Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅomie Ndidi Jehova

Ṅomie Ndidi Jehova

Ṅomie Ndidi Jehova

“Jehova adịghị egbu oge n’ihe banyere nkwa ya, . . . kama ọ na-enwe ndidi.”—2 Pita 3:9.

1. Olee onyinye na-enweghị atụ Jehova nyeworo ụmụ mmadụ?

JEHOVA enyewo anyị ihe ọ na-adịghị onye ọ bụla ọzọ ga-enyeli anyị ya. Ihe ahụ bụ ihe na-adọrọ nnọọ mmasị na ihe dị oké ọnụ ahịa, ma, a dịghị azụta ya n’ahịa, a pụghịkwa ịrụta ya n’ọrụ. Ihe ahụ o nyere anyị bụ onyinye nke ndụ ebighị ebi—nye ihe ka ọtụtụ n’ime anyị, ọ ga-abụ ndụ agwụghị agwụ n’ụwa paradaịs. (Jọn 3:16) Nke ahụ ga-abụ nnọọ ihe na-enye obi ụtọ! Ihe ndị na-akpata oké nhụjuanya agaghị adịkwa—esemokwu, ime ihe ike, ịda ogbenye, mpụ, ọrịa, na ọbụna ọnwụ. Ndị mmadụ na ibe ha ga-ebi nnọọ n’udo ma dịrị n’otu mgbe Alaeze Chineke ga na-achị n’ịhụnanya. Paradaịs ahụ na-agụsi anyị nnọọ agụụ ike!—Aịsaịa 9:6, 7; Mkpughe 21:4, 5.

2. Olee ihe mere na Jehova ewepụbeghị usoro ihe Setan?

2 Jehova n’onwe ya na-atụ anya mgbe ọ ga-eweta Paradaịs n’ụwa. E kwuwerị, ọ hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya. (Abụ Ọma 33:5) Ọ dịghị enye ya obi ụtọ ịdị na-ahụ ụwa ebe a na-adịghị eji ụkpụrụ ezi omume ya eme ihe, ụwa nke jụrụ ọchịchị ya na nke na-akpagbu ndị ya. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ezi ihe ndị mere na o wepụbeghị ajọ usoro ihe Setan. Ihe ndị a mere o ji o mebeghị otú ahụ metụtara okwu banyere ma otú o si achị ò ziri ezi ka ọ̀ bụ na o zighị ezi. Iji dozie ihe ndị a na-ese okwu, Jehova na-egosipụta otu àgwà magburu onwe ya, àgwà nke ọtụtụ mmadụ taa na-enweghị—ndidi.

3. (a) Olee ihe okwu Grik na nke Hibru a sụgharịrị na Bible ịbụ “ndidi” pụtara? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a?

3 E nwere otu okwu Grik nke a sụgharịrị ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ugboro atọ ịbụ “ndidi.” N’ụzọ nkịtị ọ pụtara “inwe mmụọ dị ogologo.” N’ihi ya, a na-asụgharịkarị ya ịbụ “ogologo ntachi obi,” a sụgharịkwara ya otu ugboro ịbụ “inwe ndidi.” Otu echiche pụtara ìhè nke dị n’okwu Grik na nke Hibru e si na ha sụgharịta okwu ahụ bụ́ “ndidi” bụ ịnagide ihe na ịghara iwe iwe ọsọ ọsọ. Olee otú ndidi Jehova si abara anyị uru? Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site na ndidi na ntachi obi Jehova na nke ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi? Olee otú anyị si mara na ndidi Jehova nwere njedebe? Ka anyị hụ.

Tụlee Ihe Banyere Ndidi Jehova

4. Gịnị ka Pita onyeozi dere banyere ndidi Jehova?

4 Pita onyeozi dere banyere ndidi Jehova, sị: “Ka unu ghara ịdị na-echezọ otu eziokwu nke a, ndị m hụrụ n’anya, na otu ụbọchị dị ka otu puku afọ n’ebe Jehova nọ, otu puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị. Jehova adịghị egbu oge n’ihe banyere nkwa ya, dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwe ndidi n’ebe unu nọ n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.” (2 Pita 3:8, 9) Biko rịba isi ihe abụọ e mere ka ha pụta ìhè n’ebe a ama, bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka ịghọta ndidi Jehova.

5. Olee otú ụzọ Jehova si ele oge anya si emetụta ihe ndị ọ na-eme?

5 Isi ihe nke mbụ bụ na Jehova adịghị ele oge anya otú anyị si ele ya. N’anya Onye ahụ nke na-adịru ebighị ebi, otu puku afọ dị ka otu ụbọchị. Oge anaghị egbochi ya ime ihe, ọ dịghịkwanụ eme ihe ọkụ ọkụ n’ihi na oge na-agwụnahụ ya, ma nke a apụtaghị na ọ na-egbu oge ime ihe. Ebe ọ bụ na Jehova nwere amamihe na-adịghị agwụ agwụ, ọ ma kpọmkwem oge kasị mma iji mee ihe ga-abara mmadụ nile uru, ọ na-ejikwa ndidi echere ka oge ahụ ruo. Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ikwubi na ahụhụ ndị ohu Jehova pụrụ ịdị na-ata ugbu a adịghị emetụ ya n’ahụ́. Ọ bụ Chineke nke nwere “obi ọmịiko,” onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya. (Luk 1:78; 1 Jọn 4:8) O nwere ikike iwepụ kpamkpam nsogbu ọ bụla nke nkwere o kweere ka nhụjuanya dịrị ruo nwa oge pụrụ ịkpataworo anyị.—Abụ Ọma 37:10.

6. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ikwubi banyere Chineke, n’ihi gịnịkwa?

6 N’ezie, ọ naghị adịrị mmadụ mfe ichere ihe na-agụsi ya agụụ ike. (Ilu 13:12) N’ihi ya, mgbe ndị mmadụ na-emeghị ngwa imezu nkwa ndị ha kwere, ndị ọzọ pụrụ ikwubi na ha ebudịghị n’obi ime ihe ahụ ha kwere ná nkwa. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe amamihe na-adịghị ya iche na Chineke dị otú ahụ! Ọ bụrụ na anyị elewe ndidi Chineke anyị anya dị ka igbu oge, ka oge na-aga, nke a pụrụ ime ka ọ dịrị anyị mfe inwe obi abụọ na nkụda mmụọ, anyị pụkwara ịmalite iro ụra n’ụzọ ime mmụọ. Nke kakwa njọ bụ na anyị pụrụ ịbụ ndị ndị ahụ Pita dọrọ anyị aka ná ntị banyere ha ná mmalite—ndị na-akwa emo, bụ́ ndị na-enweghị okwukwe—duhiere. Ndị dị otú ahụ na-eji ịkwa emo ekwu, sị: “Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị ha dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide kpọmkwem dị ka hà dị site ná mmalite nke ihe e kere eke.”—2 Pita 3:4.

7. Gịnị jikọrọ ndidi Jehova na ọchịchọ ya ịzọpụta ndị mmadụ?

7 Isi ihe nke abụọ anyị pụrụ ịmụta site n’ihe Pita kwuru bụ na Jehova nwere ndidi n’ihi na ọ na-achọ ka mmadụ nile chegharịa. Jehova ga-egbu ndị jụwara isi na ha agaghị akwụsị ime ihe ọjọọ. Otú ọ dị, ọnwụ nke onye ajọ omume adịghị atọ Chineke ụtọ. Kama nke ahụ, ọ na-enwe obi ụtọ ịhụ ka ndị mmadụ chegharịrị, kwụsị ime ihe ọjọọ, ma nọgide na-adị ndụ. (Ezikiel 33:11) Ọ bụ nke a mere o ji nọgide na-enwe ndidi, na-emekwa ka e kwusaa ozi ọma n’ụwa nile ka ndị mmadụ wee nwee ohere ịdị ndụ.

8. Olee otú ndidi Chineke si pụta ìhè n’otú o si mesoo mba Izrel?

8 Ndidi Chineke pụtakwara ìhè n’otú o si mesoo mba Izrel oge ochie. O diri nnupụisi ha ruo ọtụtụ narị afọ. Site n’ọnụ ndị amụma ya, ọ gbara ha ume ugboro ugboro, sị: “Sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu laghachi, debe ihe nile m nyere n’iwu, na ụkpụrụ m nile, dị ka iwu ahụ nile si dị nke M nyere nna unu ha n’iwu, nke M zitekwara unu n’aka ndị ohu m, bụ́ ndị amụma.” Gịnị ka nke a rụpụtara? Ọ dị mwute na ndị Izrel “anụghị.”—2 Ndị Eze 17:13, 14.

9. Olee otú ndidi Jizọs si yie nke Nna ya?

9 N’ikpeazụ, Jehova zigara Ọkpara ya, bụ́ onye nọgidere na-arịọ ndị Juu ka ha na Chineke kpezie. Ndidi Jizọs yiri nnọọ nke Nna ya. Ebe Jizọs maara nke ọma na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya, ọ kwara arịrị, sị: “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e zigaara ya nkume,—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya! Ma unu achọghị ya.” (Matiu 23:37) Okwu a na-emetụ n’ahụ́ abụghị ihe a pụrụ ịnụ n’ọnụ onyeikpe obi fere azụ bụ́ onye ọ na-agụsi agụụ ike ịta mmadụ ahụhụ kama ọ bụ ihe a pụrụ ịnụ n’ọnụ enyi na-ahụ n’anya nke na-edi ihe. Dị nnọọ ka Nna ya nke eluigwe, Jizọs chọrọ ka ndị mmadụ chegharịa ma gbanahụ ikpe ọmụma. Ụfọdụ gere ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs ma gbanahụ ikpe ọmụma dị egwu nke bịakwasịrị Jeruselem na 70 O.A.—Luk 21:20- 22.

10. Olee otú ndidi Chineke siworo baara anyị uru?

10 Ọ̀ bụ na ndidi Chineke abụghị ihe dị ịtụnanya? N’agbanyeghị otú nnupụisi ụmụ mmadụ haruru, Jehova ekwewo ka onye ọ bụla n’ime anyị, tinyere ọtụtụ nde ndị ọzọ, bịa mara ya ma nwee olileanya nke ịbụ ndị a ga-azọpụta. Pita degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “Na-agụnụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta.” (2 Pita 3:15) Ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele na ndidi Jehova emegheelara anyị ụzọ maka nzọpụta? Ọ̀ bụ na anyị adịghị ekpe ekpere ka Jehova nọgide na-enwere anyị ndidi ka anyị na-ejere ya ozi kwa ụbọchị?—Matiu 6:12.

11. Gịnị ka ịghọta ndidi Jehova ga-akpali anyị ime?

11 Mgbe anyị ghọtara ihe mere Jehova ji enwe ndidi, nke a na-enyere anyị aka iji ndidi na-echere nzọpụta ya, anyị agatụghị ekwubi na ọ na-egbu oge n’imezu nkwa ya. (Abụ Ákwá 3:26) N’agbanyeghị na anyị nọgidere na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, obi siri anyị ike na Chineke maara oge kasị mma iji za ekpere ahụ. Ọzọkwa, a na-akpali anyị iṅomi Jehova site n’inwe ndidi dị ka ya mgbe anyị na-emeso ụmụnna anyị na ndị anyị na-ezi ozi ọma ihe. Anyị onwe anyị achọghịkwa ka e bibie onye ọ bụla ma ọ ga-amasị anyị ịhụ ka ha chegharịrị ma nwee otu olileanya ahụ anyị nwere maka ndụ ebighị ebi.—1 Timoti 2:3, 4.

Tụlee Ihe Banyere Ndidi Ndị Amụma

12, 13. Dị ka Jems 5:10 si kwuo, olee otú Aịzaịa onye amụma si nwelie ndidi?

12 Ọ bụrụ na anyị anọgide na-atụle ihe banyere ndidi Jehova, nke a ga-enyere anyị aka iji àgwà a kpọrọ ihe na ịzụlite ya. Ọ naghị adịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe ịzụlite ndidi, ma a pụrụ ịzụlite ya. Anyị pụrụ isi n’aka ndị ohu Chineke nke oge ochie mụta inwe ndidi. Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ụmụnna m, werenụ ndị amụma, bụ́ ndị kwuru okwu n’aha Jehova, dị ka ihe nlereanya nke nhụjuanya na inwe ndidi.” (Jems 5:10) Ọ bụ ihe na-akasi obi nakwa ihe na-agba ume ịmara na ndị ọzọ enwewo ụdị nsogbu ndị anyị na-enwe ugbu a ma merie ha.

13 Dị ka ihe atụ, ndidi dị Aịzaịa onye amụma ezigbo mkpa iji jee ozi e dunyere ya. Jehova mere ka nke ahụ pụta ìhè site n’ịgwa ya, sị: “Jee, sị ndị nke a, Na-anụnụ, ma unu aghọtala; na-ahụnụ, ma unu amatala. Mee ka obi ndị nke a maa abụba, meekwa ka ntị ha dị arọ, techiekwa anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka a gharakwa ime ka ahụ́ dị ha ike.” (Aịsaịa 6:9, 10) N’agbanyeghị na ndị ahụ egeghị Aịzaịa ntị, o jiri ndidi zie ha ozi ịdọ aka ná ntị Jehova ọ dịkarịa ala ruo afọ iri anọ na isii! N’otu aka ahụ, ndidi ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ọrụ ikwusa ozi ọma nke e nyere anyị rụọ, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị adịghị anabata ya.

14, 15. Gịnị nyeere Jeremaịa aka idi nhụjuanya na nkụda mmụọ?

14 Ka ndị amụma ahụ na-ezisa ozi ha, nsogbu ha zutere abụghị nanị na ndị mmadụ enweghị mmasị n’ozi ha; a kpagburu ha. E tinyere Jeremaịa n’ọtọsị, tụọ ya “mkpọrọ,” tụbakwa ya n’olulu. (Jeremaịa 20:2; 37:15; 38:6) Ọ bụ ndị ahụ ọ na-achọ inyere aka kpagburu ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Jeremaịa ebughịrị ha iwe n’obi, o megwaraghịkwa ha. O ji ndidi tachie obi ruo ọtụtụ iri afọ.

15 Mkpagbu na ịkwa emo emeghị ka Jeremaịa kwụsị ije ozi e dunyere ya, ha adịghịkwa akwụsị anyị taa. N’eziokwu, anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ. Ọ dị mgbe Jeremaịa nwere nkụda mmụọ. O dere, sị: “Okwu Jehova ghọọrọ m ihe ịta ụta na ihe ịkwa emo ogologo ụbọchị nile. M wee sị, M gaghị ehota Ya, m gaghị ekwukwa okwu ọzọ n’aha Ya.” Gịnị meziri? Jeremaịa ọ̀ kwụsịrị ikwusa ozi ọma? Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “[Okwu Chineke] wee dị n’obi m dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro n’ọkpụkpụ m nile, ike gwụkwara m ịnagide ya, enweghịkwa m ike.” (Jeremaịa 20:8, 9) Rịba ama na mgbe o chewere banyere emo ndị mmadụ na-akwa ya, ọ kwụsịrị inwe ọṅụ. Mgbe o chetara na ozi ya bụ ozi ọma na ozi dị ezigbo mkpa, ọ maliteghachiri inwe ọṅụ. Ọzọkwa, Jehova nọnyeere Jeremaịa “dị ka dike nke na-eme ka a maa jijiji,” na-agba ya ume iji ịnụ ọkụ n’obi na obi ike na-akpọsa okwu Chineke.—Jeremaịa 20:11.

16. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ n’ọrụ ikwusa ozi ọma?

16 Ọrụ Jeremaịa onye amụma ò nyere ya ọṅụ? Eenụ! Ọ gwara Jehova, sị: “A chọpụtawo okwu Gị, m wee rie ha; okwu Gị wee ghọọrọ m ihe obi ụtọ na ọṅụ obi m: n’ihi na a kpọkwasịwo m aha Gị, Jehova, Chineke nke usuu nile nke ndị agha.” (Jeremaịa 15:16) Ihe ùgwù nke ịnọchite anya ezi Chineke ahụ na ikwusa okwu ya nyere Jeremaịa ọṅụ. Anyị pụkwara ịṅụrị ọṅụ. Tụkwasị na nke ahụ, anyị na-aṅụrị ọṅụ dịkwa ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe n’ihi na n’ụwa nile, ọtụtụ ndị na-anabata ozi Alaeze ahụ, na-echegharị, ma na-abanye n’ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Luk 15:10.

“Ntachi Obi Job”

17, 18. Olee otú Job si tachie obi, gịnịkwa si na ya pụta?

17 Mgbe o kwusịrị banyere ndị amụma oge ochie, Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee, na Jehova nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) Okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ntachi obi” na okwu Jems jiri mee ihe maka “ndidi” n’amaokwu bu nke a ụzọ yitụrụ ibe ha. N’igosi ihe dị iche n’okwu abụọ ahụ, otu ọkà mmụta dere, sị: “Ndidi bụ mmadụ idi mkparị, ebe ntachi obi pụtara iji obi ike na-anagide nhụjuanya.”

18 Job tara ezigbo ahụhụ. Akụ̀ na ụba ya funahụrụ ya, ụmụ ya anwụọ, ya arịakwa ọrịa na-egbu mgbu. E bokwara ya ebubo ụgha na ọ bụ Jehova na-ata ya ahụhụ. Job agbachighị nkịtị mgbe ọ na-ata ahụhụ; o ji mwute kwupụta ọnọdụ ya ọbụna kwuo ihe nyere echiche na ya bụ onye ezi omume karịa Chineke. (Job 35:2) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mgbe ọ kwụsịrị inwe okwukwe na Chineke ma ọ bụ kwụsị ime ezi ihe. Ọ kọchaghị Chineke dị ka Setan kwuru na ọ ga-eme. (Job 1:11, 21) Gịnị si na ya pụta? Jehova “gọziri ikpeazụ Job karị mmalite ya.” (Job 42:12) Jehova mere ka ahụ́ dị Job mma, nye ya akụ̀ na ụba okpukpu abụọ, ma mee ka ya na ndị ọ hụrụ n’anya bie ndụ obi ụtọ. Ntachi obi Job jiri ikwesị ntụkwasị obi tachie nyekwaara ya aka ịghọta Jehova n’ụzọ zuru ezu karị.

19. Gịnị ka anyị na-amụta site n’otú Job si jiri ndidi tachie obi?

19 Gịnị ka anyị na-amụta site n’otú Job si jiri ndidi tachie obi? Dị ka Job, anyị nwere ike ịda ọrịa ma ọ bụ nwee ihe isi ike ndị ọzọ. E nwere ike anyị agaghị aghọtacha ihe mere Jehova ji kwere ka ọnwụnwa ụfọdụ bịakwasị anyị. Ma obi siri anyị ike na: Ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi, a ga-agọzi anyị. Jehova ga-akwụghachirịrị ndị na-achọsi ya ike ụgwọ. (Ndị Hibru 11:6) Jizọs kwuru, sị: “Onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.”—Matiu 10:22; 24:13.

“Ụbọchị Jehova Ga-abịa”

20. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ụbọchị Jehova ga-abịa?

20 Ọ bụ ezie na Jehova nwere ndidi, ọ bụkwa onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ gaghịkwa agbachi ihe ọjọọ nkịtị ruo mgbe ebighị ebi. Ndidi ya nwere njedebe. Pita dere, sị: “[Chineke alaghị] azụ n’inye ụwa oge ochie ahụhụ.” E chebere Noa na ezinụlọ ya ma mmiri gbagburu ụwa ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke. Jehova kpekwara Sọdọm na Gọmọra ikpe ma mee ka ha ghọọ ntụ. Ikpe ọmụma ndị a “na-esetịpụrụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ihe atụ nke ihe ndị gaje ịbịa.” Ọ dị otu ihe nke anyị na-aghaghị ijide n’aka: “Ụbọchị Jehova ga-abịa.”2 Pita 2:5, 6; 3:10.

21. Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta ndidi na ntachi obi, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Ka anyị ṅomizie ndidi Jehova site n’inyere ndị ọzọ aka ichegharị ka e nwee ike ịzọpụta ha. Ka anyị ṅomiekwa ndị amụma site n’iji ndidi na-ekwusa ozi ọma ahụ n’agbanyeghị na ndị anyị na-ekwusara ya adịghị ege ntị. Ọzọkwa, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-agọzi anyị n’ụba ma ọ bụrụ na anyị atachie obi mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa ma nọgide na-eme ezi ihe, dị ka Job mere. E nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ n’ozi anyị mgbe anyị hụrụ otú Jehova siworo na-agọzi nnọọ mgbalị ndị ya na-eme iji kwusaa ozi ọma ahụ n’ụwa nile. Anyị ga-ahụ nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka Jehova ji enwe ndidi?

• Gịnị ka anyị na-amụta site na ndidi ndị amụma?

• Olee otú Job si tachie obi, gịnịkwa siri na ya pụta?

• Olee otú anyị si mara na ndidi Jehova nwere njedebe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndidi Jizọs yiri nnọọ nke Nna ya

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Olee otú Jehova si kwụghachi Jeremaịa ụgwọ maka ndidi ya?

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Olee otú Jehova si kwụghachi Job ụgwọ maka ntachi obi ya?