Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe ize ndụ atọ Jizọs na-adọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere ha na Matiu 5:22?

N’Ozizi Elu Ugwu Jizọs Kraịst, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Asị m unu na onye ọ bụla nke nọgidere na-eweso nwanne ya iwe ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe; ma onye ọ bụla nke na-agwa nwanne ya okwu nlelị jọgburu onwe ya ga-aza ajụjụ n’Ụlọikpe Kasị Elu, onye ọ bụla nke na-asịkwa, ‘Gị onye nzuzu na-abaghị uru!’ ga-ekpughe onwe ya nye Gehena na-ere ọkụ.”—Matiu 5:22.

Jizọs ji ihe ndị Juu maara nke ọma mee ihe—ụlọikpe, Ụlọikpe Kasị Elu, na Gehena na-ere ọkụ—iji kọwaa otú ntaramahụhụ a ga-enye maka mmehie ga-esiru n’ike dabere n’otú mmehie ahụ dịruru ná njọ.

Nke mbụ, Jizọs kwuru na onye ọ bụla nke nọgidere na-eweso nwanne ya iwe ga-aza ajụjụ “n’ụlọikpe,” nke bụ́ ụlọikpe ime obodo. Dị ka akụkọ ihe mere eme si kwuo, e nwere ụlọikpe ndị a n’obodo dị iche iche bụ́ nke ndị mejupụtara ya bụ otu narị ndị okenye na iri abụọ ma ọ bụ karịa. (Matiu 10:17; Mak 13:9) Ndị ikpe na-ekpe ikpe n’ụlọikpe dị otú ahụ nwere ikike ikpebi ikpe, ọbụna ndị metụtara igbu ọchụ. (Deuterọnọmi 16:18; 19:12; 21:1, 2) Ya mere, Jizọs na-egosi na onye nọgidere na-eburu nwanne ya iwe n’obi na-eme oké mmehie.

Jizọs kwuru ọzọ na onye ọ bụla “na-agwa nwanne ya okwu nlelị jọgburu onwe ya ga-aza ajụjụ n’Ụlọikpe Kasị Elu.” Okwu Grik bụ́ rha·kaʹ nke a sụgharịrị ịbụ “okwu nlelị jọgburu onwe ya” pụtara “onye nzuzu.” Dị ka akwụkwọ bụ́ The New Thayer’s Greek-English Lexicon of the New Testament si kwuo, okwu ahụ bụ “okwu nlelị ndị Juu nke oge Kraịst ji mee ihe.” N’ihi ya, Jizọs nọ na-adọ aka ná ntị megide igosipụta mkpọrọmasị n’ebe onye obodo mmadụ nọ site n’ịkparị ya. Ihe Jizọs na-ekwu bụ nnọọ na a ga-ekpe onye na-ekwu ụdị okwu ahụ ikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu, bụ́ nke ndị òtù Sanhedrin nile—òtù ndị ikpe e nwere na Jeruselem bụ́ nke nnukwu onye nchụàjà, ndị okenye na ndị odeakwụkwọ 70 mejupụtara—ọ bụghị n’ụlọikpe nke obodo ya.—Mak 15:1.

N’ikpeazụ, Jizọs kọwaziri na ọ bụrụ na mmadụ akpọọ onye ọzọ “onye nzuzu na-abaghị uru!” a ga-atụba ya na Gehena na-ere ọkụ. Okwu ahụ bụ́ “Gehena” sitere n’okwu Hibru bụ́ geh hin·nomʹ, nke pụtara “ndagwurugwu Hinọm,” bụ́ nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ na n’ebe ndịda Jeruselem oge ochie. N’oge Jizọs, ndagwurugwu ahụ ghọrọ ebe a na-akpọ ihe ndị ruru unyi ọkụ, tinyere ozu ndị omekome bụ́ ndị e lere anya dị ka ndị na-ekwesịghị ka e lizie ha elizie. N’ihi ya, okwu ahụ bụ́ “Gehena” bụ ihe atụ kwesịrị ekwesị nke ibibi ihe kpamkpam.

Mgbe ahụ, gịnịzi ka okwu ahụ bụ́ “onye nzuzu na-abaghị uru” pụtara? Okwu e ji mee ihe n’ebe a na-ada ka okwu Hibru pụtara “nnupụisi.” Ọ na-egosi na mmadụ bụ onye àgwà ya rụrụ arụ, onye si n’ezi ofufe dapụ na onye na-enupụrụ Chineke isi. Ya mere, onye na-akpọ ibe ya “onye nzuzu na-abaghị uru” na-ekwu nnọọ na nwanne ya kwesịrị ịnata ntaramahụhụ kwesịịrị onye na-enupụrụ Chineke isi, bụ́ mbibi ebighị ebi. A bịa n’ụzọ Chineke si ele ihe anya, onye ahụ kwuru ihe dị otú ahụ megide nwanne ya pụrụ ịnata ikpe ọnwụ ahụ n’onwe ya—mbibi ebighị ebi.—Deuterọnọmi 19:17-19.

N’ihi ya, Jizọs na-esetịpụrụ ndị na-eso ụzọ ya ụkpụrụ dị elu karịa ụkpụrụ ndị ahụ dị n’Iwu Mozis. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ kweere na onye gburu mmadụ ga-aza “ajụjụ n’ụlọikpe,” Jizọs kwuru ihe karịrị nke a. Ọ kụziri na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị izere ọbụna iburu ụmụnna ha iwe n’obi.—Matiu 5:21, 22.