Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Josef, bụ́ ohu Jehova nke kwesịrị ntụkwasị obi, ò ji iko ọlaọcha pụrụ iche arịba ihe ga-eme n’ọdịnihu ama, dị ka Jenesis 44:5 yiri ka ọ̀ na-egosi?

Ọ dịghị ihe ọ bụla mere anyị ga-eji chee na Josef tinyere aka n’ụdị ọ bụla nke mgbaasị.

Bible na-eme nnọọ ka anyị mata ihe Josef chere banyere iji majik amata ọdịnihu. Mgbe a gwara Josef ka ọ kọwaa nrọ Fero n’oge ahụ o si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ọ nọgidere na-ekwughachi ugboro ugboro na ọ bụ nanị Chineke pụrụ ‘ikwu’ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Nke a mere ka Fero n’onwe ya kweta na ọ bụ site n’aka Chineke nke Josef na-efe ofufe—ezi Chineke ahụ, ọ bụghị site ná mgbaasị—ka Josef si mata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. (Jenesis 41:16, 25, 28, 32, 39) N’Iwu ahụ e mesịrị nye Mozis, Jehova machibidoro ime majik ma ọ bụ mgbaasị iwu, si otú a mee ka o doo anya na ọ bụ nanị Ya na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu.—Deuterọnọmi 18:10-12.

Gịnịzi mere Josef ji kwuo site n’ọnụ onye na-ejere ya ozi na ya ‘na-arịba ihe ga-eme n’ọdịnihu ama n’ezie’? * (Jenesis 44:5) Anyị kwesịrị ịtụle ihe mere o ji kwuo okwu a.

N’ihi oké ụnwụ nri, ụmụnne Josef ndị nwoke gara Ijipt ịzụta ihe oriri. N’afọ ndị bu ụzọ, ọ bụ ụmụnne ya a renyere Josef n’ịgba ohu. Ugbu a, n’amataghị onye ọ bụ, ha rịọrọ nwanne ha nwoke a, bụ́ onye ghọrọla onye na-elekọta ihe oriri n’Ijipt, ka o nyere ha aka. Josef agwaghị ha onye ọ bụ. Kama nke ahụ, o kpebiri ile ha ule. N’ụzọ dabara adaba, Josef chọrọ ịmara ma nchegharị ha ọ bụkwa nke ezigbo ya. Ọ chọkwara ịchọpụta ma ha hụrụ nwanne ha nwoke bụ́ Benjamin n’anya nakwa nna ha bụ́ Jekọb, bụ́ onye hụrụ Benjamin n’anya nke ukwuu. Ọ chọkwara ịma otú ha hụruru ha n’anya. Iji mee nke a, Josef gbalịrị imegharị ha anya.—Jenesis 41:55–44:3.

Josef nyere otu n’ime ndị na-ejere ya ozi iwu ka o kpojuo akpa ụmụnne ya n’ihe oriri, tinyeghachi ego onye nke ọ bụla n’ọnụ akpa ya, ma tinye iko ọlaọcha Josef n’ọnụ akpa Benjamin. N’ihe a nile, Josef nọ na-eme ka onye nlekọta nke obodo na-ekpere arụsị. Ebe ụmụnne ya na-amataghị ya, n’obi ha, ọ bụ onye nlekọta dị otú ahụ n’ezie, n’ihi na o mere omume ma kwuo okwu dị ka onye nlekọta dị otú ahụ.

Mgbe Josef na ụmụnne ya zutesịrị ihu na ihu, ọ gara n’ihu ịjụ ha n’ụzọ aghụghọ, sị: “Ùnu amaghị na nwoke nke dị ka m na-arịba ama n’ezie?” ( Jenesis 44:15) Ya mere, ihe àmà na-egosi na o ji iko ahụ mee ihe iji megharịa ha anya. N’ezie, Josef ejighị iko ahụ rịba ọdịnihu ama dịkwa nnọọ ka Benjamin na-ezughị ya ezu n’ezie.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ka ọ na-akọwa omume a a na-eme n’oge ochie, akwụkwọ bụ́ The Holy Bible, With an Explanatory and Critical Commentary, nke F. C. Cook dere, na-akọwa, sị: “A na-eme nke a site n’ịtụba ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ nkume ọ bụla dị oké ọnụ ahịa n’ime mmiri, mgbe ahụzi na-ele otú ha ga-adị n’ime mmiri ahụ; ma ọ bụkwanụ a pụrụ ime ya nanị site n’ile anya n’ime mmiri ahụ dị ka e si ele anya n’enyo.” Onye na-akọwa Bible bụ́ Christopher Wordsworth kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, a na agbanye mmiri n’iko, a na-enwetakwa azịza ya site n’ihe ndị dị inyoghi inyoghi bụ́ ndị na-apụta mgbe anwụ chakwasịrị mmiri ahụ a gbanyere n’iko.”