Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inyere Ndị China Bi na Mexico Aka

Inyere Ndị China Bi na Mexico Aka

Inyere Ndị China Bi na Mexico Aka

“NDỊ ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ́ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Taa, amụma a magburu onwe ya na-emezu n’ụwa nile. Ndị si “n’asụsụ nile nke mba nile” na-ejide Izrel ime mmụọ aka iji fee Jehova Chineke ofufe. Ndịàmà Jehova nwere nnọọ mmasị ná mmezu nke amụma a. Ọtụtụ n’ime ha na-amụ asụsụ ọzọ iji soro n’ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ.

Ndịàmà Jehova nọ na Mexico na-emekwa otú ahụ. E mere atụmatụ na e nwere ihe dị ka iri puku mmadụ atọ na-asụ Chinese na Mexico. Na 2003, mmadụ 15 n’ime ha bịara Ncheta ọnwụ Kraịst bụ́ nke e mere na Mexico City. N’ihi ya, Ndịàmà nọ na Mexico ghọtara na a ka nwere ndị na-asụ Chinese a pụrụ inyere aka n’ụzọ ime mmụọ. Iji nwekwuo ndị nkwusa ga na-ahụ maka ndị a na-asụ Chinese, e guzobere ọmụmụ ihe were ọnwa atọ iji kụziere Ndịàmà bụ́ ndị Mexico ụzọ dị mfe isi zie ozi ọma n’asụsụ Mandarin Chinese. Ná ngụkọta, Ndịàmà 25 gara ihe ọmụmụ asụsụ ahụ. Mgbe ọmụmụ ihe ahụ gasịrị, otu onye ọrụ gọọmenti si n’ógbè na-asụ Mandarin na Mexico City bịara ememe ngụsị akwụkwọ ahụ, nke gosiri mmetụta ọmụmụ ihe ahụ nwere n’ahụ́ ndị na-asụ Chinese. Otu ụlọ akwụkwọ na-akụzi asụsụ Chinese n’ógbè ahụ nyere mmadụ atọ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ ohere ịga mba ofesi iji mụtakwuo Chinese n’efu.

Ọmụmụ asụsụ ahụ gụnyere ịkụziri ha otú e si eji ya ezi ozi ọma. Mgbe ha mụtachara ahịrịokwu ndị dị nnọọ mfe, ụmụ akwụkwọ ahụ malitere ikwusa ozi ọma ozugbo n’asụsụ Chinese n’ógbè azụmahịa dị na Mexico City. Ụmụ akwụkwọ ahụ na-anụ ọkụ n’obi malitere iduziri mmadụ 21 ọmụmụ Bible. Broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, nke e ji mkpụrụ akwụkwọ nkịtị a na-akpọ Pinyin dee n’asụsụ Chinese, nyere nnọọ aka.

Olee otú Ndịàmà ka malitere ịmụ asụsụ Chinese si duzie ọmụmụ Bible? Na mbụ, nanị ihe ha nwere ike ikwu bụ, “Qing Du [Biko gụọ]” ma tụọ aka n’otu paragraf, mesịakwa tụọ aka n’ajụjụ ya. Mgbe onye ahụ gụsịrị paragraf ahụ ma zaa ajụjụ ya n’asụsụ Chinese, ha ga-asị ya, “Shei shei [I meela]” na, “Hen Hao [Ị zatara ya].”

E si otú ahụ malite iduziri otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst elu ọnụ ọmụmụ Bible. Mgbe ha mụsịrị ihe nke ugboro atọ ya, Onyeàmà ahụ nọ na-eche ma nwanyị ahụ ọ̀ ghọtakwara ihe ọ kụziiri ya. Ya mere, Onyeàmà ahụ kpọọrọ nwanna nwoke bụ́ onye China gaa iduzi ọmụmụ ihe ahụ. Mgbe nwanna nwoke ahụ jụrụ nwanyị ahụ ma ò nwere ajụjụ, nwanyị ahụ jụrụ, sị: “M̀ ga-amarịrị otú e si egwu mmiri tupu e mee m baptizim?”

N’oge na-adịghị anya, e hiwere Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nke nkezi ndị na-abịa ya bụ mmadụ 9 na-asụ Chinese na Ndịàmà 23 bụ́ ndị Mexico. Otu n’ime ndị na-abịa nzukọ ahụ bụ otu dọkịta onye China, onye otu n’ime ndị ọ na-agwọ nyere magazin Ụlọ Nche na Teta! n’asụsụ Spanish. Ebe ọ bụ na ọ maghị agụ Spanish, ọ gwara mmadụ ka ọ sụgharịara ya ahịrị ole na ole. Mgbe ọ matara na magazin ahụ na-ekwu banyere Bible, ọ jụrụ onye ahụ ọ na-agwọ ma ò nwere ike inweta magazin ndị ahụ n’asụsụ Chinese. O wetaara ya nke e dere n’asụsụ Chinese, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico mekwara ndokwa ka Onyeàmà na-asụ Chinese gaa leta ya. Mama ya bụ́ onye bi na China nwere Bible, dọkịta ahụ gụkwara ya. Mgbe o kpebiri ịga Mexico, mama ya gwara ya ka ọ ghara ịkwụsị ịgụ Bible. Ya mere, ọ nọ na-ekpe ekpere kemgbe ka mmadụ bịa nyere ya aka ịmụtakwu banyere Chineke nke Bible. O tipụrụ, sị: “Chineke anụla ekpere m!”

Ndị ọzọ na-abịa ọmụmụ akwụkwọ ahụ bụ otu ezinụlọ bụ́ ndị China, ndị bi n’ụlọ otu nwanyị onye Mexico nke ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ọ bụ ezie na ndị ezinụlọ ndị China ahụ anaghị anụcha Spanish, ha na-abịa esonye mgbe ọ bụla a na-enwe nkwurịta okwu Bible. Ka oge na-aga, ezinụlọ ahụ jụrụ Onyeàmà na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ ma ò nwere akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ Chinese. Ka oge na-aga, a malitere iduziri ha ọmụmụ Bible n’asụsụ Chinese. N’oge na-adịghịkwa anya, ezinụlọ ahụ kwuru na ha chọrọ ikwusara ndị obodo ha ozi ọma na ịrara ndụ ha nye Jehova.

Asụsụ Chinese siri ike mmụta n’ezie. Ma, dị ka ahụmahụ ndị a kọrọ n’elu gosiri, site n’enyemaka Jehova, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, gụnyere Chinese, na-amụta ime uche Chineke na Mexico, nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa.

[Foto dị na peeji nke 17]

Na klas ebe a na-amụ asụsụ Chinese na Mexico City

[Foto dị na peeji nke 18]

Ebe Onyeàmà bụ́ onye Mexico na-eduzi ọmụmụ Bible n’asụsụ Chinese

[Foto dị na peeji nke 18]

Ebe e ji asụsụ Chinese ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Mexico City