Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Ka Ị Na-erubere Isi—Chineke Ka Ọ Bụ Mmadụ?

Ònye Ka Ị Na-erubere Isi—Chineke Ka Ọ Bụ Mmadụ?

Ònye Ka Na-erubere Isi—Chineke Ka Ọ Bụ Mmadụ?

“Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

1. (a) Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọmụmụ ihe a dabeere na ya? (b) Gịnị mere e ji jide ndịozi ahụ?

Ọ GA-ABỤRỊRỊ na oké iwe ji ndị ọkàikpe nke ụlọikpe kasị elu nke ndị Juu. A na-achọ ndị ha tụrụ mkpọrọ achọ. Ha bụ ndịozi Jizọs Kraịst, bụ́ nwoke ụlọikpe ukwu ahụ mara ikpe ọnwụ izu ole na ole gara aga. Ugbu a, ụlọikpe ahụ dị njikere imesi ụmụazụ ya kasị esochi ya anya ike. Ma mgbe ndị nche gara ịkpụta ha, ha chọpụtara na ọ dịghịzi onye nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ọ bụ ezie na ọnụ ụzọ ya mechiri emechi. Ndị nche ahụ mechara chọpụta na ndịozi ahụ nọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, na-akụziri ndị mmadụ banyere Jizọs Kraịst n’atụghị egwu—nke bụ́ otu ihe ahụ mere e ji jide ha! Ndị nche ahụ gbaara ozugbo gawa n’ụlọ nsọ, jideghachi ndịozi ahụ, ma kpụta ha n’ụlọikpe.—Ọrụ 5:17-27.

2. Olee ihe otu mmụọ ozi nyere ndịozi ahụ iwu ime?

2 Ọ bụ mmụọ ozi tọhapụrụ ndịozi ahụ site n’ụlọ mkpọrọ. Ọ̀ tọhapụrụ ha iji kwụsị mkpagbu a na-akpagbu ha? Ee e. Ọ bụ ka ndị bi na Jeruselem wee nụ ozi ọma banyere Jizọs Kraịst. Ihe mmụọ ozi ahụ gwara ndịozi ahụ bụ ka ha ‘nọgide na-agwa ndị mmadụ okwu nile metụtara ndụ a.’ (Ọrụ 5:19, 20) Ya mere, mgbe ndị nche ụlọ nsọ hụrụ ha, ndịozi ahụ ji nrubeisi na-eme ihe ahụ e nyere ha n’iwu.

3, 4. (a) Mgbe e nyere Pita na Jọn iwu ịkwụsị ikwusa ozi ọma, gịnị ka ha kwuru? (b) Olee ihe ndịozi ndị ọzọ kwuru?

3 Abụọ n’ime ndị nkwusa ahụ obi siri ike, bụ́ ndịozi bụ́ Pita na Jọn, abịala n’ụlọikpe ahụ mbụ, dị ka ọkàikpe ukwu, bụ́ Josef Keifas, ji olu ike chetara ha. O kwuru, sị: “Anyị nyesịrị unu iwu ike ka unu kwụsị ịnọgide na-ezi ihe na-adabere n’aha a [aha Jizọs], n’agbanyeghịkwa nke ahụ, lee! unu emejupụtawo Jeruselem n’ozizi unu.” (Ọrụ 5:28) O kwesịghị iju Keifas anya ịhụ Pita na Jọn ọzọ n’ụlọikpe ahụ. Mgbe mbụ e nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ndịozi abụọ ahụ zara, sị: “Ma ò ziri ezi n’anya Chineke ige unu ntị kama ige Chineke ntị, kpebienụ n’onwe unu. Ma nye anyị, anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụworo ma nụ.” Dị ka onye amụma oge ochie bụ́ Jeremaịa, Pita na Jọn enweghị ike ịkwụsị ịrụ ọrụ nkwusa e nyere ha.—Ọrụ 4:18-20; Jeremaịa 20:9.

4 Ugbu a, ọ bụghị nanị Pita na Jọn, kama ndịozi ahụ nile—gụnyere Mataịas bụ́ onye a họpụtara ọhụrụ—nwere ohere ịgwa ụlọikpe ahụ ebe ha kwụ n’okwu ahụ. (Ọrụ 1:21-26) Mgbe e nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ha onwe ha kwa ji obi ike zaa, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

Chineke Dị Ka Onye Na-achị Achị na Mmadụ Dị Ka Onye Na-achị Achị

5, 6. Gịnị mere na ndịozi ahụ erubeghị isi n’iwu ụlọikpe ahụ?

5 Ndịozi ahụ bụ ndị na-erube isi n’iwu, ha agaghịkwa enupụ isi n’iwu ụlọikpe n’enweghị ezi ihe kpatara ya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú mmadụ ọ bụla siruru n’ike, e nyeghị ya ikike ịmanye onye ọzọ inupụrụ iwu Chineke isi. Jehova bụ “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) Ọ bụghị nanị na ọ bụ “Onyeikpe ụwa nile,” kamakwa ọ bụ Onye Kachasịnụ nke Na-enye Iwu, nakwa Eze mgbe ebighị ebi. Nye Chineke, iwu ụlọikpe ọ bụla nke chọrọ imegide otu n’ime iwu ya abaghị uru.—Jenesis 18:25; Aịsaịa 33:22.

6 Ụfọdụ ndị maara iwu nke ọma ekwenyela n’eziokwu a. Dị ka ihe atụ, William Blackstone bụ́ ọkàikpe bụ́ onye England a ma ama nke narị afọ nke 18 dere na e nweghị iwu mmadụ e kwesịrị ikwe ka o megide “iwu nke mkpughe” nke dị na Bible. Ya mere, ụlọikpe Sanhedrin mere ihe na-erughịrị ya mgbe o nyere iwu ka ndịozi ahụ kwụsị ikwusa ozi ọma. O nwetụghị otú ndịozi ahụ gaara esi rube isi n’iwu ahụ.

7. Gịnị mere ọrụ nkwusa ahụ ji kpasuo ndị isi nchụàjà iwe?

7 Mkpebi siri ike ndịozi ahụ mere ịnọgide na-ekwusa ozi ọma kpasuru ndị isi nchụàjà iwe. Ụfọdụ ndị nchụàjà, gụnyere Keifas n’onwe ya, bụ ndị Sadusii, bụ́ ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. (Ọrụ 4:1, 2; 5:17) N’agbanyeghị nke ahụ, ndịozi ahụ nọgidere na-ekwu na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Tụkwasị na nke ahụ, ụfọdụ n’ime ndị isi nchụàjà agbalịsiela ike inweta ihu ọma ndị ọchịchị Rom. N’oge a na-ekpe Jizọs ikpe, mgbe e nyere ndị isi nchụàjà ohere ịnabata Jizọs dị ka eze ha, ha tiri mkpu, sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ bụghị Siza.” (Jọn 19:15) * Ọ bụghị nanị na ndịozi ahụ na-ekwu na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ, kama ha na-akụzi na e wezụga aha Jizọs, “aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyeworo n’etiti ụmụ mmadụ bụ́ nke a na-aghaghị isi na ya zọpụta anyị.” (Ọrụ 2:36; 4:12) Ndị nchụàjà ahụ na-atụ egwu na ọ bụrụ na ndị mmadụ amalite ile Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ anya dị ka Onye Ndú ha, ndị Rom nwere ike ịbịa ma nara ndị ndú ndị Juu ahụ ‘ma ebe ha ma mba ha.’—Jọn 11:48.

8. Olee ndụmọdụ amamihe dị na ya Gameliel nyere ụlọikpe Sanhedrin?

8 O yiri ka ihe ọ̀ ga-esiri ndịozi Jizọs Kraịst ike n’ọdịnihu. Ndị ọkàikpe Sanhedrin ekpebisiela ike igbu ha. (Ọrụ 5:33) Otú ọ dị, ihe a na-atụghị anya ya mere. Gameliel, onye bụ́ ọkachamara n’Iwu, biliri ọtọ ma dọọ ndị òtù ya aka ná ntị ka ha buru ụzọ chebara ihe ha na-achọ ime echiche. O ji amamihe kwuo, sị: “Ọ bụrụ na atụmatụ a ma ọ bụ ọrụ a sitere n’aka mmadụ, a ga-eme ka ọ daa; ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, unu agaghị enwe ike ime ka ha daa.” N’ụzọ dị ịrịba ama, Gameliel gbakwụnyere, sị: “Ma ọ bụghị ya, a pụrụ ịhụ, ma eleghị anya, na unu bụ n’ezie ndị na-alụso Chineke ọgụ.”—Ọrụ 5:34, 38, 39.

9. Olee ihe na-egosi na ọrụ ndịozi ahụ si n’aka Chineke?

9 N’ụzọ a na-atụghị anya ya, ụlọikpe ahụ nakweere ndụmọdụ Gameliel. Ụlọikpe Sanhedrin “[kpọrọ] ndịozi ahụ, pịa ha ihe, ma nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu na-adabere n’aha Jizọs, wee hapụ ha ka ha laa.” Otú ọ dị, kama ịtụ egwu, ndịozi ahụ kpebisiri ike irube isi n’iwu mmụọ ozi ahụ nyere ha ikwusa ozi ọma. N’ihi ya, mgbe a tọhapụsịrị ha, “kwa ụbọchị . . . , n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, [ndịozi ahụ] nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 5:40, 42) Jehova gọziri mgbalị ha. Ruo n’ókè ha aṅaa? “Okwu Chineke nọgidere na-eto eto, ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ na-eso ụzọ nọgidekwara na-amụba nke ukwuu na Jeruselem.” N’ezie, “oké ìgwè ndị nchụàjà malitekwara irube isi n’okwukwe ahụ.” (Ọrụ 6:7) Lee otú nke ahụ na-aghaghị isiwo gbakaa ndị isi nchụàjà ahụ isi! Ihe àmà nọ na-amụba n’ike n’ike: Ọrụ ndịozi ahụ si n’aka Chineke n’ezie!

Ndị Na-alụso Chineke Ọgụ Agaghị Emeri

10. N’otú mmadụ si ele ihe anya, olee ihe ọ pụrụ ịbụ ya mere Keifas ji nwee obi ike na a gaghị achụtu ya n’ọkwá, ma gịnị mere obi ike ahụ ji hie ụzọ?

10 Na narị afọ mbụ, ọ bụ ndị ọchịchị Rom na-ahọpụta ndị ga-abụ nnukwu ndị nchụàjà ndị Juu. Ọ bụ Valerius Gratus họpụtara aka ji akụ̀ ahụ bụ́ Josef Keifas, ọ nọkwara n’ọkwá ahụ ogologo oge karịa ọtụtụ n’ime ndị buru ya ụzọ. O yiri ka Keifas ò chere na ihe mere o ji ruo n’ọkwá ahụ bụ nkà ya n’iso ndị mba ọzọ emekọrịta ihe na ọbụbụenyi ya na Paịlet kama ịbụ enyemaka Chineke. Otú o sina dị, obi ike o nwere n’ebe mmadụ nọ hiere ụzọ. Nanị afọ atọ ndịozi wụchasịrị n’ụlọikpe Sanhedrin, ihe Keifas malitere iwe ndị ọchịchị Rom iwe, e wepụkwara ya n’ọkwá nnukwu onye nchụàjà.

11. Olee ihe mesịrị mee Pọntiọs Paịlet na usoro ihe ndị Juu, gịnịkwa ka nke a na-eme ka i kwubie?

11 Ọ bụ onye Paịlet na-esote n’ọkwá, bụ́ Lucius Vitellius, gọvanọ nke Siria, nyere iwu ka a napụ Keifas ọkwá ya, ezigbo enyi ya bụ́ Paịlet egbochighịkwa ya. N’ezie, nanị otu afọ ka a chụtusịrị Keifas n’ọkwá, a chụtukwara Paịlet n’ọkwá ma gwa ya ka ọ lọghachi Rom bịa zara ọnụ ya ná nnukwu ebubo ndị e boro ya. Ihe ahụ ndị ndú ndị Juu, bụ́ ndị tụkwasịrị Siza obi, nọ na-atụ ụjọ ya mesịrị mee, ndị Rom weghaara ‘ma ebe ma mba ha.’ Nke a mere n’afọ 70 O.A., mgbe ndị agha Rom bibiri obodo Jeruselem kpamkpam, tinyere ụlọ nsọ ahụ na ụlọ nzukọ Sanhedrin. Lee ka ihe ọbụ abụ ahụ kwuru si bụrụ eziokwu na nke a: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere”!—Jọn 11:48; Abụ Ọma 146:3.

12. Olee otú ihe metụtara Jizọs si gosi na ọ bụ ihe amamihe dị na ya irubere Chineke isi?

12 N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Chineke họpụtara Jizọs Kraịst e si n’ọnwụ kpọlite dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà nke ụlọ nsọ ime mmụọ dị ukwuu. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ iwepụ ya n’ọkwá ahụ. N’ezie, Jizọs “na-anọ n’ọrụ nchụàjà ya n’enweghị ndị na-anọchi ya.” (Ndị Hibru 2:9; 7:17, 24; 9:11) Chineke họpụtakwara Jizọs dị ka Onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. (1 Pita 4:5) Ebe Jizọs nọ n’ọkwá dị otú ahụ, ọ bụ ya ga-ekpebi ma à ga-akpọlite Josef Keifas na Pọntiọs Paịlet n’ọnwụ.—Matiu 23:33; Ọrụ 24:15.

Ndị Nkwusa Alaeze Na-adịghị Atụ Egwu nke Oge A

13. N’oge anyị a, olee ọrụ a chọpụtarala na o si n’aka mmadụ, oleekwa nke a chọpụtarala na o si n’aka Chineke? Olee otú i si mara?

13 N’oge anyị a, dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, e nweela ọtụtụ ‘ndị lụsoro Chineke ọgụ.’ (Ọrụ 5:39) Dị ka ihe atụ, mgbe Ndịàmà Jehova nọ na Germany jụrụ ito Adolf Hitler dị ka Onye Ndú ha, Hitler ṅụrụ iyi ikpochapụ ha. (Matiu 23:10) Ndị agha ya a ma ama n’igbu ọchụ yiri ka hà ga-emeli nke ahụ n’egbughị oge. Ndị Nazi jideliri ọtụtụ puku Ndịàmà ma kpụga ha n’ogige ịta ahụhụ. Ha gbutelidịrị ụfọdụ Ndịàmà. Ma ndị Nazi emelighị ka Ndịàmà mee ihe megidere mkpebi ha ife nanị Chineke, ha ekpochapụlighịkwa ndị ohu Chineke nile. Ọrụ Ndị Kraịst a na-arụ si n’aka Chineke, ọ bụghị n’aka mmadụ, a pụghịkwa ime ka ọrụ Chineke daa. Ka afọ 60 gaferela, ndị ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị dị ndụ pụta n’ogige ịta ahụhụ Hitler ka ‘ji obi ha, mkpụrụ obi ha, na uche ha dum’ na-ejere Jehova ozi, ma Hitler na ndị òtù Nazi ya anwụọla, e jikwa nanị omume ọjọọ ha na-echeta ha.—Matiu 22:37.

14. (a) Olee mgbalị ndị ndị mmegide merela iji kwutọọ ndị ohu Chineke, oleekwa ihe ndị si na ha pụta? (b) Mgbalị ndị ahụ hà ga-akpatara ndị Chineke nsogbu na-adịgide adịgide? (Ndị Hibru 13:5, 6)

14 Kemgbe ndị Nazi mechara mgbalị ndị ahụ ha mere, ndị ọzọ esonyela n’ọgụ ahụ a na-apụghị imeri emeri a na-alụso Jehova na ndị ya. N’ọtụtụ mba ndị dị na Europe, ndị okpukpe na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị aghụghọ agbalịala ime ka e lewe Ndịàmà Jehova anya dị ka ‘òtù nzuzo dị ize ndụ,’ nke bụ́ otu ebubo ahụ e boro Ndị Kraịst narị afọ mbụ. (Ọrụ 28:22) Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Ụlọikpe Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe maara Ndịàmà Jehova dị ka okpukpe, ọ bụghị dị ka òtù nzuzo. Nke a doro nnọọ ndị mmegide ahụ anya. N’agbanyeghị nke ahụ, ha nọgidere na-ekwutọ Ndịàmà. N’ihi aha ọjọọ a a na-enye ha, a chụọla ụfọdụ Ndị Kraịst a n’ọrụ. A kpagbuokwala ụmụ Ndịàmà n’ụlọ akwụkwọ. Ndị nwe ụlọ ụjọ ji achụpụla Ndịàmà n’ụlọ ndị ha jiworo mụọ ihe ruo ọtụtụ afọ. E nweedịla oge ole na ole ụlọ ọrụ gọọmenti jụrụ ime ndị mmadụ ụmụ amaala nanị n’ihi na ha bụ Ndịàmà Jehova! N’agbanyeghị nke ahụ, Ndịàmà adabeghị mbà.

15, 16. Olee ihe Ndịàmà Jehova nọ na France merela banyere mmegide a na-emegide ọrụ ha dị ka Ndị Kraịst, gịnịkwa mere ha ji nọgide na-eme nkwusa?

15 Dị ka ihe atụ, na France, ndị mmadụ na-ejikarị ezi uche eme ihe, ha anaghịkwa eburu ndị ọzọ ihe ọjọọ n’obi. Otú ọ dị, ndị mmegide ole na ole emeela ka e tie iwu ndị ga-emegide ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Olee ihe Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ merela? Ha ejesiwekwuola ozi ubi ike karịa ka ha jetụrụla, ihe ndị ọ rụpụtarala na-enyekwa obi ụtọ. (Jems 4:7) Leenụ, nanị n’ime ọnwa isii, ọnụ ọgụgụ ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible ebe obibi ji nnọọ pasent 33 rịa elu ná mba ahụ! Iwe ga-ewerịrị Ekwensu ịhụ ka ndị nwere obi eziokwu nọ na France na-ege ntị n’ozi ọma ahụ. (Mkpughe 12:17) Ndị Kraịst ibe anyị nọ na France nwere obi ike na ihe a Aịzaịa onye amụma kwuru ga-emezu n’isi ha: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe.”—Aịsaịa 54:17.

16 Obi anaghị atọ Ndịàmà Jehova ụtọ mgbe a na-akpagbu ha. Otú ọ dị, iji rube isi n’iwu Chineke nyere Ndị Kraịst nile, ha agaghị akwụsị ikwu banyere ihe ndị ha nụrụ. Ha na-agbalịsi ike ịbụ ezigbo ụmụ amaala. Otú ọ dị, n’ebe iwu ụmụ mmadụ megidere iwu Chineke, ha aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị.

Atụla Ha Egwu

17. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ ndị iro anyị egwu? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-akpagbu anyị omume?

17 Ndị iro anyị nọ n’ọnọdụ dị nnọọ njọ. Ha na-alụso Chineke ọgụ. N’ihi ya, kama ịtụ ha egwu, anyị kwesịrị ime ihe kwekọrọ n’iwu Jizọs, nke bụ́ ịdị na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu anyị. (Matiu 5:44) Ekpere anyị bụ na ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha na-emegide Chineke n’amaghị ama, dị ka Sọl nke Tasọs, ka Jehova jiri obi ebere meghee anya ha ịhụ eziokwu ahụ. (2 Ndị Kọrint 4:4) Sọl ghọrọ Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi ma taa nnukwu ahụhụ n’aka ndị ọchịchị nke oge ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere na-echetara ndị kwere ekwe ibe ya ka ha na-edo “onwe ha n’okpuru na irubere ọchịchị na ikike dị iche iche isi dị ka ndị na-achị achị, ịdị njikere maka ezi ọrụ ọ bụla, ịghara ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla [ee, ọbụna banyere ndị kasị akpagbu ha], ịghara inwe mmụọ ịlụ ọgụ, ka ha nwee ezi uche, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.” (Taịtọs 3:1, 2) Ndịàmà Jehova nọ na France na n’ebe ndị ọzọ na-agbalị itinye ndụmọdụ a n’ọrụ.

18. (a) Olee ụzọ ndị Jehova pụrụ isi napụta ndị ya? (b) Gịnị ga-emecha si na ya pụta?

18 Chineke gwara Jeremaịa onye amụma, sị: “Gị ka M nọnyeere ịnapụta gị.” (Jeremaịa 1:8) Olee otú Jehova pụrụ isi napụta anyị site ná mkpagbu taa? Ọ pụrụ ime ka e nwee ọkàikpe dị ka Gameliel nke na-adịghị emegbu mmadụ. Ma ọ bụ ya emee ka e wepụ onye ọchịchị ọjọọ ma ọ bụ nke na-emegide ndị Ya na mberede ma jiri onye ka ya nwee ezi uche dochie ya. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, Jehova nwere ike ikwe ka mkpagbu a na-akpagbu ndị ya dịgide. (2 Timoti 3:12) Ọ bụrụ na Chineke ekwe ka a kpagbuo anyị, ọ ga-enye anyị ike ịnagide mkpagbu. (1 Ndị Kọrint 10:13) N’agbanyeghịkwa ihe Chineke kwere ka ọ dakwasị anyị, anyị enweghị obi abụọ banyere ihe ga-emecha si na ya pụta: Ndị na-alụso ndị Chineke ọgụ na-alụso Chineke ọgụ, ndị na-alụso Chineke ọgụ agaghịkwa emeri.

19. Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 2006, oleekwa ihe mere o ji daba adaba?

19 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha tụọ anya mkpagbu. (Jọn 16:33) N’ihi nke a, ihe ahụ e dere n’Ọrụ 5:29 dabara adaba ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” N’ihi ya, a họrọla okwu ndị a na-akpali akpali ịbụ isiokwu dịịrị afọ nke Ndịàmà Jehova n’afọ 2006. Ka anyị kpebisie ike irubere Chineke isi dị ka Onye Na-achị Achị n’afọ na-abịanụ, nakwa ruo mgbe ebighị ebi, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu anyị!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 “Siza” ahụ ndị isi nchụàjà ahụ nakweere n’ihu ọha n’oge ahụ bụ Eze Ukwu Taịbiriọs nke Rom bụ́ onye e ledara anya, onye ihu abụọ na ogbu ọchụ. Ihe ọzọ e ji mara Taịbiriọs bụ omume ọjọọ ya nke ịkwa iko.—Daniel 11:15, 21.

Ị̀ Pụrụ Ịza?

• Olee ihe nlereanya na-agba ume ndịozi ahụ setịpụụrụ anyị site n’otú ha si chee mmegide ihu?

• Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-erubere Chineke isi mgbe nile dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ?

• Ònye n’ezie ka ndị na-emegide anyị na-alụso ọgụ?

• Olee ihe anyị pụrụ ịtụ anya ya maka ndị a na-akpagbu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]

Isiokwu dịịrị afọ 2006 ga-abụ: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29

[Foto dị na peeji nke 19]

“Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ”

[Foto dị na peeji nke 21]

Keifas tụkwasịrị mmadụ obi kama ịtụkwasị Chineke obi