Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchịkọta Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ihe Ndị Dị n’Ụwa

Ịchịkọta Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ihe Ndị Dị n’Ụwa

Ịchịkọta Ihe Ndị Dị n’Eluigwe na Ihe Ndị Dị n’Ụwa

“Ihe nzuzo a bụ dị ka ihe dị ya ụtọ si dị . . . ịchịkọtaghachi ihe nile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.”—NDỊ EFESỌS 1:9, 10.

1. Olee ‘ihe dị Jehova ụtọ’ maka eluigwe na ụwa?

UDO ELUIGWE NA ỤWA! Nke ahụ bụ nzube dị ebube nke Jehova, bụ́ “Chineke nke udo.” (Ndị Hibru 13:20) O si n’ike mmụọ nsọ mee ka Pọl onyeozi dee na “ihe dị ya ụtọ” bụ “ịchịkọtaghachi ihe nile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.” (Ndị Efesọs 1:9, 10) Olee nnọọ ihe ngwaa ahụ a sụgharịrị ịbụ “ịchịkọtaghachi ihe nile” n’amaokwu a pụtara? Ọkà mmụta Bible bụ́ J. B. Lightfoot na-ekwu, sị: “Okwu ahụ pụtara eluigwe na ụwa ịdị n’otu, gharakwa inwe ndị na-adịghị ekwe ekwe na ndị na-akpata nkewa, kama ndị nile nọ na ha adị n’otu n’ime Kraịst. Mmehie na ọnwụ, iru újú na enweghị ihe ịga nke ọma na ahụhụ agaghịkwa adị.”

“Ihe Ndị Dị n’Eluigwe”

2. Olee ndị bụ “ihe ndị dị n’eluigwe” bụ́ ndị ọ dị mkpa ka a chịkọta?

2 Pita onyeozi chịkọtara olileanya magburu onwe ya nke ezi Ndị Kraịst nwere mgbe o dere, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) “Eluigwe ọhụrụ” ahụ e kwere nkwa ya n’ebe a pụtara ọchịchị ọhụrụ, bụ́ Alaeze Mezaịa. A ga-achịkọta ‘ihe ndị ahụ dị n’eluigwe’ Pọl kwuru banyere ha n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs “n’ime Kraịst.” Ha bụ ọnụ ọgụgụ dị nta e si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ iso Kraịst chịa n’eluigwe. (1 Pita 1:3, 4) ‘E si n’ụwa zụta’ narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ, bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ‘si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ zụta ha,’ ịbụ ndị ha na Kraịst ga-eso chịa n’Alaeze eluigwe ya.—Mkpughe 5:9, 10; 14:3, 4; 2 Ndị Kọrint 1:21; Ndị Efesọs 1:11; 3:6.

3. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na ndị e tere mmanụ ‘nọ n’oche n’ebe ndị dị n’eluigwe’ ọbụna mgbe ha ka nọ n’ụwa?

3 E ji mmụọ nsọ mụọ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ma ọ bụ mụọ ha ọzọ ịbụ ụmụ ime mmụọ nke Jehova. (Jọn 1:12, 13; 3:5-7) Ebe Jehova nabatara ha dị ka “ụmụ” ya, ha ghọrọ ụmụnna Jizọs. (Ndị Rom 8:15; Ndị Efesọs 1:5) N’ihi ya, ọbụna mgbe ha ka nọ n’ụwa, e kwuru na a ‘kpọlitekọrọ ha ma nyekọọ ha oche n’ebe ndị dị n’eluigwe n’ịdị n’otu nke ha na Kraịst Jizọs.’ (Ndị Efesọs 1:3; 2:6) Ihe mere ha ji nọrọ n’ọnọdụ a dị elu n’ebe Chineke nọ bụ na “e ji mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa kaa [ha] akara, bụ́ ihe àmà e bu ụzọ nye tupu ihe nketa [ha],” bụ́ nke e debeere ha n’eluigwe. (Ndị Efesọs 1:13, 14; Ndị Kọlọsi 1:5) Ya mere, ndị a bụ “ihe ndị dị n’eluigwe,” bụ́ ndị ọ dị mkpa ka a chịkọtazuo ọnụ ọgụgụ ha Jehova burula ụzọ kaa akaa.

Otú E Si Malite Ịchịkọta Ha

4. Olee mgbe nchịkọta nke “ihe ndị dị n’eluigwe” malitere, oleekwa otú o si malite?

4 N’ikwekọ ná “nlekọta” nke Jehova ma ọ bụ ụzọ o si ahazi ihe, nchịkọta nke “ihe ndị dị n’eluigwe” ga-amalite “n’ozuzu nke oge ahụ a kara aka.” (Ndị Efesọs 1:10) Oge ahụ a kara aka ruru na Pentikọst afọ 33 O.A. N’ụbọchị ahụ, a wụsara ndịozi na ìgwè ndị na-eso ụzọ mmụọ nsọ, nke gụnyere ndị ikom na ndị inyom. (Ọrụ 1:13-15; 2:1-4) Nke a gosiri na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ amalitewo, na-egosikwa na a mụwo ọgbakọ Ndị Kraịst na mba ọhụrụ bụ́ Izrel ime mmụọ, ma ọ bụ “Izrel nke Chineke.”—Ndị Galeshia 6:16; Ndị Hibru 9:15; 12:23, 24.

5. N’ihi gịnị ka Jehova ji kee “mba” ọhụrụ iji dochie Izrel anụ ahụ́?

5 Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ Jehova na Izrel anụ ahụ́ gbara ewepụtalighị “alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ,” bụ́ ndị ga-eje ozi n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. (Ọpụpụ 19:5, 6) Jizọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” (Matiu 21:43) Ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, mejupụtara mba ahụ, bụ́ Izrel ime mmụọ. Pita onyeozi degaara ha akwụkwọ, sị: “Unu bụ ‘agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ, otu ndị bụ́ maka ihe onwunwe pụrụ iche, ka unu wee kpọsaa n’ebe nile ịdị mma’ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị gaa n’ìhè ya dị ebube. N’ihi na o nwere mgbe unu na-abụghị otu ndị, ma ugbu a unu bụ ndị Chineke.” (1 Pita 2:9, 10) Jehova na Izrel anụ ahụ́ anọkwaghị n’ọgbụgba ndụ. (Ndị Hibru 8:7-13) Dị ka Jizọs buru n’amụma, a napụrụ ha ihe ùgwù nke iso n’Alaeze Mezaịa ahụ ma nye ya narị puku na iri puku anọ na anọ bụ́ Izrel ime mmụọ.—Mkpughe 7:4-8.

E Webara Ha n’Ọgbụgba Ndụ Alaeze Ahụ

6, 7. Olee ọgbụgba ndụ pụrụ iche Jizọs na ụmụnna ya e ji mmụọ nsọ mụta gbara, oleekwa ihe nke a pụtaara ha?

6 N’abalị ahụ Jizọs guzobere Ihe Omume E Ji Echeta ọnwụ ya, ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Unu bụ ndị rapawooro m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche; mụ na unu na-agbakwa ndụ, dị nnọọ ka mụ na Nna m gbaworo ndụ, maka alaeze, ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’alaeze m, nọdụkwa n’ocheeze ikpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.” (Luk 22:28-30) N’ebe a, Jizọs kwuru banyere ọgbụgba ndụ pụrụ iche ya na narị puku na iri puku anọ na anọ bụ́ ụmụnna ya e ji mmụọ nsọ mụta gbara, bụ́ ndị ga-anọgide ‘na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ’ ma gosipụta onwe ha ‘ndị mmeri.’—Mkpughe 2:10; 3:21.

7 Ndị so n’ìgwè nta a na-ahapụ olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa dị ka ụmụ mmadụ nwere anụ ahụ́ na ọbara. Ha ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe, nọkwasị n’ocheeze ma na-ekpe ụmụ mmadụ ikpe. (Mkpughe 20:4, 6) Ugbu a, ka anyị tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ metụtara nanị ndị a e tere mmanụ, ndị na-egosikwa ihe mere “atụrụ ọzọ” adịghị ata ma na-aṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs.—Jọn 10:16.

8. Olee ihe ndị e tere mmanụ na-egosi site n’ịta achịcha ahụ? (Lee igbe dị na peeji nke 23.)

8 Ndị e tere mmanụ ga-ata ahụhụ dị ka Kraịst tara, dịrịkwa njikere ịnwụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ. Pọl, dị ka onye so n’òtù ahụ kwuru na ya dị njikere ịchụ ihe ọ bụla n’àjà iji nwee ike ‘inweta Kraịst wee mara ya na ike nke mbilite n’ọnwụ ya ma kere òkè n’ahụhụ ya.’ Ee, Pọl dị njikere ịnwụ “ọnwụ yiri nke ya.” (Ndị Filipaị 3:8, 10) Ọtụtụ Ndị Kraịst e tere mmanụ atachiwo obi n’anụ ahụ́ ha ná “mmeso na-eweta ọnwụ nke e mesoro Jizọs.”—2 Ndị Kọrint 4:10.

9. Olee ahụ́ nke achịcha ahụ e ji echeta ọnwụ Kraịst nọchiri anya ya?

9 Mgbe Jizọs na-eguzobe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, o kwuru, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m.” (Mak 14:22) Ọ na-ekwu banyere ahụ́ nkịtị ya, bụ́ nke a ga-etipụta ọbara n’oge na-adịghị anya. Achịcha na-ekoghị eko bụ ihe nnọchianya ya na ahụ́ ya ahụ kwekọrọ. N’ihi gịnị? N’ihi na, na Bible, ihe na-eko achịcha pụrụ ịnọchi anya mmehie ma ọ bụ mmebi iwu. (Matiu 16:4, 11, 12; 1 Ndị Kọrint 5:6-8) Jizọs zuru okè, ahụ́ mmadụ ya enweghịkwa mmehie. Ọ ga-achụ ahụ́ ahụ zuru okè dị ka àjà ịjụrụ obi. (Ndị Hibru 7:26; 1 Jọn 2:2) Ịchụ ya n’àjà ga-abara Ndị Kraịst nile kwesịrị ntụkwasị obi uru, ma hà nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs.—Jọn 6:51.

10. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ahụ na-aṅụ mmanya ahụ si ‘ekere òkè n’ọbara nke Kraịst ahụ’?

10 Pọl dere banyere mmanya ahụ Ndị Kraịst e tere mmanụ na-aṅụ n’ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs, sị: “Iko ngọzi ahụ nke anyị na-agọzi, ọ́ bụghị ikere òkè n’ọbara nke Kraịst ahụ?” (1 Ndị Kọrint 10:16) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ahụ na-aṅụ mmanya ahụ si ‘ekere òkè n’ọbara nke Kraịst ahụ’? O doro anya na ha esoghị achụ àjà mgbapụta ahụ, n’ihi na mgbapụta dị ha onwe ha mkpa. N’ihi okwukwe ha nwere n’ikike mgbapụta nke ọbara Kraịst nwere, a na-agbaghara ha mmehie ha ma gụọ ha ná ndị ezi omume maka ibi n’eluigwe. (Ndị Rom 5:8, 9; Taịtọs 3:4-7) Ọ bụ ọbara Kraịst wụsara ka e ji ‘edo narị puku na iri puku anọ na anọ, bụ́ ndị ha na Kraịst na-ekekọ ihe, nsọ,’ doo ha iche, sachapụ ha mmehie ha ịbụ “ndị nsọ.” (Ndị Hibru 10:29; Daniel 7:18, 27; Ndị Efesọs 2:19) Ee, Kraịst ji ọbara ya ‘zụtara Chineke ndị mmadụ site n’ebo na asụsụ na ndị na mba ọ bụla, meekwa ka ha bụrụ otu alaeze na ndị nchụàjà nye Chineke anyị, ha gajekwa ịchị ụwa dị ka ndị eze.’—Mkpughe 5:9, 10.

11. Gịnị ka ndị e tere mmanụ na-egosi site n’ịṅụ mmanya ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs?

11 Mgbe Jizọs na-eguzobe Ncheta ọnwụ ya, o bunyere ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi otu iko mmanya ma kwuo, sị: “Ṅụọnụ, unu nile; n’ihi na nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ bụ́ nke a gaje ịwụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.” (Matiu 26:27, 28) Dị nnọọ ka ọbara oké ehi na ewu mere ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ Chineke na mba Izrel gbara dịrị irè, otú ahụ ka ọbara Jizọs si mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ Jehova na Izrel ime mmụọ gbara dịrị irè, malite na Pentikọst afọ 33 O.A. (Ọpụpụ 24:5-8; Luk 22:20; Ndị Hibru 9:14, 15) Site n’ịṅụ mmanya ahụ nke na-anọchi anya ‘ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ,’ ndị e tere mmanụ na-egosi na e mewo ka ha banye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nakwa na ha eritewela uru na ya.

12. Olee otú e si eme ndị e tere mmanụ baptizim baa n’ọnwụ Kraịst?

12 Ọ dịkwa ihe ọzọ a na-echetara ndị e tere mmanụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Iko ahụ m na-aṅụ ka unu ga-aṅụ, baptizim ahụ a na-eme m ka a ga-emekwa unu.” (Mak 10:38, 39) Pọl onyeozi mesịrị kwuo na ‘e mere Ndị Kraịst baptizim baa n’ọnwụ Kraịst.’ (Ndị Rom 6:3) Ndị e tere mmanụ chụrụ ndụ ha n’àjà. Ọnwụ ha bụ àjà n’ihi na ha na-ahapụ olileanya ọ bụla nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Baptizim e mere ha ịba n’ọnwụ Kraịst na-ezu okè mgbe ha nwụrụ n’ịkwesị ntụkwasị obi, a kpọlitekwa ha n’ọnwụ dị ka ndị mmụọ ha na Kraịst ‘ga-achịkọ dị ka ndị eze’ n’eluigwe.—2 Timoti 2:10-12; Ndị Rom 6:5; 1 Ndị Kọrint 15:42-44, 50.

Ịta na Ịṅụ Ihe Nnọchianya Ndị Ahụ

13. N’ihi gịnị ka ndị nwere olileanya ibi n’elu ala na-ejighị ata ma na-aṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ, n’ihi gịnịkwa ka ha ji aga ihe omume ahụ?

13 Ebe ịta achịcha na ịṅụ mmanya ahụ a na-ebugharị n’oge a na-echeta ọnwụ Kraịst gụnyere ihe a nile, ọ ga-abụ nnọọ ihe na-ekwesịghị ekwesị ndị nwere olileanya ibi n’elu ala ịta na ịṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ. Ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ghọtara na ha esoghị ná ndị e tere mmanụ bụ́ akụkụ ahụ́ Kraịst, nakwa na ha esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ Jehova na ndị ha na Jizọs Kraịst ga-eso chịa gbara. Ebe ọ bụ na “iko ahụ” na-anọchi anya ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ọ bụ nanị ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ na-ata ma na-aṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ. E meghị ndị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’okpuru Alaeze ahụ dị ka ụmụ mmadụ zuru okè baptizim ịba n’ọnwụ Jizọs, a kpọghịkwa ha iso ya chịa n’eluigwe. Ọ bụrụ na ha ataa achịcha ahụ ma ọ bụ ṅụọ mmanya ahụ bụ́ ihe nnọchianyạ, ọ ga-apụta na ha na-azọrọ ihe ha na-abụghị. N’ihi ya, ha adịghị ata ma ọ bụ na-aṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ, ọ bụ ezie na ha na-aga ihe omume ahụ dị ka ndị ji nkwanye ùgwù na-ekiri ihe na-emenụ. Ha na-ekele Jehova maka ihe nile o meere ha site n’aka Ọkpara ya, gụnyere ịgbaghara ha mmehie ha site n’ọbara Kraịst wụsịrị.

14. Olee otú ndị e tere mmanụ si eme ka mmekọrịta ha na Chineke sie ike site n’ịta achịcha ahụ na ịṅụ mmanya ahụ?

14 Akara ikpeazụ a na-aka ọnụ ọgụgụ dị nta nke Ndị Kraịst a kpọrọ ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe na-abịaru ná njedebe. Ndị e tere mmanụ ịta na ịṅụ ihe nnọchianya ndị ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs na-eme ka mmekọrịta ha na Chineke sie ike ruo n’ọgwụgwụ nke ndụ elu ala ha, bụ́ nke ha ga-eji chụọ àjà. Ọ na-eme ka ha na ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị so n’ahụ́ Kraịst dị n’otu. Ịta achịcha na ịṅụ mmanya ahụ na-echetara ha ibu ọrụ ha nwere bụ́ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ.—2 Pita 1:10, 11.

Ịchịkọta “Ihe Ndị Dị n’Ụwa”

15. Olee ndị sonyeerela Ndị Kraịst e tere mmanụ?

15 Kemgbe ihe dị ka afọ 1935, ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke “atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị na-esoghị ‘n’ìgwè atụrụ nta’ nakwa ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa, esonyerela ndị e tere mmanụ ma na-akwado ha. (Jọn 10:16; Luk 12:32; Zekaraịa 8:23) Ha aghọwo ezi ndị enyi nke ụmụnna Kraịst, na-enyere ha nnọọ aka n’ikwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” ka ọ bụrụ àmà nye mba nile. (Matiu 24:14; 25:40) N’ihi ime otú ahụ, mgbe Kraịst bịara ikpe mba nile ikpe, ọ ga-ekpelara ha ikpe dị ka “atụrụ” ya ma debe ha “n’aka nri ya” maka ịgọzi ha. (Matiu 25:33-36, 46) Site n’okwukwe ha nwere n’ọbara Kraịst, ha ga-emejupụta “oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị ga-alanahụ ‘oké mkpagbu ahụ.’—Mkpughe 7:9-14.

16. Olee ndị “ihe ndị dị n’ụwa” ga-agụnye, oleekwa otú ha nile ga-esi nwee ohere nke ịghọ “ụmụ Chineke”?

16 Mgbe a kasịrị ndị fọdụrụnụ n’ime narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ akara ikpeazụ, a ga-ahapụ “ifufe,” nke bụ́ mbibi nke ajọ usoro ihe Setan dị n’ụwa. (Mkpughe 7:1-4) N’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst na ndị eze na ndị nchụàjà ibe ya, a ga-akpọlite ọnụ ọgụgụ mmadụ a na-akpọghị aha n’ọnwụ isonyere oké ìgwè mmadụ ahụ. (Mkpughe 20:12, 13) Ndị a ga-enwe ohere nke ịghọ ndị Eze Mezaịa bụ́ Kraịst Jizọs ga-achị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. N’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ, a ga-ele “ihe ndị dị n’ụwa” ule ikpeazụ. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi ga-aghọ “ụmụ Chineke” n’elu ala.—Ndị Efesọs 1:10; Ndị Rom 8:21; Mkpughe 20:7, 8.

17. Olee otú nzube Jehova ga-esi mezuo?

17 Ya mere, site ná “nlekọta” Jehova, ma ọ bụ ụzọ o si ahazi ihe, nke na-egosi amamihe ya na-enweghị atụ, ọ ga-emezuworị nzube ya nke bụ́ “ịchịkọtaghachi ihe nile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.” Ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi nọ n’eluigwe na n’ụwa ga-adịwo n’otu ma dị n’udo, ha ga-ejikwa ọṅụ na-erubere ọchịchị ezi omume nke Onye Ukwu ahụ Na-ezube Ihe bụ́ Jehova isi.

18. Olee otú ma ndị e tere mmanụ ma ndị enyi ha ga-esi rite uru site n’ịga Ncheta nke ọnwụ Jizọs?

18 Lee ihe na-ewusi okwukwe ike ọ bụ nye ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị e tere mmanụ na ọtụtụ nde atụrụ ọzọ ahụ bụ́ ndị enyi ha ịgbakọta n’April 12, 2006! Ha ga-echeta ọnwụ Kraịst, ọbụna dị ka o nyere n’iwu, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” (Luk 22:19) Ndị nile ga-abịanụ kwesịrị icheta ihe Jehova meere ha site n’Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Kraịst Jizọs.

Ntụleghachi

• Gịnị bụ nzube Jehova maka ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa?

• Ole ndị bụ “ihe ndị dị n’eluigwe,” oleekwa otú e siworo chịkọta ha?

• Ole ndị bụ “ihe ndị dị n’ụwa,” gịnịkwa bụ olileanya ha?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na Page 23]

“Ahụ́ nke Kraịst Ahụ”

1 Ndị Kọrint 10:16, 17, Pọl kpọtụrụ okwu ahụ bụ́ “ahụ́” aha n’ụzọ pụrụ iche mgbe ọ na-ekwu kpọmkwem banyere ihe achịcha ahụ pụtaara ụmụnna Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. O kwuru, sị: “Ogbe achịcha ahụ nke anyị na-anyawa, ọ́ bụghị ikere òkè n’ahụ́ nke Kraịst ahụ? N’ihi na e nwere otu ogbe achịcha, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ́, ebe anyị nile na-ekere òkè n’otu ogbe achịcha ahụ.” Mgbe Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ata achịcha ahụ, ha na-ekwupụta ịdị n’otu ha n’ọgbakọ ndị e tere mmanụ, bụ́ nke yiri otu ahụ́ ma nwee Kraịst dị ka Isi ya.—Matiu 23:10; 1 Ndị Kọrint 12:12, 13, 18.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị ndị e tere mmanụ na-ata achịcha ahụ ma na-aṅụ mmanya ahụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Site ná nlekọta ihe nke Jehova, ihe nile e kere eke dị n’eluigwe na n’elu ụwa ga-adị n’otu