Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Ga-ebi Ndụ Ka Maa n’Ụwa Ọhụrụ Chineke

A Ga-ebi Ndụ Ka Maa n’Ụwa Ọhụrụ Chineke

A Ga-ebi Ndụ Ka Maa n’Ụwa Ọhụrụ Chineke

DAVID, * bụ́ Onye Kraịst bụ́ di na nna, chere na ya na-eme ihe ga-adịrị ya na ezinụlọ ya mma site n’ịkwaga United States. Ọ bụ ezie na ọ masịghị ya ịhapụ nwunye ya na ụmụ ya n’ụlọ, obi siri ya ike na ọ bụrụ na ya enwetakwuo ego, na ya ga-eme ka ndụ dịrị ha nile mfe. Ya mere, ọ gawara New York mgbe ndị ikwu ya nọ n’ebe ahụ gwara ya bịa ma nweta ọrụ n’ebe ahụ n’oge na-adịghị anya.

Ka oge na-aga, ihe adịghịzi otú David tụrụ anya ya. Ọ naghị enwecha ohere ime ihe ndị o kwesịrị ime n’ọgbakọ. N’otu oge, ọ fọrọ nke nta ka ọ gbahapụ Chineke. Ọ bụ mgbe o tinyere aka n’omume rụrụ arụ ka anya doro ya. Ọchịchọ ịba ọgaranya ji nwayọọ nwayọọ na-anapụ ya ihe nile o ji kpọrọ ihe. Ọ ghaghị ime ihe banyere ya.

Dị ka David, kwa afọ, ọtụtụ ndị na-esi n’obodo ha na-akwaga n’ebe ọzọ n’ihi ihe isi ike, na-atụ anya ime ka ọnọdụ ha ka mma. Ma, nke a na-emekarị ka ha gbakụta Chineke azụ. Ụfọdụ ndị echewo, sị, ‘Onye Kraịst ọ̀ pụrụ ịdị na-adọga ịba ọgaranya ma ka bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ?’ Ọtụtụ ndị edemede na ndị ndú okpukpe a ma ama na-ekwu na nke ahụ pụrụ ikwe omume. Ma, dị ka David na ndị ọzọ mụtaworo, ọ pụrụ isi ike mmadụ inweta otu n’atụfughị nke ọzọ.—Luk 18:24.

Ego Abụghị Ihe Ọjọọ

N’ezie, ego bụ ihe mmadụ mepụtara. Ọ bụghị ihe ọjọọ n’onwe ya, dịkwa ka ọtụtụ ihe ndị ọzọ mmadụ mepụtara na-abụghị. N’ezie, ọ dịghị ihe ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị ihe e ji agbanwere ihe. N’ihi ya, a pụrụ iji ya rụzuo ihe dị mma ma ọ bụrụ na e jiri ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi. Dị ka ihe atụ, Bible kwetara na “ego bụ ndò,” ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ na-echebe mmadụ pụọ ná nsogbu ndị ịda ogbenye na-akpata. (Eklisiastis 7:12) Nye ụfọdụ, o yiri ka ‘ego na-aza ihe nile.’—Eklisiastis 10:19.

Akwụkwọ Nsọ katọrọ ịdị umengwụ ma gbaa anyị ume ka anyị na-arụsi ọrụ ike. Anyị ga-egboro ndị òtù ezinụlọ anyị mkpa ha, ọ bụrụkwa na e nwee ntakịrị ihe fọdụrụnụ, anyị ga-enwe “ihe anyị ga-ekenye onye nọ ná mkpa.” (Ndị Efesọs 4:28; 1 Timoti 5:8) Ọzọkwa, kama ikwu ka mmadụ na-ata ndụ ya ahụhụ, Bible na-agba anyị ume ka anyị jiri ihe onwunwe anyị tụọ ndụ mmanụ. A gwara anyị ka anyị ‘buru òkè [anyị]’ ma jiri ihe anyị rụpụtara site ná ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ tụọ ndụ mmanụ. (Eklisiastis 5:18-20) N’ezie, n’ime Bible e nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi ma bụrụ ọgaranya.

Ndị Ikom Kwesịrị Ntụkwasị Obi Bụ́ Ndị Bara Ọgaranya

Ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Ebreham, nwere ọtụtụ ìgwè ewu na atụrụ, ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo, nakwa ọtụtụ narị ndị ohu. (Jenesis 12:5; 13:2, 6, 7) Onye ezi omume bụ́ Job nwekwara akụ̀ na ụba dị ukwuu—bụ́ ndị gụnyere anụ ụlọ, ndị ohu, ọlaọcha, na ọlaedo. (Job 1:3; 42:11, 12) Mmadụ abụọ a bara ọgaranya ọbụna ma e jiri ha tụnyere oge anyị, ma ha bụkwa ọgaranya n’ebe Chineke nọ.

Pọl onyeozi kpọrọ Ebreham “nna nke ndị nile nwere okwukwe.” Ebreham enweghị aka ntagide, ọ hụghịkwa ihe onwunwe ya n’anya gabiga ókè. (Ndị Rom 4:11; Jenesis 13:9; 18:1-8) N’otu aka ahụ, Chineke n’onwe ya kọwara Job dị ka “nwoke zuru okè, ziekwa ezi.” (Job 1:8) Job dị njikere mgbe nile inyere ndị ogbenye na ndị e wedara n’ala aka. (Job 29:12-16) Ma Ebreham ma Job tụkwasịrị Chineke obi kama ịtụkwasị obi n’akụ̀ na ụba ha.—Jenesis 14:22-24; Job 1:21, 22; Ndị Rom 4:9-12.

Ihe atụ ọzọ bụ Eze Solomọn. Dị ka onye ga-anọchi anya nna ya n’ocheeze Chineke nke dị na Jeruselem, a gọziri Solomọn ọ bụghị nanị site n’inye ya amamihe sitere n’aka Chineke kamakwa site n’inye ya nnukwu akụ̀ na ụba na ebube. (1 Ndị Eze 3:4-14) O kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe ka ukwuu n’oge ndụ ya. Otú ọ dị, mgbe Solomọn mere agadi, “obi ya ezughịkwa okè n’ebe Jehova nọ.” (1 Ndị Eze 11:1-8) N’eziokwu, ahụmahụ a dị mwute na-egosi ihe ize ndụ ụfọdụ ndị dị n’ịba ọgaranya. Tụlee ụfọdụ n’ime ha.

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Ịba Ọgaranya

Ihe ize ndụ kasị njọ dị na ya bụ na ọ pụrụ ime ka mmadụ hụ ego na ihe ego pụrụ ịzụta n’anya gabiga ókè. Akụ̀ na ụba emewo ka ụfọdụ bụrụ ndị ihe onwunwe na-adịghị eju afọ. Solomọn maara banyere nke a mgbe ọ malitere ọchịchị. O dere, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ: nke a bụkwa ihe efu.” (Eklisiastis 5:10) Ma Jizọs ma Pọl mesịrị dọọ Ndị Kraịst aka ná ntị banyere ụdị ịhụnanya a dị ize ndụ.—Mak 4:18, 19; 2 Timoti 3:2.

Ọ bụrụ na anyị ahụ ego n’anya kama ile ya anya nanị dị ka ihe e ji enweta ihe, ọ ga-adị mfe ịnwata anyị itinye aka n’ụdị omume dị iche iche dị ka ịgha ụgha, izu ohi, na ịghọ aghụghọ. Otu n’ime ndịozi Kraịst bụ́ Judas Iskarịọt, raara nna ya ukwu nye n’ihi nanị mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. (Mak 14:11; Jọn 12:6) Ọbụna ụfọdụ ndị hụrụ ego n’anya gabiga ókè ejiwo ya dochie anya Chineke, na-efe ya ofufe dị ka chi. (1 Timoti 6:10) Ya mere, Ndị Kraịst kwesịrị ịgbalị ịtụle kpọmkwem ihe mere ha ji achọ inwetakwu ego.—Ndị Hibru 13:5.

E nwekwara ihe ize ndụ ndị ọzọ na-apụtachaghị ìhè ndị dị n’ịchọ ịba ọgaranya. Nke mbụ, o yiri ka oké akụ̀ na ụba ọ̀ na-akpali mmadụ ịdabere n’onwe ya. Jizọs gụnyere nke a mgbe o kwuru banyere “ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba.” (Matiu 13:22) N’otu aka ahụ, onye so dee Bible bụ́ Jems dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ghara ichefu Chineke ọbụna mgbe ha na-eme atụmatụ ịchụ nta ego. (Jems 4:13-16) Ebe o yiri ka ego ọ̀ na-eme ka anyị nweretụ onwe anyị, ndị nwere ego nọ n’ihe ize ndụ nke ịtụkwasị ego ha obi kama ịtụkwasị Chineke obi.—Ilu 30:7-9; Ọrụ 8:18-24.

Nke abụọ, dị ka David, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite mesịrị chọpụta, ọtụtụ mgbe, ịchụso akụ̀ na ụba na-ewekọrọ ihe ka ukwuu n’oge na ike mmadụ nke na ọ ga-eji nke nta nke nta mebie mmekọrịta onye ahụ na Jehova. (Luk 12:13-21) Ndị bara ọgaranya pụkwara ịbụ ndị a nwara ọnwụnwa iji ihe ha nwere ekpori ndụ ma ọ bụ achụso ihe nke aka ha nanị.

Ọ̀ ga-abụ na nsogbu ime mmụọ Solomọn nwere bụ n’ihi na o kwere ka akụ̀ na ụba ya megharịa ya anya? (Luk 21:34) Ọ maara na Chineke machibidoro ịlụ ụmụ nwanyị ndị mba ọzọ iwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ lụrụ otu puku ụmụ nwanyị. (Deuterọnọmi 7:3) N’ịchọ ime ihe ga-amasị ụmụ nwanyị ala ọzọ ọ lụrụ, o sooro ha fee chi ọzọ. Dị ka anyị hụrụ ná mmalite, Solomọn ji nke nta nke nta gbakụta Jehova azụ.

Ihe atụ ndị a na-egosi nnọọ na ndụmọdụ Jizọs bụ́, “Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na nke Akụ̀ na ụba,” bụ eziokwu. (Matiu 6:24) Oleekwanụ otú Onye Kraịst pụrụ isi nagide nsogbu akụ̀ na ụba nke ọtụtụ na-eche ihu ugbu a? Karịsịa, olee olileanya e nwere na a ga-ebi ndụ ka mma n’ọdịnihu?

A Ga-ebi Ndụ Ka Mma n’Ọdịnihu

N’adịghị ka ndị nna ochie bụ́ Ebreham, Job na mba Izrel, e nyere ụmụazụ Jizọs ọrụ nke “ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.” (Matiu 28:19, 20) Imezu nke a chọrọ oge na mgbalị ndị a gaara eji na-achụso ihe nke ụwa. Ya mere, ihe kasị mkpa anyị pụrụ ime iji nwee ihe ịga nke ọma bụ ime ihe Jizọs sịrị ka anyị mee: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze [Chineke] na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:33.

Mgbe ọ fọrọ nke nta ka ezinụlọ ya tisaa, nakwa ka ya na Jehova kwụsị ịdị ná mma, anya bịara doo David. Dị ka Jizọs kwere ná nkwa, ihe malitere ịgaziri David mgbe ọ maliteghachiri ibute ọmụmụ Bible, ekpere, na ikwusa ozi ọma ụzọ ná ndụ ya. Ya na nwunye ya na ụmụ ya jiri nke nta nke nta maliteghachi ịdị ná mma. Ọ maliteghachikwara inwe ọṅụ na afọ ojuju. Ọ ka na-arụsi ọrụ ike. Ọ bụghị ogbenye ọnụ ntụ, ọ baghịkwanụ ọgaranya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ mụtara ihe ndị bara uru site n’ahụmahụ ọjọọ o nwere.

David bịara na-akwa ụta ihe mere ya ji kwaga United States, ma kpebizie na ya agaghị ekwe ọzọ ka ego na-ekpebiri ya ihe ọ ga-eme. Ugbu a, ọ maara na a pụghị iji ego zụta ezinụlọ na-ahụ n’anya, ezi ndị enyi na mmekọrịta dị mma nke mmadụ na Chineke, bụ́cha ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa ná ndụ. (Ilu 17:17; 24:27; Aịsaịa 55:1, 2) N’ezie, omume ọma bara uru karịa akụ̀ na ụba. (Ilu 19:1; 22:1) David na ezinụlọ ya ekpebiwo ibute ihe ndị kasị mkpa ná ndụ ụzọ.—Ndị Filipaị 1:10.

Mgbalị ndị mmadụ meworo iji nwee ụwa ebe onye ọ bụla ga-aba ọgaranya ma nwee omume ọma akụwo afọ n’ala. Otú ọ dị, Chineke ekwewo nkwa na Alaeze ya ga-eme ka e nwee ụbara ihe onwunwe na ihe ime mmụọ bụ́ ihe ndị dị anyị mkpa iji bie nnọọ ndụ obi ụtọ. (Abụ Ọma 72:16; Aịsaịa 65:21-23) Jizọs kụziri na iji nwee obi ụtọ n’ezie, anyị aghaghị ibu ụzọ mara mkpa ime mmụọ anyị. (Matiu 5:3) N’ihi ya, ma ànyị bara ọgaranya ma ànyị dara ogbenye, ụzọ kasị mma onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi kwadebe ugbu a maka ụwa ọhụrụ Chineke na-abịanụ bụ site n’ibute ozi Jehova ụzọ. (1 Timoti 6:17-19) Nke ahụ ga-abụ n’ezie ụwa ebe ndị mmadụ ga-aba ọgaranya ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ime mmụọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Job tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụghị akụ̀ na ụba ya

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

A pụghị iji ego zụta ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa ná ndụ