Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Dị Ka Osisi Lagani Auna?

Ị̀ Dị Ka Osisi Lagani Auna?

Ị̀ Dị Ka Osisi Lagani Auna?

N’OTU obodo dị ná mpụga Port Moresby, Papua New Guinea, ụmụnna nwoke abụọ si ozi ọma na-alọta. Ka ha na-alọta, ha hụrụ otu osisi mara mma. Onye nke okenye tụgharịrị ma gwa onye nke nta, sị, “Ihe a bụ osisi lagani auna, aha ahụ pụtara ‘osisi na-erugharị akwụkwọ kwa afọ.’ N’adịghị ka ọtụtụ osisi ndị ọzọ nọ n’ebe okpomọkụ, ọ na-agbụsị akwụkwọ kwa afọ ma yie ka ọ nwụọla. Otú ọ dị, ọ na-eteghasị n’udu mmiri, puo okooko, ma maghachi mma.”

Anyị pụrụ ịmụta ihe site n’osisi lagani auna, ma ọ bụ royal poinciana, nke bụ́ aha e ji mara ya. Dị ka ụfọdụ ndị ọkachamara si kwuo, ọ bụ otu n’ime osisi ise kasị epu okooko ndị mara mma n’ụwa nile. N’agbanyeghị na ọ na-agbụsị okooko ya na akwụkwọ ya n’oge ọkọchị, osisi ahụ na-echekwa mmiri na-ezuru ya. Mkpọrọgwụ ya siri ike, ọ pụkwara ịtụhị gburugburu nnukwu okwute ndị bamiri n’ime ala. N’ụzọ dị otú a, ọ na-akwụsị ike mgbe e nwere oké ifufe. Ya bụ, ọ na-eto nke ọma ọbụna n’oge ọ na-esiri osisi ndị ọzọ ike ịdịgide ndụ.

Anyị pụrụ ịchọta onwe anyị n’ọnọdụ ndị pụrụ ịnwale otú okwukwe anyị siruru n’ike. Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi? Dị ka osisi lagani auna, anyị pụrụ ịdị na-amịta mmiri na-enye ndụ nke Okwu Chineke ma na-echekwa ya. Anyị kwesịkwara ịrapagidesi ike ‘n’oké nkume anyị,’ bụ́ Jehova, nakwa ná nzukọ ya. (2 Samuel 22:3) N’ezie, osisi lagani auna na-echetara anyị na anyị pụrụ ịnọgide na-agbasi ike n’ụzọ ime mmụọ ọbụna na gburugburu ebe ihe siri oké ike, ma ọ bụrụ na anyị ejiri ndokwa ndị Jehova mere kpọrọ ihe. Site n’ime otú a, anyị ‘ga-eketa nkwa ndị e kwere,’ tinyere nkwa nke ịdị ndụ ebighị ebi.—Ndị Hibru 6:12; Mkpughe 21:4.