Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị ‘Si n’Asụsụ Nile’ Na-anụ Ozi Ọma

Ndị ‘Si n’Asụsụ Nile’ Na-anụ Ozi Ọma

Ndị ‘Si n’Asụsụ Nile’ Na-anụ Ozi Ọma

“Ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile . . . sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zekaraịa 8:23.

1. Olee otú Jehova si mee ka ọrụ nke ikwusara ndị mmadụ ozi ọma bụ́ nke a ga-arụ n’ọtụtụ asụsụ na n’ụwa nile malite n’oge na n’ebe dabara nnọọ adaba?

OGE o mere na ebe ọ nọrọ mee dabara nnọọ adaba. Ọ bụ n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A. Izu ole na ole tupu mgbe ahụ, ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị si ma ọ dịkarịa ala n’ógbè 15 nke Alaeze Ukwu Rom na ebe ndị ọzọ gbakọtara na Jeruselem iji mee Ememe Ngabiga. N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ puku mmadụ n’ime ha nụrụ ka ndị nkịtị bụ́ ndị jupụtara na mmụọ nsọ na-ekwusa ozi ọma n’ọtụtụ asụsụ a na-asụ n’alaeze ukwu ahụ—ha anọghịkwa ná mgbagwoju anya dị ka ndị nụrụ ọtụtụ asụsụ na Bebel oge ochie nọ, kama nke ahụ, ha ghọtara ihe a na-ekwu. (Ọrụ 2:1-12) Ihe omume ahụ kara akara mmalite nke ọgbakọ Ndị Kraịst na mmalite nke ọrụ izi ihe a ga-arụ n’ọtụtụ asụsụ nakwa n’ụwa nile bụ́ nke dịgideworo ruo taa.

2. Na Pentikọst 33 O.A., olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si mee ‘ihe juru ndị na-ege ha ntị anya,’ bụ́ ndị si n’ala dị iche iche bịa?

2 O yiri ka ndị na-eso ụzọ Jizọs hà pụrụ ịsụ Grik nkịtị, nke bụ́ asụsụ ọtụtụ mmadụ na-asụ mgbe ahụ. Ha na-asụkwa Hibru, nke bụ́ asụsụ a na-asụ n’ụlọ nsọ. Otú ọ dị, n’ụbọchị Pentikọst ahụ, ha mere ihe ‘juru ndị na-ege ha ntị anya,’ bụ́ ndị si n’ala dị iche iche bịa, site n’ikwu okwu n’asụsụ ala nna ndị ahụ. Gịnị si na ya pụta? Eziokwu ndị dị oké mkpa ndị ahụ na-ege ha ntị nụrụ n’asụsụ ala nna ha ruru ha n’obi. Tupu chi ejie, ìgwè nta nke ndị ahụ na-eso ụzọ amụbaala ghọọ ìgwè mmadụ bara ụba nke karịrị puku mmadụ atọ!—Ọrụ 2:37-42.

3, 4. Olee otú ọrụ nkwusa ahụ si gbasaa ka ndị ahụ na-eso ụzọ si na Jeruselem, Judia, na Galili na-akwapụ?

3 Obere oge ka ihe omume ahụ dị mkpa gasịrị, mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ tiwapụrụ na Jeruselem, ‘ndị ahụ a chụsasịrị gazukwara ala ahụ, na-akpọsa ozi ọma banyere okwu ahụ.’ (Ọrụ 8:1-4) Dị ka ihe atụ, n’Ọrụ isi 8, anyị na-agụ banyere Filip, bụ́ onye na-ezisa ozi ọma, onye ọ pụrụ ịbụ na ọ na-asụ Grik. Filip ziri ndị Sameria ozi ọma. O zikwara onye ọrụ ọchịchị Etiopia ozi ọma, onye Etiopia ahụ nabatakwara ozi banyere Kraịst.—Ọrụ 6:1-5; 8:5-13, 26-40; 21:8, 9.

4 Ka Ndị Kraịst si na Jeruselem, Judia, na Galili na-akwapụ ịga chọọ ebe ha ga-ebi, ha nwetara ihe mgbochi ndị ọhụrụ ndị dị ka agbụrụ na asụsụ. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha gbaara nanị ndị Juu àmà. Ma Luk onye na-eso ụzọ kọrọ, sị: “E nwere ụfọdụ ndị ikom Saịprọs na Saịrini bụ́ ndị bịara Antiọk ma malite ịgwa ndị na-asụ Grik okwu, na-akpọsa ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.”—Ọrụ 11:19-21.

Chineke Na-adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu Nwere Ozi Ọ Chọrọ Izi Mmadụ Nile

5. Olee otú Jehova si egosi na ya adịghị ele mmadụ anya n’ihu n’ihe metụtara ozi ọma ahụ?

5 Ihe ndị ahụ kwekọrọ n’ụzọ Chineke; ọ dịghị ele mmadụ anya n’ihu. Mgbe Jehova nyesịịrị Pita onyeozi aka ịgbanwe otú o si ele ndị mba ọzọ anya, Pita ji obi ekele kwuo, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35; Abụ Ọma 145:9) Mgbe Pọl onyeozi, bụ́ onye na-akpagbubu Ndị Kraịst, kwuru na ọ bụ ‘uche Chineke ka a zọpụta ụdị mmadụ nile,’ o mesighachiri ya ike na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu. (1 Timoti 2:4) Site n’ime ka o kwe ma nwoke ma nwanyị, ndị si n’agbụrụ nile, mba nile na asụsụ nile, omume inwe olileanya ịba n’Alaeze ya, Onye Okike anyị mere ka ọ pụta ìhè na ya adịghị ele mmadụ anya n’ihu.

6, 7. Olee amụma Bible ndị kwuru na a ga-agbasa ozi ọma ahụ n’ụwa nile nakwa n’ọtụtụ asụsụ?

6 Ọtụtụ narị afọ gara aga, e buru amụma na ozi ọma ahụ ga-agbasaru akụkụ nile nke ụwa. Amụma Daniel kwuru na “e nyere [Jizọs] ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.” (Daniel 7:14) Na a na-ebipụta magazin a n’otu narị asụsụ na iri ise na otu ma na-ekesa ya n’ụwa nile, bụ́ nke na-enyere gị aka ịgụ banyere Alaeze Jehova, na-egosipụta na amụma Bible ahụ na-emezu.

7 Bible buru amụma na oge ga-abịa mgbe ndị na-asụ asụsụ dịgasị iche ga-anụ ozi ya na-enye ndụ. Mgbe Zekaraịa na-akọwa otú ezi ofufe ga-esi dọta ọtụtụ ndị, o buru amụma, sị: ‘Na mgbe ahụ ka ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ́ onye Juu [Onye Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, nke so ‘n’Izrel nke Chineke’], sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.’ (Zekaraịa 8:23; Ndị Galeshia 6:16) Mgbe Jọn onyeozi na-akọkwa ihe ọ hụrụ n’ọhụụ, o kwuru, sị: “Lee! oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:9) Anyị ahụla ka amụma ndị dị otú ahụ na-emezu!

Ikwusara Ụdị Mmadụ Nile Ozi Ọma

8. Olee ihe na-eme eme n’oge a nke chọworo ka anyị mee mgbanwe ụfọdụ n’ọrụ ịgba àmà anyị?

8 Taa, ọnụ ọgụgụ ndị na-akwaga ná mba ọzọ na-ebuwanye ibu. Njikọ ọnụ nke ụwa emewo ka ọ dịrị ọtụtụ mmadụ mfe ịkwaga ebe ọzọ. Ìgwè mmadụ ndị si n’ebe a na-alụ agha na ebe ndị ụkọ ego na-akpa aka ọjọọ na-akwaga n’ebe ndị ka nwee ego, na-achọ ibi ndụ dị mma n’ụzọ ihe onwunwe. N’ọtụtụ ala, nnubata nke ndị mba ọzọ na ndị gbatara ọsọ ndụ emeela ka e nwee ógbè dị iche iche ebe a na-asụ asụsụ mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, na Finland a na-asụ ihe karịrị otu narị asụsụ na iri abụọ; n’Australia a na-asụ ihe karịrị narị asụsụ abụọ. A na-asụ ihe karịrị otu narị asụsụ nanị n’otu obodo dị na United States—San Diego!

9. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele inwe ndị na-asụ asụsụ ndị dị iche n’ókèala anyị anya?

9 Dị ka Ndị Kraịst, ànyị na-ele inwe ndị na-asụ asụsụ ndị dị iche n’ókèala anyị anya dị ka ihe na-egbochi ozi anyị? Ọ dịghị ma ọlị! Kama nke ahụ, anyị na-ele nke a anya dị ka ohere iji gbasawanye ebe ndị anyị na-eje ozi—‘ubi chara acha maka owuwe ihe ubi.’ (Jọn 4:35) Anyị na-agbalịsi ike inyere ndị maara mkpa ime mmụọ ha aka, n’agbanyeghị mba ha si ma ọ bụ asụsụ ha na-asụ. (Matiu 5:3) N’ihi ya, kwa afọ, ọnụ ọgụgụ na-amụbawanye amụbawanye nke ndị ‘na-asụ asụsụ ọ bụla’ na-aghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Mkpughe 14:6) Dị ka ihe atụ, n’August 2004, a nọ na-arụ ọrụ nkwusa ahụ n’ihe dị ka asụsụ 40 na Germany. N’otu oge ahụ, a nọ na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka o ruo asụsụ 30 n’Australia, n’abụghịzi n’asụsụ 18 e ji kwusaa ozi ọma ebe ahụ nanị afọ iri tupu mgbe ahụ. Na Gris, Ndịàmà Jehova ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ asụsụ 20 na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Gburugburu ụwa, ihe dị ka pasent 80 nke Ndịàmà Jehova adịghị asụ Bekee, bụ́ asụsụ a kasị asụ n’ụwa.

10. Gịnị bụ ọrụ onye nkwusa nke ọ bụla n’ime ka ndị nke “mba nile” bụrụ ndị na-eso ụzọ?

10 N’ezie, a na-emezu iwu Jizọs nyere ka e “mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ”! (Matiu 28:19) Ebe Ndịàmà Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi nabata ọrụ ahụ e nyere ha, ha na-arụsi ọrụ ike na narị ala abụọ na iri atọ na ise, na-ekesa akwụkwọ n’ihe karịrị narị asụsụ anọ. Ọ bụ ezie na nzukọ Jehova na-ewepụta akwụkwọ ndị dị mkpa iji mee ka ndị mmadụ nụ ozi ọma ahụ, ndị nkwusa Alaeze n’otu n’otu aghaghị iji aka ha wegara “ụdị mmadụ nile” ozi Bible n’asụsụ ha kasị aghọta. (Jọn 1:7) Mgbalị a a gbakọrọ aka na-eme na-enyere ọtụtụ nde mmadụ na-asụ asụsụ dị iche iche aka irite uru site n’ozi ọma ahụ. (Ndị Rom 10:14, 15) Ee, onye ọ bụla n’ime anyị na-ekere òkè dị oké mkpa na nke a!

Ịnakwere Ihe Ịma Aka Ahụ

11, 12. (a) Olee ihe ịma aka ndị a na-aghaghị imeri, oleekwa otú mmụọ nsọ si enye aka? (b) N’ihi gịnị ka ikwusara ndị mmadụ ozi ọma n’asụsụ ha ji abakarị uru?

11 Taa, ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze ga-achọ ịmụ asụsụ ọzọ, ma ha apụghị ịdabere n’onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ tụọ anya ka Chineke nye ha ya iji mụọ asụsụ ọzọ. (1 Ndị Kọrint 13:8) Ịmụ asụsụ ọhụrụ siri nnọọ ike. Ọ pụrụ ịdị ọbụna ndị mụtarala ịsụ asụsụ na-abụghị nke ha mkpa ịgbanwe otú ha si ele ihe anya na otú ha si ezi ozi ọma iji mee ka ozi Bible ruo n’obi ndị na-asụ asụsụ ahụ ma bụrụ ndị a zụlitere n’ebe ọzọ na n’ebe e nwere omenala dị iche. Ihe ọzọ bụ na ndị si mba ọzọ kwabata ọhụrụ na-emekarị ihere; ọ na-esi nnọọ ike ịghọta otú ha si eche echiche.

12 Ka o sina dị, mmụọ nsọ ka na-arụ ọrụ n’etiti ndị ohu Jehova ka ha na-agbalị inyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka. (Luk 11:13) Kama ime ka anyị mụta asụsụ ọzọ n’ụzọ ọrụ ebube, mmụọ nsọ pụrụ ime ka anyị nwekwuo ọchịchọ nke iso ndị na-adịghị asụ asụsụ anyị na-ekwurịta okwu. (Abụ Ọma 143:10) Ndị mmadụ pụrụ icheta ozi Bible e kwusaara ha ma ọ bụ kụziere ha n’asụsụ ha na-amachaghị. Otú ọ dị, iji mee ka ozi anyị ruo ndị na-ege anyị ntị n’obi, ọ na-akakarị mma iji asụsụ ha—asụsụ na-emetụta ọchịchọ na olileanya ha ndị kasị mie emie.—Luk 24:32.

13, 14. (a) Gịnị na-akpali ụfọdụ izi ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma? (b) Olee otú ndị mmadụ si egosipụta mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà dị otú ahụ?

13 Ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze agawo ije ozi n’ebe ndị a na-asụ asụsụ ọzọ mgbe ha hụrụ na ọtụtụ ndị bi ebe ahụ na-anabata eziokwu Bible. Ndị ọzọ na-enwetakwu ike mgbe ha nwetakwuru ihe ịma aka ha ga-emeri n’ozi ha na mgbe ozi ha na-achọkwu ha ihe n’aka. Otu alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ndịda Europe na-ekwu, sị: “Akpịrị eziokwu na-akpọ ọtụtụ ndị si Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe kwabata nkụ.” Lee ihe na-enye afọ ojuju ọ bụ inyere ndị dị otú ahụ na-anabata ozi ọma ahụ aka!—Aịsaịa 55:1, 2.

14 Otú ọ dị, iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ a, ọ dị anyị mkpa ime mkpebi siri ike na ịchụ onwe anyị n’àjà. (Abụ Ọma 110:3) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ezinụlọ Ndịàmà bụ́ ndị Japan esila n’ezigbo ụlọ ha ndị dị n’obodo ukwu kwaga n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ iji nyere ìgwè ndị na-asụ Chinese kwabatara ebe ahụ aka ịghọta Bible. N’ụsọ oké osimiri ebe ọdịda anyanwụ United States, ndị nkwusa na-akwọ ụgbọala mgbe nile site n’otu awa ruo awa abụọ iji duziere ndị na-asụ Filipino ọmụmụ Bible. Na Norway, otu di na nwunye na-amụrụ otu ezinụlọ bụ́ ndị Afghanistan ihe. Di na nwunye ahụ bụ́ Ndịàmà na-eji mbipụta Bekee na nke Norwegian nke broshuọ ahụ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? * eme ihe. Ezinụlọ ahụ na-agụpụta paragraf ndị ahụ n’asụsụ Persian, bụ́ asụsụ yitụrụ asụsụ ha bụ́ Dari. Ha na-eji Bekee na Norwegian ekwurịta okwu. Mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà na ime mgbanwe dị otú ahụ na-arụpụta ezi ihe mgbe ndị ahụ na-asụ asụsụ ọzọ nabatara ozi ọma ahụ. *

15. Olee otú anyị nile pụrụ isi kere òkè ná mgbalị a a na-eme iji kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ asụsụ?

15 Ì nwere ike ikere òkè n’ọrụ a a na-arụ n’ọtụtụ asụsụ? Gịnị ma ị malite site n’ịchọpụta asụsụ ndị ọzọ a na-asụ n’ókèala gị? Ị pụziri iji traktị ma ọ bụ broshuọ ndị e nwere n’asụsụ ndị ahụ mgbe ị na-eje ozi. Akwụkwọ nta bụ́ Good News for People of All Nations, nke e wepụtara na 2004, enyewo aka n’ịkpọsa olileanya Alaeze ahụ n’ihi ozi dị mfe ma na-eru n’obi dị n’ime ya, bụ́ nke e dere n’ọtụtụ asụsụ.—Lee isiokwu bụ́ “Ozi Ọma Maka Ndị nke Mba Nile,” nke dị na peeji nke 32.

‘Ịhụ Ọbịa n’Anya’

16. Olee otú ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ pụrụ isi gosipụta na ha adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị n’inyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka?

16 Ma ànyị mụtara asụsụ ọzọ ma ọ bụ na anyị amụtaghị, anyị nile pụrụ inye aka n’ịkụziri ndị mba ọzọ nọ n’ógbè anyị ihe ime mmụọ. Jehova nyere ndị ya ntụziaka ka ha ‘hụ ndị ọbịa n’anya.’ (Deuterọnọmi 10:18, 19) Dị ka ihe atụ, n’otu nnukwu obodo dị n’Ebe Ugwu America, e nwere ọgbakọ ise na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe. Dị ka ọ dị n’ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọgbakọ ndị na-amụ ihe n’ụlọ nzukọ ahụ na-agbanwerịta oge ha ji enwe nzukọ kwa afọ, nke ahụ gaara eme ka ndị na-asụ Chinese na-enwe nzukọ ha n’abalị Sunday. Otú ọ dị, nke a ga-apụta na ọtụtụ ndị si mba ọzọ na-arụ ọrụ n’ụlọ nri agaghị abịali nzukọ. Ndị okenye nke ọgbakọ ndị nke ọzọ jiri obiọma mee mgbanwe ụfọdụ ka ọgbakọ Chinese nwee ike inwe nzukọ ha n’oge na Sunday.

17. Olee otú o kwesịrị ịdị anyị mgbe ụfọdụ kpebiri ịga nyere ìgwè na-asụ asụsụ ọzọ aka?

17 Ndị nlekọta na-ahụ n’anya na-aja ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ruru eru ma nwee nkà dị mkpa bụ́ ndị chọrọ ịga nyere ìgwè ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka mma. Ọpụpụ nke ndị nkụzi Bible dị otú ahụ nwere ahụmahụ pụrụ iwute ndị ọgbakọ ha, ma ndị nlekọta ahụ na-ele ihe anya otú ndị okenye nọ na Listra na Aịkoniọm si lee ha anya. Ndị okenye ahụ ejichighị Timoti ka ọ ghara iso Pọl mee njem, ọ bụ ezie na Timoti baara ọgbakọ ha uru. (Ọrụ 16:1-4) Ọzọkwa, ndị na-eduzi ọrụ nkwusa ahụ adịghị ekwe ka otú ndị si mba ọzọ si eche echiche, omenala ha, ma ọ bụ àgwà ha kụda ha mmụọ. Kama nke ahụ, ha na-anabata ha n’agbanyeghị na àgwà ha dị iche, ha na-achọkwa ụzọ isi meta ha enyi n’ihi ozi ọma ahụ.—1 Ndị Kọrint 9:22, 23.

18. Olee ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ e megheere mmadụ nile?

18 Dị ka e buru n’amụma, a na-ekwusa ozi ọma ahụ “n’asụsụ nile nke mba nile.” A ka nwere ọtụtụ ndị mba ọzọ pụrụ ịnabata ozi ọma ahụ. Ọtụtụ puku ndị nkwusa na-agba mbọ abanyewo ‘n’ọnụ ụzọ a buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.’ (1 Ndị Kọrint 16:9) Ma, iji zụlite mmasị e nwere n’ókèala ndị dị otú ahụ, ọ dị ihe ndị ọzọ dị mkpa dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 14 Iji nwetakwuo ihe atụ ndị ọzọ, lee “Obere Àjà Ndị Anyị Chụrụ Wetaara Anyị Ngọzi Dị Ukwuu,” nke dị n’Ụlọ Nche, April 1, 2004, peeji nke 24-28.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jehova site n’inwe àgwà nke eleghị mmadụ anya n’ihu?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị nọ n’ókèala anyị na-adịghị asụ asụsụ anyị anya?

• Olee ihe mere o ji aba uru izi ndị mmadụ ozi ọma n’asụsụ ala nna ha?

• Olee otú anyị pụrụ isi na-echebara ndị si mba ọzọ nọ n’etiti anyị echiche?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Map/Foto dị na peeji nke 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Rom

KRIT

ESHIA

FRIJIA

PAMFILIA

PỌNTỌS

KAPADOSHIA

MESOPOTEMIA

MIDIA

PATIA

ILAM

AREBIA

LIBIA

IJIPT

JUDIA

Jeruselem

[Mmiri]

Oké Osimiri Mediterenian

Oké Osimiri Ojii

Oké Osimiri Uhie

Ọwara Oké Osimiri Peshia

[Foto]

Na Pentikọst 33 O.A., ndị si n’ógbè 15 n’Alaeze Ukwu Rom na ebe ndị ọzọ nụrụ ozi ọma ahụ n’asụsụ nke ha

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ọtụtụ ndị si mba ọzọ na-anabata eziokwu Bible

[Foto dị na peeji nke 25]

Saịn bọọdụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nke e dere n’asụsụ ise