Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Anyị Ahụwo Mezaịa Ahụ”

“Anyị Ahụwo Mezaịa Ahụ”

“Anyị Ahụwo Mezaịa Ahụ”

“ANYỊ ahụwo Mezaịa ahụ.” “Anyị ahụwo onye ahụ nke Mozis, n’ime Iwu ahụ, na Ndị Amụma dere banyere ya.” Ndị Juu abụọ na-anụ ọkụ n’obi kwuru ihe ndị ahụ na-emetụ n’ahụ́. Mezaịa ahụ a nọ na-ele anya ya emechaala bịa. Ha kwenyesiri ike na ọ bụ ya!—Jọn 1:35-45.

Ọ bụrụ na i chee echiche banyere ọnọdụ e nwere n’oge ahụ n’ihe banyere okpukpe na akụkọ ihe mere eme nke ndị obodo ahụ, nkwenye ahụ siri ike mmadụ abụọ ahụ nwere ga-adịkwu nnọọ ịrịba ama. E nwere ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha ndị nnapụta bụ́ ndị a kpọsaara nnọọ ọha mmadụ, ha ekwekwa ọtụtụ nkwa, ma olileanya ndị mmadụ nwere n’ebe ha nọ kụrụ afọ n’ala n’oge na-adịghị anya mgbe ha na-anapụtalighị ndị Juu n’agbụ ndị Rom.—Ọrụ 5:34-37.

Otú ọ dị, ndị Juu abụọ ahụ—Andru na Filip—enweghị obi abụọ ọ bụla na ha achọtawo ezi Mezaịa ahụ. Kama nke ahụ, n’afọ ndị sochirinụ, nkwenye ha bịara sikwuo ike ka ha ji anya ha na-ahụ ọrụ ndị dị ike nwoke a na-arụ bụ́ ndị na-emezu ihe ndị e kwuru banyere Mezaịa ahụ.

Gịnị mere mmadụ abụọ a na ọtụtụ ndị ọzọ ji nwee okwukwe na ya ma kwere na ọ bụghị Mezaịa ụgha ma ọ bụ onye bịara ịghọgbu ha? Olee ihe ndị mere o ji bụrụ ezi Mezaịa ahụ?

Dị ka akụkọ ihe mere eme ahụ si kwuo, Andru na Filip ghọtara na Jizọs onye Nazaret, onye bụ́bu ọkwa nkà, bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa nke a nọworo na-eche kemgbe. (Jọn 1:45) Ọkọ akụkọ ihe mere eme anya ruru ala e nwere n’oge ahụ, bụ́ Luk, kwuru na Mezaịa ahụ bịara “n’afọ nke iri na ise nke ọchịchị Taịbiriọs Siza.” (Luk 3:1-3) Afọ nke 15 nke ọchịchị Taịbiriọs malitere na September nke afọ 28 O.A. ma gwụsịa na September nke afọ 29 O.A. Luk kwukwara na ndị Juu “nọ na-atụ anya” ọbịbịa Mezaịa ahụ n’oge ahụ. (Luk 3:15) Gịnị mere e ji na-atụ anya ya n’oge ahụ kpọmkwem? Anyị ga-ahụ.

Ihe Ndị A Ga-eji Mata Mezaịa Ahụ

N’ihi ọrụ ndị dị oké mkpa Mezaịa ahụ ga-arụ, ị ga-aghọta na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na Onye Okike, bụ́ Jehova, ga-enye ihe àmà ndị pụtara ìhè ga-enyere ndị mụ anya na ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya aka ịmata Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. N’ihi gịnị? N’ihi na nke ahụ ga-eme ka ndị Mezaịa ụgha ghara ịghọgbu ndị mụ anya, dị ka ha ghọgburu ọtụtụ ndị.

Mgbe onye nnọchianya mba gara mba ọzọ, a na-atụ anya ka o gosi akwụkwọ ndị na-egosi na mba ya ahọpụtawo ya dị ka onye nnọchianya ha. N’otu aka ahụ, Jehova buru ụzọ dekọọ ihe nile Mezaịa ahụ ga-emezu. N’ihi ya, mgbe “Onye Nnọchiteanya Ukwu” ahụ bịara, ọ ga-adị ka à ga-asị na o ji akwụkwọ na-akọwa onye ọ bụ bịa, bụ́ nke ga-egosi na ọ bụ ihe ọ na-ekwu na ya bụ.—Ndị Hibru 12:2.

E dekọrọ ihe ndị Mezaịa ahụ ga-emezu n’ọtụtụ amụma ndị dị na Bible bụ́ ndị e dekọrọ ọtụtụ narị afọ tupu oge mmezu ha. Amụma ndị ahụ kwuru kpọmkwem otú Mezaịa ahụ ga-esi bịa, ụdị ozi ọ ga-eje, ahụhụ ndị mmadụ ga-ata ya, na ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ. Ọ pụrụ ịmasị gị ịmata na amụma ndị ahụ a pụrụ ịtụkwasị obi kwukwara banyere mbilite n’ọnwụ ya, mbuli a ga-ebuli ya gaa n’aka nri Chineke, nakwa ngọzi ndị Alaeze ya ga-abịa n’ọdịnihu ga-eweta. Amụma Bible si otú ahụ mee ka e nwee akara pụrụ iche nke a pụrụ iji tụnyere akara mkpịsị aka, nke na-enweghị onye nke ya na ibe ya bụ otu.

N’eziokwu, mgbe Jizọs pụtara n’afọ 29 O.A., ọ bụghị ihe nile e buru n’amụma banyere Mezaịa ahụ mezuru n’oge ahụ. Dị ka ihe atụ, e gbughị ya ma kpọlite ya n’ọnwụ n’afọ ahụ. Ka o sina dị, Andru, Filip, na ọtụtụ ndị ọzọ kweere na Jizọs n’ihi ihe ndị o ziri ma mee. Ha hụrụ ọtụtụ ihe gosiri na ọ bụ Mezaịa ahụ n’ezie. A sị na ị dị ndụ n’oge ahụ ma jiri obi gị nile tụlee ihe àmà ndị ahụ n’onwe gị, ikekwe, ị ga-ekwenyesikwa ike na Jizọs bụ Mezaịa ahụ.

Ihe Àmà Ọtụtụ Ihe Mejupụtara

Gịnị gaara enyeworo gị aka ikwubi otú ahụ? N’ọtụtụ narị afọ gaferenụ tupu Mezaịa ahụ abịa, ndị buru amụma na Bible kwuru kpọmkwem ihe ndị Mezaịa ahụ ga-eme, bụ́ ndị ga-eme ka ọ dị mfe ịmata ya. Ka ndị amụma ahụ na-ekwu ihe ndị ahụ a ga-eji mata ya n’ime ọtụtụ narị afọ ndị ahụ, onye Mezaịa ahụ bụ jiri nwayọọ nwayọọ doo anya. Henry H. Halley kwuru, sị: “Ka e were ya na ndị ikom si mba dị iche iche, bụ́ ndị na-ahụtụbeghị onwe ha ma ọ bụ mekọrịtatụ ihe mbụ batara n’otu ọnụ ụlọ, onye nke ọ bụla ewepụta otu ibe mabụl a kpụrụ akpụ, mgbe e jikọtakwara ha nile ọnụ, ha aghọọ otu ihe a kpụrụ akpụ nke akụkụ ya nile zuru ezu—olee ihe ọzọ ị ga-ekwubi ma ọ́ bụghị na otu onye sepụtara otú akụkụ ya dị iche iche ga-adị ma zigara nwoke nke ọ bụla akụkụ nke ya?” Ọ jụziri, sị: “Olee otú a ga-esi kọwaa ihe mere ndị edemede dị iche iche dịrị ndụ n’ọtụtụ narị afọ dị iche iche ji dee akụkụ dị iche iche nke ndụ na ọrụ Jizọs ọtụtụ afọ tupu Jizọs abịa, ma ọ́ bụghị na otu onye amamihe ya karịrị nke mmadụ gwara ha ihe ndị ha dere?” Halley kwubiri na ọ bụ “nnukwu ọrụ ebube!”

“Ọrụ ebube” a malitere n’akwụkwọ mbụ nke Bible. Ka onye dere Jenesis desịrị amụma mbụ dị na Bible nke kwuru ọrụ Mezaịa ahụ ga-arụ, o dekwara na Mezaịa ahụ ga-abịa site n’usoro ọmụmụ Ebreham. (Jenesis 3:15; 22:15-18) Ihe ọzọ e kwuru na Bible nke na-enyere anyị aka ịmata Mezaịa ahụ gosiri na ọ ga-esi n’ebo Juda. (Jenesis 49:10) Chineke sitere n’ọnụ Mozis gwa ndị Izrel na Mezaịa ahụ ga-abụrụ ha ọnụ na-ekwuru ha na onye nnapụta nke karịrị Mozis.—Deuterọnọmi 18:18.

N’oge Eze Devid, e buru amụma na Mezaịa ahụ ga-eketa ocheeze Devid nakwa na alaeze Ya ‘ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.’ (2 Samuel 7:13-16) Akwụkwọ Maịka kwuru na a ga-amụ Mezaịa ahụ n’obodo Devid, bụ́ Betlehem. (Maịka 5:2) Aịzaịa buru amụma na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-amụ Ya. (Aịsaịa 7:14) Onye amụma bụ́ Malakaị buru amụma na otu onye dị ka Ịlaịja ga-ekwusa ọbịbịa Ya.—Malakaị 4:5, 6.

Akwụkwọ Daniel kọwakwuru ihe ndị doro anya a ga-eji mata Mezaịa ahụ. N’ikwu kpọmkwem afọ Mezaịa ahụ ga-apụta, amụma ahụ kwuru, sị: ‘Mara, werekwa uche mata, na site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jeruselem ruo mgbe onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú, ga-adị izu asaa: na iri izu isii na abụọ, a ga-ewuzikwa ya ọzọ, ya na ámá na ékpè, ọbụna ná mkpa nke mgbe ndị a.’—Daniel 9:25.

Eze Ataksaksis nke Peshia kwuru “okwu” ka e wughachi ma wuzie Jeruselem n’afọ nke 20 nke ọchịchị ya. Ọchịchị ya malitere n’afọ 474 T.O.A., n’ihi ya, afọ nke 20 ya ga-abụ n’afọ 455 T.O.A. (Nehemaịa 2:1-8) Nke ahụ pụtara na malite mgbe e nyere iwu ka e wughachi ma wuzie Jeruselem ruo mgbe Mezaịa ahụ ga-apụta ga-ewe izu 69 nke amụma (izu 7 a gbakwunyere izu 62). Otú ọ dị, izu 69 nkịtị ga-abụ nanị narị ụbọchị anọ na iri asatọ na atọ, ma ọ bụ ihe na-erughị afọ abụọ. Ma, ọ bụrụ na e jiri ụkpụrụ amụma e dekọrọ na Bible nke bụ́ “otu ụbọchị n’ọnọdụ otu afọ” mee ihe, ọ ga-apụta ìhè na Mezaịa ahụ ga-apụta mgbe narị afọ anọ na iri afọ asatọ na atọ gasịrị, ya bụ n’afọ 29 O.A.—Ezikiel 4:6. *

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị zọọrọ na ha bụ Mezaịa pụtara n’oge dị iche iche, Jizọs onye Nazaret pụtara n’ụwa dị ka Mezaịa n’afọ 29 O.A. (Luk 3:1, 2) N’afọ ahụ kpọmkwem, Jizọs gakwuuru Jọn Onye Na-eme Baptizim, e mekwara ya baptizim n’ime mmiri. Mgbe ahụ, e ji mmụọ nsọ tee Jizọs mmanụ dị ka Mezaịa ahụ. Ka e mesịrị, Jọn, bụ́ onye ahụ dị ka Ịlaịja e buru amụma na ọ ga-ebu ụzọ kwusaa ọbịbịa Mezaịa ahụ, kọwaara Andru na onye ọzọ na-eso ụzọ ya onye Jizọs bụ, kpọọ Ya “Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa.”—Jọn 1:29; Luk 1:13-17; 3:21-23.

Otú A Ga-esi Jiri Usoro Ọmụmụ Mata Mezaịa Ahụ

Amụma ndị sitere n’ike mmụọ nsọ kwuru kpọmkwem ezinụlọ ndị Juu Mezaịa ahụ ga-esi na ha. N’ihi ya, o kwesịrị nnọọ ekwesị na Onye Okike anyị maara ihe nile ga-eme ka ọbịbịa nke Mezaịa ahụ bụrụ n’oge a ka nwere ihe ndekọ nke usoro ọmụmụ bụ́ nke a ga-eji mata usoro ọmụmụ ya.

Akwụkwọ bụ́ Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-ekwu, sị: “O doro anya na e bibiri ihe ndekọ usoro ọmụmụ nke ndị Juu mgbe e bibiri Jeruselem [n’afọ 70 O.A.], ọ bụghị tupu mgbe ahụ.” E nwere ihe ndị doro anya na-egosi na Matiu na Luk dere Oziọma ha tupu afọ 70 O.A. N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ na ha ji ihe ndekọ ndị a mee ihe mgbe ha na-edekọ usoro ọmụmụ Jizọs. (Matiu 1:1-16; Luk 3:23-38) N’eziekwa, n’okwu dị nnọọ mkpa otú ahụ, ọtụtụ ndị ha na ha dịkọrọ ndụ ga-achọwo ịchọpụta n’onwe ha ma usoro ọmụmụ Jizọs ò kwekọkwara n’ihe e buru n’amụma.

Jizọs Ò Mezuru Amụma Ndị E Buru Banyere Mezaịa ahụ ná Ndaba?

Ma, ọ̀ pụrụ ịbụ na Jizọs mezuru amụma ndị e buru banyere Mezaịa ahụ ná ndaba? Mgbe a jụrụ otu ọkà mmụta ajụjụ ahụ, ọ zara, sị: “Ọ pụghị ịbụ. Ihe ndị ga-eme ka ọ ghara ịdị otú ahụ dị nnọọ ọtụtụ nke na e kwesịtụghị ichewe n’echiche na ọ bụ ihe mere ná ndaba. Otu onye rụrụ mgbakọ na mwepụ dị na ya ma chọpụta na ohere e nwere na nanị amụma asatọ e buru banyere Mezaịa ahụ ga-emezu ná ndaba bụ otu n’ime otu narị nde ijeri.” Iji maa atụ ihe nke ahụ pụtara, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i weta ọnụ ọgụgụ a ná mkpụrụ ego ọlaọcha dọla, ọ ga-eju obodo Texas [ebe dị narị puku square kilomita isii na iri puku itoolu], omimi ya ga-ejikwa obere ihe gafee ọkara mita. Ọ bụrụ na ị kanye otu mkpụrụ ego n’ime ha ihe ma gwa onye e kechiri ihe n’anya ka ọ gagharịa n’obodo ahụ dum ma chọta otu mkpụrụ ego ahụ a kanyere ihe na ya, olee ohere e nwere na ọ ga-achọta nke ahụ a kanyere ihe?” O kwuziri na ọ bụ “otú ahụ ka ọ ga-esi sie ike onye ọ bụla dịtụrụla ndụ imezu nanị amụma asatọ n’ime amụma ndị e buru banyere [Mezaịa] ahụ.”

Otú ọ dị, n’ime afọ atọ na ọkara Jizọs jere ozi, o mezuru ọtụtụ amụma Bible, ọ bụghị nanị asatọ. N’ihi ọtụtụ ihe àmà ndị a, ọkà mmụta ahụ kwubiri, sị: “Kemgbe ụmụ mmadụ dịwara ndụ, ọ bụ Jizọs—nanị Jizọs—jisiri ike mee nke ahụ.”

“Ọbịbịa” Mezaịa Ahụ

O doro anya na Mezaịa ahụ bịara n’afọ 29 O.A. dị ka Jizọs onye Nazaret. Ọ bịara dị ka Onye Mgbapụta wedara onwe ya ala, nke ga-ata ahụhụ. Ọ bịaghị dị ka Eze na-enwe mmeri iji napụta ndị Juu n’ọchịchị aka ike nke ndị Rom. O yikwara ka nke ahụ ọ̀ bụ ihe ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu na ọbụna ndị na-eso ụzọ ya tụrụ anya ya. (Aịsaịa, isi 53; Zekaraịa 9:9; Ọrụ 1:6-8) Otú ọ dị, e buru amụma na ọ ga-eji ike dị ukwuu bịa n’ọdịnihu.—Daniel 2:44; 7:13, 14.

Ndị maara ihe bụ́ ndị jiworo nlezianya mụọ Bible n’ụwa nile ekwenyesiela ike na Mezaịa ahụ bịara na narị afọ mbụ, nakwa na ọ ga-abịa ọzọ. Ihe àmà na-egosi na ọ bịaghachiri, dị ka e buru n’amụma, n’afọ 1914, bụ́ mgbe “ọnụnọ” ya malitere. * (Matiu 24:3-14) N’afọ ahụ, e chiri Jizọs eze n’eluigwe dị ka Eze nke Alaeze Chineke, n’ebe anya ụmụ mmadụ na-agaghị ahụ ya. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ihe iji wepụ ihe nile isi ahụ e nupụrụ n’Iden kpatara n’ụwa. Ọchịchị Puku Afọ ya nke ga-esochi ga-agọzi ndị nile kweere na ya dị ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Mezaịa ahụ, onye “na-ewepụ mmehie nke ụwa.”—Jọn 1:29; Mkpughe 21:3, 4.

Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ isoro gị tụlee ihe àmà ahụ ma site na Bible gosi gị ihe ọchịchị Mezaịa ahụ pụrụ ịpụta nye gị na ndị ị hụrụ n’anya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Iji nwetakwuo nkọwa nke Daniel 9:25, lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke Abụọ, peeji nke 899-904, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 27 Iji nwetakwuo nkọwa, lee Isi nke 10 na nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe Osise/Foto ndị dị na peeji 6, 7]

Afọ 455 T.O.A., Afọ 29 O.A., Afọ 1914, N’oge na-adịghị

“okwu ahụ Mezaịa ahụ e chiri Mezaịa anya, Mezaịa

iwughachi bịara ahụ eze ahụ ga-ewepụ

. . . Jeruselem” n’eluigwe ajọ omume ma

mee ka ụwa

ghọọ paradaịs

Afọ 483

(izu 69 nke amụma)

Daniel 9:25