Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịzụlite Ụmụ Asatọ n’Ụzọ Jehova Na-eweta Ma Ihe Ịma Aka ma Ọṅụ

Ịzụlite Ụmụ Asatọ n’Ụzọ Jehova Na-eweta Ma Ihe Ịma Aka ma Ọṅụ

Akụkọ Ndụ

Ịzụlite Ụmụ Asatọ n’Ụzọ Jehova Na-eweta Ma Ihe Ịma Aka ma Ọṅụ

DỊ KA JOYCELYN VALENTINE SI KỌỌ

Na 1989, di m gara mba ọzọ ịga rụọ ọrụ. O kwere nkwa na ya ga na-ezilata ego ka m wee nwee ike ilekọta ụmụ m asatọ. Ọtụtụ izu gafere, anụghị m ụkpọrọ di m. Ọtụtụ ọnwa gafekwara ma ọ dịbeghị ihe ọ bụla m nụrụ banyere ya. Anọgidere m na-akasi onwe m obi, sị, ‘Ozugbo ihe batawara ya n’aka, ọ ga-alọta.’

ENWERE m obi nkoropụ n’ihi na enweghị m ego m ga-eji lekọta ezinụlọ m. Nke a churu m ụra ọtụtụ abalị. Àgwà a di m kpara riri m ọnụ nke na m nọ na-ajụ onwe m, sị, ‘Olee otú ọ ga-esi mee ezinụlọ ya ihe a?’ N’ikpeazụ, ọ bịara doo m nnọọ anya na di m agbahapụla anyị. Ruo taa, ọ ka lọtabeghị kemgbe afọ 16 ọ hapụrụ anyị. Nke a mere ka m zụlite ụmụ m nanị m. Nke a abụworo m ihe ịma aka, ma enwewo m ọṅụ dị ukwuu ka m na-ahụ ka ụmụ m na-eje ije n’ụzọ Jehova. Otú ọ dị, tupu mụ akọọ otú anyị si nagide ihe isi ike ndị anyị nwere dị ka ezinụlọ, ka m kọọrọ gị otú e si zụlite m.

Ịchọ Nduzi Bible

A mụrụ m na 1938 n’agwaetiti bụ́ Jamaica nke dị n’Oké Osimiri Caribbean. Ọ bụ ezie na papa m adịghị aga chọọchị, o weere onwe ya dị ka onye na-atụ egwu Chineke. Ọ na-agwakarị m n’abalị ka m gụpụtara ya ihe site n’akwụkwọ Bible bụ́ Abụ Ọma. N’oge na-adịghị anya, amalitere m ibu ọtụtụ Abụ Ọma n’isi. Mama m na-aga otu chọọchị dị n’ógbè anyị, ọ na-akpọ m aga nzukọ okpukpe ha mgbe ụfọdụ.

Na nzukọ ndị ahụ, a gwara anyị na Chineke na-akpọrọ ndị ezi omume gaa eluigwe ma na-akpọ ndị ajọ omume ọkụ ruo mgbe ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ. A gwakwara anyị na Jizọs bụ Chineke nakwa na ọ hụrụ ụmụntakịrị n’anya. Nke a gbagwojuru m anya ma mee ka m na-atụ Chineke ụjọ. Echere m, sị, ‘Olee otú Chineke nke hụrụ anyị n’anya ga-esi na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ime ọkụ?’

Obi na-amafu m mgbe ọ bụla m chetara ihe banyere ọkụ ala mmụọ. Ka oge na-aga, amalitere m iso ndị Chọọchị Seventh-Day Adventist amụ Bible, bụ́ nke ha na-eme site n’idegara mmadụ akwụkwọ ozi. Ha kụziri na a gaghị ata ndị ajọ omume ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi, kama na a ga-akpọ ha ọkụ n’oké ọkụ, ha aghọọ ntụ. Nke a yitụrụ ihe ezi uche dị na ya, amalitekwara m ịga nzukọ okpukpe ha. Ma ihe ndị ha na-akụzi gbagwojuru m anya, ihe ndị m mụtakwara agbazighị echiche hiere ụzọ m nwere banyere ihe bụ́ omume ọma.

N’oge ahụ, ndị mmadụ n’ozuzu kweere na ịkwa iko dị njọ. N’agbanyeghị nke ahụ, mụ na ọtụtụ ndị ọzọ kweere na nanị ndị na-eso ihe karịrị otu onye enwe mmekọahụ bụ ndị na-akwa iko. N’ihi ya, mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye, bụ́ ndị na-adịghị eso onye ọ bụla ọzọ enwe mmekọahụ ma ọ bụghị nanị onwe ha, emehieghị. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Hibru 13:4) Echiche ahụ m nwere so mee ka m ghọọ nne na-alụghị di nke nwere ụmụ isii.

Inwe Ọganihu Ime Mmụọ

Na 1965, Vaslyn Goodison na Ethel Chambers bịara biri n’ógbè dị anyị nso bụ́ Bath. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ha zikwara papa m ozi ọma otu ụbọchị. O kwetara ka ha na-abịa amụrụ ya Bible. Ha na-ezikwa m ozi ọma ma ọ bụrụ na m nọ ya mgbe ha bịara. N’agbanyeghị na ana m enyo Ndịàmà Jehova enyo, ekpebiri m iso ha na-amụ Bible iji gosi ha na ihe ha na-akụzi abụghị eziokwu.

Ajụrụ m ọtụtụ ajụjụ mgbe anyị na-amụ ihe, Ndịàmà ahụ jikwara Bible zaa ha nile. Site n’enyemaka ha, achọpụtara m na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe, ha adịghịkwa ata ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. (Eklisiastis 9:5, 10) Amụtakwara m banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala. (Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 21:3, 4) Ọ bụ ezie na papa m kwụsịrị ịmụ Bible, amalitere m ịga nzukọ ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè anyị. Otú ha si enwe nzukọ ndị ahụ n’udo nakwa n’usoro mere ka m mụtakwuo banyere Jehova. Agakwara m mgbakọ sekit na nke distrikti, bụ́ nnọkọ ndị ka ibu Ndịàmà Jehova haziri. Ịghọta Bible n’ụzọ dị otú a mere ka m nwee ọchịchọ siri ike ife Jehova n’ụzọ ọ na-anakwere. Otú ọ dị, enwere otu ihe na-egbochi m ime otú ahụ.

N’oge ahụ, mụ na nwoke nwe ụmụ atọ n’ime ụmụ m isii bi, ọ bụ ezie na anyị abụghị di na nwunye. Amụtara m site na Bible na mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ dị njọ n’anya Chineke. Akọ na uche m malitekwara inye m nsogbu. (Ilu 5:15-20; Ndị Galeshia 5:19) Ka ịhụnanya m nwere maka eziokwu ahụ na-emiwanye emi, ọ gụsiri m agụụ ike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Chineke. N’ikpeazụ, emere m mkpebi. Agwara m nwoke ahụ mụ na ya bi na ọ bụrụ na anyị agaghị alụ onwe anyị, anyị ga-egbubi mmekọrịta anyị. Ọ bụ ezie na mụ na ya anọghị n’otu okpukpe, anyị gbara akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro n’August 15, 1970, nke bụ́ afọ ise Ndịàmà ahụ gwasịrị m okwu na nke mbụ ya. Na December 1970, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptizim ime mmiri.

A bịa n’ihe banyere ozi m, agaghị m echefu ụbọchị mbụ m so gaa ozi ọma. Ahụ́ nọ na-ama m jijiji, amaghịkwa m otú m ga-esi malite nkwurịta okwu Bible. N’ikwu nke bụ́ eziokwu, ekudara m ume mgbe onye mbụ anyị zutere gbubiri nkwurịta okwu anyị ngwa ngwa. N’oge na-adịghị anya, akwụsịrị m ịtụ ụjọ. Ná ngwụsị nke ụbọchị ahụ, enwere m obi ụtọ dị ukwuu n’ihi na esorowo m ọtụtụ mmadụ kwurịtara ihe ndị dị na Bible n’ụzọ dị nkenke ma nye ha ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị e ji amụ Bible.

Ime Ka Ezinụlọ M Kwụrụ Chịm n’Ụzọ Ime Mmụọ

Ka ọ na-erule 1977, ụmụ anyị eruola asatọ. Ekpebisiri m ike ime ike m nile iji nyere ndị ezinụlọ m aka ife Jehova. (Joshua 24:15) Ya mere, agbalịsiri m ike ịdị na-eduzi ọmụmụ Bible ezinụlọ n’ụzọ chịrị anya. Mgbe ụfọdụ, n’ihi ike ọgwụgwụ, ụra na-eburu m mgbe otu n’ime ụmụ m na-agụpụta otu paragraf n’olu dara ụda, ha na-akpọtekwa m. Ma, ọ dịtụbeghị mgbe ike ọgwụgwụ gbochiri anyị ịmụ Bible dị ka ezinụlọ.

Mụ na ụmụ m na-ekpechikwa ekpere anya. Ozugbo ha tolitere, akụziiri m ha otú ha ga-esi na-ekpegara Jehova ekpere n’onwe ha. M na-ahụ na nke ọ bụla n’ime ha na-ekpe ekpere tupu ya alaba ụra. Ana m ekpere nwa nke ọ bụla na-amụtabeghị otú e si ekpe ekpere n’onwe ya, ekpere.

Na mbụ, di m ekweghị ka m na-akpọ ụmụ anyị aga nzukọ ọgbakọ. Otú ọ dị, mgbe o chechara otú ọ ga-esi na-elekọta ụmụ anyị nanị ya ma m gawa ọmụmụ ihe, o mere ka ọ kwụsịlata imegide m. Ọ na-amasị ya ịga na nke ndị enyi ya n’oge abalị, ma ọ gatụghị amasị ya ịkpọrọ ụmụaka asatọ aga! N’ikpeazụ, ọ malitere ọbụna inyere m aka ịkwadebe ụmụ anyị maka ịga Ụlọ Nzukọ Alaeze.

N’oge na-adịghị anya, ịga nzukọ nile nke ọgbakọ na ikere òkè n’ọrụ nkwusa bịara mara ụmụ m ahụ́. N’oge ezumike ha, ha na-esorokarị ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile, nọ n’ọgbakọ, aga ozi ọma. Nke a nyeere ụmụ m aka ịbụ ndị ọgbakọ na ọrụ nkwusa na-amasị nke ukwuu.—Matiu 24:14.

Oge Ule

Di m malitere ịga mba ọzọ ịga rụọ ọrụ iji nwetakwuo ego anyị ga-eji na-elekọta ezinụlọ anyị. Ọ na-ahapụ ezinụlọ anyị ruo ogologo oge ma na-alọta mgbe ụfọdụ. Otú ọ dị, na 1989, ọ gaghachiri ma ọ lọtaghị ọzọ. Dị ka m kwuru na mbụ, mgbahapụ di m gbahapụrụ anyị kpataara m obi nkoropụ. Ebere m ákwá ọtụtụ abalị na-arịọsi Jehova arịrịọ ike ka ọ kasie m obi ma nyere m aka idi ya, echekwara m na ọ zara ekpere m. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Aịsaịa 54:4 na 1 Ndị Kọrint 7:15 mere ka m nwee obi iru ala na ume iji na-aga n’ihu. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, ndị ikwu m na ndị enyi m gbara m ume ma nyere m aka n’ụzọ ihe onwunwe. Enwere m ekele dị ukwuu n’ebe Jehova na ndị ya nọ maka enyemaka ha.

Anyị nwetara ọnwụnwa ndị ọzọ. N’otu oge, a chụpụrụ otu n’ime ụmụ m ndị nwanyị n’ọgbakọ n’ihi na ọ kpara àgwà Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Ọ bụ ezie na ahụrụ m ụmụ m nile n’anya, ma ịkwụsi ike n’akụkụ Jehova na-ebute ụzọ. Ya mere, n’oge ahụ, mụ na ụmụ m ndị ọzọ gbalịsiri ike itinye nduzi Bible banyere otú a ga-esi na-emeso ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ihe n’ọrụ. (1 Ndị Kọrint 5:11, 13) Ọtụtụ ndị na-aghọtaghị ihe mere anyị ji na-emeso ya otú ahụ katọrọ anyị. Otú ọ dị, mgbe a nabataghachiri nwa m nwanyị n’ọgbakọ, di ya gwara m na ya nwere mmasị n’otú anyị si gbasochie ụkpụrụ Bible anya. Ugbu a, di nwa m nwanyị na ezinụlọ ya na-efe Jehova.

Ụkọ Ego

Mgbe di m hapụrụ anyị, enweghị m ihe m na-arụ iji kpata ego, ọ dịghịzikwa ezitere ezinụlọ anyị ego. Ọnọdu a kụziiri anyị inwe afọ ojuju n’ibi ndụ dị mfe na iwere akụ̀ ime mmụọ dị ka ihe dị mkpa karịa ihe onwunwe. Ụmụ m nwere mmekọrịta chiri anya karị ka ha mụtara ịhụ ibe ha n’anya na inyere ibe ha aka. Mgbe ndị nke okenye malitere ịrụ ọrụ ego, ha na-eji obi ha nile enyere ụmụnne ha ndị nke nta aka. Nwa m nwanyị nke kasị okenye, bụ́ Marseree, nyeere nwanne ya nwanyị nke kasị nta, bụ́ Nicole, aka ịgụcha akwụkwọ sekọndịrị. Tụkwasị na nke ahụ, emepere m ụlọ ahịa ebe a na-ere ihe e ji esi nri. Obere ego m na-enweta nyeere m aka igbo mkpa anyị ụfọdụ.

Ọ dịtụbeghị mgbe Jehova gbahapụrụ anyị. N’otu oge, agwara m otu nwanna nwanyị na anyị agaghị mgbakọ distrikti n’ihi ụkọ ego. Ọ zaghachiri, sị: “Nwanna Nwanyị Val, mgbe ọ bụla ị nụru banyere mgbakọ, kwadowe ịga! Jehova ga-enyere gị aka inweta ihe ị ga-eji gaa.” Etinyere m aro ya n’ọrụ. Jehova nyeere m aka, ọ nọgidewokwa na-eme otú ahụ. Ọ dịbeghị mgbakọ ọ bụla kwara ezinụlọ anyị n’ihi ụkọ ego.

Na 1988, ajọ ifufe kpara mkpamkpa na Jamaica, anyị sikwa n’ụlọ anyi gbaga ebe anyị ga-ezere isi anyị. Mgbe ajọ ifufe ahụ dajụtụrụ, mụ na nwa m nwoke si n’ebe ahụ anyị nọ na-ezere isi anyị gawa n’ebe ụlọ anyị dịbu nke bụzi mkpọmkpọ ebe, iji hụ ihe merenụ. Ka anyị nọ na-elegharị anya, ahụrụ m otu ihe m chọrọ iburu. Na mberede, ifufe malitere ife ọzọ, n’agbanyeghị nke ahụ, ejigidesiri m ihe ahụ m chọrọ iburu ike. “Mama, hapụ televishọn ahụ. Ị̀ bụ nwunye Lọt?” (Luk 17:31, 32) Ihe ahụ nwa m kwuru mere ka m mata ebe m nọ. Ebusara m televishọn ahụ mmiri matọchaworo, anyị abụọ gbaghachikwara n’ebe ahụ anyị nọ na-ezere isi anyị.

Ọ na-awụ m akpata oyi n’ahụ́ ugbu a ka m na-echeta na m tinyere ndụ m n’ihe ize ndụ n’ihi televishọn. Ma ọ na-enye m obi ụtọ mgbe ọ bụla m chetara okwu nwa m nwoke kwuru n’oge ahụ bụ́ nke mere ka m mata onwe m. Ihe o kwuru gosiri na o ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. N’ihi ọzụzụ Bible o nwetaworo n’ọgbakọ Ndị Kraịst, o nyeere m aka izere ihe gaara akpataworo m mmerụ ahụ́ n’ụzọ nkịtị nakwa ma eleghị anya, n’ụzọ ime mmụọ.

Oké ifufe ahụ mebisịrị ebe obibi anyị na ihe onwunwe anyị, ọ kpatakwaara anyị nkụda mmụọ. Ụmụnna ime mmụọ anyị gbataziiri anyị ọsọ enyemaka. Ha gbara anyị ume idi ihe ndị funahụrụ anyị site n’ịtụkwasị Jehova obi na ịnọgide na-agachị ozi ọma anya, ha nyekwaara anyị aka iwughachi ebe obibi anyị. Ọrụ ịhụnanya na nke ịchụ onwe onye n’àjà dị otú ahụ, bụ́ nke Ndịàmà nọ na Jamaica nakwa ndị nke si mba ndị ọzọ rụrụ, metụrụ anyị n’ahụ́ n’ụzọ dị ukwuu.

Itinye Jehova n’Ọnọdụ Mbụ

Mgbe nwa m nke abụọ, bụ́ Melaine, gụsịrị akwụkwọ, o jere ozi dị ka ọsụ ụzọ. Ọ nakweere òkù a kpọrọ ya ije ozi dị ka ọsụ ụzọ n’ọgbakọ ọzọ, nke pụtara na ọ ga-ahapụ ọrụ ya. Ọ bụ ezie na ọrụ ahụ mere ka ọ na-akwado nnọọ ezinụlọ anyị n’ụzọ ego, anyị nwere obi ike na Jehova ga-elekọta anyị ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị etinye ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ. (Matiu 6:33) Mgbe e mesịrị, a kpọkwara nwa m nwoke, bụ́ Ewan, òkù ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ. Ọ na-akwado ezinụlọ anyị n’ụzọ ego, ma anyị gbara ya ume ka ọ nakwere òkù ahụ a kpọrọ ya ma rịọ Jehova ka ọ gọzie ya. Ọ dịtụbeghị mgbe m kụdara ụmụ m aka ka ha ghara ịmụba ozi Alaeze ha. E nwetụbeghịkwa mgbe anyị nile bụ́ ndị fọdụrụ n’ụlọ nọrọ n’ụkọ. Kama nke ahụ, anyị na-enwe ọṅụ dị ukwuu, ọtụtụ mgbe kwa, anyị enwewo ike inyere ndị ọzọ nọ ná mkpa aka.

Taa, obi na-atọ m nnọọ ụtọ ịhụ ka ụmụ m “na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Otu n’ime ụmụ m ndị nwanyị, bụ́ Melaine, na-esonyere di ya ugbu a ka ọ na-eleta ọgbakọ dị iche iche dị ka onye nlekọta sekit. Nwa m nwanyị bụ́ Andrea na di ya na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ọ na-esokwa di ya mgbe ọ na-eleta ọgbakọ dị iche iche dị ka onye na-enyere onye nlekọta sekit aka. Nwa m nwoke, bụ́ Ewan, na nwunye ya na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ọ bụkwa okenye ọgbakọ. Nwa m nwanyị nke ọzọ, bụ́ Ava-Gay, na di ya na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Jamaica. Jennifer, Genieve na Nicole na ezinụlọ ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eso ọgbakọ ha dị iche iche eje ozi. Mụ na Marseree bi, anyị abụọ nọzi n’Ọgbakọ Port Morant. Jehova agọziwo m n’ụzọ dị ukwuu, n’ihi na ụmụ m asatọ nọgidere na-efe Jehova.

Ime agadi ewetarala m nsogbu ahụ́ ike. Ugbu a, ana m arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo, ma m ka na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ. Otú ọ dị, oge ụfọdụ, ọ na-esiri m nnọọ ike ịgagharị gburugburu ebe m bi nke bụ́ ugwu ugwu. Ọ na-esiri m ike ijezu ozi m. Agbalịrị m ịgba ịnyịnya ígwè ma chọpụta na ọ dịịrị m mfe karịa iji ụkwụ. N’ihi ya, azụrụ m ịnyịnya ígwè ochie ma jiri ya na-aga ozi ọma. Na mbụ, obi adịghị eru ụmụ m ala ịhụ ka nne ha na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo na-agba ígwè. Ma ọ na-atọ ha nnọọ ụtọ ịhụ ka m nọgidere na-eme nkwusa dị ka m si chọọ.

Ana m enwe ọṅụ dị ukwuu ịhụ ka ndị m mụụrụ ihe na-anabata eziokwu Bible. Ana m ekpe ekpere mgbe nile ka Jehova nyere ndị nile nọ n’ezinụlọ m aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya n’oge ọgwụgwụ a nakwa ruo mgbe ebighị ebi. Ana m ekele ma na-eto Jehova, bụ́ Onye Ukwu “Na-anụ ekpere,” n’ihi na o mere ka o kwe m omume imeri ihe ịma aka nke ịzụlite ụmụ m asatọ n’ụzọ ya.—Abụ Ọma 65:2.

[Foto dị na peeji nke 10]

Mụ na ụmụ m, ndị di ha na ndị nwunye ha, nakwa ụmụ ụmụ m

[Foto dị na peeji nke 12]

Ana m ejizi ịnyịnya ígwè aga ozi