Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Gịnị Ka Triangle Purple Ahụ Pụtara?”

“Gịnị Ka Triangle Purple Ahụ Pụtara?”

“Gịnị Ka Triangle Purple Ahụ Pụtara?”

“OTU nwanyị na-arụ ọrụ Bekee nke na-arụ na ministri okwu ikpe dị n’aka na Seoul, Republic of Korea, dere, sị: “Abalị ole na ole gara aga, otu n’ime Ndịàmà Jehova nyere m otu Ụlọ Nche. Mgbe m gụrụ ya, amụtara m ihe ụfọdụ banyere otú ọchịchị Nazi na nke Kọmunist si kpagbuo Ndịàmà Jehova. Ma enwere m ajụjụ. Foto dị n’ihu ya gosiri ebe Ndịàmà Jehova yi uwe ndị a dụnyere triangle purple a kpọdoro isi n’ala n’akụkụ aka ekpe ha. Gịnị ka triangle purple ahụ pụtara?”

Mgbe ndị Nazi na-achị Germany, Ndịàmà Jehova jụrụ ito Hitler, ha etinyeghịkwa aka n’ihe metụtara ọchịchị na agha. N’ihi ya, ndị Nazi ji obi ọjọọ kpagbuo ha, tụba ihe dị ka puku Ndịàmà iri na abụọ n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ ruo oge dịgasị iche. Ihe dị ka puku mmadụ abụọ n’ime ha nwụrụ. Ọtụtụ narị n’ime ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ ndị e gburu egbu.

Gịnị ka triangle purple ahụ a dụnyere n’uwe mkpọrọ ha pụtara? Akwụkwọ bụ́ Anatomy of the SS State na-akọwa, sị: “Ụdị ndị mkpọrọ dị iche iche nọ n’ogige ịta ahụhụ [ndị Nazi] nwere ihe ndị pụrụ iche e ji amata ha. Ihe a malitere iji na-amata ndị mkpọrọ tupu agha ahụ amalite bụ ịdụnye ibe ákwà dị n’ụdị triangle n’uwe onye mkpọrọ nke ọ bụla, ụcha ya ga-adaberekwa n’ụdị onye mkpọrọ ọ bụ: ya bụrụ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, a dụnyere ha nke na-acha ọbara ọbara; nke Ndịàmà Jehova na-abụ purple; nke ndị na-akpata ọgba aghara n’obodo na-eji oji; a na-adụnyere ndị omekome nke na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ; a na-adụnyere ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha nke na-acha pinki pinki; nke ndị si mba ọzọ na-acha anụnụ anụnụ. E wezụga triangle nwere ụcha dị iche iche a na-adụnye n’uwe ndị mkpọrọ nile, a na-adụkwasịkwara ndị Juu ibe ákwà triangle odo odo ọzọ n’ụzọ ga-eme ka nke ha ghọọ ihe a na-akpọ Kpakpando Devid.”

Prọfesọ John K. Roth dere n’akwụkwọ ya bụ́ Holocaust Politics, sị: “Ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ ga-echeta ihe ọ na-akụziri anyị banyere omume ka oge na-aga, akara triangle purple ahụ ka pụrụ ichebe anyị pụọ n’ọdachi, bụrụ ihe nchebe nke akụkụ ya dị iche iche na-adọrọ uche anyị gaa n’àgwà ọma nke ụmụ mmadụ kwesịrị nnọọ ịkwanyere ùgwù.” Ndịàmà Jehova ewepụtawo ihe nkiri vidio nwetara ihe nrite nke a na-akpọ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault (Ndịàmà Jehova Guzosiri Ike n’Agbanyeghị Mkpagbu Ndị Nazi). Gịnị ma ị gwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ka o nyere gị aka ile vidio a?