Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịsụgharị Bible Gaa n’Italian—Nsogbu Ndị E Nwere na Ya

Ịsụgharị Bible Gaa n’Italian—Nsogbu Ndị E Nwere na Ya

Ịsụgharị Bible Gaa n’Italian—Nsogbu Ndị E Nwere na Ya

“BIBLE bụ otu n’ime akwụkwọ ndị a kasị ekesa n’obodo anyị [bụ́ Ịtali], ma ikekwe o sokwa n’akwụkwọ ndị ọnụ ọgụgụ kasị ala nke ndị mmadụ na-agụ. A naghị agbakarị ndị chọọchị anyị ume ịmara Bible nke ọma, a naghịkwa enyechara ha aka ịgụ ya dị ka Okwu Chineke. E nwere ndị chọrọ ịmụta Bible, ma mgbe mgbe, a naghị enwe onye ga-akụziri ha ya.”

Ihe a e kwuru ná Nzukọ Òtù Ndị Bishọp Ịtali e nwere na 1995, na-ewelite ọtụtụ ajụjụ. Ọtụtụ ndị hà gụrụ Bible n’Ịtali n’ọtụtụ narị afọ ndị gara aga? Gịnị mere na e kesaghị ya n’Ịtali otú e si kesaa ya ná mba ndị ọzọ? Gịnị mere ọ ka ji soro n’akwụkwọ ọnụ ọgụgụ kasị ala nke ndị mmadụ na-agụ n’Ịtali? Anyị ga-enweta azịza nke ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị a site n’ịtụle otú e si sụgharịa ụfọdụ Bible gaa n’asụsụ Italian n’oge ndị gara aga.

O were ọtụtụ narị afọ tupu asụsụ ndị e si na Latin nweta—French, Italian, Portuguese, Spanish, na ndị ọzọ—agbanye mkpọrọgwụ. Ná mba dị iche iche dị na Europe, bụ́ ebe ndị a na-asụbu Latin, e ji nwayọọ nwayọọ malite ịkwanyere asụsụ obodo, bụ́ asụsụ ndị nkịtị maara nke ọma, ùgwù, ọbụnakwa jiri ha na-ede akwụkwọ. Asụsụ obodo ndị ahụ a malitere na-asụ metụtara nnọọ nsụgharị Bible. N’ụzọ dị aṅaa? Ka oge na-aga, ọdịiche dị n’etiti Latin, bụ́ asụsụ dị nsọ e ji eme ihe na chọọchị, na asụsụ obodo, tinyere olumba ya dị iche iche, bịara buo ibu nke na ndị na-agaghị akwụkwọ apụghịzi ịghọta Latin.

Ka ọ na-erule n’afọ 1000, ọ gaara esiri ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ala ahụ dịịrị banye na mmiri bụ́ Ịtali ike ịgụ Latin Vulgate, ma a sịgodị na ha ga-azụtali ya. Ruo ọtụtụ narị afọ, agụmakwụkwọ, tinyere nke a na-enweta na mahadum ole na ole e nwere mgbe ahụ, dị n’aka ndị isi chọọchị. Ọ bụ nanị mmadụ ole na ole si n’ezinụlọ ndị oké ozu nwetaliri ya. N’ihi ya, Bible ghọziri “akwụkwọ a na-amaghị ama.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ chọrọ inweta Okwu Chineke na ịghọta ya n’asụsụ ha.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị ụkọchukwu megidere ịsụgharị Bible, n’ihi na ha na-atụ ụjọ na ọ ga-eme ka ihe ha kpọrọ ịjụ okwukwe gbasakwuo. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Massimo Firpo si kwuo, “iji asụsụ obodo eme ihe [ga-abụ] iwepụ ihe mgbochi [bụ́ iji asụsụ Latin eme ihe] nke mere ka ọ bụrụ nanị ndị ụkọchukwu na-ekpebi ihe ndị metụtara okpukpe.” Ya mere, omenala, okpukpe, na mmekọrịta mmadụ na ibe ya socha mee ka ndị mmadụ ghara ịma Bible, bụ́ ọnọdụ ka dị n’Ịtali taa.

Nsụgharị Bible Ndị Mbụ Na-ezughị Ezu

A sụgharịrị akwụkwọ Bible ndị mbụ site na Latin gaa n’asụsụ obodo na narị afọ nke 13. Ọ bụ aka ka e ji dee nsụgharị ndị dị otú ahụ na-ezughị ezu, ha dịkwa oké ọnụ. Ọtụtụ nsụgharị pụtakwuru na narị afọ nke 14, nke mere ka ọ fọdụ nke nta ka e nwee akụkụ nile nke Bible n’asụsụ obodo, ọ bụ ezie na ọ bụghị otu onye sụgharịrị ha, ndị sụgharịrị ha nọkwa n’ebe dị iche iche sụgharịa ha, nakwa n’oge dị iche iche. Ọ bụ ndị ọgaranya ma ọ bụ ndị gụrụ akwụkwọ, ndị ọ bụ nanị ha ga-azụtali nsụgharị ndị a, zụrụ ihe ka ọtụtụ ná nsụgharị ndị ahụ a na-amaghị aha ndị sụgharịrị ha. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Gigliola Fragnito si kwuo, ọbụna mgbe iji ígwè obibi akwụkwọ ebipụta akwụkwọ mere ka ọnụ ahịa akwụkwọ dị ala, ọ bụ nanị “mmadụ ole na ole” nwere Bible.

Ruo ọtụtụ narị afọ, ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ mmadụ bụ iti. Ọbụna mgbe e jikọtasịrị Ịtali ọnụ n’afọ 1861, ihe fọrọ nke nta ka o ruo pasent 75 nke ndị bi na ya ka bụ iti. Leenụ, mgbe gọọmenti ọhụrụ e nwere n’Ịtali chọrọ ịmanye mmadụ nile ịgụ akwụkwọ n’efu, Popu Pius nke Itoolu degaara eze ahụ akwụkwọ n’afọ 1870 ma gbaa ya ume ka o megide iwu ahụ, bụ́ nke popu ahụ kọwara dị ka “ihe otiti” e zubere iji “bibie ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik kpamkpam.”

Bible Mbụ A Sụgharịrị Gaa n’Asụsụ Italian

E bipụtara Bible mbụ zuru ezu nke a sụgharịrị gaa n’Italian n’obodo Venice n’afọ 1471, bụ́ ihe dị ka afọ 16 a malitesịrị iji mkpụrụ akwụkwọ ndị a na-edogharị edogharị ebi akwụkwọ na Europe. Nicolò Malerbi, bụ́ onye mọnk nke si Camaldoli, ji ọnwa asatọ sụgharịa ya. Akụkụ ka ukwuu ná nsụgharị ya dabeere ná nsụgharị ndị e nwere mgbe ahụ, o leere anya na Latin Vulgate degharịa ihe ndị dị na ya ma jiri okwu ndị a ma ama n’ógbè ya, bụ́ Venetia, dochie okwu ụfọdụ. Nsụgharị ya bụ Bible mbụ dị n’asụsụ Italian e biri ebi nke e kesara n’ụzọ sara mbara.

Onye ọzọ sụgharịrị Bible na Venice bụ Antonio Brucioli. Ọ bụ onye ọkà ihe ọmụma na-ekwenyechaghị n’okpukpe nke nabatara nkwenkwe ụfọdụ nke ndị Protestant, ma ọ hapụghị Chọọchị Katọlik. Na 1532, Brucioli siri n’asụsụ Hibru na Grik mbụ sụgharịa Bible. Nke a bụ Bible mbụ e si n’ihe odide ndị mbụ sụgharịa gaa n’Italian. Ọ bụ ezie na ọ dịchaghị ka Italian e ji ede akwụkwọ, ọ bụrụ na e buru otú a maruru asụsụ ndị mgbe ochie n’oge ahụ n’uche, onye sụgharịrị ya gbasoro nnọọ ihe dị n’ihe odide ndị mbụ ahụ. Brucioli tinyeghachiri aha Chineke n’ụdị ya bụ́ “Ieova” n’ebe ụfọdụ nakwa ná mbipụta ya ụfọdụ. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ, ndị Protestant Ịtali na ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe ndị e nwere n’oge ahụ nwere nnọọ mmasị na Bible ya.

E bipụtara nsụgharị ndị ọzọ n’Italian—ndị bụ́ n’ezie Bible Brucioli e degharịrị edegharị, ọ bụkwa ndị Katọlik bipụtara ụfọdụ n’ime ha. Ọ dịghị nke e kesara n’ụzọ sara mbara. Na 1607, Giovanni Diodati, bụ́ pastọ chọọchị Calvin, onye ndị mụrụ ya gbagara Switzerland ka a ghara ịkpagbu ha n’ihi okpukpe, nọrọ na Geneva sụgharịa Bible gaa n’Italian site n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya. Nsụgharị ya ghọrọ Bible ndị Protestant Ịtali jiri mee ihe ruo ọtụtụ narị afọ. N’oge e wepụtara ya, e lere ya anya dị ka Bible kasị mma e nwere n’Italian. Bible Diodati nyeere ndị Ịtali aka ịghọta ozizi Bible. Ma mmachibido iwu ndị ụkọchukwu ekweghị ka e kesaa ya na nsụgharị ndị ọzọ n’ụzọ sara mbara.

Bible—“Akwụkwọ A Na-amaghị Ama”

Akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Enciclopedia Cattolica na-ekwu, sị: “Kemgbe ụwa, chọọchị enwewo ihe ịga nke ọma n’ikpebi akwụkwọ ụmụ mmadụ ga-agụ, ma tupu a malite ibipụta akwụkwọ, o cheghị na ọ dị mkpa idepụta akwụkwọ ndị a machibidoro iwu n’ihi na a na-akpọ akwụkwọ ndị e lere anya na ha dị ize ndụ ọkụ.” Ọbụna mgbe Ndozigharị nke Ndị Protestant malitesịrị, ndị ụkọchukwu nọ n’ọtụtụ mba Europe gbasiri mbọ ike ịhụ na akwụkwọ ndị ha sịrị na ha bụ nke ndị jụrụ okwukwe agbasaghị n’ebe nile. Okwu biziiri ọkụ mgbe Nzukọ Ndị Isi Chọọchị e nwere na Trent n’afọ 1546 gasịrị, bụ́ mgbe a tụlere okwu banyere ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ obodo. Ndị isi chọọchị ahụ kewara abụọ. Ndị nke sịrị ka a machibido ya iwu kwuru na ọ bụ Bible e nwere n’asụsụ ndị mmadụ na-asụkarị “kpatara ọjụjụ okwukwe nile e nwerela.” Ndị sịkwaranụ ka a ghara ịmachibido ya iwu kwuru na “ndị iro” ha, bụ́ ndị Protestant, ga-ewere ya na chọọchị ahụ machibidoro ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ obodo dị iche iche iwu iji zochie “aghụghọ ha.”

Enweghị nkwekọrịta a mere ka Ndị Isi Chọọchị ahụ ghara inwe ihe doro anya ha kpebiri, nanị ihe ha meziri bụ ịkwado Vulgate, bụ́ nke ghọrọ Bible Chọọchị Katọlik ji eme ihe, dị ka nsụgharị ziri ezi. Otú ọ dị, Carlo Buzzetti, bụ́ onye na-akụzi na Mahadum Na-azụ Ndị Ụkọchukwu nke Ndị Òtù Salesian, nke dị na Rom, na-ekwu na site n’ịkpọ Vulgate nsụgharị “ziri ezi,” ndị ụkọchukwu ahụ “na-ekwu na ọ bụ ya bụ nanị Bible iwu kwadoro.” Ihe ndị mere mgbe nke a gasịrị mere ka nke a pụta ìhè.

Na 1559, Popu Paul nke Anọ bipụtara ndepụta mbụ nke akwụkwọ ndị a machibidoro iwu, akwụkwọ ndị a gwara ndị Katọlik ka ha ghara ịgụ, ire, ịsụgharị, ma ọ bụ inwe. E lere akwụkwọ ndị a anya dị ka akwụkwọ na-emerụ mmadụ na ndị na-emebi okwukwe na omume ọma. N’ihe ndepụta ahụ, e kwuru ka a ghara ịgụ Bible ndị a sụgharịrị gaa n’asụsụ obodo, tinyere nke ahụ Brucioli sụgharịrị. A na-achụpụ ndị dara iwu a. E denyekwuru ọtụtụ akwụkwọ n’ihe ndepụta nke afọ 1596. A gaghịzi enye mmadụ ikike ịsụgharị ma ọ bụ ibipụta Bible n’asụsụ obodo. A ga-ebibi Bible ndị dị otú ahụ.

N’ihi ya, a maliteziri ịkpọ Bible ọkụ aghara aghara n’ogige chọọchị ka narị afọ nke 16 gasịrị. Ndị mmadụ n’ozuzu malitere ile Akwụkwọ Nsọ anya dị ka akwụkwọ ndị jụrụ okwukwe, ha ka sikwa otú ahụ ele ya anya ruo taa. E bibiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Bible nile na akwụkwọ nile na-akọwa Bible bụ́ ndị dị n’ọ́bá akwụkwọ ọha na eze na ndị ndị mmadụ nwe, ruokwa narị afọ abụọ sochirinụ, ọ dịghị onye Katọlik e kwere ka ọ sụgharịa Bible gaa n’Italian. Nanị Bible ndị e kesara n’ala dịịrị banye na mmiri bụ́ Ịtali—bụ́ ndị e kesara na nzuzo ka a ghara ijichi akwụkwọ ndị ahụ—bụ ndị ndị ọkà mmụta Protestant sụgharịrị. N’ihi ya, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Mario Cignoni na-ekwu, sị: “N’ezie, ndị nkịtị kwụsịrị ịgụ Bible kpamkpam ruo ọtụtụ narị afọ. Bible ghọrọ nnọọ akwụkwọ a na-amaghị ama, ọtụtụ nde ndị Ịtali dịkwara ndụ ma nwụọ n’agụghị ọbụna otu peeji nke Bible.”

E Wepụtụ Ihe Mgbochi Ahụ

Ka e mesịrị, n’iwu Popu Benedict nke Iri na Anọ nyere banyere ihe ndepụta ahụ nke akara ụbọchị ya bụ June 13, 1757, o mezigharịrị iwu mbụ ahụ, ma “nye ohere ka a na-agụ nsụgharị Bible ndị dị n’asụsụ obodo bụ́ ndị Popu kwadoro na ndị ndị bishọp duziri mbipụta ha.” N’ihi ya, Antonio Martini, bụ́ onye mechara ghọọ achịbishọp nke obodo Florence, jikeere ịsụgharị Vulgate. E bipụtara akụkụ ya nke mbụ n’afọ 1769, e bipụtachakwara ya n’afọ 1781. Otu akwụkwọ ndị Katọlik kwuru na nsụgharị Martini bụ “nke mbụ e kwesịrị nnọọ ịkpọtụ aha.” Tupu mgbe ahụ, ndị Katọlik na-adịghị aghọta Latin apụghị ịgụ Bible chọọchị kwadoro. Ruo otu narị na iri afọ ise sochirinụ, ọ bụ nanị nsụgharị nke Martini bụ Bible a kwadoro ka ndị Ịtali na-ekpe Katọlik na-agụ.

Ihe gbanwere ná nzukọ ndị isi chọọchị nke a kpọrọ Vatican nke Abụọ. Na 1965, ihe odide bụ́ Dei Verbum, na nke mbụ ya, gbara ume “ka a sụgharịa Bible . . . gaa n’asụsụ dịgasị iche n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma zie ezie, karịsịa site n’ihe odide ndị mbụ nke akwụkwọ nsọ.” Obere oge tupu mgbe ahụ, na 1958, Pontificio istituto biblico (Ụlọ Akwụkwọ Bible nke Ndị Ụkọchukwu) bipụtara “Bible Katọlik mbụ zuru ezu e si n’ihe odide ndị mbụ sụgharịa.” Mbipụta a weghachiri aha Chineke n’ebe ole na ole n’ụdị ya bụ́ “Jahve.”

Mmegide e megidere ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ obodo kpaghasịrị ihe, a ka na-ahụkwa ihe ndị si na ya pụta ruo taa. Dị ka Gigliola Fragnito si kwuo, ihe ọ rụpụtara bụ “ime ka ndị kwere ekwe gharazie ikwenyesi ike na ha nweere onwe ha iji ọgụgụ isi ha na akọ na uche ha kpebiere onwe ha ihe ha ga-eme.” Tụkwasị na nke ahụ, a manyewo ndị mmadụ ime omenala okpukpe dị iche iche, bụ́ ndị ọtụtụ ndị Katọlik weere dị ka ihe ndị dị mkpa karịa Bible. Ihe a nile emeela ka ndị mmadụ ghara ịma ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị Ịtali nile gụrụ akwụkwọ ugbu a.

Otú ọ dị, ọrụ izisa ozi ọma nke Ndịàmà Jehova emeela ka ndị mmadụ malite inwe mmasị na Bible Italian. Na 1963 Ndịàmà bipụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Italian. Na 1967, ha sụgharịrị Bible dum. E kesawo nsụgharị Bible a ihe karịrị nde anọ nanị n’Ịtali. Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, bụ́ nke weghachiri aha Chineke, bụ́ Jehova, n’ihe odide ya, mere onwe ya ka ọ gbapụ iche n’ihi na ndị sụgharịrị ya sụgharịrị kpọmkwem ihe ihe odide ndị mbụ pụtara.

Ndịàmà Jehova na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-agụrụ ndị nile ga-ege ha ntị ozi olileanya ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ ma na-akọwara ha ya. (Ọrụ 20:20) Mgbe ọzọ i zutere Ndịàmà Jehova, gịnị ma ị gwa ha ka ha jiri Bible nke gị gosi gị ihe Bible kwuru banyere nkwa magburu onwe ya Chineke kwere ime ka e nwee “ụwa ọhụrụ” nke “ezi omume ga-ebi” n’ime ya n’isi nso?—2 Pita 3:13.

[Map/Foto dị na peeji nke 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ROM

Venice

[Foto dị na peeji nke 15]

Brucioli ji aha Chineke bụ́ Ieova mee ihe ná nsụgharị ya

[Foto dị na peeji nke 15]

E denyere Bible ndị a sụgharịrị gaa n’asụsụ obodo n’ihe ndepụta nke akwụkwọ ndị a machibidoro iwu

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 13]

Peeji bu aha Bible: Biblioteca Nazionale Centrale di Roma

[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji nke 15]

Nsụgharị Brucioli: Biblioteca Nazionale Centrale di Roma; Ihe ndepụta: Su concessione del Ministero per i Beni e le Attività Culturali