Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Abụ Ọma 102:26 kwuru na eluigwe na ụwa “ga-ala n’iyi.” Nke a ọ̀ pụtara na a ga-ebibi mbara Ụwa?

N’ekpere o kpegaara Jehova, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Na mgbe ochie ka ị tọrọ ntọala nke ụwa; ọrụ aka Gị ka eluigwe bụkwa. Ha onwe ha ga-ala n’iyi, ma Gị onwe gị na-eguzogide: ha nile ga-akakwa nká dị ka uwe; Dị ka ákwà mgbokwasị ka ị ga-agbanwe ha, a ga-agbanwekwa ha.” (Abụ Ọma 102:25, 26) Ihe ndị gbara amaokwu ndị ahụ gburugburu na-egosi na ha na-ekwu banyere ịdịru ebighị ebi nke Chineke ọ bụghị banyere mbibi nke ụwa. Ọ na-egosikwa ihe mere eziokwu ahụ dị oké mkpa ji bụrụ ihe nkasi obi nye ndị ohu Chineke.

Ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye o yiri ka a dọọrọ ya n’agha laa Babilọn, malitere okwu ya site n’ịkọwa nhụjuanya ya. Ọ kwara arịrị na ndụ ya na-agabiga “n’anwụrụ ọkụ.” Nchegbu mekpara ya ahụ́, mee ka ọkpụkpụ ya dị ka “ọlọkọ ọkụ [ma ọ bụ “ekwú ọkụ”].” Ike gwụrụ ya, ọ dịkwara ka “ihe a kụrụ n’ala, o wee kpọnwụọ.” Owu na-ama ya “dị ka nnụnụ nta nke nanị ya nọ n’elu ụlọ.” Ọnwụnwa mere ka afọ machie ya, ụbọchị ya jupụtakwara nanị n’iru újú. (Abụ Ọma 102:3-11) N’agbanyeghị nsogbu ndị a ọbụ abụ ahụ nwere, ọ daghị mbà. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi ihe Jehova kwerela nkwa imere Zaịọn, ma ọ bụ Jeruselem.

Ọ bụ ezie na e bibiri Zaịọn, Jehova ekwewo nkwa na a ga-ewughachi ya. (Aịsaịa 66:8) N’ihi ya, ọbụ abụ ahụ ji obi ike gwa Jehova, sị: “Gị onwe gị ga-ebili, nwee obi ebere n’ahụ́ Zaịọn: n’ihi na mgbe eruwo imere ya amara, n’ihi na mgbe akara aka abịawo. N’ihi na Jehova ewuwo Zaịọn.” (Abụ Ọma 102:13, 16;) Mgbe ahụ, ọbụ abụ ahụ maliteghachiri ikwu banyere nhụjuanya ya. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, o chere na ebe ọ bụ na Chineke ga-enwe ike ime ka e wughachi Jeruselem bụ́ nke e bibiri ebibi, Jehova ga-enwekwa ike ịnapụta ya ná nhụsianya ọ nọ na ya. (Abụ Ọma 102:17, 20, 23) E nwekwara ihe ọzọ kpaliri ọbụ abụ ahụ ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ eziokwu ahụ bụ́ na Chineke na-adị ruo ebighị ebi.

E nwere nnọọ ọdịiche gbara ọkpụrụkpụ dị n’etiti ịdịru ebighị ebi nke Jehova na ndụ dị mkpụmkpụ nke ọbụ abụ ahụ. Ọ gwara Jehova, sị: “N’ọgbọ nile ka afọ Gị na-adịgide.” (Abụ Ọma 102:24) Ọbụ abụ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Na mgbe ochie ka ị tọrọ ntọala nke ụwa, ọrụ aka Gị ka eluigwe bụkwa.”—Abụ Ọma 102:25.

N’agbanyeghị ogologo oge eluigwe na ụwa nọrọla, a pụghị iji ha tụnyere Jehova bụ́ onye na-adịru ebighị ebi. Ọbụ abụ ahụ gbakwụnyere, sị: “Ha onwe ha [eluigwe na ụwa] ga-ala n’iyi, ma Gị onwe gị na-eguzogide.” (Abụ Ọma 102:26) Eluigwe na ụwa nkịtị pụrụ ịla n’iyi. N’ezie, e nwere ebe Jehova kwuru na ha ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 119:90; Eklisiastis 1:4) Ma, a pụrụ ibibi ha ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ nzube Chineke. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Chineke apụghị ịnwụ anwụ. Ihe ndị e kere eke a na-ahụ anya ‘na-eguzo ruo mgbe nile ebighị ebi’ nanị n’ihi na Chineke na-elekọta ha. (Abụ Ọma 148:6) Ọ bụrụ na Jehova anwa anwaa kwụsị inyeghachi ihe ndị o kere eke ume ọhụrụ, mgbe ahụ, “ha nile ga-akakwa nká dị ka uwe.” (Abụ Ọma 102:26) Dị ka mmadụ na-anọte aka karịa uwe ya, n’otu aka ahụ, Jehova pụrụ ịnọte aka karịa ihe ndị o kere eke—ma ọ bụrụ na ọ chọọ. Otú ọ dị, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ mere ka anyị mata na nke ahụ abụghị nzube ya. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na Jehova ekpebiwo na eluigwe na ụwa nkịtị ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 104:5.

Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na Jehova ga-adịgide iji mezuo nkwa nile o kwere. N’agbanyeghị ụdị ule ọ bụla pụrụ ịdakwasị anyị, anyị ga-enwe obi ike na ọ bụrụ na anyị akpọkuo ya, ọ ‘ga-eche ekpere nke onye na-enweghị ihe ihu, ọ gaghị eledakwa ekpere ha anya.’ (Abụ Ọma 102:17) Ee, okwu Jehova kwuru iji mesie anyị obi ike na ya ga-akwado anyị, bụ́ ndị dị n’Abụ Ọma nke 102, siri ike ọbụna karịa ụwa nke anyị zọkwasịrị ụkwụ.