Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Àmà Nye Mba Nile”

“Àmà Nye Mba Nile”

“Àmà Nye Mba Nile”

“Unu ga-agbakwa àmà banyere m . . . ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.”—ỌRỤ 1:8.

1. Olee mgbe ndị ahụ na-eso ụzọ nụrụ amụma ahụ e dekọrọ na Matiu 24:14 nke mbụ ya, oleekwa ebe ha nọ nụ ya?

OKWU Jizọs e dekọrọ na Matiu 24:14 bụ ihe a na-anụ mgbe mgbe nke na ọtụtụ n’ime anyị buzi ya n’isi. N’ezie, ọ bụ amụma dị ịrịba ama! Cheedị banyere ihe ndị ahụ na-eso ụzọ pụrụ ịdị na-atụle n’uche ha mgbe ha nụrụ ya nke mbụ ya! Ọ bụ n’afọ 33 O.A. Ndị ahụ na-eso ụzọ na Jizọs anọwo ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ, ha sokwa ya bịa Jeruselem ugbu a. Ha ahụla ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, geekwa ntị n’ozizi ya. Ọ bụ ezie na eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa Jizọs kụziiri ha mere ha obi ụtọ, o dokwara ha nnọọ anya na ọ bụghị mmadụ nile nwere obi ụtọ dị ka ha. Jizọs nwere ndị iro dị ike.

2. Olee ihe ize ndụ na nsogbu ndị ga-abịakwasị ndị na-eso ụzọ Jizọs?

2 Jizọs na mmadụ anọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ n’Ugwu Oliv, ha nọ nnọọ na-ege ya ntị ka ọ na-akọrọ ha ihe ize ndụ na nsogbu ndị ga-abịakwasị ha. Tupu mgbe ahụ, Jizọs gwara ha na a ga-egbu ya. (Matiu 16:21) O meziri ka o doo ha anya na a ga-emegide ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. O kwuru, sị: “Ndị mmadụ ga-enyefe unu ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu, mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” Ma nke ahụ abụghị nanị nsogbu ha ga-enweta. Ndị amụma ụgha ga-eduhie ọtụtụ mmadụ. A ga-eme ka ụfọdụ sụọ ngọngọ, ndị ọzọ ga-aranyekwa ibe ha n’aka ndị iro ha ma na-akpọ ibe ha asị. Ụfọdụ ndị kwa, n’ezie “ndị ka n’ọnụ ọgụgụ,” ga-ekwe ka ịhụnanya ha nwere maka Chineke na Okwu ya jụọ oyi.—Matiu 24:9-12.

3. Gịnị mere ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 24:14 ji bụrụ n’ezie ihe dị ịtụnanya?

3 Ọ bụ mgbe Jizọs kwusịrị okwu ahụ na-akụda mmụọ ka o kwuru ihe yiri ka ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ee, ọrụ ahụ Jizọs malitere n’Izrel—ọrụ ‘ịgbara eziokwu ahụ àmà’—ga na-aga n’ihu ma gbasaruo ụwa nile. (Jọn 18:37) Nke a bụ amụma dị ịtụnanya n’ezie! Iji ozi ahụ gazuo “mba nile” abụghị obere ọrụ; ime nke ahụ n’agbanyeghị na ‘mba nile ga-akpọ ha asị’ bụ ọrụ ebube n’ezie. Ọ bụghị nanị na ịrụzu nnukwu ọrụ a ga-eme ka a mata na Jehova bụ eze nakwa na ọ dị ike kamakwa, ọ ga-eme ka ịhụnanya, ebere, na ndidi ya pụtakwuo ìhè. Tụkwasị na nke ahụ, ọ ga-enyekwa ndị ohu Jehova ohere igosipụta na ha nwere okwukwe na Jehova nakwa na ha raara onwe ha nye ya.

4. Ole ndị ka a gwara ka ha na-agba àmà, oleekwa otú Jizọs si kasie ha obi?

4 Jizọs mere ka o doo ndị na-eso ụzọ ya anya na ọrụ o nyere ha abụghị obere ọrụ. Tupu ya arịgoro n’eluigwe, Jizọs mere ka ha hụ ya anya ma kwuo, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-agbakwa àmà banyere m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria dum nakwa ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) N’ezie, ndị ọzọ ga-esonyere ha n’oge na-adịghị anya. Ma, ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ na-eso ụzọ ka pere mpe. Ọ bụ nnọọ ihe na-akasi obi na mmụọ nsọ dị ike nke Chineke ga-enye ha ike ha ga-eji rụzuo ọrụ a Chineke nyere ha!

5. Olee ihe ndị ahụ na-eso ụzọ na-amaghị banyere ọrụ ịgba àmà ahụ?

5 Ndị na-eso ụzọ Jizọs maara na ha ga-ekwusa ozi ọma ma “mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.” (Matiu 28:19, 20) Ma, ha amaghị ebe a ga-ekwusaru ozi ọma ahụ, ha amaghịkwa mgbe ọgwụgwụ ga-abịa. Anyị amaghịkwa. Ọ bụ nanị Jehova ka ọ dịịrị ikpebi ihe ndị a. (Matiu 24:36) Jehova ga-ebibi ajọ usoro ihe a mgbe a gbaruru àmà ahụ n’ụzọ juru ya afọ. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka Ndị Kraịst ga-aghọta na e kwusaruola ozi ọma a otú Jehova zubere. Ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ amatụghị ókè a ga-agbaru àmà ahụ ná mgbe ọgwụgwụ a.

Àmà A Gbara na Narị Afọ Mbụ

6. Gịnị mere na Pentikọst nke afọ 33 O.A. nakwa obere oge ka nke ahụ gasịrị?

6 Na narị afọ mbụ, ọrụ nke ikwusa banyere Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ rụpụtara ihe tụrụ ndị mmadụ n’anya. N’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.A., ọ bụ ihe dị ka otu narị ndị na-eso ụzọ na iri abụọ nọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jeruselem. A wụsara ha mmụọ nsọ Chineke, Pita onyeozi kwukwara okwu na-akpali akpali, na-akọwa ihe mwụsa a wụsara ha mmụọ nsọ pụtara, ihe dịkwa ka puku mmadụ atọ ghọrọ ndị kwere ekwe, e meekwa ha baptizim. Ma nke ahụ bụ nanị mmalite. N’agbanyeghị na ndị ndú okpukpe fooro ntutu taa na ha ga-akwụsịrịrị nkwusa nke ozi ọma ahụ, “Jehova nọgidere kwa ụbọchị na-atụkwasịrị [ndị ahụ na-eso ụzọ] ndị a na-azọpụta.” N’oge na-adịghị anya, “ọnụ ọgụgụ nke ndị ikom ahụ wee dị ihe dị ka puku ise.” Mgbe nke ahụ gasịrị, “a nọgidere na-atụkwasị ndị kwere n’Onyenwe anyị, ìgwè mmadụ, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị.”—Ọrụ 2:1-4, 8, 14, 41, 47; 4:4; 5:14.

7. Olee otú ntọghata a tọghatara Kọniliọs si bụrụ ihe omume dị ịrịba ama?

7 Ihe ọzọ dị ịrịba ama mere n’afọ 36 O.A.—ntọghata a tọghatara Kọniliọs bụ́ onye Jentaịl, na baptizim e mere ya. Mgbe Jehova na-eziga Pita onyeozi na nke nwoke a na-atụ egwu Chineke, o mere ka Pita mata na ọ bụghị nanị ndị Juu nọ ná mba dị iche iche ka Jizọs bu n’uche mgbe o nyere iwu ka ‘e mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Ọrụ 10:44, 45) Gịnị ka ndị ahụ na-eduzi ọrụ ịgba àmà ahụ mere? Mgbe ndịozi na ndị okenye nọ na Judia ghọtara na a ga-ekwusakwara ndị nke mba nile—ndị na-abụghị ndị Juu—ozi ọma, ha toro Chineke. (Ọrụ 11:1, 18) Ka ọ dịgodị, ọrụ nkwusa ahụ nọgidere na-amịpụta mkpụrụ n’etiti ndị Juu. Afọ ole na ole ka e mesịrị, ikekwe n’ihe dị ka n’afọ nke 58 O.A., e nwere “ọtụtụ puku ndị [Juu] kwere ekwe,” tinyekwara ndị Jentaịl kwere ekwe.—Ọrụ 21:20.

8. Olee otú ozi ọma si emetụta ndị mmadụ?

8 Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ nke Ndị Kraịst e nwere na narị afọ mbụ buru ibu, anyị ekwesịghị ichefu na ọ bụ ndị mmadụ mejupụtara ọnụ ọgụgụ a a na-ekwu okwu ya. Ozi sitere na Bible ha nụrụ kpara ike dị egwu n’ahụ́ ha. (Ndị Hibru 4:12) Ọ gbanwere nnọọ ndụ ndị nabatara ya. Ha kwụsịrị àgwà ọjọọ ndị ha na-akpabu, yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ, ma bụrụ ndị e mere ka ha na Chineke dịghachi ná mma. (Ndị Efesọs 4:22, 23) Nke ahụ na-emekwa taa. Ndị nile na-anabata ozi ọma ahụ nwere olileanya dị ebube nke ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16.

Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ

9. Olee ihe ùgwù na ibu ọrụ nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ ghọtara na ha nwere?

9 Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ anaraghị otuto maka ihe ha rụzuru. Ha ghọtara na ọ bụ site “n’ike nke mmụọ nsọ” ka ha ji arụ ọrụ ha dị ka ndị ozi. (Ndị Rom 15:13, 19) Ọ bụ Jehova na-eme ka e nwee uto ime mmụọ. N’otu oge ahụkwa, Ndị Kraịst maara na ha nwere ihe ùgwù na ibu ọrụ nke ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Ndị Kọrint 3:6-9) N’ihi ya, n’ime ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Jizọs, ha na-agbalịsi ike ịrụ ọrụ ahụ e kenyere ha.—Luk 13:24.

10. Olee mgbalị ụfọdụ Ndị Kraịst oge mbụ mere iji gbaara ndị nke mba nile àmà?

10 Dị ka “onyeozi nye ndị mba ọzọ,” Pọl mere njem ruo ọtụtụ puku kilomita n’okporo ụzọ na n’oké osimiri, na-ehiwe ọtụtụ ọgbakọ n’ógbè ndị Rom dị n’Eshia nakwa na Gris. (Ndị Rom 11:13) Ọ gakwara Rom, ikekwe si ya gawa Spen. Ka Pọl nọ na-eme nke ahụ, Pita onyeozi, bụ́ onye “e nyefere . . . ozi ọma ahụ n’aka maka ndị a na-ebighị úgwù,” gawara Babịlọn, bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu bi. (Ndị Galeshia 2:7-9; 1 Pita 5:13) Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ́ ndị so ná ndị rụsiri ọrụ ike n’ọrụ Onyenwe anyị, bụ ụmụ nwanyị ndị dị ka Traịfina na Traịfosa. E kwuru na nwanyị ọzọ aha ya bụ Pesis “rụrụ ọtụtụ ọrụ n’ime Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 16:12.

11. Olee otú Jehova si gọzie mgbalị ndị ahụ na-eso ụzọ mere?

11 Jehova gọziri nnọọ mgbalị nke ndị a na-arụsi ọrụ ike a ka kpọpụrụ aha nakwa nke ndị ọzọ ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụrụ ya ọrụ na-eme. Ihe na-erughị afọ iri atọ ka Jizọs busịrị amụma na a ga-agbara ndị nke mba nile àmà, Pọl dere na e kwusaala “ozi ọma ahụ” “n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) Ọgwụgwụ ọ̀ bịaziri mgbe ahụ? A pụrụ ikwu na ọ bịara. Usoro ihe ndị Juu gwụrụ n’afọ 70 O.A. mgbe ndị agha Rom bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ekpebiwo na a ga-agba àmà ka ukwuu tupu ya ebibie usoro ihe zuru ụwa ọnụ nke Setan.

Àmà A Na-agba Taa

12. Olee otú Ndị Mmụta Bible oge mbụ si ghọta iwu ahụ e nyere ka e kwusaa ozi ọma?

12 Ná ngwụsị narị afọ nke iri na itoolu, mgbe ogologo oge gasịworo ka a kwụsịsịrị ife Jehova ezi ofufe, a maliteghachiri ime otú ahụ. Ndị Mmụta Bible, bụ́ aha e ji mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, ghọtara nnọọ iwu ahụ e nyere bụ́ ka e mee ndị na-eso ụzọ n’ụwa nile. (Matiu 28:19, 20) Ka ọ na-erule n’afọ 1914, e nwere ihe dị ka puku ise na otu narị mmadụ bụ́ ndị na-ekerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa ahụ, a na-ekwusakwa ozi ọma ahụ n’ala iri isii na asatọ n’oge ahụ. Otú ọ dị, Ndị Mmụta Bible nọ n’oge ahụ aghọtachaghị ihe ahụ dị na Matiu 24:14. Ná ngwụsị nke narị afọ nke iri na itoolu, òtù dị iche iche na-asụgharị Bible, sụgharịrị Bible, bụ́ nke ozi ọma ahụ dị n’ime ya, n’ọtụtụ asụsụ ma kesaa ya gburugburu ụwa. N’ihi ya, ruo iri afọ ole na ole, Ndị Mmụta Bible chere na a gbaarala mba nile àmà.

13, 14. Olee nghọta ka doo anya e nwere banyere uche na nzube Chineke bụ́ nke e bipụtara n’Ụlọ Nche nke 1928?

13 Jehova ji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị ya ghọtakwuo uche ya na nzube ya. (Ilu 4:18) Ụlọ Nche (Bekee) nke December 1, 1928, kwuru, sị: “Ànyị pụrụ ikwu na nkesa e kesaworo Bible mezuru amụma e buru banyere ikwusa ozi ọma nke alaeze ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! N’agbanyeghị na e kesawo Bible n’ụzọ sara mbara otú a, ọ ka dị mkpa ka obere ìgwè a nke ndị àmà Chineke bipụta akwụkwọ iji kọwaa [nzube] Chineke na iji jekwuru ndị e nyere Bible ndị a n’ụlọ ha. Ma ọ́ bụghị ya, ndị mmadụ agaghị ama ihe ọ bụla banyere nguzobe e guzobere ọchịchị Mezaịa ahụ n’oge anyị.”

14 Ụlọ Nche ahụ gakwara n’ihu ikwu, sị: “Na 1920, . . . Ndị Mmụta Bible bịara ghọta amụma ahụ Onyenwe anyị buru na Matiu 24:14 n’ụzọ ziri ezi. Ha ghọtaziri na ‘ozi ọma a’ bụ́ nke a ga-ekwusa n’ụwa nile ka ọ bụrụ àmà nye ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị nke mba nile, abụghị ozi ọma banyere alaeze nke gaje ịbịa abịa kama ọ bụ ozi ọma nke na-eme ka a mata na Eze Mezaịa ahụ amalitela ịchị ụwa.”

15. Olee otú ọrụ ịgba àmà ahụ sirila gbasaa kemgbe afọ ndị 1920?

15 ‘Obere ìgwè nke ndị àmà’ ahụ e nwere n’afọ ndị 1920 mụbara ka oge na-aga. Ka ọtụtụ iri afọ gasịrị, a matara ma malite ịchịkọta, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ ahụ.” (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) Taa, e nwere ihe dị ka nde mmadụ isii, narị puku isii na iri na atọ na narị asatọ na iri abụọ na itoolu na-ekwusa ozi ọma na narị ala abụọ na iri atọ na ise nke ụwa. Amụma ahụ e mezuola nnọọ n’ụzọ dị ịtụnanya! Ọ dịtụbeghị mgbe e kwusara “ozi ọma nke a nke alaeze” n’ókè buru ibu otú a. Ọ dịtụbeghịkwa mgbe e nwere ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi haruru otú a n’ụwa.

16. Gịnị ka a rụzuru n’afọ ije ozi gara aga? (Lee chaatị dị na peeji nke 27-30.)

16 Ìgwè a buru nnọọ ibu nke Ndịàmà rụsiri ọrụ ike n’afọ ije ozi nke 2005. E jiri ihe karịrị otu ijeri awa kwusaa ozi ọma na narị ala abụọ na iri atọ na ise. E mere ọtụtụ nde nletaghachi, duziekwa ọtụtụ nde ọmụmụ Bible. Ọ bụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị wepụtara oge ha na ihe onwunwe ha n’efu iji kwusaara ndị ọzọ Okwu Chineke, rụrụ ọrụ a. (Matiu 10:8) Site n’ike mmụọ nsọ ya dị ike, Jehova nọgidere na-enye ndị ohu ya ike ka ha wee na-emezu uche ya.—Zekaraịa 4:6.

Ịgbalịsi Ike Iji Gbaa Àmà

17. Gịnị ka ndị Jehova na-eme banyere ihe ahụ Jizọs kwuru banyere ikwusa ozi ọma?

17 Ọ bụ ezie na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ agafeela kemgbe Jizọs kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma, ịnụ ọkụ n’obi nke ndị Chineke nwere maka ọrụ ahụ ajụbeghị oyi. Anyị maara na site n’iji ntachi obi na-eme ezi ihe, anyị na-egosipụta na anyị nwere àgwà Jehova ndị bụ́ ịhụnanya, ebere na ndidi. Dị ka Chineke, anyị achọghị ka e bibie onye ọ bụla kama anyị na-achọ ka ndị mmadụ chegharịa ka ha na Jehova wee kpezie. (2 Ndị Kọrint 5:18-20; 2 Pita 3:9) N’ihi na mmụọ Chineke na-akwali Ndịàmà Jehova, ha ji ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ ruo ebe ụwa sọtụrụ. (Ndị Rom 12:11) N’ihi ya, ndị mmadụ nọ ebe dị iche iche na-anabata eziokwu ahụ ma na-eme ka ndụ ha kwekọọ ná nduzi ịhụnanya Jehova. Tụlee ihe atụ ole na ole.

18, 19. Kọọ ahụmahụ nke ụfọdụ ndị mere ihe kwekọrọ n’ozi ọma ahụ.

18 Charles bụ onye ọrụ ugbo n’ebe ọdịda anyanwụ Kenya. Na 1998, o rere ụtaba karịrị puku kilogram asatọ, e nyekwara ya asambodo dị ka Onye Kasị Akọpụta Ụtaba. Ma, ọ malitere ịmụ Bible. N’oge na-adịghị anya, ọ bịara ghọta na onye na-emepụta ụtaba na-emegide iwu Jizọs nyere nke bụ́ mmadụ ịhụ ndị agbata obi ya n’anya. (Matiu 22:39) Mgbe ọ ghọtara na ‘onye kasị akọpụta ụtaba’ bụ n’ezie ‘onye kasị egbu mmadụ,’ Charles jiri ọgwụ gbagbusịa ụtaba ya. O nwere ọganihu n’ụzọ ime mmụọ ruo n’ịrara ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim. Ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile na ohu na-eje ozi.

19 Obi abụọ ọ bụla adịghị ya na Jehova na-eji àmà zuru ụwa ọnụ a na-agba eme ka mba nile mee mkpatụ, ihe ndị a na-achọsi ike—ndị mmadụ—ana-abatakwa. (Hagaị 2:7) Pedro, bụ́ onye bi na Portugal, banyere ụlọ akwụkwọ seminarị mgbe ọ dị afọ 13. Ihe mgbaru ọsọ ya bụ ịghọ onye ozi ala ọzọ na ịkụziri ndị mmadụ Bible. Otú ọ dị, mgbe obere oge gasịrị, o si na seminarị ahụ pụọ n’ihi na a dịchaghị akụziri ha Bible n’ihe ọmụmụ ha. Afọ isii ka e mesịrị, ọ gara otu mahadum dị na Lisbon ịga mụọ nkà mmụta banyere akparamàgwà mmadụ. Ya na nwanne mama ya, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, onye gbara ya ume ịmụ Bible, biri. N’oge ahụ, Pedro nwere obi abụọ ma è nwedịrị Chineke, ọ pụghịkwa ikpebi ma ọ ga-amụ Bible ma ọ bụ na ọ gaghị amụ. Ọ gwara prọfesọ na-akụziri ha nkà mmụta banyere akparamàgwà mmadụ na ọ na-esiri ya ike ime mkpebi. Prọfesọ ahụ gwara ya na nkà mmụta banyere akparamàgwà na-akụzi na ndị na-apụghị ime mkpebi chọrọ iji aka ha laa ndụ ha n’iyi. Mgbe ọ gwasịrị ya nke a, Pedro kpebiri ịmụ Bible. E mere ya baptizim n’oge na-adịchabeghị anya, ọ na-eduzikwara ndị ọzọ ọmụmụ Bible.

20. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ na a na-agbara ndị nke mba nile àmà n’ụzọ buru ibu otú a?

20 Ka ọ dị ugbu a, anyị amaghị ókè a ga-ekwusaru ozi ọma ahụ nye mba nile, anyị amaghịkwa ụbọchị na awa ọgwụgwụ ahụ ga-abịa. Nanị ihe anyị maara bụ na ọ ga-abịa n’oge na-adịghị anya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ na ozi ọma a e kwusaworo n’ụzọ sara mbara otú a bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ndị na-egosi na oge Alaeze Chineke ga-abịa ịnọchi ọchịchị ụmụ mmadụ eruwela. (Daniel 2:44) Kwa afọ, a na-enye ọtụtụ nde mmadụ ohere ime ihe kwekọrọ n’ozi ọma ahụ, nke a na-ewetakwara Chineke anyị, bụ́ Jehova, otuto. Kpebisie ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi na isoro ụmụnna gị bụ́ ndị nọ n’ụwa nile na-arụsị ọrụ ike n’ịgbara ndị nke mba nile àmà. Ọ bụrụ na anyị emee nke a, anyị ga-azọpụta onwe anyị na ndị na-ege anyị ntị.—1 Timoti 4:16.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị mere Matiu 24:14 ji bụrụ amụma dị ịrịba ama?

• Olee mgbalị Ndị Kraịst oge mbụ mere iji kwusaa ozi ọma ahụ, gịnịkwa ka nke ahụ rụpụtara?

• Olee otú Ndị Mmụta Bible si bịa ghọta mkpa ịgbara ndị nke mba nile àmà dị?

• Gịnị masịrị gị mgbe ị na-atụle ihe ndị Jehova rụzuru n’afọ ije ozi gara aga?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Chaatị dị na peeji nke 27-30]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 2005 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Map/Foto ndị dị na peeji nke 25]

Pọl mere njem ọtụtụ puku kilomita n’okporo ụzọ na n’oké osimiri iji kwusaa ozi ọma ahụ

[Foto dị na peeji nke 24]

Jehova zigara Pita ka ọ gaa gbaara Kọniliọs na ezinụlọ ya àmà