:17. Ka anyị wee “hụ nzọpụta Jehova,” ọ dị anyị mkpa ‘iguzo onwe anyị’ site n’ịkwadosi Alaeze Chineke ike. Kama ịbọrọ onwe anyị ọ́bọ̀, anyị aghaghị ‘iguzo onwe anyị,’ tụkwasị Jehova obi anyị nile.

24:17-19; 25:14. Ikpere arụsị matara Joash na nwa ya, bụ́ Amazaịa, n’ọnyà. Taa, ikpere arụsị pụkwara ịmata mmadụ n’ọnyà, karịsịa mgbe ọ bịara n’ụdị na-apụtachaghị ìhè dị ka anyaukwu na ịhụ mba n’anya.—Ndị Kọlọsi 3:5; Mkpughe 13:4.

32:6, 7. Anyị onwe anyị kwa aghaghị ịdị ike ma nwee ume ka anyị ‘na-eyikwasị ekike agha zuru ezu nke sitere na Chineke’ ma nọgide na-ebu agha ime mmụọ.—Ndị Efesọs 6:11-18.

33:2-9, 12, 13, 15, 16. Otú mmadụ si egosi na ya echegharịala n’eziokwu bụ ịhapụ ihe ọjọọ ọ na-eme na ịgbalịsi ike ime ihe ziri ezi. Jehova pụrụ imere ọbụna onye mere ihe ọjọọ ka Eze Manase ebere ma ọ bụrụhaala na o ji obi ya nile chegharịa.

34:1-3. Ọnọdụ ọjọọ ọ bụla anyị nọrọ na ya mgbe anyị dị obere ekwesịghị igbochi anyị ịmata Chineke na ijere ya ozi. Ọ pụrụ ịbụ na ezi ihe nlereanya Josaịa nwere mgbe ọ na-eto eto bụ nke nna nna ya chegharịrị echegharị, bụ́ Manase. Ezi ihe nlereanya ọ bụla Josaịa nwere mesịrị rụpụta ezi ihe. Otú ahụ ka ọ pụkwara ịdịrị anyị.

36:15-17. Jehova nwere ọmịiko na ndidi. Otú ọ dị, ọmịiko ya na ndidi ya nwere ebe ha na-ejedebe. Ndị mmadụ aghaghị ịnabata ozi Alaeze ahụ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịdịgide ndụ mgbe Jehova ga-ebibi ajọ usoro ihe a.

36:17, 22, 23. Okwu Jehova na-emezu mgbe nile.—1 Ndị Eze 9:7, 8; Jeremaịa 25:9-11.

Onye Otu Akwụkwọ Kpaliri Ime Ihe

Ihe E Mere nke Abụọ 34:33 na-ekwu, sị: “Josaịa wee si n’ala nile nke ụmụ Izrel nwere wezụga ihe arụ nile, mee ndị nile a hụrụ n’Izrel ka ha fee ofufe, ọbụna ife Jehova, bụ́ Chineke ha.” Gịnị kpaliri Josaịa ime nke a? Mgbe odeakwụkwọ Eze Josaịa bụ́ Shefan wetaara ya akwụkwọ Iwu Jehova ahụ a chọtara ọhụrụ, eze ahụ sịrị ka a gụpụta ya n’olu dara ụda. Ihe Josaịa nụrụ metụrụ ya nnọọ n’ahụ́ nke na o ji ịnụ ọkụ n’obi kwalite ofufe dị ọcha ná ndụ ya nile.

Ịgụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị na-agụta pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ anyị. Ọ̀ bụ na ịtụgharị uche n’akụkọ nke ndị eze sitere n’eriri Devid adịghị agba anyị ume iṅomi ihe nlereanya nke ndị tụkwasịrị Jehova obi na izere àgwà nke ndị na-emeghị otú ahụ? Ihe E Mere nke Abụọ na-akpali anyị iji obi anyị nile fee nanị ezi Chineke ahụ ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. Ozi ya dị ndụ n’ezie ma na-akpa ike.—Ndị Hibru 4:12.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Maka ajụjụ ndị metụtara nraranye nke ụlọ nsọ ahụ na ihe ndị ọzọ anyị pụrụ ịmụta site n’ekpere Solomọn kpere n’ụbọchị ahụ, lee Ụlọ Nche, July 1, 2005, peeji nke 28-31.

^ par. 23 Maka ndepụta nke otú ndị eze Juda si sochie onwe ha, lee Ụlọ Nche, August 1, 2005, peeji nke 12.

[Foto dị na peeji nke 18]

Ị̀ maara ihe mere o ji daba adaba na a kpụnyere oké ehi n’ala osimiri ahụ a wụrụ awụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ọ bụ ezie na e nyechaghịrị Josaịa aka mgbe ọ bụ nwata, o topụtara ma ghọọ onye kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova