Ịchọ Ezi Omume Ga-echebe Anyị
Ịchọ Ezi Omume Ga-echebe Anyị
“Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ . . . ezi omume [Chineke].”—MATIU 6:33.
1, 2. Mkpebi dị aṅaa ka otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst mere, gịnịkwa mere o ji mee mkpebi dị otú ahụ?
OTU nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst nke bi n’Eshia na-arụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ n’otu ụlọ ọrụ gọọmenti. Ọ naghị eji ọrụ ya egwuri egwu, ọ na-abịa ọrụ n’oge, na-arụsikwa ọrụ ike. Ma, ebe ọ bụ na e were ya n’ọrụ ịrụ ọrụ ruo nanị nwa oge, oge ruru mgbe a ga-atụle otú o si arụ ọrụ. Ọga ya gwara ya na ya ga-ewe ya n’ọrụ ka ọ rụwaziere ha ma bulie ya n’ọkwà ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ka ya na ya nwee mmekọahụ. Ọ jụwara isi n’agbanyeghị na nke ahụ ga-eme ka a chụọ ya n’ọrụ.
2 Ihe a nwanna nwanyị a mere ọ̀ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya? Ọ bụghị, o ji nlezianya na-agbaso okwu Jizọs, bụ́: “Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ . . . ezi omume [Chineke].” (Matiu 6:33) Ịgbaso ụkpụrụ ezi omume dị nnọọ mkpa nye ya karịa ihe ọ bụla ọ ga-erite site n’inwe mmekọahụ rụrụ arụ.—1 Ndị Kọrint 6:18.
Mkpa Ezi Omume Dị
3. Gịnị bụ ezi omume?
3 “Ezi omume” pụtara ime omume ọma na ịkwụwa aka ọtọ. Na Bible, okwu Grik na nke Hibru e si na ha sụgharịta ya pụtara “izi ezi.” Ọ pụtaghị mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya. (Luk 16:15) Ọ bụ izi ezi dị ka ụkpụrụ Jehova si dị. Ọ bụ ezi omume nke Chineke.—Ndị Rom 1:17; 3:21.
4. N’ihi gịnị ka ezi omume ji dị Onye Kraịst mkpa?
4 N’ihi gịnị ka ezi omume ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na Jehova, bụ́ “Chineke nke ezi omume,” na-agọzi ndị ya mgbe ha na-eme ezi omume. (Abụ Ọma 4:1; Ilu 2:20-22; Habakuk 1:13) Ya na onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume apụghị ịdị ná mma. (Ilu 15:8) Ọ bụ nke a mere Pọl onyeozi ji gbaa Timoti ume, sị: “Gbanahụ ọchịchọ nke oge ntorobịa, kama chụsoo ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, gị na ndị na-akpọku Onyenwe anyị site n’obi dị ọcha.” (2 Timoti 2:22) Ọ bụkwa n’ihi nke a ka Pọl ji gụnye “ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume” mgbe ọ na-edepụta akụkụ dị iche iche nke ihe ekike agha ime mmụọ anyị.—Ndị Efesọs 6:14.
5. Olee otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi chọọ ezi omume?
5 N’eziokwu, ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-eme ezi omume n’ụzọ zuru okè. Mmadụ nile eketawo ezughị okè site n’aka Adam, anyị nile bụkwa ndị mmehie, ndị ajọ omume site n’ọmụmụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịchọ ezi omume. Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume? Ọ ga-ekwe omume n’ihi na Jizọs nyere ndụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta maka anyị, ọ bụrụkwa na anyị egosipụta okwukwe n’àjà ahụ, Jehova dị njikere ịgbaghara anyị mmehie anyị. (Matiu 20:28; Jọn 3:16; Ndị Rom 5:8, 9, 12, 18) N’ịdabere na nke ahụ, ka anyị na-amụ banyere ụkpụrụ ezi omume nke Jehova ma na-eme ike anyị nile iji na-agbaso ha—na-ekpegara Jehova ekpere ka o nyere anyị aka imeri adịghị ike anyị—Jehova ga-anabata ofufe anyị. (Abụ Ọma 1:6; Ndị Rom 7:19-25; Mkpughe 7:9, 14) Nke ahụ bụ ihe na-akasi obi n’ezie!
Ime Ezi Omume n’Ụwa nke Jupụtara n’Ajọ Omume
6. N’ihi gịnị ka ụwa ji bụrụ ebe dị ize ndụ nye Ndị Kraịst oge mbụ?
6 Mgbe e nyere ndị na-eso ụzọ Jizọs ọrụ nke ịbụ ndị àmà “ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa,” ha chere ihe ịma aka ihu. (Ọrụ 1:8) Ókèala nile e kenyere ha “dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ,” bụ́ Setan. (1 Jọn 5:19) Ihe jupụtara n’ụwa bụ mmụọ nke ọ na-akwalite, mmụọ dị otú ahụ pụkwara imetụta Ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 2:2) Ụwa bụ ebe dị ize ndụ nye ha. Ọ bụ nanị site n’ibu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke ka ha nwere ike ịtachi obi ma nọgide na-eme ezi ihe. Ọtụtụ n’ime ha tachiri obi, ma mmadụ ole na ole si “n’ụzọ ezi omume” pụọ.—Ilu 12:28; 2 Timoti 4:10.
7. Ibu ọrụ ndị dị aṅaa ka e nyere Ndị Kraịst nke mere ka ọ dị mkpa na ha ga-ezere àgwà ndị na-emerụ emerụ?
7 Ihe ọ̀ dịịrị Ndị Kraịst nke oge a mfe n’ụwa? Ọ dịghị ma ọlị! Ụwa rụdịrị arụ ugbu a karịa ka ọ dị na narị afọ mbụ. Tụkwasị na nke ahụ, a chụdawo Setan n’ụwa, ọ na-ebukwa agha kpụ ọkụ n’ọnụ megide Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ‘ndị fọdụrụ n’ime mkpụrụ nwanyị ahụ, bụ́ ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.’ (Mkpughe 12:12, 17) Setan na-akpagbukwa onye ọ bụla nke na-akwado “mkpụrụ” ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst agaghị esili n’ụwa gbapụ. Ọ bụ ezie na ha abụghị akụkụ nke ụwa, ha aghaghị ibi n’ime ya. (Jọn 17:15, 16) Ha aghaghịkwa ikwusa ozi ọma n’ime ya iji chọta ndị nwere ezi obi ma kụziere ha ihe ka ha wee ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Matiu 24:14; 28:19, 20) N’ihi ya, ebe ọ bụ na Ndị Kraịst apụghị izere kpamkpam ihe ndị na-emerụ emerụ n’ụwa a, ha aghaghị iguzogide ha. Ka anyị tụlee anọ n’ime ihe ndị dị otú ahụ.
Ọnwụnwa nke Itinye Aka n’Omume Rụrụ Arụ
8. N’ihi gịnị ka ụmụ Izrel ji malite ife chi dị iche iche nke Moab?
8 Ka ha na-eru ná ngwụsị nke njem were afọ iri anọ ha ji ụkwụ mee n’ịkpa, ihe ka ọtụtụ ná ndị Izrel si n’ụzọ ezi omume kpafuo. Ha ahụwo ọtụtụ ihe ndị Jehova mere iji zọpụta ha, n’oge na-adịghịkwa anya, ha ga-abanye n’Ala Nkwa ahụ. Ma, n’oge a mgbe ọ fọrọ nke nta ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ, ha malitere ife chi dị iche iche nke ndị Moab. N’ihi gịnị? Ha mere ihe kwekọrọ ‘n’ọchịchọ nke anụ ahụ́.’ (1 Jọn 2:16) Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Ndị Izrel wee malite isoro ụmụ ndị inyom Moab na-akwa iko.”—Ọnụ Ọgụgụ 25:1.
9, 10. Ọnọdụ dị aṅaa nke e nwere n’ụwa taa na-eme ka ọ dị oké mkpa iburu n’uche ikike ọchịchọ anụ ahụ́ na-ezighị ezi nwere imebi omume anyị?
9 Ihe ahụ merenụ na-egosi otú ọchịchọ anụ ahụ́ na-ezighị ezi pụrụ isi mee ka ndị na-adịghị ike mehie. Ọ ga-adị mma ma anyị mụta ihe site na nke a, karịsịa ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-ele omume rụrụ arụ anya dị ka ihe na-adịghị ihe o mere. (1 Ndị Kọrint 10:6, 8) Otu akụkọ e si na United States nweta na-ekwu, sị: “Tupu 1970, na steeti nile dị n’America, nwoke na nwanyị ibikọ ọnụ na-alụghị di na nwunye bụ ihe iwu na-akwadoghị. Taa, ọ bụ ihe a na-eme n’ebe nile. Ihe karịrị ọkara nke ndị nile lụrụ di na nwunye ọhụrụ bikọrọ ọnụ tupu ha alụọ.” Ọ bụghị nanị n’otu mba ka e nwere omume a na omume rụrụ arụ ndị ọzọ yiri ya. Ha zuru ebe nile n’ụwa, ọ dịkwa mwute na ụfọdụ Ndị Kraịst na-etinye aka n’omume ndị a—ọbụna na-emebi mmekọrịta ha na Chineke.—1 Ndị Kọrint 5:11.
10 Ọzọkwa, o yiri ka a na-akwalite omume rụrụ n’ebe nile. Ihe ndị a na-egosi na fim nakwa na telivishọn na-enye echiche na ọ dịghị ihe o mere ma ndị na-eto eto na-enwe mmekọahụ tupu ha alụọ di na nwunye. A na-akọwa mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya dị ka ihe na-abụghị ihe ọjọọ. N’ọtụtụ ihe nkiri, a na-egosikwa nnọọ ebe a na-enwe mmekọahụ́ na-ezotụghị ihe ọ bụla. Ọ na-adịkwa nnọọ mfe ugbu a ịchọta ebe ndị a na-egosi ndị na-enwe mmekọahụ n’Intanet. Dị ka ihe atụ, otu onye so ede akwụkwọ akụkọ kọrọ na nwa ya nwoke dị afọ asaa si akwụkwọ lọta otu ụbọchị ma jiri obi ụtọ gwa ya na enyi ya n’ụlọ akwụkwọ hụrụ ebe a na-egosi ụmụ nwanyị ndị gba ọtọ ma na-enwe mmekọahụ n’Intanet. Nke a wụrụ nna ahụ akpata oyi n’ahụ́, ma ụmụaka ole hụworo ebe ndị dị otú ahụ ma gwa ndị mụrụ ha? Tụkwasị na nke ahụ, ndị nne na nna ole maara ihe a na-egosi n’egwuregwu vidio ụmụ ha na-egwu? A na-egosi omume ndị na-asọ oyi, mgbaasị, na ime ihe ike n’ọtụtụ egwuregwu vidio ndị na-ewu ewu.
11. Olee otú ndị ezinụlọ pụrụ isi chebe onwe ha pụọ n’omume rụrụ arụ nke dị n’ụwa?
11 Olee otú ezinụlọ pụrụ isi zere “ihe ntụrụndụ” ndị dị otú ahụ rụrụ arụ? Ọ bụ site n’ibu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke, na-ezere itinye aka n’ihe ọ bụla rụrụ arụ. (2 Ndị Kọrint 6:14; Ndị Efesọs 5:3) Ndị nne na nna bụ́ ndị na-enyocha ihe ụmụ ha na-eme ma na-akụnye ọchịchọ nke ịhụ Jehova na iwu ezi omume ya n’anya n’ime ụmụ ha, na-ewusi ha ike izere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ndị dị ka egwuregwu vidio, fim ndị rụrụ arụ, na ihe ndị ọzọ na-anwa mmadụ ọnwụnwa itinye aka n’omume rụrụ arụ.—Deuterọnọmi 6:4-9. *
Ịbụ Onye A Rụgidere Itinye Aka n’Omenala Obodo
12. Nsogbu dị aṅaa bilitere na narị afọ mbụ?
12 Mgbe Pọl nọ na Listra nke dị n’Eshia Mainọ, ọ gwọrọ otu nwoke n’ụzọ ọrụ ebube. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ìgwè mmadụ ahụ, n’ịhụ ihe Pọl meworo, welikwara olu ha, na-ekwu n’asụsụ ndị Likeonia, sị: ‘Ndị bụ chi adịrịwo ka ụmụ mmadụ, ha agbadakwutewokwa anyị!’ Ha wee malite ịkpọ Banabas Zus, ma na-akpọ Pọl Hamis, ebe ọ bụ onye na-ebute ụzọ n’ikwu okwu.” (Ọrụ 14:11, 12) Mgbe e mesịrị, otu ìgwè ahụ chọrọ igbu Pọl na Banabas. (Ọrụ 14:19) Nke a na-egosi n’ụzọ doro anya na ọ bụ ndị obodo kpaliri ha imeso Pọl na Banabas ihe otú ahụ. O yiri ka ụfọdụ ndị si n’ebe ahụ ahapụghị nkwenkwe ụgha ha mgbe ha ghọrọ Ndị Kraịst. N’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi, Pọl onyeozi dọrọ ha aka ná ntị megide ‘ife ndị mmụọ ozi ofufe.’—Ndị Kọlọsi 2:18.
13. Gịnị bụ ụfọdụ omenala ndị Onye Kraịst na-aghaghị izere, gịnịkwa pụrụ inyere ya aka ime otú ahụ?
13 Ọ dịkwa ezi Ndị Kraịst mkpa taa izere Eklisiastis 9:5, 10) E nwere ala ụfọdụ ọ bụ omenala ha ibekasị ụmụntakịrị nwanyị akụkụ ahụ́ ha ji amụ nwa. * Nke a bụ omume obi ọjọọ nke na-adịghị mkpa, bụ́ nke ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst, ndị kwesịrị iji ịhụnanya na-elekọta ụmụ ha, na-ekwesịghị itinye aka na ya. (Deuterọnọmi 6:6, 7; Ndị Efesọs 6:4) Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi guzogide nrụgide ndị a na-enweta n’obodo ma zere omume ndị dị otú ahụ? Ọ bụ site n’ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. (Abụ Ọma 31:6) Chineke nke ezi omume ga-elekọta ndị ji obi ha dum na-agwa ya, sị: “Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike; Ị bụ Chineke m, Onye m na-atụkwasị obi.” (Abụ Ọma 91:2; Ilu 29:25) Ọ ga-ewusikwa ha ike.
omenala ndị na-ewu ewu bụ́ ndị hiwere isi n’echiche okpukpe ụgha ndị megidere ụkpụrụ Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, n’ala ụfọdụ, ọtụtụ ememe ndị a na-eme mgbe a mụrụ nwa na mgbe mmadụ nwụrụ dabeere n’echiche ụgha nke bụ́ na anyị nwere mmụọ na-adịgide ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị. (Echefula Jehova
14. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jehova nyere ụmụ Izrel mgbe ọ fọrọ nke nta ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ?
14 Mgbe ọ fọrọ nke nta ka ndị Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ, Jehova dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara ichefu ya. Ọ gwara ha, sị: “Lezie onwe gị anya ka ị ghara ichezọ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’edebeghị ihe nile O nyere n’iwu, na ikpe Ya nile, na ụkpụrụ Ya nile, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa: ka o wee ghara ịbụ, mgbe ị na-eri ihe, rijuo afọ, wuokwa ezi ụlọ, wee biri n’ime ha: mgbe ìgwè ehi gị na ìgwè ewu na atụrụ gị na-abakwa ụba, mgbe ọlaọcha na ọlaedo na-abakwara gị ụba, mgbe ihe nile i nwere na-abakwa ụba; na obi gị ga-adị elu, i wee chezọọ Jehova, bụ́ Chineke gị.”—Deuterọnọmi 8:11-14.
15. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị adịghị echefu Jehova?
15 Ihe yiri ya ọ̀ pụrụ ime taa? Ee, ọ pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị adịghị ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ ezi omume Chineke, ofufe dị ọcha ga-abụ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị. Anyị ga-eme dị ka Pọl gbara anyị ume ka anyị mee, ya bụ, ‘ịzụpụtara onwe anyị oge kwesịrị ekwesị,’ ma ghọta na ozi anyị na-ezisa chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa. (Ndị Kọlọsi 4:5; 2 Timoti 4:2) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ntụrụndụ dịzi mkpa ná ndụ anyị karịa ije nzukọ na ozi ubi, nke a pụrụ ime ka anyị chefuo Jehova n’ụdị na anyị ga na-edebe ya n’ọnọdụ nke abụọ ná ndụ anyị. Pọl kwuru na n’ụbọchị ikpeazụ, ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:4) Ndị Kraịst nwere obi eziokwu na-enyocha onwe ha mgbe nile iji hụ na ha adịghị enwe echiche dị otú ahụ.—2 Ndị Kọrint 13:5.
Zere Mmụọ nke Mmadụ Ime Otú Masịrị Ya
16. Mmụọ dị aṅaa dị njọ ka Iv na ụfọdụ ndị dịrị ndụ n’oge Pọl gosipụtara?
16 N’Iden, Setan nwere ihe ịga nke ọma n’ịrafu Iv n’ihi na Iv nwere ọchịchọ ime ihe masịrị ya. Iv chọrọ ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 3:1-6) Na narị afọ mbụ, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọrint nwere mmụọ yiri nke ahụ. Ha chere na ha ma ihe karịa Pọl, ọ kpọkwara ha ndịozi ọ kasị mma n’ụzọ ịkwa emo.—2 Ndị Kọrint 11:3-5; 1 Timoti 6:3-5.
17. Olee otú anyị pụrụ isi zere inwe mmụọ nke ime otú masịrị anyị?
2 Timoti 3:4; Ndị Filipaị 3:18) Mgbe a bịara n’ihe metụtara ofufe dị ọcha, ọ dị oké mkpa ka anyị legara Jehova anya maka nduzi ma na-ekwenyere “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na ndị okenye ọgbakọ. Nke a bụ otú anyị ga-esi na-achọ ezi omume, ọ na-egbochikwa anyị inwe mmụọ nke ime otú masịrị anyị. (Matiu 24:45-47; Abụ Ọma 25:9, 10; Aịsaịa 30:21) Ọgbakọ nke ndị e tere mmanụ mejupụtara bụ “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu.” Jehova guzobere ọgbakọ a iji na-echebe ma na-eduzi anyị. (1 Timoti 3:15) Ịghọta ọrụ dị oké mkpa ọ na-arụ ga-enyere anyị aka ‘ịghara ịbụ ndị onwe anyị na-ebu isi’ ka anyị ji obi umeala na-eme ihe kwekọrọ n’ọchịchọ ezi omume nke Jehova.—Ndị Filipaị 2:2-4; Ilu 3:4-6.
17 N’ụwa taa, ọtụtụ ndị bụ “ndị isi ike, ndị nganga,” ụfọdụ Ndị Kraịst na-akpakwa àgwà ndị dị otú ahụ. Ọbụna ụfọdụ aghọọla ndị na-emegide eziokwu ahụ. (Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Jizọs
18. Olee àgwà Jizọs ndị a na-agba anyị ume iṅomi?
18 Bible buru amụma banyere Jizọs, sị: “Ị hụwo ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị.” (Abụ Ọma 45:7; Ndị Hibru 1:9) Nke a bụ nnọọ àgwà dị mma nṅomi! (1 Ndị Kọrint 11:1) Ọ bụghị nanị na Jizọs maara ụkpụrụ Jehova ndị ziri ezi; ọ hụrụ ha n’anya. N’ihi ya, mgbe Setan nwara ya ọnwụnwa n’ịkpa, Jizọs jụwara isi ịgbahapụ ‘ụzọ ezi omume.’—Ilu 8:20; Matiu 4:3-11.
19, 20. Olee ezi ihe ndị na-esi n’ịchọ ezi omume apụta?
19 N’eziokwu, ọchịchọ anụ ahụ́ ndị na-ezighị ezi siri ezigbo ike. (Ndị Rom 7:19, 20) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ezi omume dị oké ọnụ ahịa nye anyị, ọ ga-ewusi anyị ike ịjụ ajọ omume. (Abụ Ọma 119:165) Ịhụ ezi omume n’anya ga-echebe anyị mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa itinye aka n’ihe ọjọọ. (Ilu 4:4-6) Cheta, mgbe ọ bụla anyị dara n’ọnwụnwa, anyị na-eme ka Setan nwee mmeri. Ọ ka nnọọ mma iguzogide Setan ma mee ka Jehova nwee mmeri!—Ilu 27:11; Jems 4:7, 8.
20 Ebe ọ bụ na ezi Ndị Kraịst na-achọ ezi omume, ha “jupụtara ná mkpụrụ ezi omume, bụ́ nke sitere na Jizọs Kraịst, iji wetara Chineke otuto na ịja mma.” (Ndị Filipaị 1:10, 11) Ha na-eyikwasị “ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Ndị Efesọs 4:24) Ha bụ nke Jehova, ha kwesịkwara iji ndụ ha na-ejere ya ozi, ọ bụghị iji ya eme ihe na-amasị ha. (Ndị Rom 14:8; 1 Pita 4:2) Nke ahụ bụ ihe na-ekpebi ihe ha ga na-eche n’echiche na ihe ndị ha ga na-eme. Lee ka nke ahụ ga-esi na-ewetara Nna ha nke eluigwe ọṅụ!—Ilu 23:24.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Ndị nne na nna ga-achọta aro ndị bara uru banyere otú ha ga-esi chebe ezinụlọ ha pụọ n’omume rụrụ arụ n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 13 Ihe a na-akpọbu ibekasị akụkụ ahụ́ nwanyị ji amụ nwa bụ ibi úgwù.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• N’ihi gịnị ka ịchọ ezi omume ji dị oké mkpa?
• Olee otú Onye Kraịst na-ezughị okè pụrụ isi na-achọ ezi omume?
• Olee ụfọdụ ihe Ndị Kraịst na-aghaghị izere n’ụwa?
• Olee otú ịchọ ezi omume si echebe anyị?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 26]
Ụwa bụ ebe dị ize ndụ nye ụmụazụ Jizọs
[Foto dị na peeji nke 27]
Ụmụaka ndị a kụnyere ọchịchọ ịhụ Jehova n’anya n’ime obi ha ga-abụ ndị e wusiri ike izere omume rụrụ arụ
[Foto dị na peeji nke 28]
Ụfọdụ ndị Izrel chefuru Jehova mgbe ihe malitere ịgaziri ha n’Ala Nkwa ahụ
[Foto dị na peeji nke 29]
Ndị Kraịst kpọrọ mmebi iwu asị dị ka Jizọs mere