Ezi Ihe nke Ihe Ọjọọ Gbara Gburugburu
Ezi Ihe nke Ihe Ọjọọ Gbara Gburugburu
N’ỤWA nke taa, o yiri ka ọ̀ bụ nanị mmadụ ole na ole dị njikere inyere ndị ọzọ aka. Otú ọ dị, ụfọdụ ka nwere ọchịchọ imere ndị ọzọ ihe ọma n’ụzọ ụfọdụ. Kwa afọ, ọtụtụ mmadụ na-enye òtù dị iche iche na-elekọta ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ọtụtụ ijeri dollar. Dị ka ihe atụ, na Britain, ego kachasịnụ òtù ọrụ ebere nwetarala ruru ijeri dollar 13 (U.S.) na 2002. Kemgbe 1999, ndị omepụrụ onye ọ dịịrị iri enyela ma ọ bụ kwe nkwa inye ihe karịrị ijeri dollar 38 (U.S.) iji nyere ndị ihe na-esiri ike aka.
Ụfọdụ n’ime ezigbo ọrụ ndị òtù ọrụ ebere na-arụ gụnyere ịkwụrụ ezinụlọ ndị dara ogbenye ụgwọ ọgwụ, ịzụ ụmụ mgbei, na iweta ego a ga-eji hụ maka ịgba ndị mmadụ ọgwụ mgbochi ọrịa ná mba ndị ka na-emepe emepe. Ọrụ ndị ọzọ ha na-arụ gụnyekwara inye ndị na-azụ anụmanụ ná mba ndị dara ogbenye anụ ndị ga na-amụ ụmụ na ibugara ndị ọdachi dakwasịrị ihe enyemaka.
Ihe ndị a nile na-egosi na ụmụ mmadụ nwere ikike imere ndị ọzọ ihe ọma. Otú ọ dị, ọ dị mwute na e nwekwara ndị na-eme ihe ọjọọ ndị jọgburu onwe ha.
Ihe Ọjọọ Na-amụba Amụba
Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ bisịrị, ọ fọrọ nke nta ka o ruo ugboro 50 e gbukpọrọ agbụrụ dị iche iche ma gbuo ndị mmadụ n’ìgwè n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “E gbuwo site ná nde mmadụ iri na abụọ ma ọ dịkarịa ala ruo ná nde mmadụ iri abụọ na abụọ aka ha dị ọcha bụ́ nke karịrị mmadụ ole nwụrụ n’agha agbụrụ na agbụrụ na nke mba na mba a lụrụla kemgbe 1945.”
N’agbata afọ 1950 na 2000, e gburu ihe karịrị nde mmadụ abụọ na Cambodia n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ịkpọasị agbụrụ e nwere na Rwanda kpatara ọnwụ nke ihe karịrị ụmụ nwoke, ụmụ nwanyị na ụmụaka dị narị puku asatọ. E gbuola ihe karịrị narị puku mmadụ abụọ na Bosnia n’ihi ihe metụtara okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Mgbe ọ na-agụsị ihe ọjọọ ndị mere n’oge na-adịbeghị anya, odeakwụkwọ ukwu nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu, kwuru n’afọ 2004, sị: “N’Iraq, anyị ahụla ka a na-egbu ndị nkịtị ka ọkụkọ, na-ejichikwa ndị ọrụ enyemaka, ndị odeakụkọ na ndị aka ha dị ọcha ma gbuo ha n’ụzọ obi ọjọọ na-enweghị atụ. N’otu oge ahụ, anyị ahụla ka a na-arụsa ndị Iraq a tụrụ mkpọrọ arụrụala. Na
Darfur, anyị ahụla ka a na-achụpụ ọtụtụ mmadụ n’ụlọ ha ma kụtuo ụlọ ha. Ndị agha ana-edinakwa ụmụ nwanyị n’ike iji manye ndị iro ha ịchịli aka elu. N’ebe ugwu Uganda, anyị ahụla ka a na-ebe ụmụaka ụkwụ na aka ma na-amanye ha iso na-akpa àgwà obi ọjọọ. Na Beslan, anyị ahụla ka a na-ejichi ụmụaka ma gbusịsịa ha n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́.”Ọbụna ná mba ndị a sị na ha mepere emepe, mpụ ndị ịkpa ókè agbụrụ kpatara na-arịwanye elu. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2004, akwụkwọ akụkọ bụ́ Independent News kọrọ na na Britain “ọnụ ọgụgụ ndị a wakporo ma ọ bụ merụọ ahụ́ n’ihi agbụrụ ha si na ya ejirila okpukpu iri na otu rịa elu n’afọ iri gara aga.”
Gịnị mere ụmụ mmadụ bụ́ ndị nwere ikike ime nnọọ ezi ihe ji eme ihe ọjọọ ndị dị otú a? Ọ̀ dị mgbe ihe ọjọọ na-agaghị adịkwa? Dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi, Bible zara ajụjụ ndị a na-agbagwoju anya n’ụzọ na-eju afọ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
IHU AKWỤKWỌ: Mark Edwards/Still Pictures/Peter Arnold, Inc.