Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ego na Omume Ihe Anyị Na-amụta Site n’Ihe Ndị Mere Eme

Ego na Omume Ihe Anyị Na-amụta Site n’Ihe Ndị Mere Eme

Ego na Omume Ihe Anyị Na-amụta Site n’Ihe Ndị Mere Eme

N’APRIL 7, 1630, ihe dị ka narị mmadụ anọ nọ n’ụgbọ mmiri anọ, si England na-aga America. Ọtụtụ n’ime ha gụrụ ezigbo akwụkwọ. Ndị ọzọ bụ ndị ọchụnta ego bara ọgaranya. Ọbụna ụfọdụ n’ime ha so n’òtù ndị omeiwu. Ọnọdụ akụ̀ na ụba e nwere n’obodo ha n’oge ahụ dị njọ, Agha Afọ Iri Atọ nke a na-alụ na Europe n’oge ahụ (1618-1648) mekwara ka ọnọdụ ahụ ka njọ. Ya mere, n’amaghị ihe ha gaje izute n’ebe ha na-aga, ha hapụrụ ụlọ ha, ahịa ha, na ndị ikwu ha ije chọọ ebe ihe ga-adịtụrụ ha mfe.

Otú ọ dị, ìgwè a bụ́ ndị nwere olileanya na ihe ga-adịtụrụ ha mfe n’ebe ha na-aga, abụghị nnọọ ndị na-achọ ebe ha ga-erite uru ahịa ka ukwuu. Ha bụ ndị Puritan na-anụ ọkụ n’obi, bụ́ ndị na-agba ọsọ ndụ n’ihi mkpagbu a na-akpagbu ha n’ihi okpukpe ha. * Nzube ha bụ́ isi bụ ihiwe obodo ebe e nwere ndị na-atụ egwu Chineke, bụ́ ebe ha na ụmụ ha pụrụ ịba ọgaranya n’ụzọ na-emegideghị ụkpụrụ Bible. Oge na-adịghị anya ka ha rutesịrị Salem, Massachusetts, ha weere otu obere ala dị n’ụsọ oké osimiri. Ha kpọrọ obodo ọhụrụ ha Boston.

Ọ Dịghị Mfe Inwe Ego Ma Nwee Omume Ọma

John Winthrop, bụ́ onye ndú ha na gọvanọ ha, mere ihe nile o nwere ike ime iji kwalite mmụọ nke mmadụ ịba ọgaranya na iji ego ya enyere ndị ọzọ nọ n’ógbè ya aka. Ọ chọrọ ka ndị obodo ya nwee ma ego ma omume ọma. Ma nke a bịara sie ike omume. Mgbe ọ tụrụ anya na nke a ga-esi ike omume, ọ gwasiri ndị òtù ya okwu ike banyere uru ego na-aba n’ógbè ebe e nwere ndị na-atụ egwu Chineke.

Dị ka ndị ndú ndị ọzọ nke ndị Puritan kweere, Winthrop kweere na ọ dịghị njọ mmadụ ịchọ ịba ọgaranya. O kwuru na uru bụ́ isi ego na-aba bụ iji ya nyere ndị ọzọ aka. N’ihi ya, ka mmadụ na-abakwu ọgaranya otú ahụ ka ọ na-enwekwu ike inyere ndị ọzọ aka. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Patricia O’Toole kwuru, sị: “Ihe banyere akụ̀ na ụba bụ okwu a kpụ n’ọnụ n’etiti ndị Puritan. Akụ̀ na ụba bụ ma ngọzi Chineke ma ọnwụnwa siri ike nke pụrụ ime ka mmadụ dị mpako . . . nweekwa ike iduba mmadụ ná mmehie.”

Iji zere mmehie ndị akụ̀ na ụba na ndụ okomoko na-eduba mmadụ na ya, Winthrop gbara ndị obodo ya ume ka ha na-emeru ihe n’ókè ma na-egosipụta njide onwe onye. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, mgbalị ọ na-eme ịmanye ha ịdị na-atụ egwu Chineke na ịhụ ibe ha n’anya bịara sewere ya na ụfọdụ ndị obodo ya, bụ́ ndị na-achọ imere nke ha. Ha malitere ikwu okwu megide ihe ha lere anya dị ka ọ̀ bụ Winthrop iji anya ike na-etinye aka n’ihe na-agbasaghị ya. Ụfọdụ malitere ikwu ka e mee ntụli aka elu iji họpụta òtù ga-eso na-ekpebi otú a ga-esi na-achị obodo ha. Ndị ọzọ gosiri iwe ha site n’ịkwaga n’obodo dị ha nso bụ́ Connecticut ịga kpara afọ nke ha.

O’Toole na-ekwu, sị: “Ohere ịba ọgaranya, ọganihu, ọchịchị onye kwuo uche ya, bụcha ihe ndị dị mkpa ná ndụ ndị Puritan bi na Massachusetts. Ihe a nile mekwara ka ndị mmadụ nwee ọchịchọ imere nke ha kama ịchọ ọdịmma nke ndị ọzọ, bụ́ ihe Winthrop nọ na-agba mbọ ya.” Na 1649, Winthrop nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri isii na otu. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ tọgbọghị kọbọ ma nwụọ. Ọ bụ ezie na ógbè ahụ nke chọrọ itisa etisa etisaghị n’agbanyeghị ihe isi ike ndị ha nwere, ọchịchọ Winthrop emezughị n’oge ndụ ya.

A Nọgidere Na-achọ Ndụ Ka Mma

Ọ bụghị nanị John Winthrop chọrọ ka ndị mmadụ na-ebi ndụ ka mma. Kwa afọ, ọtụtụ narị puku mmadụ na-esi n’Africa, Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na Latin America, akwaga ebe ọzọ, na-atụ anya ibi ndụ ka mma. Ihe na-akpali ụfọdụ n’ime ha ịkwaga ebe ndị ọzọ bụ ọtụtụ narị akwụkwọ, nzukọ ọmụmụ ihe, na ógbè Intanet ndị a na-enwe kwa afọ bụ́ ndị na-egosi otú mmadụ pụrụ isi baa ọgaranya. N’ụzọ doro anya, ọtụtụ ndị ka na-adọga inwe ego, na-atụ anya ime otú ahụ n’etinyeghị aka n’omume ọjọọ.

N’ikwu nke bụ́ eziokwu, nke ahụ ekwebeghị omume. Ndị na-achọ ịba ọgaranya na-emebikarị ụkpụrụ ndị ha ji kpọrọ ihe, mgbe ụfọdụkwa, ha na-ajụ Chineke n’ihi ego. N’ihi ya, ị pụrụ ịjụ n’ụzọ ziri ezi, sị: “Mmadụ ọ̀ pụrụ ịbụ ezigbo Onye Kraịst ma bụrụkwa ọgaranya? À pụrụ inwe ụwa nke na-atụ egwu Chineke bụ́ ebe ndị mmadụ ga-aba ọgaranya n’ụzọ nkịtị na n’ụzọ ime mmụọ?” Bible na-aza ajụjụ ndị a, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụ ndị Protestant nọ na Chọọchị England, bụ́ ndị chọrọ ime ka chọọchị ha dị ọcha pụọ n’ihe ọ bụla metụtara Chọọchị Roman Katọlik, ka e nyere aha ahụ bụ́ ndị Puritan na narị afọ nke 16.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Ụgbọ mmiri: The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck; Winthrop: Brown Brothers