Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ije Ije n’Okporo Ụzọ Ìhè Na-amụsiwanye Ike na Ya

Ije Ije n’Okporo Ụzọ Ìhè Na-amụsiwanye Ike na Ya

Ije Ije n’Okporo Ụzọ Ìhè Na-amụsiwanye Ike na Ya

“Okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.”—ILU 4:18.

1, 2. Olee uru ndị Chineke riteworo n’ihi ìhè Jehova nke mụsiwanyerela ike?

ÒNYE pụrụ ịkọwa mmetụta ọwụwa anyanwụ na-enwe n’ọchịchịrị nke abalị karịa nnọọ Onye na-enye ìhè, bụ́ Jehova Chineke? (Abụ Ọma 36:9) Chineke kwuru, sị: ‘Mgbe ìhè ụtụtụ jidere akụkụ nile nke ụwa aka, ụwa na-agbanwe onwe ya dị ka ụrọ akara, ha na-eguzokwa onwe ha dị ka uwe.’ (Job 38:12-14) Ka ìhè anyanwụ na-amụsikwu ike, ihe ndị dị n’ụwa na-apụtawanye ìhè, a na-ahụkwa ha nke ọma karị, dị nnọọ ka ụrọ na-esighị ike na-ama mma mgbe e ji ihe kaa ya akara.

2 Jehova bụkwa Onye na-enye ìhè ime mmụọ. (Abụ Ọma 43:3) Ọ bụ ezie na ụwa nọ n’oké ọchịchịrị, ezi Chineke ahụ anọgidewo na-amụkwasị ndị ya ìhè. Gịnị siworo na ya pụta? Bible na-aza, sị: “Okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) Ìhè Jehova nke na-amụsiwanye ike ka na-eme ka e nwee ìhè n’okporo ụzọ nke ndị ya. Ọ na-eme ka ha na-enwe ọganihu n’ihe metụtara nzukọ ha, ozizi nakwa àgwà ha.

Ìhè Ime Mmụọ Mụsiwanyere Ike Dugara n’Imeziwanye Ihe ná Nzukọ Jehova

3. Gịnị ka e kwere ná nkwa n’Aịsaịa 60:17?

3 Jehova buru amụma site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, sị: “N’ọnọdụ ọla M ga-eweta ọlaedo, n’ọnọdụ ígwè M ga-eweta ọlaọcha, n’ọnọdụ osisi M ga-eweta ọla, n’ọnọdụ nkume M ga-eweta ígwè.” (Aịsaịa 60:17) Dị nnọọ ka iwepụ ihe dịbu adị ma jiri ihe ka ya mma dochie ya bụ imeziwanye ihe, Ndịàmà Jehova emeziwanyewo ọtụtụ ihe ná nzukọ ha kemgbe anyị banyere ná “ngwụsị nke usoro ihe a,” ma ọ bụ ‘ụbọchị ikpeazụ’ ndị a.—Matiu 24:3; 2 Timoti 3:1.

4. Olee ndokwa e mere n’afọ 1919, oleekwa otú o si baa uru?

4 Ná mmalite nke ụbọchị ikpeazụ ndị a, ọgbakọ nke Ndị Mmụta Bible, bụ́ ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, na-ahọpụtabu ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi site ná ntụli aka. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị okenye enweghị ezi mmasị n’ikwusa ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha abụghị nanị na ha enweghị mmasị n’ọrụ nkwusa, kama, ha kụdakwara ndị ọzọ aka n’ịrụ ya. Ya mere, n’afọ 1919, e hiwere ọrụ ọhụrụ n’ọgbakọ ọ bụla—nke onye nduzi ije ozi. Ọ bụghị ọgbakọ na-ahọpụta onye nduzi ije ozi site ná ntụli aka kama ọ bu alaka ụlọ ọrụ nke ndị Chineke na-ahọpụta ya n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Ọrụ nke onye nduzi ahụ a họpụtara ahọpụta gụnyere ịhazi ọrụ nkwusa, ikenye ndị mmadụ ókèala na ịgba ha ume ikere òkè n’ozi ubi. N’afọ ndị sochirinụ, a gbakwuru nnọọ ndị mmadụ ume ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze.

5. Olee ihe e meziwanyere n’agbata afọ 1922 na afọ 1927?

5 Agbamume a e nyere ná mgbakọ Ndị Mmụta Bible e nwere na Cedar Point, Ohio, U.S.A., n’afọ 1922, bụ́ “Kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya” nyekwuru ndị nile nọ n’ọgbakọ ike. Ka ọ na-erule n’afọ 1927, a haziela ozi ubi ahazie nke na e wepụtara ụbọchị Sunday dị ka ụbọchị kasị mma ịga ozi ụlọ n’ụlọ. N’ihi gịnị ka e ji họrọ Sunday? Ọ bụ n’ihi na ihe ka ọtụtụ adịghị aga ọrụ n’ụbọchị ahụ. Ndịàmà Jehova taa na-egosipụta otu mmụọ ahụ site n’ịgbalịsi ike ịkpọtụrụ ndị mmadụ mgbe o yiri ka hà ga-anọ n’ụlọ, dị ka ná ngwụsị izu ma ọ bụ ná mgbede.

6. Olee nkwupụta a nabatara n’afọ 1931, oleekwa otú nke ahụ si metụta ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze?

6 Otu ihe kwalitekwuru nnọọ ọrụ nkwusa Alaeze mere n’ehihie Sunday, July 26, 1931, na Columbus, Ohio, U.S.A., bụ́ mgbe e bu ụzọ nabata otu nkwupụta e mere, e mesịakwa nabata ya gburugburu ụwa. Otu akụkụ nke nkwupụta ahụ e mere sịrị: “Anyị bụ ndị ohu Jehova Chineke bụ́ ndị o nyere ikike ịrụ ọrụ n’aha ya, na irube isi n’iwu ya ma gbaara Jizọs Kraịst àmà, na ịgwa ndị mmadụ na Jehova bụ ezi Chineke ahụ, bụrụkwa Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile; n’ihi ya, anyị ji obi ụtọ na-anabata ma na-anakwere aha Onyenwe anyị Chineke ji ọnụ ya gụọ, malitekwa taa gaa n’ihu, anyị chọrọ ka e jiri aha bụ́ Ndịàmà Jehova, mara anyị.” (Aịsaịa 43:10) Lee nnọọ otú aha ọhụrụ ahụ si kọwaa ọrụ bụ́ isi nke ndị nile na-aza ya ga-arụ! Ee, Jehova nwere ọrụ nke ọ chọrọ ka ndị ohu ya nile rụọ. N’ezie, ihe ka ọtụtụ ji ịnụ ọkụ n’obi nabata ya!

7. Olee mgbanwe e mere n’afọ 1932, n’ihi gịnịkwa?

7 Ọtụtụ ndị okenye wedara onwe ha ala ma jiri ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ nkwusa ahụ. Otú ọ dị, n’ebe ụfọdụ, ndị okenye a họpụtara site ná ntụli aka megidere nnọọ ihe ahụ e kwuru bụ́ na mmadụ nile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ikwusa ozi ọma. Otú ọ dị, a ga-enwe mgbanwe ndị ọzọ n’oge na-adịghị anya. N’afọ 1932, e si n’Ụlọ Nche nye ọgbakọ dị iche iche ntụziaka ka ha kwụsị ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi site n’ime ntụli aka. Kama nke ahụ, ha ga-ahọpụta kọmitii ije ozi, nke ndị mejupụtara ya bụ ndị ikom ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma. Otú ahụ ka e si mee ka ọrụ ilekọta ọgbakọ dịrị n’aka ndị na-ejechi ozi anya, ọrụ nkwusa gakwara n’ihu.

Ìhè Mụsiwanyekwuru Ike Mere Ka E Meziwanyekwuo Ihe

8. Olee mgbanwe e mere n’afọ 1938?

8 Ìhè ahụ nọgidere “na-amụ aga n’ihu n’ihu.” N’afọ 1938, a kwụsịrị ime ntụli aka kpamkpam n’ọgbakọ. Ọ bụzi “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ahọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi bụ́ ndị ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ ha n’aka. (Matiu 24:45-47) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova nabatara mgbanwe a, ọrụ ịgba àmà ahụ nọgidekwara na-arụpụta ihe.

9. Olee ndokwa e mere n’afọ 1972, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji bụrụ imeziwanye ihe?

9 Malite n’October 1, 1972, e mere mgbanwe ọzọ n’ihe banyere otú e si elekọta ọgbakọ. E mere ndokwa ka ọ bụrụ òtù ndị okenye ga na-elekọtazi ọgbakọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, kama ịhapụrụ ya otu ohu, ma ọ bụ onye nlekọta, ọgbakọ. Ndokwa ọhụrụ a agbawo nnọọ ndị ikom tozuru okè ume iru eru idu ndú n’ọgbakọ. (1 Timoti 3:1-7) N’ihi ya, ọtụtụ ụmụnna nwoke enwewo ahụmahụ n’ịrụ ọrụ ndị dị n’ọgbakọ. Lee nnọọ ka ha siworo nye aka n’ịzụ ọtụtụ ndị ọhụrụ nabatara eziokwu Bible!

10. Olee ndokwa e mere n’afọ 1976?

10 A haziri Òtù Na-achị Isi gaa na kọmitii isii, malitekwa na January 1, 1976, ọ buzi kọmitii ndị a na-elekọta ọrụ nile nke nzukọ a nakwa nke ọgbakọ nile dị n’ụwa. Lee nnọọ otú o siworo baa uru inwe ‘ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ’ na-elekọta akụkụ nile nke ọrụ nkwusa Alaeze!—Ilu 15:22; 24:6.

11. Gịnị ka e meziwanyere n’afọ 1992, n’ihi gịnịkwa?

11 N’afọ 1992, e meziwanyekwara ihe ọzọ, bụ́ nke yiri ihe mere mgbe ndị Izrel na ndị ọzọ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babilọn lọghachi. N’oge ahụ, ndị Livaị e nwere ije ozi n’ụlọ nsọ ahụ ezughị ezu. N’ihi ya, e nyekwuru ndị Netinim na-abụghị ndị Izrel ọrụ iji nyere ndị Livaị aka. N’otu aka ahụ, iji nyere ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche aka ịrụ ọrụ ya na-amụba amụba n’ụwa, e nyekwuru ụfọdụ n’ime ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ ọrụ, n’afọ 1992. A họpụtara ha dị ka ndị ga na-enyere kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi aka.—Jọn 10:16.

12. Olee otú Jehova siworo mee ka ‘ndị nlekọta anyị ghọọ udo’?

12 Gịnị siworo ná mgbanwe a nile e mere pụta? Jehova kwuru, sị: “M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” (Aịsaịa 60:17) E nwere “udo” n’etiti ndị ohu Jehova taa, ịhụnanya ha nwere maka “ezi omume” aghọwo ‘onye na-achị ha n’ihe ike’—nke bụ́ ihe na-akwali ha ijere Chineke ozi. A haziwo ha nke ọma ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

Jehova Mere Ka E Nwewanye Ìhè n’Okporo Ụzọ Ndị Ya n’Ihe Banyere Ozizi

13. N’ime afọ iri sochiri 1920, olee otú Jehova si mee ka ìhè mụsiwanye ike n’okporo ụzọ nke ndị ya n’ihe banyere ozizi?

13 Jehova na-emekwa ka ìhè jiri nwayọọ nwayọọ na-amụsiwanye ike n’okporo ụzọ nke ndị ya n’ihe banyere ozizi. Mkpughe 12:1-9 na-enye ihe atụ. Ihe ndekọ ahụ kpọrọ ndị nnọchianya atọ aha—“nwanyị” dị ime ma mụọ nwa, “dragọn,” nakwa “ọkpara, bụ́ nwa nwoke.” Ị̀ maara onye onye nke ọ bụla n’ime ha nọchiri anya ya? A kọwara ndị ha bụ n’isiokwu bụ́ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ” bụ́ nke e bipụtara n’Ụlọ Nche (Bekee) nke March 1, 1925. Isiokwu ahụ mere ka ndị Chineke ghọtakwuo amụma ndị e buru banyere ọmụmụ nke Alaeze ahụ, bụ́ nke mere ka o doo anya na e nwere nzukọ abụọ dị iche n’ibe ha—nzukọ Jehova na nke Setan. N’agbata afọ 1927 na 1928, ndị Chineke ghọtakwara na ememe Krismas nakwa nke ụbọchị ọmụmụ esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, ha kwụsịkwara ime ha.

14. Olee eziokwu ndị metụtara ozizi bụ́ ndị e mere ka ha doo anya n’ime afọ iri sochiri 1930?

14 N’ime afọ iri sochiri 1930, ìhè mụsiwanyekwara ike n’eziokwu atọ ndị metụtara ozizi. Kemgbe ọtụtụ afọ, Ndị Mmụta Bible ghọtara na “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị e kwuru banyere ha ná Mkpughe 7:9-17 na narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ, bụ́ ndị eze na ndị nchụàjà ibe Kraịst abụghị otu. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1-5) Otú ọ dị, a matachaghị ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ. Dị nnọọ ka ìhè ụtụtụ nke na-amụ aga n’ihu n’ihu na-eme ka ọdịdị na ụcha nke ihe ndị gbaburu ọchịchịrị pụta ìhè, n’afọ 1935, a bịara mata oké ìgwè mmadụ ahụ dị ka ndị ga-alanahụ ‘oké mkpagbu ahụ,’ nwee olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ka oge gatụkwuru n’afọ ahụ, a kọwara otu ihe nke metụtara ụmụ Ndịàmà Jehova nọ n’ụlọ akwụkwọ n’ọtụtụ mba. Ka ịhụ mba n’anya nọ na-egbu ụwa nile ka mmanya, Ndịàmà ghọtara na ikele ọkọlọtọ abụghị nanị ihe e ji emezu iwu. N’afọ sochirinụ, a kọwara eziokwu Bible ọzọ, na a kpọgburu Kraịst n’elu osisi, ọ bụghị n’elu obe.—Ọrụ 10:39.

15. Olee mgbe e mere ka ịdị nsọ nke ọbara doo anya, oleekwa otú e si mee ya?

15 Ngwa ngwa Agha Ụwa nke Abụọ bisịrị, bụ́ mgbe a nabatarala mmịnye ọbara dị ka ụzọ a ga-esi na-agwọ ndị agha merụrụ ahụ́, a ghọtakwuru ihe banyere ịdị nsọ nke ọbara. Ụlọ Nche (Bekee) nke July 1, 1945, gbara “ndị nile na-efe Jehova ofufe bụ́ ndị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume ya ume ka ha lee ọbara anya dị ka ihe dị nsọ nakwa ka ha rube isi n’iwu ezi omume ndị Chineke nyere n’okwu a dị mkpa.”

16. Olee mgbe e wepụtara New World Translation of the Holy Scriptures, oleekwa ihe abụọ dị ịrịba ama dị n’ime ya?

16 N’afọ 1946, a hụrụ mkpa ọ dị inwe nsụgharị Bible ọhụrụ nke ga-adabere n’ihe ọmụma ndị kasị ọhụrụ e nwetara banyere Bible na nke ozizi na omenala Krisendọm na-agaghị agwagbu. Na December 1947, a malitere ọrụ ná nsụgharị dị otú ahụ. N’afọ 1950, e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Bekee. Akwụkwọ Nsọ Hibru nke a sụgharịrị gaa n’asụsụ Bekee dị mpịakọta ise, e wepụtakwara ha obere obere, malite n’afọ 1953. E wepụtara mpịakọta ya nke ikpeazụ n’afọ 1960, bụ́ mgbe ọ gafetụrụla afọ 12 a malitere ịsụgharị ya. E wepụtara New World Translation of the Holy Scriptures dịkọtara ọnụ n’afọ 1961. Nsụgharị a bụ́ nke e nwere ugbu a n’ọtụtụ asụsụ nwere ụfọdụ ihe ndị dị ịrịba ama dị n’ime ya. O weghachiri aha Chineke bụ́ Jehova n’ebe ndị o kwesịrị ịdị. Ọzọkwa, nsụgharị a bụ́ nke a sụgharịrị otú ha dị n’ihe odide ndị mbụ, emewo ka a nọgide na-aghọtakwu eziokwu nke Okwu Chineke.

17. Olee ihe e mere ka o doo anya n’afọ 1962?

17 N’afọ 1962, e mere ka okwu ahụ bụ́ “ikike ndị ka elu” bụ́ nke dị ná Ndị Rom 13:1 nakwa ókè Ndị Kraịst ga-edoru onwe ha n’okpuru ha, dokwuo anya. Mgbe a mụrụ Ndị Rom isi 13 na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ dị ka Taịtọs 3:1, 2 na 1 Pita 2:13, 17 nke ọma, ọ bịara doo anya na okwu ahụ bụ́ “ikike ndị ka elu” adịghị ekwu banyere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst, kama na ọ na-ekwu banyere ndị ọchịchị bụ́ mmadụ.

18. Olee eziokwu ụfọdụ ndị e mere ka ha dokwuo anya n’ime afọ iri sochiri 1980?

18 N’afọ ndị sochirinụ, ìhè nọgidere na-amụ aga n’ihu n’ihu n’okporo ụzọ nke ndị ezi omume. N’afọ 1985, a ghọtara ihe ịgụ mmadụ n’onye ezi omume “maka ndụ” na ịbụ enyi Chineke pụtara. (Ndị Rom 5:18; Jems 2:23) A kọwara nke ọma ihe Jubile Ndị Kraịst pụtara n’afọ 1987.

19. Olee otú Jehova siworo nyekwuo ndị ya ìhè ime mmụọ n’oge ndị na-adịbeghị anya?

19 N’afọ 1995, a ghọtara nkewa nke “atụrụ” na ‘ụmụ ewu’ nke ọma. N’afọ 1998, a kọwara ọhụụ Izikiel banyere ụlọukwu n’ụzọ zuru ezu, bụ́ nke na-emezu ugbu a. N’afọ 1999, e mere ka mgbe ‘ihe arụ ahụ ga-eguzo n’ebe nsọ’ na otú ọ ga-esi guzo doo anya. (Matiu 24:15, 16; 25:32) N’afọ 2002 kwa, a bịara ghọtakwuo ihe ife Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu” pụtara.—Jọn 4:24.

20. Olee ụzọ ndị ọzọ ndị Chineke siworo meziwanye ihe?

20 Tụkwasị n’ihe ndị e meziwanyere n’ihe banyere nzukọ na ozizi, e meziwanyekwara ihe n’ihe banyere àgwà Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1973, a ghọtara iji ụtaba eme ihe dị ka ‘mmerụ nke anụ ahụ́,’ nakwa na a ga-ele ndị ji ya eme ihe anya dị ka ndị mere oké mmehie. (2 Ndị Kọrint 7:1) Afọ iri ka nke ahụ gasịrị, e mere ka otú anyị kwesịrị isi lee iji égbè eme ihe anya dokwuo anya n’Ụlọ Nche nke January 15, 1984. Ihe ndị a bụ nanị ole na ole n’ebe ndị ìhè mụsiwanyere ike n’oge anyị.

Nọgide Na-eje Ije n’Okporo Ụzọ nke Ìhè Na-amụsiwanye Ike na Ya

21. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ihe anya iji nọgide na-eje ije n’okporo ụzọ ìhè na-amụsiwanye ike na ya?

21 Otu okenye nke jeworo ozi ruo ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Ịnakwere mgbanwe na itinye ya n’ọrụ na-esi ike.” Gịnị nyewooro ya aka ịnabata ọtụtụ ihe ndị e meziwanyeworo kemgbe afọ 48 o jewere ozi dị ka onye nkwusa Alaeze? Ọ zara, sị: “Ihe nyewooro m aka bụ ile ihe anya n’ụzọ ziri ezi. Ịjụ ịnabata mgbanwe pụtara achọghị iso nzukọ a na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na o siere m ike ịnabata mgbanwe, ana m echeta okwu Pita gwara Jizọs: ‘Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-agakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.’ Mgbe ahụ ana m ajụ onwe m, sị: ‘Ebee ka m ga-aga—ọ̀ bụ n’ụwa nke a gbara ọchịchịrị?’ Nke a na-enyere m aka ịnọgidesi ike ná nzukọ Chineke.”—Jọn 6:68.

22. Olee otú anyị si erite uru site n’ije ije n’ìhè?

22 N’ezie, ụwa anyị bi n’ime ya nọ n’oké ọchịchịrị. Ka Jehova na-anọgide na-amụkwasị ndị ya ìhè, ọdịiche dị n’etiti ha na ndị ụwa na-ebuwanye ibu. Olee uru ìhè a na-abara anyị? Dị nnọọ ka ịgba ọkụ n’olulu dị n’okporo ụzọ gbara ọchịchịrị na-adịghị ewepụ olulu ahụ, otú a ka ìhè nke Okwu Chineke na-adịghị ewepụ ọnyà dị iche iche. N’agbanyeghị nke ahụ, ìhè nke Chineke na-enye na-enyere anyị nnọọ aka izere ha iji wee nwee ike ịnọgide na-eje ije n’okporo ụzọ nke ìhè na-amụsiwanye ike na ya. N’ihi ya, ka anyị nọgide na-ege ntị n’okwu amụma Jehova, “dị ka oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị.”—2 Pita 1:19.

Ì Chetara?

• Olee mgbanwe ndị Jehova meworo ka ndị ya mee n’ihe banyere nzukọ ha?

• Olee mgbanwe ndị ìhè na-amụsiwanye ike meworo ka e nwee n’ihe banyere ozizi?

• Olee mgbanwe ndị e merela bụ́ ndị i jiworo anya gị hụ, gịnịkwa nyewooro gị aka ịnabata ha?

• N’ihi gịnị ka i ji chọọ ịnọgide na-eje ije n’okporo ụzọ ìhè na-amụsiwanye ike na ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Mgbakọ e nwere n’afọ 1922 na Cedar Point, Ohio, gbara Ndị Mmụta Bible ume ịrụ ọrụ Chineke

[Foto dị na peeji nke 29]

“Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst” nke N. H. Knorr wepụtara n’afọ 1950

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

© 2003 BiblePlaces.com