Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Okwu E Kwuru na Mgbe Ya, Lee Ka O Si Dị Mma nke Ukwuu!”

“Okwu E Kwuru na Mgbe Ya, Lee Ka O Si Dị Mma nke Ukwuu!”

“Okwu E Kwuru na Mgbe Ya, Lee Ka O Si Dị Mma nke Ukwuu!”

NÁ MGBAKỌ otu ụbọchị nke Ndịàmà Jehova nwere, Kim gbalịsiri ike ige ntị na idetu ihe ka ọ na-agbalịkwa ime ka nwa ya nwanyị dị afọ abụọ na ọkara nọrọ jụụ. Mgbe ihe omume ahụ mechiri, otu nwanna nwanyị nke ya na ya nọ n’otu oche lere Kim anya ma jaa ya mma nke ukwuu maka otú ya na di ya si lekọta nwa ha nwanyị mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Okwu ịja mma dị otú ahụ gbara Kim ume nke ukwuu nke na ọbụna ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịworo, o kwuru, sị: “Mgbe ike gwụrụ m ná nzukọ, m na-echeta ihe ahụ nwanna nwanyị ahụ kwuru. Okwu ọma ya ka na-agba m ume ịnọgide na-azụ nwa anyị nwanyị.” N’ezie, okwu e kwuru na mgbe ya pụrụ ịgba mmadụ ume. Bible na-ekwu, sị: “Okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!”—Ilu 15:23.

Otú ọ dị, ọ pụrụ isiri ụfọdụ n’ime anyị ike ịja ndị ọzọ mma. Mgbe ụfọdụ, ịmara na e nwere ebe ndị anyị onwe anyị na-adịghị emezi emezi pụrụ ime ka o siere anyị ike ịja ndị ọzọ mma. Otu Onye Kraịst kwuru, sị: “Nye m, ọ dị ka iguzo n’apịtị. Ka m na-agụpụta ndị ọzọ, otú ahụkwa ka m na-emikpu.” Ihe ndị dị ka ihere, enweghị ùgwù onwe onye, ma ọ bụ ịtụ ụjọ na ndị ọzọ ga-aghọtahie anyị pụkwara ime ka o siere anyị ike ịja ndị ọzọ mma. Tụkwasị na nke ahụ, ọ bụrụ na a gwakebeghị anyị okwu ịja mma mgbe anyị na-etolite, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ dịghịdị onye jara anyị mma n’oge ahụ, ọ pụrụ isiri anyị ike ịja ndị ọzọ mma.

Otú o sina dị, ịmara na okwu ịja mma pụrụ ịbara ma onye kwuru ya ma onye a gwara ya uru pụrụ ịkpali anyị ime ike anyị nile ịgwa mmadụ okwu ịja mma n’oge kwesịrị ekwesị. (Ilu 3:27) Ya mere, olee uru ndị a na-erite site n’ime otú ahụ? Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha ná mkpirikpi.

Abamuru Ya

Okwu ịja mma kwesịrị ekwesị pụrụ ime ka onye a gwara ya nwee ùgwù onwe onye. Elaine, bụ́ nwunye bụ́ Onye Kraịst, kwuru, sị: “Mgbe ndị mmadụ jara m mma, ọ na-egosi m na obi siri ha ike na m ga-emeli ihe a tụrụ anya ya n’aka m.” Ee, ịja onye na-enweghị ùgwù onwe onye mma pụrụ ime ka onye ahụ nwee obi ike imeri ihe mgbochi ma nweta ọṅụ. Ọ na-abara ndị na-eto eto uru karịsịa ma ọ bụrụ na a jaa ha mma mgbe ha mere ihe dị mma. Otu nwa agbọghọ nta nke kwetara na echiche na-ezighị ezi ndị ọ na-enwe na-akụda ya mmụọ kwuru, sị: “M na-eme ihe nile m nwere ike ime iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, ma mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka m dịghị eru ihe a chọrọ n’agbanyeghị ihe nile m na-eme. Mgbe mmadụ jara m mma, obi na-atọ m ụtọ.” N’ezie, ilu Bible a na-esonụ bụ eziokwu: “Mkpụrụ osisi apụl ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ.”—Ilu 25:11.

Okwu ịja mma pụrụ ịkwali mmadụ ime ihe, ọ pụkwara ịgba mmadụ ume. Otu onye ozi oge nile na-ekwu, sị, “Ịbụ onye a jara mma na-akpali m ịrụsikwu ọrụ ike na ime ka ozi m kakwuo mma.” Otu nne nke nwere ụmụ abụọ chọpụtara na mgbe ndị nọ n’ọgbakọ jara ụmụ ya mma maka ajụjụ ha zara ná nzukọ, ha na-achọ ịzakwu ọzọ. Ee, ịja ndị na-eto eto mma pụrụ ịkpali ha ibi ndụ dị ka Ndị Kraịst. N’ezie, ọ dị anyị nile mkpa ka e mesie anyị obi ike na e ji anyị kpọrọ ihe nakwa na anyị bara uru. Ụwa a jupụtara n’ihe isi ike pụrụ ime ka anyị nwee ike ọgwụgwụ na nkụda mmụọ. Otu okenye ọgbakọ kwuru, sị, “Mgbe ụfọdụ, mgbe m nwere nkụda mmụọ, okwu ịja mma na-adị ka azịza nye ekpere m.” N’ụzọ yiri nke ahụ, Elaine na-ekwu, sị, “Mgbe ụfọdụ, mgbe ndị ọzọ jara m mma ọ na-adị m ka Jehova ọ̀ na-egosi na ya nwere mmasị n’ebe m nọ.”

Mmadụ ịbụ onye a jara mma pụrụ ime ka ọ mara na e ji ya kpọrọ ihe. Ịja mmadụ mma site n’obi na-egosi na anyị na-eche banyere onye ahụ, ọ na-emekwa ka onye ahụ nwee obi ụtọ, mee ka ahụ́ ruo ya ala, gosikwa ya na e ji ya kpọrọ ihe. Ọ na-egosi na anyị hụrụ Ndị Kraịst ibe anyị n’anya n’ezie nakwa na anyị ji ha kpọrọ ihe. Josie, onye bụ́ nne, na-ekwu, sị: “N’oge gara aga, anọsiri m ike n’eziokwu n’agbanyeghị na mụ na ndị ezinụlọ m anọghị n’otu okpukpe. N’oge ahụ, okwu ịja mma ndị m nụrụ site n’ọnụ ndị tozuru okè nọ n’ọgbakọ mere ka m kpebisie ike ịghara ịda mbà.” N’ezie, “anyị bụ akụkụ ahụ́ nke dịịrị ibe anyị.”—Ndị Efesọs 4:25.

Inwe ọchịchọ ịja ndị ọzọ mma na-enyere anyị aka ịhụ ebe ha na-eme nke ọma. Anyị na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma ọ bụghị n’ebe ha na-adịghị eme nke ọma. Otu okenye ọgbakọ aha ya bụ David kwuru, sị, “Inwe ekele maka ihe ndị ọzọ mere ga-enyere anyị aka ịja ha mma ọtụtụ mgbe karị.” Icheta otú Jehova na Ọkpara ya si aja nnọọ ụmụ mmadụ na-ezughị okè mma ga-akpali anyị iṅomi ha mgbe anyị na-aja ndị ọzọ mma.—Matiu 25:21-23; 1 Ndị Kọrint 4:5.

Ndị Kwesịrị Ka A Jaa Ha Mma

N’ihi ihe ndị o kere, Jehova Chineke bụ onye mbụ n’ime ndị kwesịrị ka e too ha. (Mkpughe 4:11) Ọ bụ ezie na ọ dịghị ya mkpa ka anyị jaa ya mma iji mee ka o nwee obi ike n’onwe ya ma ọ bụ iji kpalie ya ime ihe, ma ọ bụrụ na anyị etoo Jehova n’ihi ịdị ebube ya nakwa n’ihi obiọma sitere n’ịhụnanya ya, ọ ga-abịarukwu anyị nso, anyị na ya abụrụkwa enyi. Inye Chineke otuto na-enyekwara anyị aka ịghara ibuli onwe anyị elu n’ihi ihe ndị anyị rụzuru. Ọ na-emekwa ka anyị na-ekwu na ọ bụ Jehova mere anyị ji nwee ihe ịga nke ọma ndị anyị nwere. (Jeremaịa 9:23, 24) Jehova na-eme ka ndị nile ruru eru inweta ndụ ebighị ebi nwee olileanya nke ndụ ebighị, nke ahụ bụkwa ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-eto ya. (Mkpughe 21:3, 4) Ọ dị Eze Devid oge ochie ọkụ n’obi “ito aha Chineke” na “iji ekele too ya.” (Abụ Ọma 69:30) Ka nke ahụ bụrụkwa ọchịchọ anyị!

Ndị anyị na ha so na-efe Jehova kwesịrị ka anyị na-aja ha mma mgbe o kwesịrị. Mgbe anyị jara ha mma, anyị na-eme ihe kwekọrọ n’iwu Chineke nke bụ́ ka “anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” (Ndị Hibru 10:24) Pọl onyeozi setipụrụ ezi ihe nlereanya na nke a. O degaara ọgbakọ dị na Rom akwụkwọ ozi, sị: “Nke mbụ, ana m enye Chineke m ekele site na Jizọs Kraịst banyere unu nile, n’ihi na a na-ekwu banyere okwukwe unu gburugburu ụwa dum.” (Ndị Rom 1:8) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jọn onyeozi jara Onye Kraịst ibe ya bụ́ Geọs mma maka ezi ihe nlereanya ya ‘n’ije ije n’eziokwu ahụ.’—3 Jọn 1-4.

Taa, mgbe Onye Kraịst ibe anyị kpara àgwà kwesịrị nṅomi e ji mara Ndị Kraịst, mee ihe omume ọ kwadebere nke ọma, ma ọ bụ zaa ajụjụ sitere n’obi ná nzukọ, anyị na-enwe ohere mara mma ikele onye ahụ. Ma ọ bụkwanụ, mgbe nwatakịrị gbalịsiri ike ịsapeta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-agụ ná nzukọ, anyị pụrụ ịja ya mma. Elaine, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, kwuru, sị: “Anyị nwere onyinye dịgasị iche iche. Site n’ịja ndị ọzọ mma n’ihi ihe ha mere, anyị na-egosi ekele anyị nwere maka onyinye dịgasị iche iche ndị Chineke nwere.”

N’ezinụlọ

Gịnị banyere ịja ndị ezinụlọ anyị mma? Ọ chọrọ oge, mgbalị, na nlekọta ịhụnanya dị ukwuu n’aka ndị bụ́ di na nwunye iji nye ezinụlọ ha ihe na-akpa ha n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ anụ ahụ́. N’ezie, ọ dị di na nwunye mkpa ịdị na-anụ okwu ịja mma site n’ọnụ ibe ha nakwa site n’ọnụ ụmụ ha. (Ndị Efesọs 5:33) Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke na-ekwu banyere nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma, sị: “Ụmụ ya ebiliwo, kpọọ ya nwanyị ihe na-agara nke ọma; di ya kwa, ọ na-etokwa ya.”—Ilu 31:10, 28.

Ụmụaka kwesịrị ka a na-aja ha mma. Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị nne na nna na-adị ngwa ịgwa ụmụ ha ihe ndị ha chọrọ ka ha na-eme, ma ha adịkebeghị aja ha mma maka mgbalị ndị ha na-eme n’ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù nakwa n’irube isi. (Luk 3:22) Ọ bụrụ na a na-aja nwatakịrị mma mgbe ọ na-etolite etolite, ọ na-emekarị ka nwata ahụ nwee mmetụta na ya dị mkpa, ọ na-emekwa ka ahụ́ ruo ya ala.

N’eziokwu, ọ chọrọ mgbalị iji na-aja ndị ọzọ mma, ma anyị na-erite ọtụtụ uru site n’ime otú ahụ. N’eziokwu, ka anyị na-etinyekwu mgbalị n’ịgwa ndị kwesịrị ka a jaa ha mma okwu ịja mma, otú ahụ ka anyị ga-enwekwu obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.

Jiri Mmụọ Kwesịrị Ekwesị Na-anabata Ịja Mma, Jirikwa Otu Mmụọ ahụ Na-aja Ndị Ọzọ Mma

Otú ọ dị, ịja ụfọdụ ndị mma pụrụ itinye ha n’ule. (Ilu 27:21) Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ime ka ndị nwere mmụọ mpako malite ibuli onwe ha elu. (Ilu 16:18) N’ihi ya, ọ dị mkpa ịkpachara anya. Pọl onyeozi nyere ndụmọdụ a kapịrị ọnụ, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche; kama ka ọ na-eche echiche iji wee nwee uche zuru okè, onye ọ bụla dị ka Chineke kenyeworo ya ọ̀tụ̀tụ̀ nke okwukwe.” (Ndị Rom 12:3) Iji nyere ndị ọzọ aka ịghara ịchọwa ibuli onwe ha elu, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ịghara ịja mmadụ mma n’ihi ịbụ onye ụbụrụ na-aghọ nkọ ma ọ bụ n’ihi mma ọ mara. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịja ndị ọzọ mma n’ihi ezi ihe ndị ha mere.

Ọ bụrụ na anyị ejiri mmụọ kwesịrị ekwesị na-aja ndị ọzọ mma ma jiri otu mmụọ ahụ na-anabata ịja mma, ọ pụrụ ịbara anyị uru. Ka anyị nile bụrụ ndị a kpaliri ikweta na ọ bụ Jehova mere anyị ji mee ezi ihe ọ bụla anyị mere. Ịbụ ndị a jara mma pụkwara ịkpali anyị ịnọgide na-akpa àgwà dị mma.

Okwu ịja mma e ji ezi obi kwuo bụ onyinye nke onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inye. Mgbe anyị ji ezi obi jaa mmadụ mma, ọ pụrụ ịbara onye ahụ uru karịa ka anyị pụrụ ichetụ n’echiche.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

Akwụkwọ Ozi nke Metụrụ Ya n’Ahụ́

Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị chetara ihe mere mgbe ya na nwunye ya si ozi ọma lọta otu ụbọchị ezigbo oyi na-atụ. O kwuru, sị: “Ezigbo oyi na-atụ nwunye m n’ụbọchị ahụ, o nwekwara nkụda mmụọ. Ọ gwara m na ya echeghị na ya ka ga-anọgide n’ọrụ njegharị. O kwuru, sị, ‘Ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na anyị na-eje ozi oge nile n’ọgbakọ, nọrọ otu ebe ma na-eduzi ọmụmụ Bible nke anyị.’ Ahapụrụ m ime mkpebi ọ bụla ruo mgbe anyị jesịrị ozi anyị n’izu ahụ ma hụ otú ọ dị ya. Ọ bụrụ na ọ ka chọrọ ka anyị kwụsị, m ga-ekwenyere ya. Kpọmkwem n’ụbọchị ahụ, anyị kwụsịrị n’ebe a na-ezipụ akwụkwọ ozi ma hụ akwụkwọ ozi si n’alaka ụlọ ọrụ bụ́ nke e deteere ya. Ihe dị n’akwụkwọ ozi ahụ bụ okwu ịja mma maka mgbalị ndị ọ na-etinye n’ozi ubi nakwa maka ntachi obi ya. Alaka ụlọ ọrụ gosikwara n’akwụkwọ ozi ahụ na ha ghọtara otú o si esi ike ịrahụ ụra n’ákwà dị iche kwa izu. Okwu ịja mma dị otú ahụ metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu nke na o kwughịzikwa okwu banyere ịhapụ ozi njegharị. N’ezie, ọtụtụ mgbe, ọ na-agba m ume ịnọgide n’ozi mgbe m chere echiche banyere ịkwụsị.” Di na nwunye a nọgidere n’ọrụ njegharị ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri anọ.

[Foto dị na peeji nke 17]

Olee onye nọ n’ọgbakọ gị nke kwesịrị ka ị jaa ya mma?

[Foto dị na peeji nke 19]

Ụmụaka na-eme nke ọma mgbe e ji ịhụnanya na-elekọta ha ma na-aja ha mma