Jehova Nyeere M Aka Ịchọta Ya
Akụkọ Ndụ
Jehova Nyeere M Aka Ịchọta Ya
DỊ KA FLORENCE CLARK SI KỌỌ
Ejidere m aka di m nke nọ n’ọnụ ọnwụ aka. Dị ka onye Anglịkan, ekpegaara m Chineke ekpere na-arịọ ya ka o mee ka di m gbakee. Ekwekwara m nkwa na ọ bụrụ na di m anwụghị, m ga-achọ Chineke ruo mgbe m chọtara ya. M chọta ya, m ga-abụ nke ya.
ANA m azabu Florence Chulung, a mụrụ m na September 18, 1937, n’ógbè Aborigine bụ́ Oombulgurri. Oombulgurri dị na Kimberley Plateau, bụ́ obodo dị n’ime ime Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia.
E nwere ọtụtụ ihe mere mgbe m dị obere bụ́ ndị na-enye m obi ụtọ mgbe ọ bụla m chetara ha. N’oge ahụ, ọ dịbeghị ihe ndị m na-echegburu m onwe m banyere ha. Amụtara m isi ihe ole na ole banyere Chineke na Bible site na chọọchị, ma ọ bụ mama m bụ onye kụziiri m ụkpụrụ Ndị Kraịst. Ọ na-agụrụ m Bible mgbe nile, abịakwara m nwee mmasị ịmụta ihe banyere Chineke site ná nwata. Enwere m mmasị n’ebe nwanne nwanyị mama m nọ, onye bụ́ onye ozi ala ọzọ nke chọọchị ya. N’obi m, achọrọ m ịgbaso nzọụkwụ ya.
Ụlọ akwụkwọ e nwere n’obodo anyị, nke a na-akpọbu Forrest River Mission, bụ site n’elementrị nke mbụ ruo na nke ise. M na-anọ nanị awa abụọ n’ụlọ akwụkwọ kwa ụtụtụ. Nke a mere ka m ghara ịgụcha akwụkwọ nke ọma, bụ́ ihe na-enye papa m nsogbu n’obi. Ọ chọrọ ka ụmụ ya gụọ akwụkwọ nke ọma, n’ihi ya, o kpebiri ịkpọrọ ezinụlọ ya si n’Oombulgurri kwaga n’obodo Wyndham. Obi adịghị mụ nnọọ mma n’ụbọchị anyị kwapụrụ, ma mgbe anyị ruru Wyndham, amalitere m ịga akwụkwọ n’ụzọ zuru ezu
ruo afọ anọ, site na 1949 ruo 1952. Obi dị m ụtọ na papa m mere ka m gaa akwụkwọ.Mama m na-arụrụ otu dọkịta nọ n’ógbè anyị ọrụ, mgbe m gụsịrị akwụkwọ, bụ́ mgbe m dị afọ iri na ise, onye dọkịta ahụ were m n’ọrụ dị ka nọọsụ n’ụlọ ọgwụ dị na Wyndham. Eji m obi ụtọ nakwere ọrụ ahụ n’ihi na ọ na-esi ike ịchọta ọrụ n’oge ahụ.
Afọ ole na ole ka e mesịrị, amatara m Alec, bụ́ onye ọcha nke na-azụ anụ. Anyị lụrụ na 1964 n’obodo Derby, bụ́ ebe m nọ na-agachi Chọọchị Anglịkan anya. Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ m. Agwara m ha na mụ enwetụghị mmasị n’ozi ọma ha ma gwa ha ka ha ghara ịbịa ọzọ. Otú ọ dị, e nwere ihe ha kwuru nke dọọrọ mmasị m—ha sịrị na ezigbo aha Chineke bụ Jehova.
“Ị́ Gaghị Ekpeli Ekpere n’Onwe Gị?”
Na 1965 ihe malitere isiri m nnọọ ike. Di m nwere nnukwu ihe ọghọm ugboro atọ. Abụọ ka o ji ịnyịnya ya nwee ma jiri ụgbọala ya nwee otu. Obi dị m ụtọ na ọ gbakere ma maliteghachi ọrụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya ka nke a gasịrị, o ji ịnyịnya ya nwee ihe ọghọm ọzọ. Na nke ugbu a, o merụrụ ezigbo ahụ́ n’isi. Mgbe m rutere n’ụlọ ọgwụ, dọkịta nọ n’ebe ahụ gwara m na di m na-aga ịnwụ. Obi mapụrụ m. Otu nọọsụ gwara otu ụkọchukwu ka ọ bịa hụ m, ma ụkọchukwu ahụ kwuru, sị: “M gaghị ahụ ya ugbu a. M ga-abịa echi!”
Achọrọ m ka ụkọchukwu ahụ nọrọ m n’akụkụ ma kpeere m ekpere, agwakwara m onye nọn banyere nke a. O kwuru, sị: “Gịnịdị na-eme gị? Ị́ gaghị ekpeli ekpere n’onwe gị?” N’ihi nke a, amalitere m ikpegara ihe oyiyi ndị dị na chọọchị anyị ekpere maka enyemaka—ma nke ahụ enweghị isi. Di m nọ na-anwụ n’ike n’ike. M nọ na-eche, sị, ‘Olee ihe m ga-eme ma di m nwụnahụ m?’ Ụmụ m atọ—Christine, Nanette, na Geoffrey—na-echekwa m uche. Olee otú ụwa ga-adị ha ma ọ bụrụ na nna ha anwụọ? Obi dị m ụtọ mgbe di m nwetara onwe ya mgbe ụbọchị atọ gasịrị. O sikwa n’ụlọ ọgwụ lọta na December 6, 1966.
Ọ bụ ezie na di m mesịrị gbakee nke ọma, ma ọ bịara nwee nsogbu n’ụbụrụ. Ọ na-echefukarị ihe, ọ naghịkwa ara ya ahụ́ ịkụwa mmadụ ihe. Otu minit obi na-adị ya mma, na minit nke ọzọ, iwe ejide ya. Ọ na-esiri ya ike idi ihe ụmụaka na-eme, ọ na-akụkwa ha ihe ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe ka ndị toworo eto. Ilekọta ya abụghị obere ọrụ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na m na-emere ya ihe nile. Ọbụna m kụziiri ya ọzọ otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe. Ilekọta ya na ịrụ ọrụ ndị dịịrị m n’ụlọ kpara m aka ọjọọ n’ahụ́. Ọ kpatakwaara m uche mkpasasị. Mgbe afọ asaa gasịrị ka di m nwesịrị ihe ọghọm ahụ, anyị kwekọrịtara ikewa ruo oge ụfọdụ iji nye m ohere ịgbake.
Akpọọrọ m ụmụ anyị kwaga n’obodo Perth nke dị n’ebe ndịda. Tupu anyị akwaga n’ebe ahụ, nwanne m nwanyị amalitelarị iso Ndịàmà Jehova nọ na Kununurra, bụ́ ntakịrị obodo dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia, na-amụ Bible. O gosiri m otu ihe osise dị n’akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, * bụ́ nke na-egosi nkwa dị na Bible banyere paradaịs elu ala. O si n’akwụkwọ a gosi m na Chineke nwere aha, nke bụ́ Jehova, nke a masịkwara m. Ebe ọ bụ na ọ dịtụbeghị mgbe a gwara m ihe ndị dị otú a na chọọchị m, ekpebiri m ịkpọ Ndịàmà Jehova na fon ozugbo m ruru Perth.
Otú ọ dị, obi akachaghị m ịkpọtụrụ ha. Ka a na-ekwu, a kụrụ mgbịrịgba ọnụ ụzọ n’otu uhuruchi. Nwa m nwoke gara n’ọnụ ụzọ ahụ ma gbaghachi azụ ọsọ ọsọ gwa m, sị, “Mama, ndị ahụ ị sị na ị ga-akpọ na fon abịala.” Nke ahụ tụtụrụ m n’anya, agwara m ya, sị, “Gwa ha na mụ anọghị ya!” Ma ọ zara, sị, “Mama ị ma na ekwesịghị m ịgha ụgha.” Mgbe nwa m chetaara m nke a, m gara meghee ụzọ. Mgbe m kelesịrị ndị ọbịa ahụ, achọpụtara m na ha nwetụrụ ihe iju anya.
Ha bịara ịhụ onye ọzọ, bụ́ onye kwapụworonụ. Akpọbatara m ha n’ime ụlọ ma were ajụjụ saa ha ahụ́, ha jikwa Bible zaa ajụjụ ndị ahụ n’ụzọ na-eju afọ.N’izu sochirinụ, amalitere m iso Ndịàmà ahụ na-amụchi Bible anya site n’akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Ọmụmụ ihe ahụ mere ka m nweghachi mmasị ịmụta banyere Chineke. Mgbe izu abụọ gasịrị, agara m Ncheta nke Ọnwụ Jizọs Kraịst. Amalitere m ịga ọmụmụ ihe kwa Sunday, n’oge na-adịghịkwa anya, amalitere m ịga nke etiti izu. Amalitekwara m ịkọrọ ndị ọzọ ihe m na-amụta. Achọpụtara m na inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu Bible mere ka uche mkpasasị na nkụda mmụọ m nwere na-adị mma. Mgbe ọnwa isii gasịrị, e mere m baptizim ná mgbakọ distrikti e nwere na Perth.
Ka m na-enwe ọganihu ime mmụọ, abịara m ghọta na Jehova na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka ihe dị nsọ, ghọtakwa ụkpụrụ Bible dị na 1 Ndị Kọrint 7:13, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Nwanyị nke nwekwara di na-ekweghị ekwe, nwoke ahụ ekwetakwa ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ di ya.” Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a kpaliri m ịlaghachikwuru Alec.
Ịlaghachi Derby
Alaghachiri m Derby na June 21, 1979, ka m hapụsịworo di m ruo ihe karịrị afọ ise. N’ezie, obi akachaghị m, m nọkwa na-eche ihe ọ ga-eme ma m lọghachi. N’ụzọ tụrụ m n’anya, obi dị ya ụtọ na m lọghachiri, ma ọ masịchaghị ya na mụ aghọọla otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ tụrụ aro ozugbo ka m gawa chọọchị ya, bụ́ nke m na-agabu tupu mụ ahapụ Perth. Akọwaara m ya na mụ apụghị ime otú ahụ. Agbalịsiri m ike ịkwanyere ya ùgwù dị ka onyeisi ezinụlọ ma mee ihe nile m pụrụ ime dị ka a chọrọ n’aka nwunye bụ́ Onye Kraịst. Agbalịrị m ịkọrọ ya banyere Jehova na nkwa ndị dị ebube O kwere maka ọdịnihu, ma o gosighị mmasị.
Otú ọ dị, ka oge na-aga, ọ bụghị nanị na Alec nabatara ụzọ ndụ ọhụrụ m kamakwa, ọ malitere inye m ego m ji na-aga mgbakọ dị iche iche nakwa nzukọ ndị a na-enwe kwa izu. Obi dị m ụtọ nke ukwuu mgbe ọ zụtara ụgbọala—bụ́ ihe dị oké mkpa n’ógbè a dị n’ime ime Australia—ka m jiri ya na-aga ozi ọma. Ọtụtụ mgbe, ụmụnna anyị, tinyere onye nlekọta sekit, nọrọ n’ụlọ anyị ruo ọtụtụ ụbọchị. Nke a mere ka Alec mata ọtụtụ Ndịàmà, o yikwara ka mkpakọrịta ha na ya ọ̀ na-amasị ya.
Ọ Dị M Ka M Bụ Ezikiel
Ọbịbịa ụmụnna anyị na-abịa na-atọ m ụtọ, ma enwekwara m otu ihe ịma aka. Ọ bụ nanị m bụ Onyeàmà e nwere na Derby. Ọgbakọ kasị nso dị na Broome, bụ́ nke dị narị kilomita abụọ na iri abụọ site na Derby. N’ihi ya, ekpebiri m ime ihe nile m nwere ike ime iji gbasaa ozi ọma ahụ. Site n’enyemaka Jehova, abịara m mee ka ndụ m kpakọọ ọnụ ma malite ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọrụ a siiri m nnọọ ike, ma m nọgidere na-echetara onwe m ihe Pọl onyeozi kwuru: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
Obi adịghị ụkọchukwu e nwere n’ógbè anyị mma n’ihi ọrụ m na-arụ, karịsịa n’ihi na m na-agbara ndị Aborigine ibe anyị àmà. Ha nwara imenye m ụjọ ma kwụsị m ikwusa ozi ọma. Mmegide ha na-emegide m mere ka m kpebisikwuo ike ịnọgide na-eme ihe m na-eme, ekpekukwara m Jehova ekpere mgbe mgbe ka o nyere m aka. M na-echetakarị okwu na-agba ume nke a gwara Ezikiel: “Lee, emewo m ihu gị ka ọ dị ike megide ihu ha, ọ bụkwa egedege ihu gị ka m meworo ka Ezikiel 3:8, 9.
ọ dị ike megide egedege ihu ha. Dị ka nkume adamant nke dị ike karị ọmụ, otú a ka m meworo egedege ihu gị: atụla egwu ha, atụkwala ụjọ ihu ha.”—Ọtụtụ mgbe, ụmụ nwoke abụọ sitere na chọọchị bịakwutere m mgbe m na-azụ ihe. Ha ji oké olu na-akwa m emo, na-achọ ka ndị ọzọ na-azụ ihe tụgharịa lewe anyị. Eleghaara m ha anya. N’otu oge, mgbe m na-eleta otu onye nwere mmasị, onye ụkọchukwu nke si na chọọchị e nwere n’ógbè anyị bịakwutere m ma kwuo na mụ ekweghị na Jizọs. Ọ naara m Bible m, fegharịa ya n’ihu m, ma tụnyeghachi ya n’aka m. M legidere ya anya n’ihu ma jiri nwayọọ hotara ya ihe e dere na Jọn 3:16 n’atụghị ya egwu, meekwa ka ọ ghọta na m nwere okwukwe na Jizọs. Otú m si jiri obi ike zaghachi ya riri ya ọnụ, ọ pụkwara n’ekwughị ihe ọ bụla ọzọ.
Ọ na-amasị m ikwusara ndị Aborigine nọ na Derby ozi ọma. Otu onye ụkọchukwu e nwere n’ógbè anyị gbalịrị igbochi m ịgakwuru ndị nọ n’otu ime obodo, ma a kpọfere ya ebe ọzọ. N’ihi ya, agara m zisaara ndị bi n’obodo ahụ ozi Bible. Achọrọ m ịbụ onye ozi ala ọzọ dị ka nwanne mama m, ugbu a kwa, m nọ na-arụ ọrụ yiri nke ndị ozi ala ọzọ, na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta Okwu Chineke. Ọtụtụ n’ime ndị Aborigine nabatara ozi ọma m na-ezisa, amalitekwara m iduziri ọtụtụ ndị ọmụmụ Bible.
Ịghọta Mkpa Ọ Dị Ijere Jehova Ozi
Ruo afọ ise, nanị m bụ Onyeàmà Jehova nọ na Derby. O siiri m ike ịnọgide jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’enwetaghị agbamume m kwesịrị inweta site n’iso ndị mụ na ha na-efekọ ofufe na-agachi nzukọ anya. N’otu oge, obi adịchaghị m mma, m wee buru ụgbọala pụọ gaa ịgbagharịtụ. Mgbe m lọghachiri n’uhuruchi, otu nwanna nwanyị na
ụmụ ya asaa nọ na-eche m. Ha si n’ọgbakọ dị na Broome, nke dị ọtụtụ kilomita site na Derby buteere m akwụkwọ. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, nwanna nwanyị a, bụ́ Betty Butterfield, mere ndokwa ịdị na-abịa Derby otu ugboro kwa ọnwa ma nọnyere m ná ngwụsị izu. Anyị abụọ na-ejekọ ozi ọnụ ma na-amụkọ Ụlọ Nche ọnụ n’ụlọ m. M na-agakwa Broome otu ugboro kwa ọnwa.Ụmụnna ndị bi na Broome nyeere m aka nke ukwuu, mgbe mgbe kwa, ha na-esi na Broome nke dị ezigbo anya abịa Derby inyere m aka n’ozi ubi. Ha gwara ụmụnna ọ bụla ga-esi na Derby agafe mgbe ha na-aga obodo ọzọ ka ha gbalịa lee otú m na-eme ma soro m jee ozi. Ndị a si Derby na-agafe na-ewetakwara m kaseti ndị okwu ihu ọha dị n’ime ha. Ụfọdụ na-eso m amụ Ụlọ Nche. Nleta ndị a na-adịghị adịte aka gbara m ume n’ezie.
Inwetakwu Enyemaka
Ruo afọ ụfọdụ, enwetakwuru m enyemaka mgbe Arthur na Mary Willis, bụ́ di na nwunye lara ezumike nká ndị si ná ndịda Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia, bịara nyere m aka ruo ọnwa atọ n’oge oyi. Nwanna Willis duziri ihe ka ukwuu ná nzukọ ndị anyị nwere ma duzie ozi ubi anyị gara. Mụ na ha gara n’ógbè ndị dị n’ime ime Kimberley Plateau, na-aga n’ebe ndị a na-azụ ehi n’ógbè ndị a dịbara n’ime. Mgbe ọ bụla Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Willis lara, ọ na-adị m ka nnukwu ihe o funahụwo m.
N’ikpeazụ, ka ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ 1983, anatara m ozi na-enye obi ụtọ nke bụ́ na e nwere ezinụlọ—Danny na Denise Sturgeon na ụmụ ha nwoke anọ—na-abịa ibi na Derby. Mgbe ha rutere, anyị malitere inwe nzukọ kwa izu ma na-eso agakọ ozi ubi. Na 2001, e hiwere otu ọgbakọ. Taa, na Derby, e nwere otu ọgbakọ nke na-eme nke ọma bụ́ nke nwere ndị nkwusa iri abụọ na anọ na ndị okenye abụọ na otu ohu na-eje ozi, bụ́ ndị na-elekọta anyị n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-enwe ihe ruru mmadụ iri atọ na-abịa nzukọ anyị.
Mgbe m chere echiche laa azụ, ọ na-enye m obi ụtọ ịhụ otú Jehova si nyere m aka ijere ya ozi. Ọ bụ ezie na di m aghọbeghị Onyeàmà Jehova, ọ nọgidere na-akwado m n’ụzọ ndị ọzọ. Mmadụ ise n’ime ezinụlọ m aghọọla Ndịàmà e mere baptizim—ụmụ m nwanyị abụọ, ụmụ ụmụ m abụọ ndị bụ́cha ndị nwanyị na nwa nwanyị nke nwanne m nwanyị. Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ ndị ikwu m sokwa ndị Jehova na-amụ Bible.
Enwere m ekele n’ezie na Jehova nyeere m aka ịchọta ya. Ekpebisiri m ike ịbụ nke ya ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 65:2.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 14 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, ma a dịghịzi ebipụta ya.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 15]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
AUSTRALIA
Wyndham
Kimberley Plateau
Derby
Broome
Perth
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Anụ kangaroo na nnụnụ lyre: Lydekker; koala: Meyers
[Foto dị na peeji nke 14]
N’oge m na-arụ ọrụ dị ka nọọsụ n’ụlọ ọgwụ dị na Wyndham na 1953
[Foto dị na peeji nke 15]
Ọgbakọ dị na Derby, na 2005