Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Osisi Afọ Ọhụrụ—Ọ̀ Bụ Omenala Ndị Russia? Ka Ọ̀ Bụ Omenala Ndị Kraịst?

Osisi Afọ Ọhụrụ—Ọ̀ Bụ Omenala Ndị Russia? Ka Ọ̀ Bụ Omenala Ndị Kraịst?

Osisi Afọ Ọhụrụ—Ọ̀ Bụ Omenala Ndị Russia? Ka Ọ̀ Bụ Omenala Ndị Kraịst?

“NÁ MMALITE afọ ndị 1830, a ka na-akpọ osisi ahụ akwụkwọ ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ ‘ihe ọma ndị Germany wetara.’ Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke iri afọ ahụ, ọ ‘ghọọla ihe a na-ahụkarị’ n’ụlọ ndị St. Petersburg a ma ama. . . . Ọ bụ nanị n’ụlọ ndị ụkọchukwu na n’ụlọ akịrịka nke ndị ogbenye ka a na-adịghị enwe osisi ahụ na narị afọ nke 19. . . .

“Tupu oge ahụ, e jikarịghị . . . osisi ahụ kpọrọ ihe. Otú ndị mmadụ sizi bịa lewe ya anya n’etiti narị afọ nke 19 ekwekọghị n’otú ndị Russia sibu ele ya anya, nke bụ́ dị ka ihe na-anọchi anya ọnwụ na ihe ya na ‘ala ndị mmụọ’ nwere njikọ, o kwekọghịkwa n’ihe a na-ejibu ya eme bụ́ ịdọnye ya n’elu ụlọ mmanya. . . . O doro nnọọ anya na ọ bụrụ na a malite iji ya eme ihe otú e si eji ya eme ihe ná mba ndị ọzọ, ọ ga-abụ otu ihe ahụ osisi Krismas bụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ihe e jikọrọ ya na Krismas. . . .

“Ọ bụghị ihe dị mfe ime ka ndị Russia lewezie osisi ahụ anya dị ka ihe Ndị Kraịst. Chọọchị Ọtọdọks megidere ya n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndị ụkọchukwu weere ememe ọhụrụ ahụ dị ka ihe ‘aka ndị mmụọ ọjọọ dị na ya,’ omenala ndị ọgọ mmụọ, nke ọ na-enweghị ihe jikọrọ ya na ọmụmụ nke Onye Nzọpụta, ọzọkwa, ọ bụ omenala si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.”—Prọfesọ Yelena V. Dushechkina, ọkachamara na sayensị nkà ihe ọmụma asụsụ na edemede na Mahadum Mba nke dị na St. Petersburg.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 32]

Foto: Nikolai Rakhmanov