Otú Ezi Ihe Ga-esi Merie Ihe Ọjọọ
Otú Ezi Ihe Ga-esi Merie Ihe Ọjọọ
Eze Devid bụ ezigbo mmadụ. Ọ hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu, ikpe ziri ezi na-agụsi ya agụụ ike, ọ na-echebakwara ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha echiche. N’agbanyeghị nke ahụ, eze ọma a sooro nwunye otu n’ime ndị ikom ya ọ tụkwasịrị obi kwaa iko. Mgbe ọ chọpụtakwara na ya atụwala Bat-sheba, bụ́ nwunye otu n’ime ndị ikom ya ime, Devid mere ka e gbuo di ya. Ọ lụwaziri Bat-sheba ná mgbalị ya ikpuchi mmehie ya.—2 Samuel 11:1-27.
O DORO anya na ụmụ mmadụ nwere ikike ime ezi ihe. Oleezi ihe mere ha ji eme oké ihe ọjọọ? Bible kwuru isi ihe ụfọdụ kpatara ya. O kwukwara otú Chineke ga-esi jiri Kraịst Jizọs wepụ ihe ọjọọ kpamkpam.
Ọchịchọ Ime Ihe Ọjọọ
Eze Devid n’onwe ya kpọtụrụ otu n’ime ihe ndị na-akpata ihe ọjọọ aha. Mgbe a gbasịrị mmehie ya n’anwụ, o kwetara nnọọ ihe ndị ahụ o mere. Ọ kwara ụta ma dee, sị: “Lee, n’ajọ omume ka a mụpụtara m; ọ bụkwa ná mmehie ka nne m tụụrụ ime m.” (Abụ Ọma 51:5) Ọ dịtụghị mgbe ọ bụ nzube Chineke ka ndị nne na-amụ ụmụ na-eme mmehie. Otú ọ dị, mgbe Iv họọrọ inupụrụ Chineke isi, e mesịakwa Adam esonyere ya, ha enweghịzi ike ịmụ ụmụ ndị na-adịghị eme mmehie. (Ndị Rom 5:12) Ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-amụba n’ọnụ ọgụgụ, ọ bịara pụta ìhè na ha nwere ọchịchọ nke ime ihe ọjọọ ebe ọ bụ na Jenesis 8:21 na-ekwu na “nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.”
Ọ bụrụ na a chịkwaghị ọchịchọ a nke ụmụ mmadụ nwere ime ihe ọjọọ, ọ pụrụ iduga ‘n’ịkwa iko, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, ịrọ òtù, anyaụfụ,’ Ndị Galeshia 5:19-21) Eze Devid kwere ka adịghị ike nke anụ ahụ́ ya merie ya, ọ kwakwara iko, bụ́ nke wetaara ya ọtụtụ nsogbu. (2 Samuel 12:1-12) Ọ gaara ewepụ ọchịchọ ahụ na-ezighị ezi n’obi ya. Kama ime nke ahụ, site n’ịnọgide na-eche banyere Bat-sheba, Devid mere ihe Jems onye na-eso ụzọ mesịrị kọwaa: “A na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà. Ọchịchọ ahụkwa, mgbe ọ tụrụwooro ime, na-amụpụta mmehie; mmehie, n’aka nke ya, mgbe e mechaworo ya, na-eweta ọnwụ.”—Jems 1:14, 15.
nakwa àgwà ndị ọzọ na-emebi ihe bụ́ ndị Bible kọwara dị ka “ọrụ nke anụ ahụ́.” (Igbu ndị mmadụ n’ìgwè, idina mmadụ n’ike, na ịkwakọrọ ihe ndị mmadụ bụ́ ihe ndị a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ bụ nnọọ ihe atụ gbara ọkpụrụkpụ nke na-egosi ihe ndị na-eme mgbe mmadụ kwere ka ọchịchọ na-ezighị ezi na-achịkwa ya.
A Na-eme Ihe Ọjọọ Ụfọdụ n’Amaghị Ama
Ahụmahụ Pọl onyeozi nwere na-eme ka ihe nke abụọ mere ndị mmadụ ji eme ihe ọjọọ pụta ìhè. Tupu Pọl anwụọ, a maara ya dị ka onye dị nwayọọ, na onye na-echebara ndị ọzọ echiche. O wepụtara nnọọ onwe ya ijere ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị ozi. (1 Ndị Tesalonaịka 2:7-9) Otú ọ dị, mgbe ọ bụ nwa okorobịa, bụ́ mgbe a maara ya dị ka Sọl, ọ nọ “na-ekupụ iyi egwu na igbu ọchụ dị ka ume” megide otu ìgwè a. (Ọrụ 9:1, 2) Olee ihe mere Pọl ji kwadoo ma soro mesoo Ndị Kraịst narị afọ mbụ ihe ọjọọ? O kwuru, sị: “N’ihi na amaghị m nke a na-akọ.” (1 Timoti 1:13) Ee, Pọl ‘na-anụburu Chineke ọkụ n’obi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.’—Ndị Rom 10:2.
Ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu emeela ihe ọjọọ dị ka Pọl n’ihi na ha enweghị ezi ihe ọmụma banyere uche Chineke. Dị ka ihe atụ, Jizọs dọrọ ụmụazụ ya aka ná ntị, sị: “Oge awa na-abịa mgbe onye ọ bụla ga-egbu unu ga-eche na ya ejeworo Chineke ozi dị nsọ.” (Jọn 16:2) Ndịàmà Jehova na-ahụkwa ka ihe ahụ Jizọs kwuru na-eme taa. N’ọtụtụ ala, ndị na-azọrọ na ha na-ejere Chineke ozi akpagbuola ha, ọbụna gbuokwa ha. O doro nnọọ anya na ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ hiere ụzọ adịghị amasị ezi Chineke ahụ.—1 Ndị Tesalonaịka 1:6.
Onye Ihe Ọjọọ Sitere n’Aka Ya
Jizọs mere ka a mata onye bụ́ isi ihe ọjọọ sitere n’aka ya. Mgbe ọ na-agwa ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị kpebisiri ike igbu ya, okwu, o kwuru, sị: “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ọchịchọ nke nna unu. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere.” (Jọn 8:44) Ọ bụ Setan rabara Adam na Iv inupụrụ Chineke isi n’ihi na ọ chọrọ ka ha na-ege ya onwe ya ntị. Nnupụisi ahụ mere ka ihe nile a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie ma na-anwụ anwụ.
Obi ịta mmiri nke Setan pụtakwuru ìhè n’otú o si mesoo Job. Mgbe Jehova nyere ya ohere ile Job ule ma ọ̀ ga-anọgide na-eme ezi ihe, ịnapụsị Job ihe onwunwe ya ezughịrị Setan. O gbukwara ụmụ iri Job. (Job 1:9-19) Na narị afọ gara aga, ihe ọjọọ mụbara n’ụzọ dị egwu n’ihi ezughị okè nke ụmụ mmadụ na n’ihi na ha amaghị nke a na-akọ nakwa n’ihi aka Setan na-etinyekwu n’ihe omume ụmụ mmadụ. Bible na-ekpughe na ‘a chụdara Ekwensu n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.’ Otu amụma ahụ kwuru n’ụzọ ziri ezi na nchụda a a ga-achụda Setan ga-akpatara ‘ụwa ahụhụ’ a na-ahụtụbeghị ụdị ya. Ọ bụ ezie na Setan apụghị ịmanye ndị mmadụ ime ihe ọjọọ, ọ bụ aka ochie ‘n’iduhie ụwa dum mmadụ bi.’—Mkpughe 12:9, 12.
Iwepụ Ọchịchọ Ime Ihe Ọjọọ
Iji wepụ ihe ọjọọ kpamkpam n’ụwa, a ghaghị iwepụ ọchịchọ ime ihe ọjọọ nke ụmụ mmadụ bu pụta ụwa, mee ka ha nwee ezi ihe ọmụma, meekwa ka Setan kwụsị ịkpa ike n’ahụ́ ha. Nke mbụ bụ, olee otú a pụrụ isi wepụ ọchịchọ ime mmehie nke mmadụ bu pụta ụwa n’obi ya?
Ọ dịghị dọkịta ọ bụla na-awa ahụ́ ma ọ bụ ọgwụ mmadụ mere ga-emeli ya. Otú ọ dị, Jehova Chineke ewepụtawo ọgwụ ga-agwọta mmehie na ezughị okè e ketara eketa maka ndị nile dị njikere ịnakwere ya. Jọn onyeozi dere, sị: “Ọbara nke Jizọs . . . na-emekwa ka anyị dị ọcha pụọ ná mmehie nile.” (1 Jọn 1:7) Mgbe nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs ji ọchịchọ obi nyefee ndụ ya, o “buuru mmehie anyị n’ahụ́ ya n’elu osisi, ka anyị wee sepụ aka ná mmehie ma bie ndụ n’ezi omume.” (1 Pita 2:24) Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ga-ewepụ nsogbu nile mmehie Adam kpatara. Pọl na-ekwu na Kraịst Jizọs ghọrọ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ nile.” (1 Timoti 2:6) Ee, ọnwụ Kraịst megheere ihe nile a kpọrọ mmadụ ohere nke inwetaghachi izu okè nke Adam tụfuru.
Otú ọ dị, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ na ọnwụ Jizọs nwụrụ ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga mere ka o kwe ihe a kpọrọ mmadụ omume inwetaghachi izu okè, gịnị mekwaranụ ihe ọjọọ na ọnwụ ji ka dịrị?’ Ọ bụrụ na anyị achọta azịza nke ajụjụ a, ọ pụrụ inye aka iwepụ ihe nke abụọ na-akpata ihe ọjọọ—amaghị nzube Chineke.
Ezi Ihe Ọmụma Na-akpali Ndị Mmadụ Ime Ezi Ihe
Inweta ezi ihe ọmụma banyere ihe Jehova na Jizọs na-eme ugbu a iji wepụ ihe ọjọọ pụrụ ime ka onye obi ya ziri ezi ghara ịdị na-akwado ihe ọjọọ n’amaghị ama, ma ọ bụ nke ka njọ, ghọọ onye “na-alụso Chineke ọgụ.” (Ọrụ 5:38, 39) Jehova Chineke dị njikere ileghara ihe ọjọọ ndị anyị mere n’amaghị ama n’oge gara aga anya. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu okwu n’Atens, o kwuru, sị: “Chineke elefuruwo oge amaghị ihe dị otú ahụ anya, ma ugbu a ọ na-agwa ihe a kpọrọ mmadụ na ha nile kwesịrị ichegharị n’ebe nile. N’ihi na o setịpụwo otu ụbọchị nke ọ na-ezube ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtaworo, o nyewokwa mmadụ nile ihe mmesi obi ike ebe ọ bụ na o siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya.”—Ọrụ 17:30, 31.
Site n’ahụmahụ o nwere n’onwe ya, Pọl maara na a kpọlitewo Jizọs n’ọnwụ n’ihi na Jizọs ahụ e meworo ka o si n’ọnwụ bilie kwụsịrị ya ịkpagbu Ndị Kraịst oge mbụ. (Ọrụ 9:3-7) Ozugbo Pọl nwetara ezi ihe ọmụma banyere nzube Chineke, ọ gbanwere ma ghọọ nnọọ ezigbo mmadụ nke na-eṅomi Kraịst. (1 Ndị Kọrint 11:1; Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Tụkwasị na nke ahụ, Pọl jiri ịnụ ọkụ n’obi kwusaa “ozi ọma nke a nke alaeze.” (Matiu 24:14) Ruo ihe fọrọ nke nta ugbu a ka ọ bụrụ puku afọ abụọ Jizọs nwụsịrị ma bilite n’ọnwụ, Kraịst esiwo n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họrọ ndị dị ka Pọl bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’Alaeze ya.—Mkpughe 5:9, 10.
Site na narị afọ gara aga ruo ugbu a, Ndịàmà Jehova ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ahụ Jizọs kwuru ka a rụọ nke bụ́: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:19, 20) Ndị na-eme ihe kwekọrọ n’ozi a nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’oge ọchịchị eluigwe nke Kraịst. Jizọs kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ihe ọma kachasịnụ mmadụ pụrụ imere ibe ya bụ inyere ya aka inweta ihe ọmụma a.
N’agbanyeghị ihe ọjọọ nile gbara ha gburugburu, ndị nabatara ozi ọma a nke Alaeze na-egosipụta àgwà ndị dị ka “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) Iji gosi na ha na-eṅomi Jizọs, ha ‘adịghị eji ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:17) N’onwe ha, ha na-agbalịsi ike ‘ịnọgide na-eji ezi ihe emeri ihe ọjọọ.’—Ndị Rom 12:21; Matiu 5:44.
Mmeri Ikpeazụ A Ga-emeri Ihe Ọjọọ
A sị hapụ ụmụ mmadụ, ha agaghị emerili Setan Ekwensu bụ́ onye bụ́ isi na-akpata ihe ọjọọ. Otú ọ dị, Jehova ga-eme ka Jizọs gwepịa isi Setan n’oge na-adịghị anya. (Jenesis 3:15; Ndị Rom 16:20) Jehova ga-emekwa ka Kraịst Jizọs ‘tipịa ọchịchị nile, bụ́ ndị ọ bụ ọtụtụ n’ime ha kpataworo ọtụtụ ihe ọjọọ ndị e meworo n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, ma mee ka ha gwụsịa.’ (Daniel 2:44; Eklisiastis 8:9) N’ụbọchị ikpe a na-abịanụ, ndị nile “na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs. . . . ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke mbibi ebighị ebi.”—2 Ndị Tesalonaịka 1:8, 9; Zefanaịa 1:14-18.
Ozugbo e wepụrụ Setan na ndị na-akwado ya, Jizọs ga-esi n’eluigwe nyere ndị lanahụrụ aka ime ka ụwa dịghachi otú ọ dị mgbe e kere ya. Kraịst ga-akpọlitekwa ndị nile ruru eru ka e nye ha ohere ịdị ndụ n’ụwa e mere ka ọ dịghachi otú ọ dị na mbụ. (Luk 23:32, 39-43; Jọn 5:26-29) Site n’ime otú a, ọ ga-ewepụ ihe ụfọdụ ndị na-esi n’ihe ọjọọ ndị na-eme ụmụ mmadụ apụta.
Jehova agaghị amanye ndị mmadụ irube isi n’ozi ọma banyere Jizọs. Otú ọ dị, ọ na-enye ndị mmadụ ohere inweta ihe ọmụma nke na-eduga ná ndụ. Ọ dị oké mkpa ka i jiri ohere a mee ihe nke ọma ugbu a! (Zefanaịa 2:2, 3) Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-amụta otú ị ga-esi nagide ihe ọjọọ ọ bụla nke na-akpa gị aka ọjọọ ugbu a. Ị ga-ahụkwa otú Kraịst ga-esi merie ihe ọjọọ n’ikpeazụ.—Mkpughe 19:11-16; 20:1-3, 10; 21:3, 4.
[Foto dị na peeji nke 5]
Sọl kwadoro ihe ọjọọ n’ihi na o nweghị ezi ihe ọmụma
[Foto dị na peeji nke 7]
Ihe ọma kachasịnụ mmadụ pụrụ imere ibe ya bụ inyere ya aka inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke