Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Ezumike Ọ̀ Ga-adị Nnọọ Otú Ị Tụrụ Anya Ya?

Oge Ezumike Ọ̀ Ga-adị Nnọọ Otú Ị Tụrụ Anya Ya?

Oge Ezumike Ọ̀ Ga-adị Nnọọ Otú Ị Tụrụ Anya Ya?

“Peter [Onye Ukwu] nyere iwu ka e kwuo okwuchukwu pụrụ iche maka Afọ Ọhụrụ na chọọchị nile na January 1. Ọzọkwa, o kwuru ka e were akwụkwọ ndụ ndị mara mma chọọ ọnụ ụzọ ụlọ nile mma, o nyekwara iwu ka ụmụ amaala nile nke Moscow ‘gosipụta obi ụtọ ha site n’ịdị na-eji olu dara ụda ekele’ ibe ha n’Afọ Ọhụrụ.”—Akwụkwọ bụ́ Peter the Great—His Life and World.

GỊNỊ ka ị na-atụ anya ya n’oge ọtụtụ mmadụ sị na ọ bụ oge ezumike? Ndị mmadụ gburugburu ụwa na-ekwu na oge a bụ oge Krismas, ụbọchị ọtụtụ ndị kweere na ọ bụ mgbe a mụrụ Kraịst, ma ọ na-agụnyekwa ememe Afọ Ọhụrụ. N’ihi ya, ọ bụ oge ezumike dị ogologo. Ma ndị mụrụ ụmụ ma ụmụ ha anaghị aga ọrụ ma ọ bụ akwụkwọ n’oge a, ya mere, ọ pụrụ iyi oge dabara nnọọ adaba ndị ezinụlọ iji nọrịa. Otú ọ dị, ndị ọzọ na-akpọ oge a “oge Krismas,” ebe ọ bụ na ha na-achọ ịsọpụrụ Kraịst n’oge a n’afọ. Ọ pụrụ ịbụ na ị na-echekwa na nke a bụ ihe kasị mkpa ime n’oge a.

Ma ọ̀ bụ iji sọpụrụ Kraịst, iji soro ezinụlọ ha kporie ndụ, ma ọ bụ ha abụọ, ọtụtụ nde ndị di, nwunye, na ụmụaka gburugburu ụwa na-atụsi anya oge a ike. Oleekwanụ maka afọ a? Ọ̀ ga-abụ oge pụrụ iche nye ezinụlọ gị, ọ̀ ga-abụkwa oge pụrụ iche nye Chineke? Ọ bụrụ na unu ga-enwe nnọkọ ezinụlọ, ọ̀ ga-adị nnọọ otú ị tụrụ anya ya, ka ọ̀ ga-akpatara gị mwute?

Ọtụtụ ndị na-atụ anya na a ga-eji oge a mee ihe metụtara okpukpe na-ahụ na ma ememe Krismas ma nke Afọ Ọhụrụ adịghị nke a na-eji mmụọ Kraịst eme. Kama nke ahụ, oge ezumike ahụ na-aghọ nanị oge e ji anata onyinye, oge e ji eri oriri ndị pụrụ iduga n’ime omume ndị na-adịghị asọpụrụ Kraịst, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ nnọọ oge ndị ezinụlọ ji ahụ onwe ha anya ọzọ. Ọtụtụ mgbe, ihe na-akpaghasị nnọkọ ahụ na-abụ otu onye ma ọ bụ abụọ n’ime ezinụlọ iribiga nri ókè ma ọ bụ ṅụbiga mmanya ókè ma malite arụmụka ndị na-akpatakarị ime ihe ike n’ezinụlọ. O nwere ike ịbụ na ị hụtụla nke ahụ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na o metụla gị.

Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ iyi gị ka ọ dịchabeghị ihe gbanwerenụ kemgbe oge Eze Peter Onye Ukwu nke Russia, bụ́ onye e kwuru banyere ya ná mmalite isiokwu a. Otú a e si eme ememe Krismas na nke Afọ Ọhụrụ ugbu a na-enye ọtụtụ ndị nsogbu n’obi, ọ na-agụkwa ha agụụ ka oge ezumike ahụ bụrụ oge e ji atụgharị uche n’ụzọ miri emi n’ihe ndị metụtara okpukpe na oge ndị ezinụlọ ga-eji na-enwe mkpakọrịta na-ewuli elu. Ụfọdụ na-arụsidị ọrụ ike ịhụ na e nwere mgbanwe, na-ekwu ihe ndị dị ka, Ọ bụ Jizọs ka a na-emere Krismas. Ma ihe ọ̀ pụrụ ịgbanwe? Nke a ọ̀ ga-ewetara Kraịst nsọpụrụ? Ọ̀ dị ihe ndị mere anyị ga-eji lee oge ezumike ahụ anya n’ụzọ dị iche?

Iji nweta azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị a, ka anyị hụ otú otu mba nke nwere ezi ihe mere ọ ga-eji nwee ekele maka oge a n’afọ si lee oge a anya.