Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Krismas—Gịnị Ka A Na-eme na Ya?

Oge Krismas—Gịnị Ka A Na-eme na Ya?

Oge Krismas—Gịnị Ka A Na-eme na Ya?

NYE ọtụtụ nde mmadụ, oge ezumike bụ oge iji soro ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha nọkọọ, oge iji wuliteghachi mmekọrịta ịhụnanya. Ọtụtụ ndị ọzọ na-ele ya anya dị ka oge iji tụgharịa uche n’ọmụmụ Jizọs Kraịst na òkè o keere ná nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ. Russia dị iche n’ọtụtụ ala ndị ọzọ, n’ihi na ọ dị mgbe a na-adịghị ekwe ka ndị bi na ya gbaa Krismas. Ọ bụ ezie na Chọọchị Ọtọdọks nke Russia gbara Krismas n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla ruo ọtụtụ narị afọ, e kweghị ka ha mee otú ahụ n’akụkụ ka ukwuu nke narị afọ nke 20. Gịnị mere ihe ji gbanwee?

Obere oge ka Mgbanwe Ọchịchị Kọmunist nke Bolshevik, bụ́ nke e mere na 1917, gasịrị, ndị ọchịchị Soviet gbalịsiri ike ime ka ndị nile bi ná mba ahụ kwụsị ikwere na Chineke. A malitere ile oge ezumike Krismas na ememe okpukpe ndị e ji mara ya anya ọjọọ. Gọọmenti malitere imegide ma ememe Krismas ma nke Afọ Ọhụrụ. A katọdịrị ihe ndị e ji agba Krismas ná mba ahụ n’ihu ọha—osisi Krismas na Ded Moroz, ma ọ bụ Nna Nna Frost, nke bụ́ Fada Krismas ndị Russia.

Na 1935, ihe gbanwere na Russia bụ́ nke gbanwere nnọọ otú ndị mba ahụ si eme ememe oge ezumike ahụ. Ndị Soviet maliteghachiri inwe Nna Nna Frost, osisi oge ezumike, na ime ememe Afọ Ọhụrụ—ma n’ụzọ dịzi nnọọ iche n’otú ha sibu eme ya. E kwuru na Nna Nna Frost ga na-enye ndị mmadụ onyinye n’Ụbọchị Afọ Ọhụrụ, ọ bụghịzi n’ụbọchị Krismas. A gaghịzikwa adị na-enwe osisi Krismas. Ọ ga-abụzi osisi Afọ Ọhụrụ! Oge ezumike si nnọọ otú a gbanwee na Soviet Union. E jizi ememe Afọ Ọhụrụ dochie ememe Krismas.

Oge Krismas ghọziri nanị oge ememe ndị ọrụ, ndị ọchịchị kwụsịkwara nnọọ ile ya anya dị ka oge e ji eme ememe okpukpe. Kama iji ihe ndị metụtara okpukpe achọ osisi Afọ Ọhụrụ mma, a malitere iji ihe ndị na-egosi ọganihu ọchịchị Soviet Union achọ ya mma. Akwụkwọ Russia bụ́ Vokrug Sveta (Gburugburu Ụwa) na-akọwa, sị: “Mmadụ nwere ike ịmata mgbe ọchịchị Kọmunist malitere site n’ile ihe ndị e ji chọọ osisi Afọ Ọhụrụ mma n’afọ dị iche iche n’oge ọchịchị ndị Soviet. Tinyere ụmụ òké Bekee, ihe ndị na-egbuke egbuke, na ógbè achịcha, bụ́ ndị a na-ahụ ebe nile, e webatara mma owuwe ihe ubi, hama, na ụgbọala traktọ n’ihe ndị e ji achọ osisi Afọ Ọhụrụ mma. E mesịrị jiri ihe ọkpụkpụ nke ndị na-egwu ọlaedo, ndị na-aga na mbara igwe, ihe ndị e ji egwupụta mmanụ n’ala, rọket, na ụgbọ ndị e ji aga n’ọnwa dochie ha.”

Gịnịkwanụ banyere Ụbọchị Krismas n’onwe ya? N’ezie, a nabataghị ya. Kama nke ahụ, ndị ọchịchị Soviet mere ka ọ bụrụ ụbọchị ọrụ. Ndị chọrọ ime ememe okpukpe ahụ bụ́ Krismas na-eji akọ eme ya ka ndị ọchịchị ghara ịkpara ha aka ma taa ha ahụhụ. Ee, na narị afọ nke 20, ihe a na-eme na Russia n’oge ezumike gbanwere site n’ịbụ ihe ndị metụtara okpukpe gaa n’ịbụ ihe ndị na-emetụtaghị okpukpe.

Mgbanwe E Nwere na Nso Nso A

Na 1991, Soviet Union dara, ndị mmadụ nwekwukwaara onwe ha. E wepụrụ iwu ndị ọchịchị nyere iji mee ka mmadụ nile ghọọ ndị na-ekweghị na Chineke. Mba dị iche iche kwụụrụ onwe ha e kepụtara ọhụrụ enwechaghị mmasị n’okpukpe, ha ejikọtaghịkwa Chọọchị na ọchịchị. Ọtụtụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe chere na ha nweziri ike ime ihe ndị kwekọrọ na nkwenkwe ha. Ha chere na otu ụzọ isi mee nke a ga-abụ ime ememe okpukpe ahụ bụ́ Krismas. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ọtụtụ n’ime ndị dị otú ahụ hụrụ na ha enwetaghị ihe ha tụrụ anya ya. N’ihi gịnị?

Kwa afọ, oge ezumike ahụ ghọwanyere oge azụmahịa. Ee, dị ka ọ dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, oge Krismas aghọwo oge kasị mma ndị na-emepụta ngwá ahịa na ndị na-ere ahịa ji akpa ego. A na-achọ ihu ọtụtụ ụlọ ahịa mma n’oge Krismas. A na-anụzi ụdị egwu na ukwe Krismas a na-anụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, bụ́ ndị a na-amabughị ama na Russia, ugbu a n’ụlọ ahịa dị iche iche. Ndị na-ere ahịa na-ebu nnukwu akpa ndị ihe ndị e ji achọ ihe mma n’oge Krismas juru na-agagharị n’ime ụgbọ okporo ígwè na ụgbọ ndị ọzọ na-ebu ndị njem iji ree ngwá ahịa ha. Nke ahụ bụ nnọọ ihe a na-ahụzi ugbu a.

Ọ dị ihe ọzọ na-eme n’oge Krismas bụ́ nke pụrụ ịdị na-enye ọbụna ndị na-ahụghị ihe ọ bụla dị njọ n’oké azụmahịa ahụ nsogbu n’obi—ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè na ihe nile na-esi na ya apụta. Onye dọkịta na-arụ n’ebe a na-edebe ndị chọrọ nlebara anya ngwa ngwa n’otu ụlọ ọgwụ dị na Moscow kọwara, sị: “O doro ndị dọkịta anya na ememe Afọ Ọhụrụ ga-eme ka e nwee ọtụtụ ndị merụrụ ahụ́, ma ndị nwere ákpụ̀ na nchihịa ahụ́ ma ndị a mara mma ma ọ bụ ndị a gbara égbè, ọ bụ ime ihe ike n’ezinụlọ, ịṅụbiga mmanya ókè, na ihe mberede ụgbọala na-akpata ihe ka ọtụtụ n’ime ha.” Otu ọkà mmụta sayensị nọ n’ọkwá dị elu n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Sayensị nke Russia kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ nke ndị na-anwụ n’ihi ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya arịala elu. Ọ rịrị elu karịsịa n’afọ 2000. Ọnụ ọgụgụ ndị na-egbu onwe ha na ndị e gburu egbu rịkwara elu.”

Ọ bụ ihe dị mwute na ọ dị ihe ọzọ na-eme ka àgwà ndị dị otú ahụ na-arịwanye elu n’oge ezumike na Russia. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Izvestiya, n’isiakụkọ ya bụ́ “Ndị Russia Na-agba Krismas Ugboro Abụọ n’Afọ,” na-akọ, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu onye n’ime ndị Russia 10 ọ bụla na-agba Krismas ugboro abụọ n’afọ. Dị ka nnyocha nke ụlọ ọrụ nke Òtù Russia Na-ajụta Uche Ọha Mmadụ na Ngwá Ahịa Ndị Mmadụ Chọrọ mere si kwuo, pasent 8 nke ndị ha jiri mee nnyocha ahụ kwetara na ha na-eme ememe nke Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ ma na December 25, n’ikwekọ na kalenda ndị Katọlik ji agụ oge Krismas, ma na January 7, n’ikwekọ na kalenda ndị Ọtọdọks . . . O doro anya na ihe mere ụfọdụ ndị ji agba Krismas bụ n’ihi oriri e ji oge ahụ eme kama ịbụ n’ihi na ọ bụ oge e ji eme ememe okpukpe.” *

Otú E Sizi Agba Krismas Ọ̀ Na-asọpụrụ Kraịst?

O doro anya na a na-emekarị omume ndị na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ n’oge ezumike ahụ. N’agbanyeghị otú nke a si enye nsogbu n’obi, ụfọdụ na-eche na ha kwesịrị ime ememe a iji sọpụrụ Chineke na Kraịst. Mmadụ ịchọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ bụ ihe kwesịrị ịja mma. Ma ememe Krismas ọ̀ na-atọ Chineke na Kraịst ụtọ n’ezie? Tụlee otú o si malite.

Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị otú mmadụ si lee echiche ndị Soviet banyere Krismas anya, ọ ga-esi ike ịgbagha ihe a mere eme bụ́ nke e dere n’akwụkwọ bụ́ Great Soviet Encyclopedia: “E nwetara Krismas . . . site n’ofufe nke chi ‘ndị na-anwụ ma na-ebilite n’ọnwụ’ ndị e fere tupu oge Ndị Kraịst, karịsịa n’etiti ndị ọrụ ugbo, bụ́ ndị na-eme ememe ‘ọmụmụ’ nke Chineke Onye Nzọpụta nke na-eme ka ala maliteghachi imepụta ihe kwa afọ, ha na-emekwa ya kpọmkwem n’etiti oge oyi site na December 21 ruo 25.”

Eziokwu a akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ kwuru pụrụ ịdọrọ mmasị gị: “Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ amaghị banyere Krismas. . . . Malite n’etiti narị afọ nke anọ, Iso Ụzọ Kraịst malitere ịnabata ememe etiti oge oyi a na-eme n’ofufe Mithra, ma gbanwee ya ịghọ ememe Krismas. Ndị okpukpe nọ na Rom bụ ndị mbụ mere ememe Krismas. Na narị afọ nke iri, Krismas na Iso Ụzọ Kraịst, gbasara ruo Russia, bụ́ ebe a gwakọtara ya na ememe oge oyi nke ndị Slav oge ochie, nke ha ji asọpụrụ mmụọ nke ndị nna nna ha.”

Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Gịnị ka Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekwu banyere ọmụmụ Jizọs na December 25?’ N’ezie, Bible ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs, ọ dịghịkwa ebe e dere na Jizọs n’onwe ya kwuru banyere ya, ka ọ fọkwa inye iwu ka a na-eme ememe ya. Otú ọ dị, Bible na-enyere anyị aka ịmata oge a mụrụ Jizọs n’afọ.

Oziọma Matiu, isi nke 26 na nke 27, na-egosi na e gburu Jizọs na Naịsan 14, ná ngwụsị nke Ememe Ngabiga ndị Juu bụ́ nke malitere na March 31, 33 O.A. Anyị mụtara site n’Oziọma Luk na Jizọs dị ihe dị ka afọ 30 mgbe e mere ya baptizim, ya amalitekwa ozi ya. (Luk 3:21-23) Ozi ya ahụ were afọ atọ na ọkara. Ya mere, Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ na atọ na ọkara mgbe ọ nwụrụ. Ọ gaara agba afọ 34 n’ihe dị ka October 1, 33 O.A. Luk kọrọ na n’oge a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ “bi ebi n’ọhịa, na-echekwa ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.” (Luk 2:8) Ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha agaraghị anọ n’èzí n’oyi nke oge December, snow nwedịrị ike ịdị na-ada na Betlehem n’oge ahụ. Ma ha na atụrụ ha pụrụ ịnọ n’èzí n’ihe dị ka October 1, bụ́ mgbe ihe àmà na-egosi na a mụrụ Jizọs.

Oleekwanụ banyere ememe Afọ Ọhụrụ? Dị ka anyị hụrụla, e ji àgwà rụrụ arụ mara ya. N’agbanyeghị na a gbalịala ime ka ọ bụrụ ememe ọha na eze, a na-enyokwa otú o si malite enyo.

N’ihi ihe ndị gbara oge ezumike ahụ gburugburu, o doro anya na okwu ndị dị ka, Ọ bụ Jizọs ka a na-emere Krismas, enweghị isi. Ya bụrụ na azụmahịa na omume ndị na-adịghị mma e ji mara Krismas, tinyekwara otú o si malite site n’ememe ndị ọgọ mmụọ, na-ewute gị, adala mbà. E nwere ụzọ kwesịrị ekwesị anyị pụrụ isi nye Chineke na Kraịst nsọpụrụ ruuru ha, n’otu oge ahụkwa, mee ka nkekọ ezinụlọ anyị sikwuo ike.

Ụzọ Ka Mma Isi Sọpụrụ Chineke na Kraịst

Bible na-agwa anyị na Jizọs Kraịst bịara iji “nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) O kwere ka e gbuo ya, jiri obi ya nile kwere ịnwụ maka mmehie anyị. Ụfọdụ ndị pụrụ ịchọ ịsọpụrụ Kraịst, chee na ha pụrụ iji oge Krismas mee otú ahụ. Ma dị ka anyị hụworo, e nwechaghị ihe jikọrọ Kraịst na Krismas na Afọ Ọhụrụ, e sikwa n’ememe ndị ọgọ mmụọ weta ha. Ọzọkwa, n’agbanyeghị otú oge Krismas pụrụ isi na-adọrọ mmasị ụfọdụ ndị, e ji oké azụmahịa mara ya. E wezụga nke ahụ, anyị aghaghị ikweta na e ji omume ndị na-eme ihere bụ́ ndị na-adịghị amasị Chineke na Kraịst mara oge ezumike Krismas.

Gịnị ka onye na-achọ ime ihe ga-amasị Chineke kwesịrị ime? Kama ijigidesi ọdịnala ndị ụmụ mmadụ wepụtara bụ́ ndị na-eme ka ha chee na ha ji okpukpe kpọrọ ihe ma bụrụ ndị na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ ike, onye nwere ezi obi ga-achọ ụzọ ziri ezi isi sọpụrụ Chineke na Kraịst. Olee nke bụ́ ụzọ ahụ ziri ezi, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime?

Kraịst n’onwe ya na-agwa anyị, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ee, onye nwere ezi obi n’ezie na-achọ inweta ezi ihe ọmụma banyere otú ọ ga-esi sọpụrụ Chineke na Kraịst. Ọ na-agbalịzi itinye ihe ọmụma a n’ọrụ ná ndụ ọ na-adị kwa ụbọchị ọ bụghị nanị n’oge ụfọdụ n’afọ. Mgbalị dị otú ahụ e ji ezi obi eme, bụ́ nke pụrụ iduba ná ndụ ebighị ebi, na-amasị Chineke.

Ọ̀ ga-amasị gị ka ezinụlọ gị soro ná ndị na-asọpụrụ Chineke na Kraịst n’ezie n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ? Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde ezinụlọ gburugburu ụwa aka inweta ihe ọmụma dị oké mkpa sitere na Bible. Anyị ji obi ụtọ na-agwa gị ka ị kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ degara ha akwụkwọ ozi n’adres kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 2 nke magazin a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Tupu a gbanwee ọchịchị n’October 1917, Russia nọ na-eji kalenda Julian merela ochie agụ oge, ma ihe ka ọtụtụ ná mba ndị ọzọ gbanwere ma na-ejizi kalenda Gregory. Na 1917, kalenda Gregory jiri ụbọchị 13 karịa nke Julian. Mgbe a gbanwesịrị ọchịchị, ndị Soviet maliteziri iji kalenda Gregory agụ oge, nke ahụ meziri ka Russia na mba ndị ọzọ na-ejizi otu kalenda agụ oge. Otú ọ dị, Chọọchị Ọtọdọks akwụsịghị iji kalenda Julian eme ihe maka ememe ya, ha kpọrọ ya kalenda “Ochie.” Ị pụrụ ịnụ na a na-agba Krismas na Russia na January 7. Otú ọ dị, cheta na January 7 na kalenda Gregory bụ December 25 na kalenda Julian. Ya mere, ọtụtụ ndị Russia na-esi otú a ahazi oge ezumike ha: December 25, Krismas Ebe Ọdịda Anyanwụ; January 1, Afọ Ọhụrụ ndị ọrụ; January 7, Krismas ndị Ọtọdọks; January 14, Afọ Ọhụrụ Oge Ochie.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Otú Ememe Afọ Ọhụrụ Si Malite

Onye Georgia Bụ́ Onye Mọnk Ndị Ọtọdọks Ekwuo Echiche Ya n’Ezoghị Ọnụ

“E si n’ọtụtụ ememe ndị ọgọ mmụọ Rom nweta ememe Afọ Ọhụrụ. A raara ụbọchị ezumike nke January 1 nye chi ndị ọgọ mmụọ bụ́ Janus, e sikwa n’aha ya nweta aha ọnwa ahụ. Ihe oyiyi Janus nwere ihu abụọ, otu n’ihu, nke ọzọ n’azụ, nke pụtara na ọ na-ahụ ma ihe ndị mere n’oge gara aga ma ndị na-eme ugbu a. Ọ dị mgbe a na-ekwu na onye na-aṅụrị ọṅụ, na-achị ọchị ma nwee ụbara nri na ihe ọṅụṅụ na January 1 ga-enwe obi ụtọ na ahụ́ ike n’afọ ahụ nile. Ọtụtụ ndị obodo anyị na-eme ememe afọ ọhụrụ na-ebu otu nkwenkwe ụgha ndị a n’obi eme ya . . . N’oge ememe ụfọdụ nke ndị ọgọ mmụọ, ndị mmadụ na-achụrụ arụsị àjà. E ji nnọọ omume rụrụ arụ na ịkwa iko mara ụfọdụ. N’oge ndị ọzọ, dị ka ihe atụ n’oge ememe Janus, a na-eri oké nri, na-aṅụ oké mmanya, na-aṅụbiga mmanya ókè ma na-eme ụdị omume rụrụ arụ nile na-eso ha. Ọ bụrụ na anyị echeta otú anyị onwe anyị si mee ememe Afọ Ọhụrụ n’oge ndị gara aga, anyị ga-ekweta na anyị nile emeela ememe ndị ọgọ mmụọ a.”—Otu akwụkwọ akụkọ Georgia.

[Foto dị na peeji nke 6]

Krisendọm nakweere ofufe Mithra

[Ebe E Si Nweta Foto]

Museum Wiesbaden

[Foto dị na peeji nke 7]]

Ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha agaraghị anọ n’èzí n’oyi nke oge December