Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ntụkwasị Obi I Nwere Na Chineke Siruru N’ike?

Olee Otú Ntụkwasị Obi I Nwere Na Chineke Siruru N’ike?

Olee Otú Ntụkwasị Obi I Nwere Na Chineke Siruru N’ike?

“Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ.”—MATIU 6:33.

1, 2. Gịnị ka otu nwa okorobịa mere banyere ọrụ ya, n’ihi gịnịkwa ka o ji mee otú ahụ?

OTU nwa okorobịa chọrọ ịbakwuru ọgbakọ ya uru. Ma nsogbu ya bụ na ọrụ ya adịghị ekwe ka ọ na-agachi ọmụmụ ihe anya. Gịnị ka o mere banyere nsogbu a? Ọ kwụsịlatara ime ihe ụfọdụ ndị na-ewekọrọ oge ya, gbaa arụkwaghịm n’ọrụ ya, ma mesịa chọta ọrụ ọzọ nke na-adịghị egbochi ya ikere òkè n’ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ. Ego ọ na-akpata ugbu a dị nnọọ ala karịa nke ọ na-akpatabu, ma ọ ka na-egbo mkpa ezinụlọ ya, nweekwa ike inyekwu aka n’ọgbakọ.

2 Ị̀ ghọtara ihe mere nwa okorobịa ahụ ji mee mgbanwe ndị ahụ o mere? Ọ bụrụ gị, ị̀ ga-emeli ihe ahụ o mere? Ọtụtụ Ndị Kraịst emewo ụdị mgbanwe ndị ahụ nwa okorobịa ahụ mere, nke ahụ kwesịkwara ịja mma. Nke a na-egosikwa na ha kwenyesiri ike ná nkwa Jizọs bụ́: “Nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:33) Kama ịtụkwasị obi n’ụwa, ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enyere ha aka inweta ihe e ji ebi ndụ.—Ilu 3:23, 26.

3. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị pụrụ iji chee ma ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya taa ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke?

3 N’ihi otú oge anyị bi na ya si sie ike, ụfọdụ ndị pụrụ ịdị na-eche ma amamihe ọ̀ dị ná mkpebi ahụ nwa okorobịa ahụ mere. Taa, ụfọdụ ndị bụ ogbenye ọnụ ntụ ebe ndị ọzọ nọ n’ikpo akụ̀. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bi ná mba ndị dara ogbenye agaghị ekwe ka ohere ọ bụla nke pụrụ ime ka ihe dịtụrụ ha mma ná ndụ gafenahụ ha. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị bi ná mba ndị ka baa ọgaranya na-adọga iji hụ na ọnọdụ obibi ndụ ha agbadaghị n’agbanyeghị na e jighị ọnọdụ akụ̀ na ụba na ọrụ ego n’aka, ndị were ha n’ọrụ a na-achọkwa ka ha tinye oge na ume dị ukwuu n’ọrụ ha. N’ihi otú o si esi ike ịkpata ihe e ji ebi ndụ, ụfọdụ ndị pụrụ iche ma ọ̀ ka bụ ihe ezi uche dị na ya ibu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ? Iji nye aka ịza ajụjụ ahụ, tụlee ụdị mmadụ ndị Jizọs nọ na-agwa okwu a.

“Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu”

4, 5. Olee otú Jizọs si gosi na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ka ndị Chineke ghara ichegbubiga onwe ha ókè banyere ihe ndị a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị?

4 Jizọs nọ na Galili na-agwa oké ìgwè mmadụ si ọtụtụ ebe bịa okwu. (Matiu 4:25) Ọ bụrụ na e nwedịrị ndị bara ọgaranya n’ime ha, ha ga-adị ole na ole. Eleghị anya, ihe ka ọtụtụ n’ime ha dara ogbenye. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs gbara ha ume ịghara ibu ụzọ na-achụso akụ̀ na ụba kama ka ha buru ụzọ na-akpadoro onwe ha ihe bara nnọọ uru karịa akụ̀ na ụba—akụ̀ ime mmụọ. (Matiu 6:19-21, 24) O kwuru, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi. Ọ̀ bụ na mkpụrụ obi adịghị mkpa karịa ihe oriri, ahụ́ ọ́ dịghịkwa mkpa karịa uwe?”—Matiu 6:25.

5 Okwu Jizọs pụrụ ịdawo ná ntị ọtụtụ ndị nọ na-egere ihe ọ na-ekwu dị ka ihe ezi uche na-adịghị na ya. Ha maara na ọ bụrụ na ha arụsighị ọrụ ike, ezinụlọ ha ga-ata ahụhụ. Otú ọ dị, Jizọs chetaara ha ihe banyere ụmụ nnụnụ. Jehova na-elekọta ụmụ nnụnụ n’agbanyeghị na ha na-agbalị ịkpa afọ ha kwa ụbọchị. Jizọs chetakwaara ha ụzọ Jehova si elekọta okooko osisi nke ọhịa, bụ́ ndị mara mma karịa Solomọn na ebube ya nile. Ọ bụrụ na Jehova na-elekọta nnụnụ na okooko osisi, ọ̀ bụ na ọ gaghị elekọta anyị karị? (Matiu 6:26-30) Dị ka Jizọs kwuru, ndụ (mkpụrụ obi) anyị na ahụ́ anyị dị nnọọ mkpa karịa ihe oriri ndị anyị na-azụ iji nọgide na-adị ndụ nakwa uwe anyị na-azụ iji yichie ahụ́ anyị. Ọ bụrụ na anyị etinye oge anyị nile nanị n’ịchọ ihe anyị ga-eri na ihe anyị ga-eyikwasị n’ahụ́, ma ghara iwepụta oge zuru ezu maka ozi Jehova, nke a ga-eme ka anyị leghara nzube bụ́ isi anyị ji dịrị ndụ anya.—Eklisiastis 12:13.

Echiche Ziri Ezi Banyere Ihe Onwunwe

6. (a) Ibu ọrụ ndị dị aṅaa ka Ndị Kraịst nwere? (b) Ebee ka Ndị Kraịst na-atụkwasị obi kpamkpam?

6 Ihe a na-ekwu abụghị na Jizọs na-agba ndị na-ege ya ntị ume ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ma chewe Chineke ka o nye ezinụlọ ha nri n’ụzọ ọrụ ebube? Ọbụna ụmụ nnụnụ na-achọ nri ha na ụmụ ha ga-eri. N’ihi ya, Ndị Kraịst aghaghị ịrụ ọrụ ma ọ bụrụ na ha chọrọ iri ihe. Ha aghaghị ibu ibu ọrụ dịịrị ha n’ezinụlọ. Ndị Kraịst na-agbara ndị ọzọ odibo aghaghị ịrụsiri ndị nna ha ukwu ọrụ ike. (2 Ndị Tesalonaịka 3:10-12; 1 Timoti 5:8; 1 Pita 2:18) Ọtụtụ mgbe, Pọl onyeozi rụrụ ọrụ dị ka onye na-akpa ákwà ụlọ ntu iji nyere onwe ya aka. (Ọrụ 18:1-4; 1 Ndị Tesalonaịka 2:9) N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst ndị a adịghị ele ọrụ ego ha anya dị ka ihe ga-eme ka ọnọdụ ha ka mma. Ha tụkwasịrị Jehova obi. N’ihi ya, ha na-enwe obi iru ala nke ndị ọzọ na-adịghị enwe. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ndị na-atụkwasị Jehova obi dị ka ugwu Zaịọn, nke a na-adịghị ewezụga ya n’ọnọdụ ya, kama ruo mgbe ebighị ebi ka ọ na-adịgide.—Abụ Ọma 125:1.

7. Gịnị ka onye na-enweghị ntụkwasị obi siri ike n’ebe Jehova nọ pụrụ ịdị na-eche?

7 Onye ọ bụla nke na-enweghị ntụkwasị obi siri ike na Jehova pụrụ iche na ihe ahụ ọbụ abụ ahụ kwuru abụghị eziokwu. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ele ihe onwunwe anya dị ka isi ihe na-eme ka ndụ ha ka mma. N’ihi ya, ndị nne na nna na-agba ụmụ ha ume iji ihe ka ukwuu n’oge ntorobịa ha na-achụso agụmakwụkwọ ka elu, na-atụ anya na nke ahụ ga-akwadebe ha inweta ọrụ na-enye ezigbo ego. N’ụzọ dị mwute, nke a efuwo ụfọdụ Ndị Kraịst ihe dị nnọọ ukwuu n’ihi na ụmụ ha na-akwụsị iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ma tinye isi n’ịchụso ihe nke ụwa.

8. Olee otú Ndị Kraịst si ahụ na ọ dịghị ihe omume ha ọ bụla nke na-emegide ibe ya?

8 N’ihi ya, Ndị Kraịst maara ihe ghọtara na ndụmọdụ Jizọs dị nnọọ irè taa dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ha na-agbalịkwa ịhụ na ọ dịghị ihe omume ha ọ bụla nke na-emegide ibe ya. Ọ bụrụgodị na ha ga-etinye oge dị ukwuu n’ọrụ ego ha iji hụ maka ibu ọrụ ha nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ha adịghị ekwe ka ịkpata ego mee ka ha leghara ihe ime mmụọ, bụ́ ihe ndị ka mkpa, anya.—Eklisiastis 7:12.

Ya Adịla Mgbe Unu Ga-echegbu Onwe Unu

9. Olee otú Jizọs si mesie ndị tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam obi ike?

9 N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs gbara ndị na-ege ya ntị ume, sị: “Ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’ N’ihi na ihe a nile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsosi ike. N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa.” (Matiu 6:31, 32) Okwu ndị a na-agba ume n’ezie! Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi kpamkpam, ọ ga na-enyere anyị aka mgbe nile. Otú ọ dị, okwu Jizọs kwesịkwara ka anyị chebara ya echiche. Okwu ya na-echetara anyị na ọ bụrụ na anyị ‘ana-achụsosi’ ihe onwunwe ike, echiche anyị dị ka nke “ndị mba ọzọ,” bụ́ ndị na-abụghị ezi Ndị Kraịst.

10. Mgbe otú nwa okorobịa bịakwutere Jizọs ka Jizọs nye ya ndụmọdụ, olee otú Jizọs si mee ka ihe nwa okorobịa ahụ kasị hụ n’anya pụta ìhè?

10 N’otu oge, otu nwa okorobịa bara nnọọ ọgaranya jụrụ Jizọs ihe ya kwesịrị ime iji nweta ndụ ebighị ebi. Jizọs chetaara ya ihe ndị Iwu ahụ, bụ́ nke ka dị irè n’oge ahụ, chọrọ ka e mee. Nwa okorobịa ahụ gwara Jizọs, sị: “Edebewo m ihe ndị a nile; gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” Ihe Jizọs zaghachiri ya pụrụ ịda ọtụtụ ndị ná ntị dị ka ihe amamihe na-adịghị na ya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka i zuo okè, gaa ree ihe i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe, bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.” (Matiu 19:16-21) Nwa okorobịa ahụ ji mwute lawa na-eche otú ọ ga-esi hapụ akụ̀ na ụba ya. N’agbanyeghị otú ọ hụruru Jehova n’anya, ọ hụrụ ihe onwunwe ya n’anya karị.

11, 12. (a) Okwu dị aṅaa kwesịrị nchebara echiche ka Jizọs kwuru banyere akụ̀ na ụba? (b) Olee otú ihe onwunwe pụrụ isi gbochie mmadụ ijere Jehova ozi?

11 Ihe ahụ merenụ mere ka Jizọs kwuo otu ihe dị ịtụnanya: “Ọ ga-abụ ihe siri ike onye bara ọgaranya ịba n’alaeze nke eluigwe. . . . Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa onye bara ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.” (Matiu 19:23, 24) Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ na ọ dịghị ọgaranya ga-aba n’Alaeze ahụ? Ee e, n’ihi na ọ gara n’ihu ikwu, sị: “N’ebe Chineke nọ ihe nile kwere omume.” (Matiu 19:25, 26) N’ezie, site n’enyemaka Jehova, ụfọdụ ndị bara ọgaranya n’oge ahụ ghọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. (1 Timoti 6:17) Otú o sina dị, e nwere ezi ihe mere Jizọs ji kwuo okwu ahụ dị ịtụnanya. Ọ nọ na-agwa ndị na-ege ya ntị okwu ịdọ aka ná ntị.

12 Ọ bụrụ na mmadụ ahụ ihe onwunwe ya n’anya nke ukwuu dị ka nwa okorobịa ahụ bara ọgaranya mere, ihe onwunwe ya pụrụ igbochi ya iji obi ya dum na-ejere Jehova ozi. Nke ahụ pụrụ ime ma onye bara ọgaranya ma onye “kpebisiri ike ịba ọgaranya.” (1 Timoti 6:9, 10) Mmadụ ịtụkwasị ihe onwunwe obi gabiga ókè pụrụ ime ka onye ahụ ghara ‘ịmacha mkpa ime mmụọ ya.’ (Matiu 5:3) Nke a pụrụ ime ka ọ ghara iche na enyemaka Jehova dị ya mkpa. (Deuterọnọmi 6:10-12) Ọ pụrụ ịmalite ịtụ anya ka a na-akwanyere ya ùgwù n’ụzọ pụrụ iche n’ọgbakọ. (Jems 2:1-4) Ọ pụkwara iji ihe ka ukwuu n’oge ya na-ekpori ndụ kama iji ya na-ejere Jehova ozi.

Nwee Echiche Ziri Ezi Banyere Ihe Onwunwe

13. Echiche dị aṅaa na-ezighị ezi ka ndị Leodisia nwere?

13 Otu ihe atụ nke ndị nwere echiche na-ezighị ezi banyere ihe onwunwe bụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Leodisia. Jizọs gwara ha, sị: “Ị na-asị: ‘Abara m ọgaranya, enwetawokwa m akụ̀ na ụba, ọ dịghịkwa ihe na-akpa m ma ọlị,’ ma ị maghị na ị nọ ná nhụsianya, bụrụkwa onye e kwesịrị imere ebere nakwa onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.” Ọ bụghị akụ̀ na ụba ndị Leodisia nwere tinyere ha n’ajọ ọnọdụ ime mmụọ dị otú ahụ. Ihe tinyere ha n’ọnọdụ ahụ bụ n’ihi na ha tụkwasịrị akụ̀ na ụba obi kama ịtụkwasị Jehova obi. N’ihi nke ahụ, ha bịara dịrị ṅaranara n’ụzọ ime mmụọ, Jizọs na-agakwa ‘ịgbụpụ ha n’ọnụ ya.’—Mkpughe 3:14-17.

14. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst bụ́ Ndị Hibru ji ruo eruo inweta ịja mma site n’aka Pọl?

14 N’aka nke ọzọ, Pọl jara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru mma maka àgwà ha gosipụtara mgbe a malitere ịkpagbu ha. Ọ sịrị: “Unu gosipụtara obi ebere n’ahụ́ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ma jiri ọṅụ nara mbukọ e bukọọrọ ihe unu nwere, ebe unu maara na unu onwe unu nwere ihe onwunwe ka mma na nke na-adịgide adịgide.” (Ndị Hibru 10:34) Ihe onwunwe ndị funahụrụ ụmụnna ndị ahụ emeghị ka ha nwee nkụda mmụọ. Ha nọgidere na-enwe ọṅụ n’ihi na ha jigidere ihe onwunwe kasị dịrị oké ọnụ ahịa ha nwere, bụ́ “ihe onwunwe ka mma na nke na-adịgide adịgide.” Dị ka onye ahịa ahụ nke dị n’ilu Jizọs, bụ́ onye rere ihe nile o nwere iji nweta otu pel nke dị oké ọnụ ahịa, ha kpebisiri ike ịghara ikwe ka olileanya Alaeze ahụ funahụ ha n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha iji nweta ya. (Matiu 13:45, 46) Nke ahụ bụ nnọọ àgwà ziri ezi!

15. Olee otú otu nwanna nwanyị bi na Liberia si bute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ?

15 Ọtụtụ ndị taa azụlitewo àgwà ọma dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, na Liberia, e nyere otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst ohere ịgụ akwụkwọ na mahadum. Ná mba ahụ, a na-ele ohere dị otú ahụ anya dị ka ụzọ isi kwadebe maka ọdịnihu ka mma. Ma nwanna nwanyị ahụ bụ onye ọsụ ụzọ, onye ozi oge nile, ọ natawokwa akwụkwọ e ji gwa ya ka ọ gaa malite ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche nke nwa oge. Ọ họọrọ ibu ụzọ chọọ Alaeze ahụ ma nọgide n’ozi oge nile. O jere n’ókèala ebe e kenyere ya ije ozi, ọ malitekwara iduziri mmadụ iri abụọ na otu ọmụmụ Bible n’ime ọnwa atọ. Nwanna nwanyị a na ọtụtụ puku ndị ọzọ dị ka ya bu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ, n’agbanyeghị ohere inweta ihe onwunwe ndị nke a pụrụ ime ka o funahụ ha. Olee otú ha si nwee ike ịnọgide na-enwe àgwà dị otú a n’ụwa a nke e ji nchụso ihe onwunwe mara? Nke a bụ n’ihi na ha azụlitewo ọtụtụ àgwà ndị mara mma. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime àgwà ndị a.

16, 17. (a) N’ihi gịnị ka ịdị umeala n’obi ji dị anyị mkpa iji wee nwee ike ịtụkwasị Jehova obi? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ikwenyesi ike na nkwa Chineke ga-emezu?

16 Ịdị umeala n’obi: Bible na-ekwu, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie. Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị.” (Ilu 3:5-7) Mgbe ụfọdụ, ihe ụfọdụ pụrụ iyi ihe amamihe dị na ha dị ka ụwa si ele ihe anya. (Jeremaịa 17:9) N’agbanyeghị nke ahụ, Onye Kraịst nwere ezi obi na-elegara Jehova anya maka nduzi. (Abụ Ọma 48:14) ‘N’ụzọ ya nile’—n’ihe ndị metụtara ọgbakọ, n’agụmakwụkwọ ma ọ bụ n’ọrụ ego, n’ihe banyere ntụrụndụ, ma ọ bụ n’ihe ọ bụla ọzọ—ọ na-eji obi umeala achọ ndụmọdụ Jehova.—Abụ Ọma 73:24.

17 Inwe obi ike ná nkwa Jehova: Pọl kwuru, sị: “Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọ bụrụ na anyị enwee obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-emezu nkwa ya, ọ pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya ‘iji ụwa a eme ihe n’ùjú.’ (1 Ndị Kọrint 7:31) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na okwukwe anyị siri ike, anyị ga-ekpebisi ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ. Olee otú anyị pụrụ isi nwee okwukwe siri ike? Ọ bụ site n’ịbịaru Jehova nso site n’ịdị na-ekpechi ekpere sitere n’obi anya nakwa site n’ịdị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye mgbe nile. (Abụ Ọma 1:1-3; Ndị Filipaị 4:6, 7; Jems 4:8) Dị ka Eze Devid, anyị pụrụ ikpe ekpere, sị: “Gị ka m tụkwasịworo obi, Jehova: asịwo m, Chineke m ka ị bụ. Lee ka ezi ihe Gị si baa ụba.”—Abụ Ọma 31:14, 19.

18, 19. (a) Olee otú ịdị uchu si eme ka ntụkwasị obi anyị nwere na Jehova siwanye ike? (b) N’ihi gịnị ka Onye Kraịst ga-eji dị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà?

18 Iji ịdị uchu na-eje ozi Jehova: Pọl gosiri otú mmadụ ikwenyesi ike na nkwa Jehova ga-emezu na ịdị uchu si nwee njikọ mgbe o dere, sị: “Anyị chọrọ ka onye ọ bụla n’ime unu na-egosi otu ịdị uchu ahụ iji wee nwee obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ.” (Ndị Hibru 6:11) Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu na-ejere Jehova ozi, Ọ ga-enyere anyị aka. Mgbe ọ bụla o nyeere anyị aka, ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe ọ nọ na-esiwanye ike, anyị na-aghọkwa “ndị na-eguzosi ike, ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Nke a na-eme ka okwukwe anyị siwanye ike, olileanya anyị na-abụkwa nke e ji n’aka.—Ndị Efesọs 3:16-19.

19 Ịdị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà: Pọl hapụrụ ọrụ na-enye ezigbo ego o nwere iji nwee ike iso Jizọs. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o mere nhọrọ ziri ezi, ọ bụ ezie na ihe siiri ya ike mgbe ụfọdụ. (1 Ndị Kọrint 4:11-13) Jehova adịghị ekwe anyị nkwa na ndụ ga-adịrị anyị nnọọ mfe, ihe na-esikwara ndị ohu ya ike mgbe ụfọdụ. Anyị ịdị njikere ịhapụ ihe omume ụfọdụ ndị na-ewekọrọ oge anyị na ịdị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà na-egosi na anyị kpebisiri ike ijere Jehova ozi.—1 Timoti 6:6-8.

20. N’ihi gịnị ka ndidi ji dị onye na-ebute Alaeze ahụ ụzọ mkpa?

20 Ndidi: Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems gbara Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Nweenụ ndidi ruo n’ọnụnọ nke Onyenwe anyị.” (Jems 5:7) N’ụwa a nke jupụtara na gbalụ gbalụ, o siri ike inwe ndidi. Anyị na-achọ ka ihe nile na-eme ngwa ngwa. Ma Pọl na-agba anyị ume iṅomi ndị “sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.” (Ndị Hibru 6:12) Dịrị njikere ichere Jehova. N’ezie, ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs kwesịrị nchere!

21. (a) Gịnị ka anyị na-egosi mgbe anyị bu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 N’ezie, ndụmọdụ Jizọs nyere ka e buru ụzọ na-achọ Alaeze ahụ bụ ihe ga-ekwe omume. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi n’ezie, na-egosikwa na anyị họọrọ ụzọ kasị mma Onye Kraịst ga-esi na-ebi ndụ. Otú ọ dị, Jizọs nyekwara anyị ndụmọdụ ka anyị nọgide ‘buru ụzọ na-achọ ezi omume Chineke.’ N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ ihe mere agbamume ahụ ji dị oké mkpa karịsịa taa.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Echiche dị aṅaa ziri ezi ka Jizọs gbara anyị ume inwe banyere ihe onwunwe?

• Gịnị ka anyị na-amụta site n’ilu Jizọs banyere kamel na anya agịga?

• Àgwà ndị dị aṅaa ka Ndị Kraịst kwesịrị inwe bụ́ ndị ga-enyere ha aka ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Ọtụtụ n’ime ndị gere ntị n’okwu Jizọs bụ ndị ogbenye

[Foto dị na peeji nke 23]

Nwa okorobịa ahụ bara ọgaranya hụrụ ihe onwunwe ya n’anya karịa Chineke

[Foto dị na peeji nke 23]

Onye ahịa ahụ Jizọs kwuru banyere ya n’ilu ya rere ihe nile o nwere iji nweta otu pel dị oké ọnụ ahịa

[Foto dị na peeji nke 24]

Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu na-ejere Jehova ozi, Ọ ga-enyere anyị aka