Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe Kasị Ochie A Maara E Si na Bible Hota”

“Ihe Kasị Ochie A Maara E Si na Bible Hota”

“Ihe Kasị Ochie A Maara E Si na Bible Hota”

AFỌ 25 gara aga, ndị ọkà mmụta ihe ochie bụ́ ndị Izrel chọpụtara otu ihe dị ịtụnanya. N’ime ọgba ebe a na-eli ozu ná mkpọda Ndagwurugwu Hinọm na Jeruselem, ha hụrụ mpekere ọlaọcha abụọ ndị e dere amaokwu Bible ụfọdụ n’elu ha. Ihe odide ahụ dịwara tupu Babilọn ebibie Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. Ihe odide ahụ hotara akụkụ ụfọdụ nke ngọzi ndị e dekọrọ n’Ọnụ Ọgụgụ 6:24-26. E dere aha Chineke bụ́ Jehova n’ọtụtụ ebe n’ihe odide abụọ ahụ. A kọwawo ihe odide ndị ahụ dị ka “ihe kasị ochie bu amaokwu Bible Hibru.”

Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta ụfọdụ rụrụ ụka banyere oge e dere ha ma kwuo na e dere ha na narị afọ nke abụọ T.O.A. Otu ihe kpatara arụmụka a bụ na ụdị ígwè foto e ji see obere ihe odide ndị a foto na mbụ ekweghị ka e nyochaa ihe ndị e dere na ha nke ọma. Iji dozie nsogbu banyere oge e ji dee ya, otu òtù nke ndị ọkà mmụta mere nchọpụta ọhụrụ. Ha ji ígwè foto kasị ọhụrụ segharịa ihe odide ndị a foto ma jiri otu ụdị kọmputa kasị ọhụrụ mee ka a hụ ha nke ọma. E bipụtara ihe ndị si ná nchọpụta ọhụrụ a pụta na nso nso a. Gịnị ka ndị ọkà mmụta ahụ kwubiri?

Nke mbụ, ndị ọkà mmụta ahụ kwusiri ike na ihe ndị e gwupụtara n’ala n’ebe a chọtara ihe odide ndị ahụ kwadoro na e dere ha tupu ndị Babilọn adọrọ ndị Izrel n’agha. Ihe a chọpụtara banyere oge e ji dee ihe odide ahụ site n’otú ihe odide ndị ahụ dị n’ile ha anya, aka akwụkwọ e ji dee ha, ọnọdụ ha, otú ihe odide ha si sote ibe ha, na ebe ha chere ihu zoro aka n’otu oge ahụ, ya bụ, ngwụsị nke narị afọ nke asaa T.O.A. N’ikpeazụkwa, mgbe ndị ọkà mmụta a tụlere otú e si supee okwu ndị dị na ha, ha kwubiri, sị: “Otú e si supee okwu ndị dị n’ihe odide ahụ, ihe e gwutere n’ala n’ebe a chọtara ha, na otú ihe odide ndị ahụ dị n’anya na-arụtụcha aka n’otu oge.”

Akwụkwọ bụ́ Bulletin of the American Schools of Oriental Research si otú a chịkọta ihe ọmụmụ nke ihe odide ahụ e dere ná mpekere ọlaocha, bụ́kwa nke a maara dị ka ihe odide Ketef Hinnom: “N’ihi nke a, anyị pụrụ ịkwado ihe ahụ ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta kwubiri bụ́ na ihe odide ndị ahụ dị ná mpekere ọlaọcha ndị a bụ ihe kasị ochie a maara e si na Bible hota.”

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 32]

Ọgba: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.; ihe odide: Foto © Ebe Ndebe Ihe Ochie Izrel, Jeruselem; site n’ikike a natara Ndị Na-ahụ Maka Ihe Ochie n’Izrel