Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ugbu A Bụ Oge Ime Ihe Ngwa Ngwa

Ugbu A Bụ Oge Ime Ihe Ngwa Ngwa

Ugbu A Bụ Oge Ime Ihe Ngwa Ngwa

“Ruo ole mgbe ka unu onwe unu ga na-erugharị n’etiti ụzọ abụọ ndị a?”—1 Ndị Eze 18:21.

1. Olee ihe mere oge anyị ji dị nnọọ iche n’oge ndị gara aga?

Ì KWEERE na Jehova bụ nanị ezi Chineke e nwere? Ì kwekwaara na amụma Bible na-akọwa oge anyị dị ka ‘ụbọchị ikpeazụ’ nke usoro ihe ọjọọ Setan? (2 Timoti 3:1) Ya bụrụ otú ahụ, ị ga-ekweta n’ezie na ọ dị mkpa ime ihe ngwa ngwa ugbu a karịa ka ọ dịtụrụla mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ dịtụbeghị mgbe ndụ ọtụtụ mmadụ dị n’ihe ize ndụ otú ọ dị ugbu a.

2. Gịnị mere n’alaeze ebo iri Izrel n’oge ọchịchị Eze Ehab?

2 Na narị afọ nke iri T.O.A., ọ dị mba Izrel mkpa ime otu mkpebi siri nnọọ ike. Ònye ka ha ga-efe? Nwunye Eze Ehab, bụ́ Jezibel, nke na-ekpere arụsị mere ka Ehab kwalite ofufe Bel n’alaeze ebo iri nke Izrel. Bel bụ chi ihe ubi nke a sị na ọ bụ ya na-enye mmiri ozuzo ma na-eme ka ihe ndị a kụrụ n’ala mee nke ọma. Ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ ndị na-efe Bel na-esutụ ọbụ aka ha ọnụ ma fụọ ya ọnụ iji fụgara ya ihe oyiyi nke chi ha ma ọ bụ na-akpọrọ ya isiala. Iji mee ka Bel gọzie ihe ọkụkụ ha na anụ ụlọ ha, ndị na-efe ya na-eso ndị akwụna ụlọ nsọ enwe mmekọahụ. Ihe ọzọ e ji mara ha bụ ibi onwe ha mma ka ọbara wee gbaa ha n’ahụ́.—1 Ndị Eze 18:28.

3. Olee mmetụta ofufe Bel nwere n’ahụ́ ndị Chineke?

3 Ihe dị ka puku ndị Izrel asaa fọdụrụnụ jụrụ itinye aka n’ụdị ofufe arụsị a nke na-agụnye ime omume rụrụ arụ na ime ihe ike. (1 Ndị Eze 19:18) Ha ji iguzosi ike n’ezi ihe rapagidesie ike n’ọgbụgba ndụ ha na Jehova Chineke, a kpagbukwara ha maka ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Eze Nwanyị Jezibel gburu ọtụtụ ndị amụma Jehova. (1 Ndị Eze 18:4, 13) N’ihi ọnọdụ ndị a tara akpụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị Izrel fere chi abụọ, na-agbalị ime ihe ga-amasị ma Jehova ma Bel. Ma onye Izrel ọ bụla hapụrụ Jehova gaa fee chi ụgha adapụla n’ezi ofufe. Jehova kwere nkwa ịgọzi ụmụ Izrel ma ọ bụrụ na ha ahụ ya n’anya ma rube isi n’iwu ya. Otú ọ dị, ọ dọrọ ha aka ná ntị na ọ bụrụ na ha efeghị ya dị ka “Chineke ekworo [ma ọ bụ, “Chineke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa”],” a ga-ekpochapụ ha.—Deuterọnọmi 5:6-10; 28:15, 63.

4. Gịnị ka Jizọs na ndịozi ya buru n’amụma na ọ ga-eme n’etiti Ndị Kraịst, oleekwa otú nke ahụ sirila mezuo?

4 E nwere ọnọdụ yiri nke ahụ na Krisendọm taa. Ndị chọọchị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst, ma ememe ha, akparamàgwà ha, na nkwenkwe ha na-emegide ozizi Bible. Dị ka Jezibel, ndị ụkọchukwu Krisendọm na-ebute ụzọ n’ịkpagbu Ndịàmà Jehova. Ọ dịkwala anya ndị ụkọchukwu Krisendọm kwadowere agha ma si otú a na-akpata ọnwụ nke ọtụtụ nde ndị chọọchị ha. Bible na-akpọ aka ahụ okpukpe na-etinye n’ọchịchị ụwa ịkwa iko ime mmụọ. (Mkpughe 18:2, 3) Tụkwasị na nke ahụ, Krisendọm anabatawakwuola ịkwa iko nkịtị, ọbụna n’etiti ndị ụkọchukwu ya. Jizọs Kraịst na ndịozi ya buru amụma banyere oké ndapụ n’ezi ofufe a. (Matiu 13:36-43; Ọrụ 20:29, 30; 2 Pita 2:1, 2) Gịnị ka nke a ga-emecha rụpụtara ihe karịrị otu ijeri mmadụ nọ na Krisendọm? Oleekwa ibu ọrụ ndị na-efe Jehova ezi ofufe nwere n’ebe ndị a na ndị ọzọ okpukpe ụgha duhierela nọ? Anyị ga-enweta azịza doro anya nye ajụjụ ndị a site n’ịtụle ihe ndị dugara ‘n’ikpochapụ Bel n’Izrel.’—2 Ndị Eze 10:28.

Ịhụnanya Chineke Nwere n’Ebe Ndị Ya Na-enupụ Isi Nọ

5. Olee otú Jehova si gosi ndị ya na-enupụ isi na ya hụrụ ha n’anya?

5 Obi anaghị adị Jehova Chineke ụtọ ịta ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye ya ahụhụ. Dị ka Nna na-ahụ n’anya, ọ na-achọ ka ndị ajọ omume chegharịa ma laghachikwute ya. (Ezikiel 18:32; 2 Pita 3:9) Iji gosi na nke ahụ bụ ọchịchọ ya, Jehova ji ọtụtụ ndị amụma dọọ ndị Ya aka ná ntị n’oge Ehab na Jezibel banyere ntaramahụhụ ha ga-enweta ma ha fee Bel. Ịlaịja bụ otu n’ime ndị amụma ahụ. Mgbe otu oké ụkọ mmiri ozuzo e buru ụzọ maa ọkwa ya gasịrị, Ịlaịja gwara Eze Ehab ka ọ kpọkọta ụmụ Izrel na ndị amụma Bel n’Ugwu Kamel.—1 Ndị Eze 18:1, 19.

6, 7. (a) Olee otú Ịlaịja si kpughee isi ihe mere Izrel ji dapụ n’ezi ofufe? (b) Gịnị ka ndị amụma Bel mere? (ch) Gịnị ka Ịlaịja mere?

6 Ebe ha zukọrọ bụ n’akụkụ ebe ịchụàjà Jehova “e tipịara” etipịa, eleghị anya iji mee ka obi dị Jezibel mma. (1 Ndị Eze 18:30) Ọ dị mwute na ụmụ Izrel bịara ebe ahụ amaghị ma ọ̀ bụ Jehova ka ọ̀ bụ Bel nwere ike ime ka mmiri a na-atụ anya ya kemgbe zoo. Narị ndị amụma anọ na iri ise nọchiri anya Bel, ebe Ịlaịja bụ nanị onye amụma nọchiri anya Jehova. Ịlaịja gaziri nnọọ kpọmkwem n’ihe bụ́ nsogbu nke ndị ahụ ma jụọ ha, sị: “Ruo ole mgbe ka unu onwe unu ga na-erugharị n’etiti ụzọ abụọ ndị a?” O kwuziri ya n’ụzọ ka doo anya ma hapụ ha ka ha kpebiere onwe ha ihe ha ga-eme: “Ọ bụrụ na Jehova bụ Chineke, jesoonụ Ya: ọ bụrụ Bel, jesoonụ ya.” Iji kpalie ụmụ Izrel ahụ nwere obi abụọ ife Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa, Ịlaịja wepụtara ihe a ga-eji mara chi nke bụ́ ezi Chineke. A ga-egbu oké ehi abụọ, a ga-eji otu chụọrọ Jehova àjà, jiri nke ọzọ chụọrọ Bel. Nke bụ́ ezi Chineke ga-eji ọkụ ripịa àjà ya. Ndị amụma Bel kwadebere àjà nke ha, ma malitezie iti mkpu ruo ọtụtụ awa, na-asị: “Bel, za anyị.” Mgbe Ịlaịja malitere ịkwa ha emo, ha ji mma agha na ube na-ebi onwe ha ruo mgbe ọbara gbawara ha n’ahụ́, ha jikwa oké olu na-eti mkpu. Ma ọ dịghị onye zara ha.—1 Ndị Eze 18:21, 26-29.

7 Oge nke Ịlaịja ruziri. O buru ụzọ rụzie ebe ịchụàjà Jehova ma tụkwasị anụ oké ehi ahụ n’elu ya. O nyeziri iwu ka a wụọ nnukwu ite mmiri anọ n’elu àjà ahụ. E mere nke ahụ ugboro atọ ruo mgbe okokoro nile e gwuru n’akụkụ ebe ịchụàjà ahụ jupụtara na mmiri. Ịlaịja kpeziri ekpere, sị: “Jehova, bụ́ Chineke Ebreham na Aịzik na Izrel, ka a mara taa na Gị onwe gị bụ Chineke n’Izrel, na mụ onwe m bụkwa ohu Gị, na ọ bụkwa n’okwu Gị ka m meworo ihe nile ndị a. Za m, Jehova, za m, ka ndị nke a wee mara na Gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke, na Gị onwe gị echigharịwokwa obi ha ịlọta.”—1 Ndị Eze 18:30-37.

8. Olee otú Chineke si zaa ekpere Ịlaịja, gịnịkwa ka onye amụma ahụ mere?

8 Ezi Chineke ahụ zara ekpere ahụ site n’iji ọkụ sitere n’eluigwe ripịa ma àjà ahụ ma ebe ịchụàjà ahụ. Ọkụ ahụ rachapụrụ ọbụna mmiri dị n’okokoro ahụ dị gburugburu ebe ịchụàjà ahụ! Lee otú nke a na-aghaghị isiwo metụ ụmụ Izrel n’ahụ́. “[Ha dara] kpuo ihu ha n’ala, sị, Jehova, Ya onwe ya bụ [ezi] Chineke; Jehova Ya onwe ya bụ [ezi] Chineke.” Ịlaịja meziri ihe ọzọ chọrọ obi ike site n’inye ndị Izrel iwu, sị: “Jidenụ ndị amụma Bel; ekwela ka otu nwoke n’ime ha wepụga onwe ya.” E gbuziri narị ndị amụma Bel anọ na iri ise nile ahụ na ndịda Ugwu Kamel.—1 Ndị Eze 18:38-40.

9. Olee otú e si lekwuo ndị na-efe ezi ofufe ule?

9 N’otu ụbọchị ahụ a na-apụghị ichefu echefu, Jehova mere ka mmiri zoo n’ala ahụ nke mbụ ya kemgbe afọ atọ na ọkara! (Jems 5:17, 18) Cheedị ụdị ihe ndị Izrel ga na-ekwurịta mgbe ha na-ala; Jehova egosila na ọ bụ ya bụ ezi Chineke ahụ. Otú ọ dị, ndị na-efe Bel akwụsịghị ife ya. Jezibel nọgidere na-akpagbu ndị ohu Jehova. (1 Ndị Eze 19:1, 2; 21:11-16) E si otú ahụ lee iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke ule ọzọ. Hà ga na-efe Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa n’ụbọchị ọ ga-ekpe ndị na-efe Bel ikpe?

Mee Ihe Ngwa Ngwa Ugbu A

10. (a) N’oge a, olee ihe Ndị Kraịst e tere mmanụ nọworo na-eme? (b) Olee otú mmadụ pụrụ isi rube isi n’iwu ahụ dị ná Mkpughe 18:4?

10 N’oge a, Ndị Kraịst e tere mmanụ arụọla ọrụ yiri nke Ịlaịja. Ha ejirila ma okwu ọnụ ma akwụkwọ dọọ ndị nke mba nile, ma ndị Krisendọm ma ndị na-abụghị ndị Krisendọm, aka ná ntị banyere ihe ize ndụ dị n’okpukpe ụgha. N’ihi ya, ọtụtụ nde mmadụ emeela ihe ngwa ngwa ma hapụ okpukpe ụgha. Ha ararala ndụ ha nye Jehova ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst e mere baptizim. Ee, ha erubela isi n’iwu ahụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke Chineke nyere banyere okpukpe ụgha, bụ́: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, nakwa ma ọ bụrụ na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.”—Mkpughe 18:4.

11. Olee ihe ọ dị mmadụ mkpa ime iji nweta ihu ọma Jehova?

11 Ọ bụ ezie na ozi Bible nke Ndịàmà Jehova na-ezi na-adọrọ mmasị ha, ọtụtụ nde ndị ọzọ amabeghị ihe ha kwesịrị ime. Ụfọdụ n’ime ndị a na-abịa nzukọ dị iche iche nke Ndị Kraịst mgbe ụfọdụ, dị ka ncheta Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma ọ bụ mgbakọ distrikti. Anyị na-agba ndị nile dị otú ahụ ume iji nlezianya tụlee ihe a Ịlaịja kwuru: “Ruo ole mgbe ka unu onwe unu ga na-erugharị n’etiti ụzọ abụọ ndị a?” (1 Ndị Eze 18:21) Kama ịdị na-egbu oge, ọ dị ha mkpa ime ihe ngwa ngwa ugbu a ma jiri ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ iji ruo ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ndị Jehova raara onwe ha nye, ndị e mekwara baptizim. Ihe ha mere ugbu a ga-ekpebi ma hà ga-adị ndụ ebighị ebi ka ọ̀ bụ na ha agaghị adị!—2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9.

12. Olee ọnọdụ dị ize ndụ Ndị Kraịst ụfọdụ dabara na ya, gịnịkwa ka ha kwesịrị ime?

12 Ọ dị mwute na ụfọdụ Ndị Kraịst e mere baptizim aghọọla ndị na-adịghị efechi Chineke anya ma ọ bụ ndị kwụsịrịla ife ya kpamkpam. (Ndị Hibru 10:23-25; 13:15, 16) Ụfọdụ anaghịzi anụ ọkụ n’obi n’ihi ụjọ mkpagbu, nchegbu nke inweta ihe ndị e ji ebi ndụ, mgbalị ịba ọgaranya, ma ọ bụ nchụso nke ihe ụtọ. Jizọs dọrọ aka ná ntị na ihe ndị a ga-eme ka ụfọdụ n’ime ụmụazụ ya sụọ ngọngọ, kpagbuo mkpụrụ nke eziokwu a kụnyere n’ime ha, ma mata ha n’ọnyà. (Matiu 10:28-33; 13:20-22; Luk 12:22-31; 21:34-36) Kama ịdị “na-erugharị n’etiti ụzọ abụọ,” dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ndị dị otú ahụ kwesịrị ịdị “na-anụ ọkụ n’obi ma chegharịa” site n’ime ihe ngwa ngwa iji mee ihe kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye Chineke.—Mkpughe 3:15-19.

Mbibi Mberede nke Okpukpe Ụgha

13. Kọwaa ọnọdụ e nwere n’Izrel mgbe e tere Jihu mmanụ ịbụ eze.

13 Ihe mere n’Izrel afọ 18 ka e kpebisịrị onye bụ́ ezi Chineke ahụ n’Ugwu Kamel gosiri na ọ dị mkpa ka ụmụ mmadụ mee ihe ngwa ngwa ugbu a. Ụbọchị ikpe Jehova megide ofufe Bel bịara na mberede na n’ụzọ a na-atụghị anya ya n’oge onye nọchiri anya Ịlaịja, bụ́ Ịlaịsha, na-eje ozi ya. Nwa Eze Ehab bụ́ Jehoram na-achị Izrel mgbe ahụ, Jezibel bụ́ nne eze ka dịkwa ndụ. Ịlaịsha zipụrụ onyeozi ya na nzuzo ịga tee onyeisi usuu ndị agha Izrel, bụ́ Jihu, mmanụ ịbụ eze ọhụrụ nke Izrel. N’oge ahụ, Jihu nọ n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan na Remọt-gilied na-eduzi agha a na-alụ megide ndị iro Izrel. Eze Jehoram nọ na Jezril n’ala dị larịị nke dị nso na Megido, na-agbake site n’ahụ́ e merụrụ ya n’agha.—2 Ndị Eze 8:29–9:4.

14, 15. Olee ọrụ e nyere Jihu, oleekwa otú o si rụọ ya?

14 Nke a bụ iwu Jehova nyere Jihu: “Ị ga-etigbukwa ụlọ Ehab, bụ́ onyenwe gị, ka M wee bọọ ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu m, bụ́ ndị amụma, na ọbara ndị ohu nile nke Jehova, n’aka Jezibel. Ụlọ nile nke Ehab ga-alakwa n’iyi: . . . Nkịta ga-erikwa Jezibel n’ókèala ubi Jezril, ọ dịghịkwa onye na-eli ya.”—2 Ndị Eze 9:7-10.

15 Jihu bụ nwoke nwere obi ike. N’egbughị oge, ọ banyere n’ụgbọ ịnyịnya ya ma gbara gawa Jezril. Otú Jihu si na-akwọ ụgbọ ịnyịnya ya mere ka onye nche nọ na Jezril mata na ọ bụ ya na-abịa ma kọọrọ Eze Jehoram, Jehoram banyere n’ụgbọ ịnyịnya ya ozugbo ma pụọ ịga zute onyeisi usuu ndị agha ya. Mgbe ha zutere, Jehoram jụrụ ya, sị: “Udo [ọ̀] dịkwa, Jihu?” Jihu zara ya, sị: “Gịnị bụ udo ahụ, na mgbe ịkwa iko Jezibel, bụ́ nne gị, na mgbaasị ya na-adị ọtụtụ?” Mgbe ahụ, tupu Eze Jehoram agbalaga, Jihu mịpụtara ụta ma gbuo Jehoram site n’ịgbaba ya akụ́ n’obi.—2 Ndị Eze 9:20-24.

16. (a) Olee ọnọdụ ndị ọnaozi Jezibel chere ihu na mberede? (b) Olee otú ihe Jehova kwuru banyere Jezibel si mezuo?

16 N’egbughị oge ọ bụla, Jihu nyaara ụgbọ ịnyịnya ya gbaba n’ime obodo. Mgbe Jezibel bụ́ onye chọrọ nnọọ onwe ya mma si na windo leda anya n’ala, o yiri Jihu egwu. Jihu lefuuru ya anya ma chọọ nkwado site n’iti, sị: “Ònye dịnyeere m? ònye?” Ndị na-ejere Jezibel ozi aghaghị ime ihe ngwa ngwa ugbu a. Ndị ọnaozi abụọ ma ọ bụ atọ siri na windo lepụta anya. Ozugbo ahụ, e lere ikwesị ntụkwasị obi ha ule. Jihu nyere ha iwu, sị: “Tụdanụ ya.” Ndị ọnaozi ahụ siri n’elu tụda Jezibel n’ala, ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya Jihu zọkwara ya ụkwụ. Onye na-akpali ụmụ Izrel ife Bel ofufe si otú a nwụọ ọnwụ kwesịịrị ya. Tupu e nweta ohere iji lie ya, nkịta erichapụla anụ ahụ́ ya, dị nnọọ ka e buru n’amụma.—2 Ndị Eze 9:30-37.

17. Ikpe Chineke megide Jezibel kwesịrị iwusi okwukwe anyị ike maka ihe dị aṅaa ga-eme n’ọdịnihu?

17 Mbibi dị otú ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ga-abịakwasị nwanyị akwụna ihe atụ ahụ, bụ́ onye a na-akpọ “Babilọn Ukwu Ahụ.” Nwanyị akwụna ahụ na-anọchi anya okpukpe ụgha nke ụwa Setan, bú nke malitere n’obodo Babilọn oge ochie. Mgbe e bibisịrị okpukpe ụgha, Jehova Chineke ga-elekwasị anya n’ebe ụmụ mmadụ nile nọ, bụ́ ndị mejupụtara akụkụ fọrọ afọ nke ụwa Setan. A ga-ebibikwa ndị a bụ́ ndị na-anọchiri ụwa ọhụrụ nke ezi omume ahụ ụzọ.—Mkpughe 17:3-6; 19:19-21; 21:1-4.

18. Mgbe Jezibel nwụsịrị, gịnị mere ndị na-efe Bel n’Izrel?

18 Mgbe Jezibel nwụsịrị, Eze Jihu egbughị oge ọ bụla n’igbusịsị ụmụ Ehab na ndị bụ́ isi na-akwado ya. (2 Ndị Eze 10:11) Ma ọtụtụ ndị Izrel na-efe Bel ka fọdụrụ n’ala ahụ. Jihu mere ihe ngwa ngwa banyere ndị a iji gosi ‘ekworo ọ na-ekworo Jehova.’ (2 Ndị Eze 10:16) Jihu mere ka à ga-asị na ya onwe ya na-efe Bel ma hazie oké oriri n’ụlọ nsọ Bel nke Ehab wuru na Sameria. Ndị nile na-efe Bel n’Izrel bịara oriri ahụ. Mgbe ha nile batasịrị n’ụlọ nsọ ahụ, ndị ikom Jihu gbukpọrọ ha nile. Lee ka Bible si mechie akụkọ ahụ: “Jihu wee kpochapụ Bel n’Izrel.”—2 Ndị Eze 10:18-28.

19. Olee ihe magburu onwe ya “oké ìgwè mmadụ” ahụ ji iguzosi ike n’ihe na-efe Jehova na-atụ anya ya?

19 E kpochapụrụ ofufe Bel n’Izrel. Ọ bụkwa nnọọ otú ahụ ka okpukpe ụgha nke ụwa a ga-esi bịa ná njedebe na mberede n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́. N’akụkụ ònye ka ị ga-anọ n’oké ụbọchị ikpe ahụ? Mee ihe ngwa ngwa ugbu a, i nwekwara ike inwe ihe ùgwù nke iso ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ ga-alanahụ ‘oké mkpagbu ahụ.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwe ike iji ọṅụ leghachi anya azụ, ị ga-etokwa Chineke maka imezu ihe o kpere n’ikpe n’isi “oké nwanyị akwụna ahụ, bụ́ onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa.” Ị ga-eso ndị ọzọ na-efe ezi ofufe kwenye n’ihe ndị ahụ na-akpali akpali olu ndị sitere n’eluigwe bụrụ n’abụ: “Toonụ Jaa, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke anyị, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, amalitewo ịchị achị dị ka eze.”—Mkpughe 7:9, 10, 14; 19:1, 2, 6.

Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche

• Olee otú ndị Izrel oge ochie si daba n’ofufe Bel?

• Olee oké ndapụ n’ezi ofufe Bible buru amụma ya, oleekwa otú amụma ahụ si mezuo?

• Olee otú Jihu si kpochapụ ofufe Bel?

• Gịnị ka anyị ga-emerịrị iji lanahụ ụbọchị ikpe Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Map dị na peeji 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Soko

Efek

Helket

Jọkniam

Megido

Teanak

Dotan

SAMERIA

En-dọ

Shunem

Ọfra

Jezril

Ibliam (Gat-rimọn)

Teza

Bet-shimesh

Bet-shian (Bet-shan)

Jebesh-gilied?

Ebel-mehola

Ụlọ Abel

Remọt-gilied

[Ugwu]

Ugwu Kamel

Mọre

Ugwu Tebọ

Ugwu Gilboa

[Mmiri]

Oké Osimiri Mediterenian

Oké Osimiri Galili

[Osi Mmiri]

Osimiri Jọdan

[Iyi na Olulu Mmiri]

Olulu Mmiri Herọd

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ọ dabeere na map Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. and Survey of Israel ji ikike mbipụtaghachi ya

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ịgachi ozi ọma Alaeze ahụ na nzukọ Ndị Kraịst anya bụ akụkụ dị oké mkpa nke ezi ofufe

[Foto ndị dị na peeji nke 28, 29]

Dị ka Jihu, ndị nile chọrọ ịlanahụ ụbọchị Jehova ga-emerịrị ihe ngwa ngwa