Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nehemaịa

AFỌ iri na abụọ agafeela kemgbe ndị Izrel mesịrị ihe ikpeazụ ahụ e dekọrọ n’akwụkwọ Bible bụ́ Ezra. Oge eruwela maka “mpụta nke okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jeruselem”—ihe omume nke na-aka akara mmalite nke izu iri asaa ahụ nke afọ bụ́ nke na-eduga ná mpụta nke Mezaịa ahụ. (Daniel 9:24-27) Akwụkwọ Nehemaịa bụ akụkọ ihe mere eme nke ndị Chineke, bụ́ nke gụnyere akụkọ banyere mwughachi nke mgbidi Jeruselem. Ọ kọrọ ihe omume ndị dị oké mkpa bụ́ ndị were afọ 12, site n’afọ 456 T.O.A. gafetụ afọ 443 T.O.A.

Ọ bụ Gọvanọ Nehemaịa dere akwụkwọ ahụ. Akwụkwọ ahụ kọrọ otú e si maliteghachi ife Jehova ezi ofufe mgbe ndị mmadụ tụkwasịrị Jehova Chineke obi kpamkpam ma jiri nnọọ obi ike mee ihe. O gosiri n’ụzọ doro anya otú Jehova si eduzi ihe iji hụ na nzube ya mezuru. Ọ bụkwa akụkọ banyere otu onye ndú dị ike ma nwee obi ike. Ezi ndị na-efe Jehova ofufe taa na-amụta ihe ndị bara uru site n’ozi dị n’akwụkwọ Nehemaịa, “n’ihi na okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.”—Ndị Hibru 4:12.

“E WEE RỤZUO MGBIDI AHỤ”

(Nehemaịa 1:1–6:19)

Nehemaịa nọ n’obí eze dị na Shushan, na-arụrụ Eze Ataksakses Longimanus ụdị ọrụ chọrọ onye a tụkwasịrị obi. Mgbe Nehemaịa nụrụ na ndị ya “nọ n’ọnọdụ ọjọọ na n’ịta ụta: e tipusikwara mgbidi Jeruselem, sureekwa ọnụ ụzọ ámá ya nile ọkụ,” o nyere ya nsogbu n’obi nke ukwuu. O kpesiri ekpere ike maka nduzi Chineke. (Nehemaịa 1:3, 4) Ka oge na-aga, eze chọpụtara na obi adịghị Nehemaịa mma, o nyekwara Nehemaịa ohere ịga Jeruselem.

Mgbe o ruru Jeruselem, Nehemaịa ji abalị gaa leruo mgbidi ahụ anya ma gwa ndị Juu atụmatụ ya iwughachi mgbidi ahụ. Ọrụ biiri ọkụ. A malitekwara imegide ọrụ ahụ. Otú ọ dị, site ná nduzi Nehemaịa, bụ́ nwoke nwere obi ike, “e wee rụzuo mgbidi ahụ.”—Nehemaịa 6:15.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:1; 2:1—Ọ̀ bụ otu ebe ka e si gụwa ‘afọ nke iri abụọ’ ndị ahụ e kwuru okwu ha n’amaokwu abụọ ndị a? Ee, afọ nke iri abụọ ahụ bụ afọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Ataksakses. Otú ọ dị, usoro ọgụgụ oge e ji mee ihe n’amaokwu ndị a dịrịta iche. Akụkọ ihe mere eme rụtụrụ afọ 475 T.O.A. aka dị ka afọ Ataksakses nọkwasịrị n’ocheeze. Ebe ọ bụ na ndị odeakwụkwọ Babilọn na-agụkarị afọ ndị eze Peshia malitere ịchị site na Naịsan (March/April) nke afọ ọchịchị ha malitere ruo na Naịsan nke afọ na-eso ya, afọ mbụ nke ọchịchị Ataksakses malitere na Naịsan nke afọ 474 T.O.A. N’ihi ya, afọ nke iri abụọ nke ọchịchị ahụ a kpọtụrụ aha na Nehemaịa 2:1 malitere na Naịsan nke afọ 455 T.O.A. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na ọnwa Kislev ahụ (November/December) a kpọtụrụ aha na Nehemaịa 1:1 bụ ọnwa Kislev nke afọ bu ụzọ—afọ 456 T.O.A. Nehemaịa kwuru na ọnwa ahụ dabakwara n’afọ nke iri abụọ nke ọchịchị Ataksakses. Ikekwe n’ebe a, o si n’oge eze ahụ nọkwasịrị n’ocheeze gụwa afọ ahụ. Ọ pụkwara ịbụ na Nehemaịa gụwara ya site n’afọ ndị Juu nke oge a na-akpọ afọ nkịtị, bụ́ nke malitere n’ọnwa Tishri, nke bụ́ September/October. Nke ọ bụla ọ bụ, afọ ahụ e kwuru ka a gaa wughachi Jeruselem bụ afọ 455 T.O.A.

4:17, 18—Olee otú mmadụ ga-esi jiri nanị otu aka na-ewughachi mgbidi? Nke a agaghị abụrụ ndị na-ebu ibu arọ nsogbu. Ozugbo ha tụkwasịrị ibu ha n’isi ma ọ bụ n’ubu ha, ọ pụrụ ịdịrị ha mfe iji otu aka jide ya ma jiri ‘aka ha nke ọzọ jide ihe agha ha.’ Ndị kwesịrị iji aka abụọ arụ ọrụ n’etiti ndị ọrụ ahụ, ‘kere nwoke ọ bụla mma agha ya n’úkwù ya, ha wee na-arụ mgbidi ahụ.’ Ha dị njikere ịlụ ọgụ ma ọ bụrụ na ndị iro ha abịa ịlụso ha ọgụ.

5:7—N’echiche dị aṅaa ka Nehemaịa ‘sooro ndị a maara aha ha na ndị nọchiri anya eze see okwu’? Ndị a na-anara ọmụrụ nwa n’aka ndị Juu ibe ha n’ihi ego ha binyere ha, bụ́ ihe megidere Iwu Mozis. (Levitikọs 25:36; Deuterọnọmi 23:19) Tụkwasị na nke ahụ, ọmụrụ nwa ndị ha na-ana karịrị akarị. Ọ bụrụ na ha na-ana ọmụrụ nwa ahụ kwa ọnwa, ‘otu ụzọ n’ime ụzọ otu narị’ ga-abụ ịkwụ pasent 12 nke ego ahụ ha gbazinyere ndị Izrel ibe ha n’otu afọ. (Nehemaịa 5:11) Ọ bụ omume obi ọjọọ ịmanye ndị na-akwụ nnukwu ụtụ isi na ndị nọ n’ụkọ nri ịkwụ ọmụrụ nwa hà otú ahụ. Nehemaịa na ndị ọgaranya sere okwu n’echiche bụ́ na o ji Iwu Chineke tụọ ha mmehie ha n’anya ma baara ha mba, si otú ahụ gbaa ajọ omume ha n’anwụ.

6:5—Ebe ọ bụ na a na-etinyekarịrị mmadụ akwụkwọ ozi ya nke onye ọzọ na-ekwesịghị ịgụ n’ime akpa e mechiri emechi, gịnị mere Sanbalat ji zigara Nehemaịa “akwụkwọ ozi e megheworo emeghe”? Ọ pụrụ ịbụ na Sanbalat zubere ime ka ndị ọzọ mara banyere ebubo ụgha ahụ ọ na-ebo Nehemaịa site n’izite akwụkwọ ozi ahụ n’emechighị ya emechi. Ikekwe o chere na nke a ga-akpasu Nehemaịa iwe nke na ọ ga-ahapụ ọrụ ihe owuwu ahụ ma bịa zara ọnụ ya. Ma ọ bụkwanụ Sanbalat pụrụ iche na ihe dị n’akwụkwọ ozi ahụ pụrụ ịkụda ndị Juu ahụ mmụọ nke na ha ga-akwụsị ọrụ ahụ kpamkpam. Nehemaịa ekweghị ka nke a kụda ya mmụọ, o jikwara nwayọọ rụrụ ọrụ Chineke nyere ya gaa n’ihu.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:4; 2:4; 4:4, 5. Mgbe anyị zutere ọnọdụ ndị tara akpụ ma ọ bụ mgbe anyị na-eme mkpebi ndị dị oké mkpa, anyị kwesịrị ‘ịnọgidesi ike n’ekpere’ ma na-eme ihe kwekọrọ ná ntụziaka anyị na-enweta n’Okwu Chineke ma ọ bụ ná nzukọ ya.—Ndị Rom 12:12.

1:11–2:8; 4:4, 5, 15, 16; 6:16. Jehova na-aza ekpere nke ndị ohu ya ji ezi obi kpee.—Abụ Ọma 86:6, 7.

1:4; 4:19, 20; 6:3, 15. Ọ bụ ezie na Nehemaịa bụ nwoke nwere ọmịiko, o setịpụrụ ezi ihe nlereanya dị ka nwoke bụ́ ekwu eme nke na-adịghị ala azụ ime ihe ziri ezi.

1:11–2:3. Isi ihe na-ewetara Nehemaịa ọṅụ abụghị ọkwá ya dị ka obu ihe ọṅụṅụ eze. Ọ bụ ọganihu e nwere n’ezi ofufe. Ọ̀ bụ na ofufe Jehova na ihe ọ bụla na-eme ka ọ na-aga n’ihu ekwesịghị ịbụ isi ihe na-echegbu anyị na ihe bụ́ isi na-ewetara anyị ọṅụ?

2:4-8. Jehova mere ka Ataksakses kwe ka Nehemaịa gaa wughachi mgbidi Jeruselem. Ilu 21:1 na-ekwu, sị: “Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ n’aka Jehova: n’ebe ọ bụla nke na-atọ Ya ụtọ ka Ọ na-ewezụga ya.”

3:5, 27. Anyị ekwesịghị iwere ọrụ ọkpụkpụ aka ndị a na-arụ iji kwalite ezi ofufe dị ka ihe anyị toferela ịrụ, dị ka “ndị dị ebube” n’etiti ndị Tekoa mere. Kama nke ahụ, anyị pụrụ iṅomi ndị nkịtị n’etiti ndị Tekoa bụ́ ndị ji ọchịchọ obi ha dum rụọ ọrụ ahụ.

3:10, 23, 28-30. Ọ bụ ezie na ụfọdụ nwere ike ịkwaga ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze, ọtụtụ n’ime anyị na-akwado ezi ofufe n’ebe dị anyị nso. Anyị pụrụ ime nke a site n’iso na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na inyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. Ma ụzọ bụ́ isi anyị si akwado ezi ofufe bụ iso na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ.

4:14. Mgbe anyị chere mmegide ihu, anyị pụkwara imeri ụjọ site n’icheta onye ahụ “Nke dị ukwuu dịkwa egwu.”

5:14-19. Gọvanọ Nehemaịa bụụrụ Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta ihe nlereanya magburu onwe ya n’ihe banyere ịdị umeala n’obi, achọghị ọdịmma onwe onye nanị, nakwa iji akọ eme ihe. N’agbanyeghị na o ji ịnụ ọkụ n’obi hụ na e mere Iwu Chineke, ọ bụghị onye ọchịchị aka ike nke na-achọ uru onwe ya. Kama nke ahụ, o gosiri mmetụta n’ebe ndị a na-emegbu emegbu na ndị ogbenye nọ. Nehemaịa setịpụụrụ ndị ohu Chineke nile ihe nlereanya magburu onwe ya n’ihe banyere imesapụ aka.

“CHINEKE M, CHETA M, IMERE M EZI IHE”

(Nehemaịa 7:1–13:31)

Ozugbo e wusịrị mgbidi Jeruselem, Nehemaịa rụnyere ọnụ ụzọ ámá ma mee ndokwa ịhụ na e chebere obodo ahụ. O dekọrọ osuso ọmụmụ nke ndị Juu. Ka mmadụ nile gbakọtara ‘n’ámá nke dị n’ihu ọnụ ụzọ ámá mmiri,’ onye nchụàjà bụ́ Ezra gụpụtara akwụkwọ Iwu Mozis, Nehemaịa na ụmụ Livaị akọwakwaara ndị Izrel Iwu ahụ. (Nehemaịa 8:1) Mgbe ha matara ihe banyere Ememe Ụlọ Ntu, o mere ka ha jiri ọṅụ na-eme ya.

Ha gbakọtara ọzọ, na nke ugbu a “mkpụrụ Izrel” kwupụtara mmehie ndị ha mere n’ozuzu, ụmụ Livaị echetara ha otú Chineke si mesoo Izrel, ha wee ṅụọ iyi “ijegharị n’iwu Chineke.” (Nehemaịa 9:1, 2; 10:29) Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ mmadụ bi na Jeruselem ka dị obere, e fere nzà iji mee ka otu onye n’ime mmadụ iri ọ bụla bi n’obodo ndị ọzọ kwabata na Jeruselem. Ha jikwara ọṅụ rara mgbidi ahụ nye Jehova nke mere na ‘a nụrụ ọṅụ Jeruselem ruo ebe dị anya.’ (Nehemaịa 12:43) Mgbe afọ iri na abụọ gasịrị kemgbe ọ lọtara Jeruselem, Nehemaịa hapụrụ Jeruselem ma laghachi n’ọrụ ọ na-arụrụ Ataksakses. N’oge na-adịghị anya, ndị Juu ji nke nta nke nta malite itinye aka n’omume na-adịghị ọcha. Mgbe ọ lọghachiri Jeruselem, Nehemaịa ji obi ike mee ihe iji mezie ọnọdụ ahụ. O ji obi umeala rịọrọ onwe ya arịrịọ, sị: “Chineke m, cheta m, imere m ezi ihe.”—Nehemaịa 13:31.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

7:6-67—N’ihi gịnị ka ọnụ ọgụgụ ndị Nehemaịa depụtara bụ́ ndị sooro Zerubabel laghachi Jeruselem ji dị iche na nke Ezra dere ma a bịa n’ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ụfọdụ? (Ezra 2:1-65) Ọ pụrụ ịbụ na ihe mere ọnụ ọgụgụ ndị a ji dịrịta iche bụ n’ihi na ọ bụghị otu ebe ka Ezra na Nehemaịa si nweta ihe ha dere. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na ọnụ ọgụgụ ndị dere aha na ha ga-eso alọghachi dị iche n’ọnụ ọgụgụ ndị lọghachirinụ. Ọ pụkwara ịbụ na ihe mere ihe ndekọ abụọ ahụ ji dị iche bụ n’ihi na ụfọdụ ndị Juu, bụ́ ndị na-enweghị ike ịkọwa osuso ọmụmụ ha ná mmalite mesịrị mee nke ahụ n’ikpeazụ. Otú ọ dị, ihe ndekọ abụọ ahụ kwekọrịtara n’otu ihe: ọnụ ọgụgụ ndị mbụ lọghachirinụ dị puku mmadụ iri anọ na abụọ na narị atọ na iri isii n’agụnyeghị ndị ohu na ndị ọbụ abụ.

10:34—Gịnị mere e ji gwa ndị Izrel ka ha na-eweta nkụ? N’Iwu Mozis, e nyeghị iwu ka a na-eweta nkụ. Ọ bụ n’ihi mkpa e nwere mere e ji chọọ nke a. A chọrọ nnukwu nkụ iji suree àjà ndị a chụrụ n’elu ebe ịchụàjà n’ọkụ. Eleghị anya, e nweghị ndị Netinim zuru ezu, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ohu ụlọ nsọ, ndị na-abụghị ndị Izrel. N’ihi ya, a na-efe nza iji hụ na a na-enwe nkụ mgbe nile.

13:6—Ogologo oge ha aṅaa ka Nehemaịa na-anọghị na Jeruselem? Nanị ihe Bible kwuru bụ na “n’ọgwụgwụ ụbọchị ụfọdụ,” Nehemaịa rịọrọ ka eze kwe ka ya hapụ ọrụ ya ma laghachi Jeruselem. N’ihi ya, ọ gaghị ekwe omume ịma ogologo oge ọ na-anọghị na Jeruselem. Otú ọ dị, mgbe Nehemaịa rutere Jeruselem, ọ chọpụtara na ndị Izrel adịghị akwado òtù ndị nchụàjà, ọ dịghịkwa onye na-edebe Ụbọchị Izu Ike. Ọtụtụ n’ime ha alụrụwo ụmụ nwanyị ala ọzọ, ụmụ ha kwa adịghịdị asụ asụsụ ndị Juu. Ọ ghaghị ịbụ na ọ dịwo anya Nehemaịa hapụrụ Jeruselem nke mere ọnọdụ jiri jọruo njọ otú ahụ.

13:25, 28—Tụkwasị ‘n’iso ndị Juu a gbahapụrụ ezi ofufe see okwu,’ olee ihe ndị ọzọ Nehemaịa mere iji dozie ọnọdụ ahụ? Nehemaịa ‘kọchara ha’ n’echiche bụ́ na ọ gụpụtaghachiiri ha okwu ikpe ọmụma ndị dị n’akwụkwọ Iwu Chineke. O ‘tiri ụfọdụ n’ime ha aka,’ ikekwe site n’ikwu ka a maa ha ikpe. Iji gosi iwe ji ya n’ihi omume ọjọọ ha, o ‘kwopụrụ agịrị isi ha.’ Ọ chụpụrụ nwa nwa Elaịashib bụ́ nnukwu onye nchụàjà, nke lụrụ nwa nwanyị Sanbalat bụ́ onye Horonaim na Jeruselem.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

8:8. Dị ka ndị na-akụzi Okwu Chineke, anyị ‘na-eme ka a mata isi ihe anyị na-agụ’ site n’ịkpọpụta okwu n’ụzọ doro anya na imesi okwu ndị kwesịrị ekwesị ike nakwa site n’ịkọwa Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ ziri ezi, na-eme ka ihe ha pụtara doo anya.

8:10. “Ọṅụ Jehova” na-abịa site na mmadụ ịmara na ọ dị mkpa ka ya na Chineke nwee mmekọrịta chiri anya na ime ihe iji zụlite mmekọrịta dị otú ahụ. Ọ na-abịakwa site n’ịgbaso nduzi a na-enye ná nzukọ Chineke. Lee ka o si dị oké mkpa na anyị ga-eji ịdị uchu na-amụ Bible, na-agachi nzukọ Ndị Kraịst anya ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ!

11:2. Mmadụ ịhapụ ihe nketa ya ma kwaba na Jeruselem ga-efu onye ahụ ihe dị ukwuu, wetakwara ya ihe isi ike ndị ọzọ. Ndị wepụtara onwe ha ime nke a gosipụtara mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Anyị onwe anyị pụrụ igosipụta mmụọ dị otú ahụ site n’iwepụta onwe anyị iji jeere ndị ọzọ ozi ná mgbakọ na n’oge ndị ọzọ mgbe ohere dị otú ahụ dapụtara.

12:31, 38, 40-42. Ịbụ abụ bụ ụzọ dị mma isi too Jehova ma gosipụta ekele anyị nwere n’ebe ọ nọ. Anyị kwesịrị iji obi anyị dum bụọ abụ ná nnọkọ Ndị Kraịst.

13:4-31. Anyị aghaghị ịkpachara anya iji ghara iji nke nta nke nta malite ịhụ ihe onwunwe n’anya, malite ịkpa àgwà na-ezighị ezi, ma ọ bụ si n’ezi ofufe pụọ.

13:22. Nehemaịa maara nke ọma na ya ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke. Anyị kwesịkwara iburu n’uche na anyị ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova.

Inweta Nkwado Jehova Dị Oké Mkpa!

Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” (Abụ Ọma 127:1) Lee ka akwụkwọ Nehemaịa si gosipụta na okwu ndị a bụ eziokwu!

Ihe mmụta dị n’akwụkwọ Nehemaịa doro nnọọ anya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ihe ịga nke ọma n’ihe ọ bụla anyị na-eme, ihe ndị anyị na-eme aghaghị ịbụ ihe ndị kwekọrọ n’uche Jehova. Ànyị pụrụ n’ezie ịtụ anya ka Jehova gọzie anyị ma ọ bụrụ na anyị adịghị ebute ezi ofufe ụzọ ná ndụ anyị? Dị ka Nehemaịa, ka anyị mee ka ofufe Jehova na ọganihu nke ofufe ya bụrụ isi ihe na-echegbu anyị.

[Foto dị na peeji nke 8]

“Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ n’aka Jehova”

[Foto dị na peeji nke 9]

Nehemaịa—nwoke bụ́ ekwu eme, nke nwere ọmịiko—abịarute Jeruselem

[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

Ị̀ maara ụzọ isi ‘mee ka a mata isi’ ihe dị n’Okwu Chineke?